Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Kraịst Oge Gboo n’Oge A Na-asụ Asụsụ Grik n’Ọtụtụ Ebe

Ndị Kraịst Oge Gboo n’Oge A Na-asụ Asụsụ Grik n’Ọtụtụ Ebe

Ndị Kraịst Oge Gboo n’Oge A Na-asụ Asụsụ Grik n’Ọtụtụ Ebe

Ọ BỤ asụsụ Grik ka ọtụtụ n’ime ndị Ndị Kraịst oge gboo ziri ozi ọma na-asụ. Ọ bụ asụsụ Grik ka e ji dee Akwụkwọ Nsọ ha ji egosi ndị mmadụ na ozi ọma ha na-ezisa banyere Jizọs bụ eziokwu. Ọtụtụ n’ime ndị mmụọ nsọ kpaliri ide mpaghara Baịbụl e mechara na-akpọ Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst dere ha n’asụsụ Grik. Ha ji ihe atụ na okwu ndị na-asụ asụsụ Grik na-aghọta nke ọma dee ha. Ma, Jizọs na ụmụazụ ya na ndị niile so dee Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst abụghị ndị Grik. N’ezie, ha niile bụ ndị Juu.—Ndị Rom 3:1, 2.

Olee otú asụsụ Grik si ghọọ asụsụ e ji mee ka ọtụtụ ndị ghọọ Ndị Kraịst? Olee otú Ndị Kraịst oge gboo, bụ́ ndị so dee Baịbụl ma gaa ná mba dị iche iche zisaa ozi ọma, si mee ka ozi ha masị ndị dị iche iche na-asụ asụsụ Grik? Oleekwa ihe mere anyị ga-eji nwee mmasị n’ihe mere n’oge ahụ?

Otú Omenala Ndị Grik Si Gbasaa

Alexander Onye Ukwu kwaturu Alaeze Ukwu Peshia n’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ atọ gara aga wee malite imeri ọtụtụ mba n’ụwa. Ọ malitere ịkụziri ndị o meriri, bụ́ ndị na-asụ asụsụ dị iche iche, asụsụ na omenala ndị Grik iji mee ka ha niile dịrị n’otu. Otú ihe ahụkwa ka ndị eze nọchiri ya mere.

Ọbụna mgbe ọtụtụ afọ gachara, n’oge Rom meriri Gris wee chịwa ụwa, mba ndị gbara Gris gburugburu ka nọgidere na-eme omenala ndị Grik. Ndị chịrị Rom n’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ abụọ gara aga nwere mmasị dị ukwuu n’ihe niile ndị Grik na-eme, ma ná nkà ha, ma n’otú ha si arụ ụlọ, ma n’akwụkwọ ha, ma ná nkà ihe ọmụma ha. Ọ bụ ya mere onye na-ede uri bụ́ Horace ji kwuo, sị: “Ọ bụ ezie na e meriri Gris, ọ ka ji ndị meriri ya eji.”

Mgbe ndị Rom na-achị ụwa, nnukwu obodo ndị dị n’Eshia Maịnọ dum, Siria, na Ijipt ghọrọ ebe a na-amụ omenala ndị Grik. Omenala ndị Grik mepere ndị mmadụ anya wee metụta ihe niile ha na-eme ná ndụ, ma ọchịchị, ma iwu, ma azụmahịa, ma ngwá ahịa a na-emepụta, ma ejiji. N’ọtụtụ obodo ndị Grik, e nwere ebe a na-emega ahụ́, bụ́ ebe ụmụ okorobịa na-anọ amụ egwuregwu, nweekwa ebe a na-anọ eme ihe nkiri ndị Grik.

Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Emil Schürer, kwuru, sị: “N’oge ahụ omenala ndị Grik na-ewu ewu, ndị Juu ji nke nta nke nta nabata ya. Ná mmalite, ịnụ ọkụ n’obi ndị Juu ji na-ekpe okpukpe ha mere ka ha jụ ikpere arụsị e ji mara omenala ndị Grik. Ma, ka oge na-aga, omenala ndị ahụ malitere imetụta ọtụtụ ụzọ ndị Juu si ebi ndụ. A sị ka e kwuwe, Schürer sịrị na “ọ fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ na ndị na-eme omenala ndị Grik gbara obere ala ndị Juu bi gburugburu n’akụkụ niile. Azụmahịa mekwara ka ha na ndị Juu na-emekọrịta ihe mgbe niile.”

Otú Nsụgharị Septuagint Si Nye Aka

Mgbe ndị Juu si n’ala ha gaa ná mba ndị dị nso n’Oké Osimiri Mediterenian, obodo ndị ha gara biri bụ ebe ndị a na-eme omenala ndị Grik, na-asụkwa asụsụ Grik. Ndị Juu ndị ahụ nọgidere na-ekpe okpukpe ndị Juu, ha na-agakwa Jeruselem maka ememme dị iche iche ndị Juu na-eme kwa afọ. Ma, ka oge na-aga, ọtụtụ n’ime ha chefuru asụsụ Hibru. * Ọ bụ ya mere ịsụgharị Akwụkwọ Nsọ Hibru n’asụsụ Grik nke ọtụtụ ndị na-asụ n’oge ahụ ji dị mkpa. N’ihe dị ka afọ 280 tupu a mụọ Kraịst, ndị ọkà mmụta bụ́ ndị Juu malitere ime nsụgharị ahụ. Ọ ga-abụ n’Alexandria, Egypt, bụ́ obodo omenala ndị Grik hiwere isi, ka ha nọ mee ya. A na-akpọ Akwụkwọ Nsọ ha sụgharịrị Septuagint.

Nsụgharị Septuagint dị oké mkpa. Ọ bụ ya mere ka ndị ala Bekee mata ihe ndị magburu onwe ha dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. E wezụga ya, ọ bụ mmadụ ole na ole gaara ama banyere mmekọrịta ụmụ Izrel na Chineke, n’ihi na ọ ka gaara adị n’asụsụ ọtụtụ ndị na-anaghị aghọta, bụ́ nke na-agaraghị enye aka n’ozi ọma a na-agbasa n’ụwa dum. N’eziokwu, ọ bụ ihe e dere ná nsụgharị Septuagint mere ka ndị na-asụ asụsụ dị iche iche nwee ike ịmara banyere Jehova bụ́ Chineke. Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị maara asụsụ Grik n’oge ahụ, ọ bụ ya bụ asụsụ kacha mma iji mee ka ndị mmadụ mara eziokwu banyere Chineke.

Ndị Na-eso Ụzọ Ndị Juu na Ndị Ọzọ Na-atụ Egwu Chineke

N’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ abụọ gara aga, ndị Juu sụgharịrị ọtụtụ n’ime akwụkwọ ha n’asụsụ Grik, malitekwa ide ndị nke ọhụrụ n’asụsụ Grik. Nke a nyere aka nke ukwuu mee ka ndị na-abụghị ndị Izrel mara akụkọ ụmụ Izrel, marakwa banyere okpukpe ha. Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kwuru na n’oge ahụ, ọtụtụ ndị na-abụghị ndị Juu ‘na-akpa ndị Juu nso, soro ha na-efe ofufe, na-edebekwa iwu ha dị iche iche, ọ bụ ezie na mgbe ụfọdụ ha na-emefe ya ókè, mgbe ụfọdụ, ha anaghị emeru ya n’isi.’—Akwụkwọ bụ́ The History of the Jewish People in the Age of Jesus Christ.

Ụfọdụ ndị na-abụghị ndị Juu sonyeere ndị Juu n’okpukpe ha, e biekwa ha úgwù, ha aghọọ ndị na-eso ụzọ ndị Juu. Ndị ọzọ malitere idebe ụfọdụ iwu ndị Juu, ma, ha ekweghị agbanwe okpukpe ha. Akwụkwọ Grik na-akpọkarị ha “ndị na-atụ egwu Chineke.” A kpọrọ Kọniliọs “nwoke obi ya dị ọcha, onye . . . na-atụ egwu Chineke.” Pọl onyeozi hụrụ ọtụtụ ndị na-atụ egwu Chineke, bụ́ ndị ha na ndị Juu na-emekọrịta ihe, n’Eshia Maịnọ dum nakwa na Gris. Dị ka ihe atụ, n’Antiọk nke dị na Pisidia, ọ kpọrọ ndị zukọrọ n’ụlọ nzukọ dị n’ebe ahụ “ụmụ Izrel na unu ndị ọzọ na-atụ egwu Chineke.”—Ọrụ 10:2; 13:16, 26; 17:4; 18:4.

Ọ bụ ya mere na mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs malitere izi ndị Juu na-ebighị na Judia ozi ọma, ọtụtụ n’ime ndị nụrụ ozi ọma ha bụ ndị na-eme omenala ndị Grik. Ọ dịịrị ọtụtụ ndị bi n’ebe ndị ahụ mfe ịghọ Ndị Kraịst. Mgbe o doro ndị na-eso ụzọ Jizọs anya na Chineke ekwela ka ndị na-abụghị ndị Juu nwee olileanya nzọpụta, ha matara na n’anya Chineke “e nweghịkwa onye Juu ma ọ bụ onye Grik.”—Ndị Galeshia 3:28.

Izi Ndị Grik Ozi Ọma

Ná mmalite, ụfọdụ ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst n’oge gboo enwechaghị mmasị ịnabata ndị na-abụghị ndị Juu ghọrọ Ndị Kraịst n’ọgbakọ ha n’ihi otú ndị na-abụghị ndị Juu si efe ofufe na otú ha si ebi ndụ. Ya mere, mgbe o doro anya na Chineke nwere mmasị ịnabata ndị na-abụghị ndị Juu, ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem mere ka o doo anya na ndị ahụ na-abụghị ndị Juu, bụ́ ndị ghọrọla Ndị Kraịst, aghaghị izere ọbara, ịkwa iko, na ikpere arụsị. (Ọrụ 15:29) Nke a dị onye ọ bụla biri ndụ otú ndị Grik si ebi ndụ oké mkpa n’ihi na ihe e ji mara ndị Grik na ndị Rom bụ “agụụ mmekọahụ na-eme ihere” nakwa nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị inwe mmekọahụ. Ndị Kraịst anaghị ebi ụdị ndụ ahụ.—Ndị Rom 1:26, 27; 1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10.

N’ime Ndị Kraịst niile gara n’ala ọzọ kwusaa ozi ọma n’oge a na-asụ asụsụ Grik n’ọtụtụ ebe, ọ dịghị onye a ma ama ka Pọl onyeozi. Taa, onye ọ bụla gara Athens, nke dị na Greece, ka ga-ahụ ihe e ji ọla nchara dee n’ala ugwu Ariopagọs, bụ́ nke e ji echeta okwu ahụ a ma ama Pọl kwuru n’obodo ahụ. E dere okwu ahụ o kwuru n’akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi isi nke iri na asaa. Otú o si jiri okwu bụ́ “Ndị Atens” malite okwu ya bụ otú ndị ọkà okwu chọrọ ịgwa ọhaneze okwu na Gris si amalite okwu ha. Otú a o si gwa ha okwu mere ka ahụ́ ruo ndị ọ gwara okwu ala. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị ọkà ihe ọmụma a na-akpọ ndị òtù Epikurọs na ndị òtù Stoik. Kama Pọl iwe iwe ma ọ bụ katọọ otú ndị ahụ ọ gwara okwu si efe ofufe, o kwuru ihe mere ka obi dị ha mma site n’ịgwa ha na ha ji okpukpe kpọrọ ihe. O kwuru banyere ebe ịchụàjà nke e dere na ọ bụ “Nye Chi A Na-amaghị Ama” ma kwuo ihe ga-eme ka ya na ha nwee otu olu mgbe ọ sịrị na ọ bụ Chi ahụ ka ya chọrọ ịgwa ha okwu ya.—Ọrụ 17:16-23.

Ndị ahụ Pọl gwara okwu ghọtara ihe o kwuru n’ihi na o kwuru banyere ihe ha ma. Ọ ga-abụrịrị na ndị nọ n’òtù ndị Stoik kwetara ihe o kwuru, ya bụ, na Chineke na-enye ndụ, na mmadụ niile si n’otu agbụrụ, na Chineke anọghị n’ebe dị anya n’ebe anyị nọ, nakwa na ndụ mmadụ dị n’aka Chineke. Pọl ji ihe ndị nọ n’òtù ndị Stoik bụ́ ndị na-ede uri dere kwadoo na ndụ mmadụ dị n’aka Chineke. Ihe ahụ o kwuru si n’uri Aratus (nke bụ́ Phaenomena) nakwa n’uri Cleanthes (nke bụ́ Hymn to Zeus). Ọ ga-abụrịrị na ndị nọ n’òtù ndị Epikurọs chọpụtara na ihe Pọl kwuru dabara n’ihe ha kwere, ya bụ, na Chineke dị ndụ nakwa na mmadụ nwere ike ịmara onye ọ bụ. O nweghị ihe na-akpa ya, ọ dịghị ihe mmadụ ga-enyere ya aka mee, o bighịkwa n’ụlọ nsọ ndị e ji aka wuo.

Okwu Pọl kwuru mgbe ọ na-agwa ndị gere ya ntị okwu abụghịrị ha okwu ọhụrụ. N’ezie, otu akwụkwọ kwuru na “ụwa (ya bụ, kosmos),” “ndị ọ mụrụ,” na “Chineke” bụcha okwu ndị ọkà ihe ọmụma Grik na-ekwu. (Ọrụ 17:24-29) Nke a apụtaghị na Pọl gwara ha ihe ha chọrọ ịnụ iji mee ka ha ghọọ Ndị Kraịst. Kama nke ahụ, ihe o kwuru banyere mbilite n’ọnwụ na ikpe mgbe ọ na-emechi okwu ya adabaghị n’ihe ha kweere. N’agbanyeghị nke ahụ, o ji nkà kwuo okwu ya ka o wee masị ndị ọkà ihe ọmụma ahụ ọ gwara okwu.

Ọ bụ ọgbakọ ndị dị n’obodo ndị Grik ma ọ bụ n’obodo ndị Rom na-achị, bụ́ ndị na-eme omenala ndị Grik, ka o degaara ọtụtụ n’ime akwụkwọ ozi ya. Akwụkwọ ozi ndị ahụ o ji ezigbo Grik dee gosiri nnọọ otú ndị Grik si eche echiche na otú ha si eme ihe. Pọl kwuru banyere egwuregwu, ihe a na-enye onye meriri n’asọmpi, onye nduzi nke na-eduga nwatakịrị n’ụlọ akwụkwọ, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ ndị Grik na-eme ná ndụ ha. (1 Ndị Kọrịnt 9:24-27; Ndị Galeshia 3:24, 25) N’agbanyeghị na Pọl ji okwu dị iche iche ndị Grik na-ekwu kọwaa ihe ọ gwara ha, ọ jụrụ kpamkpam otú ha si ebi ndụ na otú ha si efe ofufe.

Ịghọ Ihe Niile n’Ebe Ụdị Mmadụ Niile Nọ

Pọl onyeozi ghọtara na ihe ga-eme ka ya zie ndị ọzọ ozi ọma bụ ịghọ “ihe niile n’ebe ụdị mmadụ niile nọ.” Ọ sịrị: “N’ebe ndị Juu nọ, adịrị m ka onye Juu, ka m wee rite ndị Juu n’uru.” O mekwara ka onye Grik n’ebe ndị Grik nọ, iji nyere ha aka ịghọta nzube Chineke. N’ezie, Pọl ruru nnọọ eru ime otú ahụ, n’ihi na ọ bụ onye Juu nke bi n’obodo a na-eme omenala ndị Grik. Ndị Kraịst niile taa kwesịrị ime ụdị ihe ahụ o mere.—1 Ndị Kọrịnt 9:20-23.

Taa, ọtụtụ nde mmadụ na-esi n’otu ala gaa n’ala ọzọ, ya bụ, n’otu ebe a na-eme otu omenala gaa n’ebe a na-eme omenala ọzọ. Nke a na-akpatara Ndị Kraịst ọrụ dị ukwuu, n’ihi na ha na-agbasi mbọ ike izisa ozi ọma Alaeze Chineke na ime ihe Jizọs nyere ha n’iwu, ya bụ, ‘ime ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya.’ (Matiu 24:14; 28:19) Ha achọpụtala ugboro ugboro na ọ bụrụ na ndị mmadụ anụ ozi ọma n’asụsụ ala nna ha, ọ na-eru ha n’obi, ha na-anabatakwa ya.

Ọ bụ ya mere e ji ebipụta magazin a bụ́ Ụlọ Nche nke Na-ekwusa Alaeze Jehova n’otu narị asụsụ na iri isii na itoolu, na-ebipụtakwa magazin a na-ebipụtakọ ya na ya, bụ́ Teta! n’asụsụ iri asatọ na otu. E wezụga nke ahụ, ọtụtụ Ndịàmà Jehova na-agbalị ịmụ asụsụ ọhụrụ, tinyere asụsụ siri ike, ndị dị ka Arabic, Chinese, na Russian, iji zie ndị kwatara n’ebe ha bi ozi ọma. Ihe ha bu n’obi eme ya bụ otu ihe ahụ Ndị Kraịst oge gboo bu n’obi. Pọl onyeozi kwutere ya mgbe ọ sịrị: “Aghọwo m ihe niile n’ebe ụdị mmadụ niile nọ, ka m wee si n’ụzọ ọ bụla zọpụta ụfọdụ ndị.”—1 Ndị Kọrịnt 9:22.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Ọtụtụ ndị Juu bi na Jeruselem na-asụ asụsụ Grik. Dị ka ihe atụ, e nwere ndị ikom ndị “a na-akpọ Ụlọ Nzukọ nke Ndị A Tọhapụrụ Atọhapụ, na nke ndị Saịrini na ndị Alegzandria na ndị si Silishia na Eshia,” bụ́ ndị ọ ga-abụ na ha na-asụ asụsụ Grik.—Ọrụ 6:1, 9.

[Map dị na peeji nke 18]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Rom

GRIS

Atens

ESHIA

Antiọk (nke dị na Pisidia)

SILISHIA

SIRIA

JUDIA

Jeruselem

IJIPT

Alegzandria

Saịrini

OKÉ OSIMIRI MEDITERENIAN

[Foto dị na peeji nke 19]

Nsụgharị “Septuagint” mere ka ndị mmadụ mara Jehova n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga

[Ebe E Si Nweta Foto]

Israel Antiquities Authority

[Foto dị na peeji nke 20]

Ihe e dere n’Ariopagọs bụ́ nke e ji echeta okwu Pọl kwuru