Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Onye Okike nke Anyị Kwesịrị Inye Otuto

Onye Okike nke Anyị Kwesịrị Inye Otuto

Bịaruo Chineke Nso

Onye Okike nke Anyị Kwesịrị Inye Otuto

Mkpughe 4:11

Ò NWETỤLA mgbe ị jụrụ, sị, ‘Olee ihe mere mmadụ ji dịrị ndụ?’ Ndị kweere na anyị pụtara n’onwe anyị, n’enweghị onye okike nwere ọgụgụ isi kere anyị, anaghị achọtali azịza ajụjụ a. Ma, ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị ndị kweere eziokwu doro anya bụ́ na Jehova Chineke bụ Isi Iyi nke ndụ. (Abụ Ọma 36:9) Ha ma na o nwere ihe mere o ji kee anyị. A kọwara ihe mere o ji kee anyị ná Mkpughe 4:11. Ka anyị hụ otú ihe ahụ Jọn onyeozi dere si kọwaa ihe mere anyị ji dịrị ndụ.

Jọn dere na ndị mmụọ ozi bụkuru Chineke abụ otuto, sị: “I kwesịrị ekwesị, Jehova, bụ́ Chineke anyị, ịnata otuto na nsọpụrụ na ike, n’ihi na ọ bụ gị kere ihe niile, ọ bụkwa n’ihi uche gị ka ha ji dịrị, ọ bụkwa ya mere e ji kee ha.” Ọ bụ naanị Jehova ka anyị kwesịrị ịkwanyere ụdị ùgwù a. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụ ya “kere ihe niile.” Ma, olee ihe ndị o kere eke nwere ọgụgụ isi kwesịrị ime?

E kwuru na Jehova kwesịrị “ịnata” otuto, nsọpụrụ, na ike. O doro anya na ọ bụ ya bụ Onye kacha dị ebube, onye kacha nwee ùgwù na onye kacha dị ike n’eluigwe na ala. Ma, ọtụtụ mmadụ ekwetaghị n’ezie na ọ bụ ya kere ihe niile. N’agbanyeghị nke ahụ, e nwere ndị na-esi n’ihe e kere eke na-ahụ “àgwà [Chineke] ndị a na-apụghị ịhụ anya,” na-ahụ ha nke ọma. (Ndị Rom 1:20) Ebe ọ bụ na obi ha juru n’ekele, ha na-enye Jehova otuto na nsọpụrụ. Ha na-akpọsara ndị niile nwere mmasị ihe ndị magburu onwe ha na-egosi na ọ bụ Jehova kere ihe niile, kee ha ha amaa mma. Ha na-akpọsakwara ha na ọ bụ ya ka anyị kwesịrị ịkwanyere ùgwù.—Abụ Ọma 19:1, 2; 139:14.

Ma, olee otú Jehova si anata ike n’aka ndị na-efe ya? N’eziokwu, ọ dịghị ihe e kere eke ma ọ bụ onye e kere eke ga-enyeli Onye okike pụrụ ime ihe niile ike. (Aịzaya 40:25, 26) Ma, ebe ọ bụ na e kere anyị n’onyinyo Chineke, anyị ketara àgwà Chineke ụfọdụ, nke otu n’ime ha bụ ike. (Jenesis 1:27) Ọ bụrụ na ihe Onye kere anyị meere anyị masịrị anyị n’ezie, anyị ga-eji ike anyị na ume anyị na-asọpụrụ ya ma na-enye ya otuto. Kama iji ike anyị na-egbo naanị mkpa anyị, anyị na-egosi na ọ bụ Jehova bụ́ Chineke kwesịrị ịnata ike anyị niile mgbe anyị na-ejere ya ozi.—Mak 12:30.

Ma, olee ihe mere anyị ji dịrị ndụ? Okwu mmechi e kwuru ná Mkpughe 4:11 zara, sị: “Ọ bụkwa n’ihi uche gị ka ha [ya bụ, ihe niile e kere eke] ji dịrị, ọ bụkwa ya mere e ji kee ha.” Ọ bụghị ọchịchọ anyị mere anyị ji pụta ụwa. Anyị dị ndụ maka na ọ bụ uche Chineke. Ọ bụ ya mere onye na-achọ naanị ọdịmma onwe ya ná ndụ na-anaghị enwe obi ụtọ, ndụ ya anaghịkwa enwe isi. Tupu obi eruo anyị ala, anyị enweekwa ọṅụ, afọ ojuju na obi ụtọ, anyị ga-amụta ihe bụ́ uche Chineke ma na-ebi ndụ otú ọ chọrọ. Ọ bụ naanị mgbe ahụ ka anyị ga-egosi na anyị ma ihe mere e ji kee anyị na ihe mere anyị ji dịrị ndụ.—Abụ Ọma 40:8.

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 31]

NASA, ESA, na A. Nota (STScI)