Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Ezigbo Nnwere Onwe Si Ruo Ndị Maya Aka

Otú Ezigbo Nnwere Onwe Si Ruo Ndị Maya Aka

Otú Ezigbo Nnwere Onwe Si Ruo Ndị Maya Aka

A MA ndị Maya ama n’ihi ike ha kpara n’oge ochie. Kwa afọ, ọtụtụ puku mmadụ na-aga Yucatán nke dị na Mexico, bụ́ obodo fọrọ obere ka mmiri gbaa ya gburugburu, ka ha kirie nnukwu pyramid, dị ka ndị nke dị na Chichén Itzá nakwa na Cobá. Ihe e ji mara ndị Maya abụghị naanị na iwu ihe owuwu doro ha anya kamakwa ha kpara ike n’ide ihe odide, n’ime mgbakọ na mwepụ, na ịmụ banyere ihe ndị dị na mbara igwe. Ha chepụtara mkpụrụ akwụkwọ yiri ihe e sere ese, chepụtakwa mkpụrụ ọnụ ọgụgụ bụ́ zero, nakwa kalenda nwere narị abalị atọ na iri isii na ise, tinyere otu ụbọchị a ga na-agbakwụnye ya n’afọ ụfọdụ.

Ma n’ihe gbasara okpukpe, ha mere ihe dị nnọọ iche. Ndị Maya nwere ọtụtụ chi ha na-efe; ha na-efe chi anyanwụ, chi ọnwa, chi mmiri ozuzo, chi ọka na chi ndị ọzọ. Ndị nchụàjà ha ji ịgụ kpakpando kpọrọ ihe. Ha na-eji ihe oyiyi dị iche iche efe ofufe, na-amụ insensi, na-ebekasịkwa onwe ha ahụ́, ọbara ana-agba ha mgbe ha na-efe chi ha. Ha na-ejikwa ndị ha tụrụ mkpọrọ, ndị ohu, ma karịchaa, ụmụaka achụ àjà.

Ndị Spain Abịa n’Ala Ha

Mgbe ndị Spain rutere n’ala ndị Maya n’ihe dị ka narị afọ ise gara aga, ha hụrụ na ndị Maya mepere anya. Ndị Spain ahụ bu ihe abụọ n’obi bịa, ya bụ, inweta ala ọhụrụ na akụnụba, nakwa ime ka ndị Maya ghọọ ndị Katọlik, ka ha wee kwụsị ikpere arụsị na arụrụala so ya. Ọbịbịa ndị Spain bịara n’ala ndị Maya ò mere n’ezie ka ha kwụsị okpukpe ọjọọ ha na-ekpe, nwerekwa onwe ha n’ụzọ ndị ọzọ?

Ndị Spain, tinyere ndị ụkọchukwu Katọlik, naara ndị Maya ala ha, bụ́ ebe ndị Maya na-asụcha, na-esu ọkụ, ma na-akọ ihe kemgbe ụwa. Nnapụ ha napụrụ ndị Maya ala ha mere ka ihe siere ndị Maya ike nke ukwuu, meekwa ka ha na ndị Spain ghọọ ndị iro. Ndị Spain nakwaara ha olulu mmiri dị iche iche dị na Yucatán, bụ́ naanị ebe ha si enweta mmiri n’ebe ahụ. Ihe ọzọ mere ka ihe sikwuoro ndị Maya ike bụ na chọọchị Katọlik kwuru na ụtụ isi nwoke ọ bụla ga na-akwụ ha kwa afọ bụ real * iri na abụọ na ọkara, ebe nwaanyị ọ bụla ga na-akwụ real itoolu. Ha ga na-akwụkwa nnukwu ụtụ isi ndị ọchịchị kwuru ka ha na-akwụ. Ndị Spain bụ́ ndị naara ndị Maya ala ha ji nke a mekpọọ ha ọnụ. Ha na-atụrụ ndị Maya ụtụ isi ahụ chọọchị kwuru ka ha na-akwụ ma manyezie ha ka ha rụwara ha ọrụ iji kwụghachi ha ụgwọ ụtụ isi ahụ ha tụụrụ ha. Nke a mere ka ndị Maya bụrụ ndị ohu ha.

Ndị ụkọchukwu na-anakwa ndị Maya ego maka agbamakwụkwọ, olili ozu na ime ha baptizim. Ala chọọchị ahụ naara ndị Maya, ụtụ isi ndị Maya na-atụrụ ha, na ụgwọ ndị ọzọ ha na-akwụ ha mere ka chọọchị ahụ baa ọgaranya. Ha na-ele ndị Maya anya dị ka ndị na-ekwere ihe na-enweghị isi, ndị na-enweghị ihe ha ma, na ndị na-enweghị mgbanwe. Ya mere, ndị ụkọchukwu na ndị ọzọ nọ n’ọchịchị chere na ọ dịghị njọ ịpịa ndị Maya ihe ka ha wee na-erube isi ma kwụsị ihe na-enweghị isi ha kweere.

Agha Ndị A Na-emegbu Emegbu

Iji megwara ihe ọjọọ a na-eme ha, ndị Maya kwụsịrị ịtụrụ chọọchị ụtụ isi, kpọpụta ụmụ ha n’ụlọ akwụkwọ ndị ụka, kwụsị ịga katikizim, kwụsịkwa ịrụrụ ha ọrụ n’ugbo. Ma, nke a mere ka e mesikwuo ha ike. N’afọ 1847, bụ́ mgbe ndị Spain chịrịla ndị Maya ihe dị ka narị afọ atọ, esemokwu ha ekweghịzi mmeta. Ndị Maya lụsoro “ndị ọcha” agha, bụ́ agha a na-akpọ Agha Ndị A Na-emegbu Emegbu.

Ndị isi ndị Maya n’agha ahụ na-eji obe ha kpọrọ Obe Na-ekwu Okwu agwa ndị Maya ka ha jiri ndụ ha lụọ agha. Mmadụ na-esi n’obe ahụ ekwu okwu, ya adị ka à ga-asị na ọ bụ obe ahụ na-ekwu ya. Agha ahụ kpara ndị Maya aka ọjọọ. Mgbe agha ahụ biri n’afọ 1853, ọ fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ na o riri isi ọkara ndị Maya bi na Yucatán. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị Maya na “ndị ọcha” nọkwa na-alụ agha, ha lụtụ ha akwụsị, ruo afọ iri ise na ise. N’ikpeazụ, ndị Maya nweere onwe ha, ndị Spain akwụsị ịchị ha. E wee kee ala, ya erute onye ukwu na onye nta aka. Ma, hà kwụsịrị okpukpe na-ezighị ezi ha na-ekpe?

Ha Ka Na-ekpe Okpukpe Na-ezighị Ezi

Ma chọọchị Katọlik ndị Spain ji bịa ma agha ahụ a lụrụ emeghị ka ndị Maya nwere onwe ha n’ezie. Taa, ndị mmadụ ka na-ekpe okpukpe a gwakọtara omenala ndị Maya na-emebu na okpukpe Katọlik.

Akwụkwọ bụ́ The Mayas—3000 Years of Civilization kwuru banyere ndị Maya nke oge a, sị: “Ndị Maya na-anọ n’ọhịa, n’ọgba na n’ugwu na-efe chi ndị ha na-efe kemgbe ụwa, na-efekwa ndị nna nna ha, . . . ma na-agakwa n’ụlọ ụka na-efe ndị senti.” Ya mere, ha na-ewere na chi bụ́ Quetzalcoatl, ma ọ bụ Kukulcán, na Jizọs bụ otu, na-ewerekwa na chi ọnwa ha, bụ́ chi nwaanyị, na Vegin Marịa bụ otu. Ha jikwa ùgwù ha na-akwanyere obe, bụ́ nke ha na-agba mmiri dị ka à ga-asị na ọ bụ osisi dị ndụ, dochie ofufe ha na-efe osisi ha dị nsọ bụ́ ceiba. Ihe ha na-eji achọ obe ha mma bụ okooko osisi ceiba, ọ bụghị onyinyo Jizọs.

Ezigbo Nnwere Onwe Mechara Ruo Ha Aka

N’afọ ndị na-adịbeghị anya, Ndịàmà Jehova nọ na Mexico malitere ikwusara ndị Maya ozi ọma n’obodo ha niile. A na-ebipụta akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, dị ka magazin a, n’asụsụ ndị Maya iji nyere ha aka ịghọta ihe Chineke zubere imere ụmụ mmadụ. Gịnị si na ya pụta? N’oge a na-ede isiokwu a, e nweela ihe dị ka puku ndị na-ekwusa ozi ọma isii na narị isii, bụ́ ndị na-asụ asụsụ Maya, nweekwa narị ọgbakọ Ndịàmà Jehova abụọ na iri anọ na otu ha nọgasị. Ọ̀ na-adịrị ndị Maya mfe ịhapụ ihe ndị ha kweere wee nabata eziokwu dị na Baịbụl?

Ọtụtụ ndị Maya ndị nwere ezi obi ga-agwa gị na ọ dịghị mfe. Marcelino na nwunye ya, bụ́ Margarita, kweere na ha bụ ezigbo ndị Katọlik. Kwa afọ, ha na-akwanyere obe ùgwù. Ha na-esi na chọọchị ha buru obe laa n’ụlọ ha, bụ́ ebe ha na-eji ụmụ anụmanụ achụrụ ya àjà. Ha mechaa, ha na ndị ikwu ha na ndị enyi ha erie anụ ndị ahụ ha ji chụọ àjà. Ka oge na-aga, Ndịàmà Jehova bịara na nke ha, ha na ha wee malite ịmụ Baịbụl. Ha kwuru, sị: “Anyị ghọtara na ihe anyị na-amụta bụ eziokwu, ma anyị chere na ọ bụrụ na anyị ahapụ chọọchị anyị, ndị mmụọ ga-emerụ anyị ahụ́.” N’agbanyeghị nke ahụ, ha nọgidere na-amụ Baịbụl. Marcelino kwuru, sị: “Eziokwu dị na Baịbụl ji nke nta nke nta bamie anyị n’obi. Nke ahụ mere ka anyị nwee obi ike ịkọrọ ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi anyị ihe ndị anyị na-amụta na Baịbụl. Obi dị anyị ụtọ ugbu a, n’ihi na anyị enwerela onwe anyị n’ihe ndị na-enweghị isi anyị kweere. Naanị ihe na-ewute anyị bụ na anyị amaliteghị ijere Chineke ozi ngwa ngwa. Anyị chọrọ ịkwụ ụgwọ oge funahụrụ anyị site n’iji ike anyị niile na-agwa ndị ọzọ banyere eziokwu magburu onwe ya dị na Baịbụl.”

Alfonso, onye dị afọ iri asaa na atọ, bụ ezigbo onye Katọlik. Ọ bụ ya na-ahazi ememme ndị okpukpe ha na-eme n’obodo ha. A na-edo Mas n’ememme ahụ, ndị niile bịara ya na-agbakwa egwú, rie nri, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ. E nwekwara ndị ha na ehi na-alụ ọgụ. Alfonso sịrị: “A na-ejikarị oké aṅụrụma na esemokwu apịachi ememme ndị ahụ. Ọ bụ ezie na ememme ndị ahụ na-atọ m ụtọ, obi m nọ na-agwa m na okpukpe m adịchaghị mma.” Mgbe Ndịàmà Jehova ziri Alfonso ozi ọma, o kwetara ka ya na ha mụwa Baịbụl. N’agbanyeghị na ọ na-arịa ọrịa, ọ malitere ịga ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova. Ugbu a, ọ hapụla ihe niile ahụ ọ na-eme n’okpukpe ọ na-ekpebu, jiri ohere ọ bụla o nwere na-agwa ndị mmadụ ihe ndị ọ mụtara banyere Jehova ma ha bịa ileta ya n’ụlọ ya.

Ndị a a kọrọ banyere ha n’ebe a bụ mmadụ ole na ole n’ime ọtụtụ ndị Maya nwere ezi obi, bụ́ ndị kwụsịrịla okpukpe na-ezighị ezi ha na-ekpebu. N’ezie, ụmụ ụmụ ndị wuru nnukwu pyramid ndị ahụ dị na Yucatán ka dị ndụ ugbu a. Ha ka na-asụ otu asụsụ ahụ ndị nna nna hà sụrụ. Ọtụtụ n’ime ha ka bi n’ụdị ụlọ ndị nna nna hà biri, ya bụ, n’ụlọ ájá ndị e ji akịrịka kpuo. Ha ka na-akọ ugbo otú ahụ ndị nna nna hà si akọ ya, ya bụ, ịsụcha ọhịa, suo ya ọkụ ma kụọ ya ọka na ogho. Ma ugbu a, eziokwu dị n’Okwu Chineke emeela ka ọtụtụ ndị Maya nwere onwe ha, wee kwụsị ikpe okpukpe ụgha, hapụkwa ihe na-enweghị isi ha kweere. Ha kwetara nnọọ okwu gbara ọkpụrụkpụ Jizọs kwuru, sị: “Unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.”—Jọn 8:32.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Real bụ ego ndị Spain jibu azụ ahịa.

[Maapụ dị na peeji nke 13]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Ebe ndị Maya chịrị n’oge ochie

Ọwara Oké Osimiri Mexico

MEXICO

Yucatán Peninsula

Chichén Itzá

Cobá

BELIZE

GUATEMALA

HONDURAS

EL SALVADOR

[Foto dị na peeji nke 13]

Obodo Maya, bụ́ Chichén Itzá—mgbe e bibichara ya

[Foto dị na peeji nke 15]

Marcelino na nwunye ya, bụ́ Margarita, ka ha na-ezi ozi ọma na Yucatán