Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ò nwere ihe mere Pọntịọs Paịlet ji tụọ Siza ụjọ?

Mgbe ndị ndú ndị Juu na-achọ ime ka Pọntịọs Paịlet, bụ́ gọvanọ ha, kweta igbu Jizọs, ha kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ị hapụ nwoke a, ị bụghị enyi Siza.” (Jọn 19:12) “Siza” ndị Juu kwuru okwu ya n’ebe a bụ eze ukwu Rom bụ́ Taịbiriọs. Ọ̀ ga-abụ na Paịlet nwere ihe mere o ji kwesị ịtụ Siza a ụjọ?

Olee ụdị onye Siza Taịbiriọs bụ? Akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica kwuru na ọtụtụ afọ tupu e kpee Jizọs ikpe, Taịbiriọs aghọọla “nwoke a ga-asị na naanị ihe na-amasị ya bụ ihe ọ bụla ga-atọ ya ụtọ nakwa arụrụala ọ ga-arụ iji nweta ya.” Inyo ndị mmadụ enyo mere ka ọ taa onye ọ bụla o chere na ọ na-agba ya mgba okpuru ahụhụ ma gbuo ya. Akwụkwọ ahụ kwukwara, sị: “Ọ bụrụ na ihe ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme ya na ha dịkọrọ ndụ kwuru bụ eziokwu, ọ pụtara na ihe na-akacha ya mma ikiri bụ ebe a na-arụ arụrụala na ebe a na-eme omume rụrụ arụ. A sịgodị ka e dozie olu kwuo ihe o mere, a ga-asị na o ji obi ọjọọ gbuo ndị mmadụ aghara aghara.”

Aha ọjọọ a Taịbiriọs nwere ga-abụ ihe mere Paịlet ji kpebie ime ihe ndị ndú ndị Juu kwuru ma nye iwu ka e gbuo Jizọs.—Jọn 19:13-16.

Gịnị mere Jizọs ji saa ụkwụ ndịozi ya?

N’Izrel oge ochie, ọ ga-abụ na ọtụtụ ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha na-agba ụkwụ nkịtị aga ebe ọ bụla ha chọrọ ịga. Ihe ndị nwere akpụkpọ ụkwụ na-eyi bụ sandal nke na-ekpuchi naanị ọbọ ụkwụ, e jirizie eriri kegide ya n’elu ụkwụ nakwa na nkwonkwo ụkwụ. Ebe ọ bụ na uzuzu na apịtị na-adị n’ụzọ, o nweghị ihe ga-eme ka ụkwụ ndị mmadụ ghara iru unyi.

N’ihi ya, ọ maara ndị Juu ahụ́ iyisa sandal n’ọnụ ụzọ tupu ha abanye n’ime ụlọ. Otu n’ime ụzọ e si ele mmadụ ọbịa bụ ịsa ya ụkwụ. Ọ bụ onyenwe ụlọ ma ọ bụ onye na-ejere ya ozi na-asa onye ọbịa ụkwụ. E nwere ọtụtụ ebe na Baịbụl kwuru na a sara ndị ọbịa ụkwụ. Dị ka ihe atụ, Ebreham gwara ndị ọbịa bịara n’ụlọikwuu ya, sị: “Biko, ka e kute obere mmiri saa unu ụkwụ. Mgbe ahụ, unu ga-ezuru ike n’okpuru osisi a. Ka m wetatụrụ unu achịcha, ka obi unu nweta ume.”—Jenesis 18:4, 5; 24:32; 1 Samuel 25:41; Luk 7:37, 38, 44.

Nke a na-eme ka anyị ghọtakwuo ihe mere Jizọs ji saa ụkwụ ndịozi ya n’ememme Ngabiga ikpeazụ ya na ha mekọrọ. N’ememme ahụ, e nweghị onye bụ onyenwe ụlọ ma ọ bụkwanụ onye na-eje ozi ga-asa ha ụkwụ, o dokwara anya na o nweghị otu n’ime ndịozi Jizọs wepụtara onwe ya ime ya. N’ihi ya, Jizọs gbanyere mmiri n’efere saa ụkwụ ndịozi ya, jirikwa ákwà hichaa ha ụkwụ, si otú ahụ kụziere ha inwe ịhụnanya na ịdị umeala n’obi.—Jọn 13:5-17.