Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-atụ Ndị Nwụrụ Anwụ Ụjọ?

Ị̀ Na-atụ Ndị Nwụrụ Anwụ Ụjọ?

Ị̀ Na-atụ Ndị Nwụrụ Anwụ Ụjọ?

Ọ BỤRỤ na a jụọ ọtụtụ ndị ajụjụ a, ha ga-asị, “Mbanụ! Gịnị mere m ga-eji tụọ ha ụjọ?” Ha kweere na onye nwụrụ anwụ anwụchaala. Ma, ọtụtụ nde mmadụ kwenyesiri ike na ndị nwụrụ anwụ na-aghọ mmụọ, dịrị ndụ gawa.

Ná mba Benin, nke dị n’Ọdịda Anyanwụ Africa, ọtụtụ ndị kweere na ndị nwụrụ anwụ nwere ike ịpụta gbuo ndị ezinụlọ ha ndị ọzọ. Ndị mmadụ na-ere ihe ndị ha nwere ma ọ bụ gaa bite ego iji zụta anụmanụ ha ga-eji chụọ àjà ma mee ememme ga-eme ka obi jụrụ ndị ikwu ha nwụrụ anwụ. Ụfọdụ ndị kweere na e nwere ahụ́ mmadụ bụ́ mmụọ nke na-adịrị ndụ gawa mgbe mmadụ nwụrụ, nke na-agwakwa ndị dị ndụ okwu. N’ihi ya, ha na-agbalị ka ha na ha na-ekwurịta okwu. Ndị ọzọ nwekwara ihe ndị na-emenye ụjọ mere ná ndụ ha, bụ́ ndị ha chere na ọ bụ mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ kpatara.

Otu onye ụdị ihe ahụ mere bụ Agboola, bụ́ nwoke bi n’ebe dị nso n’ókè Benin na Nigeria. O kwuru, sị: “Ndị obodo anyị na-eme mgbaasị nke ukwuu. Ọ bụ omenala ndị obodo anyị ịsa ozu ahụ́ iji kwadebe ya maka ịga biri n’ala ndị mmụọ. Ọtụtụ mgbe, m na-ewere ncha fọrọ ná ncha e ji saa ozu ahụ́, gwakọta ya na ahịhịa ụfọdụ. M gwakọtachaa ya, mụ etee ya n’égbè m ji achụ nta, jirizie olu dara ụda kwuo anụ m chọrọ ịgbata ma m gaa nta. Ndị mmadụ na-emekarị ụdị ihe a, o yikwara ka ọ na-erere ha. Ma, e nwekwara ụdị ime mgbaasị na-atụ ụjọ.

“Mgbe ụmụ m ndị nwoke abụọ nwụrụ ọnwụ a na-amaghị ihe kpatara ya, m chere na ọ ga-abụ na o nwere onye gwọgburu ha n’ọgwụ. Iji mata ihe gburu ha, m gara na nke otu agadi nwoke bụ́ azụ eru ala n’ime mgbaasị. Ihe o kwuru gburu ụmụ m bụ nnọọ ihe ahụ m chere. Nke ka njọ bụ na o kwuru na ụmụ m ahụ nọzi n’ala ndị mmụọ na-eche mgbe onye gburu ha ga-anwụ ka ha gbawara ya ohu. Agadi nwoke ahụ kwukwara na otu ihe ahụ ga-eme nwa m nwoke nke atọ. Abalị ole na ole o kwuru ya, nwa m nwoke ahụ nwụkwara.”

Ọ bụ n’oge ahụ ka John na Agboola hụrụ. John bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova nke bi na Nigeria, bụ́ ebe dị nso n’obodo Agboola. John ji Baịbụl kọwaara ya ihe bụ ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ. Ihe ahụ ọ kọwaara Agboola gbanwere ndụ Agboola. O nwekwara ike ịgbanwe ndụ gị.

Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Ka Dị Ndụ?

Olee onye ga-azatali ajụjụ a? Ọ bụghị mmadụ, otú ọ sọkwara ya bụrụ onye a ma ama. Kama, ọ bụ Jehova, Onye kere ihe niile dị ndụ “n’eluigwe na n’elu ụwa, ihe ndị a pụrụ ịhụ anya na ihe ndị a na-apụghị ịhụ anya.” (Ndị Kọlọsi 1:16) O kere ndị mmụọ ozi ka ha biri n’eluigwe, keekwa ụmụ mmadụ na anụmanụ ka ha biri n’ụwa. (Abụ Ọma 104:4, 23, 24) Ọ bụ Ya nyere ihe niile dị ndụ ndụ ha dị. (Mkpughe 4:11) Ka anyị tụlee ihe Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, kwuru banyere ọnwụ.

Ọ bụ Jehova bụ onye mbụ kwuru banyere ọnwụ. Ọ gwara Adam na Iv na ọ bụrụ na ha enupụrụ ya isi, ha ga-anwụ. (Jenesis 2:17) Gịnị ka ihe ahụ ọ gwara ha pụtara? Jehova kwuru, sị: “Ájá ka ị bụ, ọ bụkwa n’ájá ka ị ga-alaghachi.” (Jenesis 3:19) Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ na-erekasị; ọ na-alaghachikwa n’ájá. Onye ahụ na-akwụsị ịdị ndụ.

Adam na Iv kpachaara anya nupụrụ Chineke isi, ọ bụ ihe mere e ji maa ha ikpe ọnwụ. Ma, ọ bụghị ha bụ ndị mbụ nwụrụnụ. Ọ bụ nwa ha Ebel bụ onye mbụ nwụrụnụ. Ken, nwanne ya nke tọrọ ya, gburu ya. (Jenesis 4:8) Ken atụghị egwu na nwanne ya nwụrụ anwụ ga-egbugwara ya. Kama nke ahụ, ihe tụrụ Ken ụjọ bụ ihe ndị mmadụ dị ndụ nwere ike ime ya.—Jenesis 4:10-16.

Mgbe ọtụtụ narị afọ gafere, ndị na-agụ kpakpando gwara Eze Herọd na “a mụrụ . . . eze ndị Juu” n’ebe ọ na-achị. Mgbe ọ nụrụ ya, ahụ́ erughị ya ala. Ebe Herọd kpebiri na ya ga-egburịrị onye ahụ o chere ga-anaghara ya ọchịchị, ọ kpara nkata igbu ụmụntakịrị nwoke niile nọ na Betlehem, malite ná ndị gbara afọ abụọ gbadaa. Ma, otu mmụọ ozi gwara Josef ka ọ kpọrọ Jizọs na Meri “gbaga n’Ijipt.”—Matiu 2:1-16.

Mgbe Herọd nwụrụ, mmụọ ozi ahụ gwara Josef ka ọ laghachi n’Izrel, “n’ihi na ndị na-achọ mkpụrụ obi nwatakịrị [ahụ] anwụwo.” (Matiu 2:19, 20) Mmụọ ozi ahụ, bụ́ onye bụ́ mmụọ, matara na Herọd enwekwaghị ike ime Jizọs ihe ọ bụla. Josef atụghị Eze Herọd ahụ nwụrụ anwụ ụjọ. Onye Josef nọzi na-atụ ụjọ bụ nwa Herọd, bụ́ Akeleyọs, onye obi tara mmiri. N’ihi ya, Josef na ezinụlọ ya gara biri na Galili, bụ́ ebe na-esoghị n’ebe Akeleyọs na-achị.—Matiu 2:22.

Akụkọ ndị a na-enyere anyị aka ịmata na ndị nwụrụ anwụ enweghị ike ime ihe ọ bụla. Oleezi ihe kpatara ihe ahụ mere Agboola na ndị ọzọ?

“Ndị Mmụọ Ọjọọ” Ma Ọ Bụ Ndị Mmụọ Na-adịghị Ọcha

Mgbe Jizọs bụ dimkpa, ya na ndị e kere eke bụ́ ndị mmụọ ọjọọ zuru. Ha matara onye Jizọs bụ ma kpọọ ya “Ọkpara Chineke.” Jizọs makwaara ndị ha bụ. Ha abụghị ndị mmadụ nwụrụ anwụ ghọọ ndị mmụọ. Kama nke ahụ, Jizọs sịrị na ha bụ “ndị mmụọ ọjọọ” ma ọ bụ ndị mmụọ na-adịghị ọcha.—Matiu 8:29-31; 10:8; Mak 5:8.

Baịbụl kwuru na e nwere ndị bụ́ mmụọ bụ́ ndị nọgidesiri ike na-eme uche Chineke na ndị nke nupụụrụ ya isi. Akwụkwọ Jenesis kwuru na mgbe Adam na Iv nupụụrụ Jehova isi, ọ chụpụrụ ha n’ogige Iden, mee ka ndị cherọb, ma ọ bụ ndị mmụọ ozi, nọrọ n’ebe ọwụwa anyanwụ nke ogige ahụ, ka ha ghara ikwe ka onye ọ bụla banye n’ime ya. (Jenesis 3:24) Ma eleghị anya, ihe ahụ bụ nke mbụ ụmụ mmadụ na-ahụ ndị bụ́ mmụọ anya.

Mgbe obere oge gafere, ọtụtụ ndị mmụọ ozi bịara n’ụwa n’ọdịdị mmadụ. Jehova edunyeghị ha ka ha bịa n’ụwa rụọ ọrụ ọ bụla. Kama nke ahụ, “ha hapụrụ ebe obibi ha kwesịrị ekwesị” nke bụ́ eluigwe. (Jud 6) Ọ bụ anyaukwu mere ha ji bịa. Ha lụrụ ụmụ nwaanyị, ụmụ nwaanyị ahụ amụtara ha ụmụ a na-akpọ ndị Nefilim. Ndị Nefilim ahụ na ndị nna ha bụ́ ndị nnupụisi emee ka ihe ike na ihe ọjọọ ndị ọzọ ju n’ụwa. (Jenesis 6:1-5) Otú Jehova si mee ka nsogbu ahụ kwụsị bụ ime ka e nwee Iju Mmiri n’ụwa dum n’oge Noa. Mmiri ahụ gburu ndị niile bụ́ ndị ajọ omume, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị ma ụmụ ndị mmụọ ozi ahụ. Gịnịzi mere ndị mmụọ ozi ahụ?

Iju Mmiri ahụ mere ka ha laghachi n’eluigwe. Ma, Jehova ekweghị ka ha nọrọghachi “n’ọnọdụ mbụ ha.” (Jud 6) Baịbụl kwuru, sị: “Chineke ahapụghị inye ndị mmụọ ozi ahụ mehiere emehie ahụhụ, kama, site n’ịtụba ha n’ime Tatarọs, ọ tụbara ha n’olulu nke oké ọchịchịrị ka e debe ha maka ikpe.”—2 Pita 2:4.

O nweghị otu ebe a na-akpọ Tatarọs. Ihe ọ pụtara bụ na ndị mmụọ ozi ahụ a jụrụ ajụ ghọrọ ndị e ji eji, ndị e wedara ala, ka ha ghara ime otú ọ bụla ha chọrọ. Ndị mmụọ ọjọọ ahụ enwekwaghị ike ịgbanwe ghọọ mmadụ. Ma, ha ka nwere ike dị ukwuu, ha ka nwekwara ike ịgbanwe echiche na ndụ ụmụ mmadụ. Ha nwere ike ịchị ụmụ mmadụ na anụmanụ. (Matiu 12:43-45; Luk 8:27-33) Ha na-eduhiekwa ụmụ mmadụ site n’ime ka à ga-asị na ha bụ mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ iji mee ka ndị mmadụ ghara ife Jehova otú dị Jehova mma nakwa iji megharịa ha anya ka ha ghara ịmata ihe bụ́ ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ.

Otú Ị Ga-esi Akwụsị Ịtụ Ndị Nwụrụ Anwụ Ụjọ

Agboola chọpụtara na otú Baịbụl si kọwaa ọnwụ na ndị bụ́ mmụọ ziri nnọọ ezi nke na anyị kwesịrị ikwere ya. Ọ ghọtara na ya kwesịrị ịmụtakwu Okwu Chineke. Ya na John malitere ịgụ Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. Agboola mụtara na ụmụ ya anọghị n’ala mmụọ na-eche ka ha gbawara onye gburu ha ohu, kama, ha na-ehi ụra n’ili. Nke a kasikwara ya obi.—Jọn 11:11-13.

Agboola ghọtakwara na ya kwesịrị isepụ aka kpamkpam ná mgbaasị. Ọ kpọrọ ihe niile o nwere ndị gbasara anwansi ọkụ. (Ọrụ 19:19) Ụfọdụ ndị obodo ya dọrọ ya aka ná ntị na ndị mmụọ ga-eme ya ihe. Ma, ụjọ atụghị Agboola. O sooro ndụmọdụ dị ná Ndị Efesọs 6:11, 12, nke sịrị: “Yirinụ ekike agha zuru ezu nke si n’aka Chineke . . . n’ihi na anyị nwere mgba . . . megide ìgwè ndị mmụọ ọjọọ.” Ihe ndị so n’ekike agha a bụ ezi omume, eziokwu, ozi ọma nke udo, okwukwe, mma agha nke mmụọ nsọ, ya bụ, Okwu Chineke. Ekike agha a si n’aka Chineke, ọ na-akpakwa ike!

Ụfọdụ n’ime ndị enyi na ndị ikwu Agboola malitere ize ya eze mgbe ọ kwụsịrị ime omenala ndị gbasara mgbaasị. Ma, o nwetara ndị enyi ọhụrụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị kweere ihe Baịbụl na-akụzi.

Ugbu a, Agboola maara na, n’oge na-adịghị anya, Jehova ga-ekpochapụ ajọ omume n’ụwa, kwụsịchaakwa ndị mmụọ ọjọọ ịrụ ọrụ. E mechaa, ọ ga-ebibi ha. (Mkpughe 20:1, 2, 10) Chineke ga-akpọlite “ndị niile nọ n’ili ncheta” n’ụwa anyị a. (Jọn 5:28, 29) Ndị ga-eso ná ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ bụ Ebel, na ụmụaka ndị ahụ na-enweghị ihe ha mere Eze Herọd gburu, nakwa ọtụtụ nde ụmụ mmadụ ndị ọzọ nwụrụ anwụ. Agboola nwere okwukwe na a ga-akpọlitekwa ụmụ ya atọ. E nwekwara ike ịkpọlite ndị ị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ. Ndị niile ahụ a ga-akpọlite n’ọnwụ ga-eji ọnụ ha gbaa akaebe na, malite mgbe ha nwụrụ ruo mgbe a kpọlitere ha n’ọnwụ, o nweghị ihe ọ bụla ha ma, nakwa na ha amatụdịghị banyere ememme niile e meere ha.

I kwesịtụdịghị ịtụ ndị nwụrụ anwụ ụjọ. Kama nke ahụ, nwee olileanya na gị na ndị ị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ nwere ike ịhụ ọzọ. Ka ọ dị ugbu a, ọ ga-adị mma ka ị mụọ Baịbụl, ka okwukwe gị sie ike. Ka ndị gị na ha ga na-akpa bụrụ ndị kweere ihe Baịbụl na-akụzi. Ọ bụrụ na o nwere ka i si na-eme mgbaasị, kwụsị ya ozugbo. Ọ bụrụ na i ‘yiri ekike agha zuru ezu nke si n’aka Chineke,’ o nweghị ihe ndị mmụọ ọjọọ ga-eme gị. (Ndị Efesọs 6:11) Ọ ga-amasị Ndịàmà Jehova inyere gị aka. Ha na-aga n’ụlọ ndị mmadụ na-enyere ha aka ka ha mụta Baịbụl n’anaghị ha ego. Akwụkwọ ha na-eji enyere ha aka bụ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? *

Agboola anakwaghị atụ ndị nwụrụ anwụ ụjọ, ọ mụtakwala otú e si ezere ndị mmụọ ọjọọ. Ọ sịrị: “Amaghị m onye gburu ụmụ m atọ. Ma, kemgbe m malitere ife Jehova, m mụọla ụmụ asaa ọzọ. O nweghị onye nọ n’ala ndị mmụọ merela ha ihe ọ bụla.”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 25 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 13]

Agboola anakwaghị atụ ndị nwụrụ anwụ ụjọ, ọ mụtakwala otú e si ezere ndị mmụọ ọjọọ

[Foto dị na peeji nke 12]

Ken atụghị egwu na nwanne ya nwụrụ anwụ ga-egbugwara ya