Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Mụtara Ihe n’Ihe Ndị O Mejọrọ

Ọ Mụtara Ihe n’Ihe Ndị O Mejọrọ

Ṅomie Okwukwe Ha

Ọ Mụtara Ihe n’Ihe Ndị O Mejọrọ

Ọ DỊ Jona ka ya bụrụ na ya ga-akwụsịli oké mkpọtụ na-emenụ. Nsogbu ya abụghị naanị oké ifufe ahụ nke na-ebugharị ụdọ ji ákwà ifufe ụgbọ mmiri ahụ, ma ọ bụkwanụ ebili mmiri nke na-enugharị ụgbọ ahụ ma na-eme ka osisi e ji rụọ ya na-eme mkpọtụ. Kama nke ahụ, ihe kacha enye Jona nsogbu bụ mkpu onyeisi ụgbọ ahụ na ndị ọzọ na-arụ ọrụ n’ụgbọ ahụ na-eti, ka ha na-agbalịsi ike ime ka ụgbọ ahụ ghara ikpu. Jona ewerela ya nnọọ na ha niile na-aga ịnwụ n’ihi ihe o metara.

Gịnị mere Jona ji banye n’ụdị nsogbu ọjọọ a? O mejọrọ Chineke ya, bụ́ Jehova, nke ukwuu. Gịnị ka o mere? Ya na Chineke hà ga-emecha dị ná mma? Azịza ajụjụ ndị a nwere ike ịkụziri anyị ọtụtụ ihe. Dị ka ihe atụ, akụkọ ndụ Jona na-akụziri anyị na ọbụna ndị okwukwe ha siri ike nwere ike imejọ ihe. Ọ na-akụzikwa otú ha nwere ike isi mezie ihe ha mejọrọ.

Onye Amụma Si Galili

Ihe na-abatakarị ndị mmadụ n’obi banyere nwoke ahụ bụ́ Jona bụ àgwà na-adịghị mma ndị ọ kpara, dị ka ihe atụ, isi o nupụrụ ma ọ bụkwanụ isi ike o mere. Ma, e nwere ihe ndị ọzọ ka mma anyị kwesịrị ịmara banyere ya. Cheta na ọ bụ Jehova Chineke họọrọ Jona ka ọ bụrụ onye amụma ya. Jehova agaraghị ahọrọ ya ka ọ gawara ya ozi ahụ pụrụ iche ma a sị na o kwesịghị ntụkwasị obi ma ọ bụ bụrụ onye ajọ omume.

A kọtụụrụ anyị banyere Jona ná 2 Ndị Eze 14:25. Ọ bụ onye Gat-hifa, bụ́ obodo dị kilomita anọ site na Nazaret, ya bụ, Nazaret ahụ Jizọs Kraịst nọ tolite mgbe ihe dị ka narị afọ asatọ ọzọ gafere. * Jona buru amụma n’oge Eze Jeroboam nke Abụọ chịrị alaeze ebo iri nke Izrel. Ịlaịja anwụọla tupu oge ahụ. Ịlaịsha onye nọchiri ya anwụọkwala n’oge nna Jeroboam na-achị. Ọ bụ eziokwu na Jehova ji ndị amụma ahụ mee ka ndị Izrel kwụsị ife Bel, ndị Izrel kpachaara anya mejọọ Chineke ọzọ. Eze na-achị ha n’oge a nọ “na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova.” (2 Ndị Eze 14:24) N’ihi ya, ọ ga-abụ na ozi Jona na-eje adịghịrị ya mfe ma ọ bụ tọọ ya ụtọ. N’agbanyeghị ya, o ji ikwesị ntụkwasị obi jee ozi ya.

Ma otu ụbọchị, e nwere ihe dị mkpa mere ná ndụ Jona. Jehova nyere Jona ọrụ Jona weere na ọ tara ezigbo akpụ. Gịnị ka Jehova gwara ya mee?

“Bilie, Gaa Ninive”

Jehova gwara Jona, sị: “Bilie, gaa Ninive bụ́ obodo ukwu ma kwusaara ya na ihe ọjọọ ha erutewo n’ihu m.” (Jona 1:2) Ọ dị mfe ịghọta ihe mere ọrụ ahụ ji tụọ Jona ụjọ. Ninive dị ihe dị ka narị kilomita asatọ ma e si n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Izrel gawa ya. Ọ bụrụ na e jiri ụkwụ gawa ya, ọ ga-ewe ihe dị ka otu ọnwa iji garuo ya. Iji ụkwụ gaa ebe ahụ adịghị mfe, ma, o yiri ka ọ bụghị ya bụ nsogbu Jona. Ọ bụrụ na Jona eruo Ninive, ndị ọ ga-agwa ihe Jehova kpebiri ime bụ ndị Asiria obi tara mmiri, ndị e ji ime ihe ike mara. Ebe ọ bụ na ndị Chineke Jona gwara okwu egeghị ntị, oleezi ihe ọ ga-atụ anya ka ndị ahụ na-ekpere arụsi mee? Olee otú ụwa ga-adị otu ohu Jehova n’obodo ukwu ahụ bụ́ Ninive, nke e mechara kpọọ “obodo na-awụfu ọbara”?—Nehọm 3:1, 7.

Ọ ga-abụ na Jona nọ na-eche ihe ndị a n’obi ya. Anyị amaghị. Naanị ihe anyị ma bụ na ọ gbara ọsọ. Jehova gwara Jona ka ọ gaa n’ebe ọwụwa anyanwụ. Ma, Jona tinyere isi n’ime ime ebe ọdịda anyanwụ. Ọ gawara n’ọdụ ụgbọ mmiri dị n’ụsọ oké osimiri, n’obodo a na-akpọ Jọpa. N’ebe ahụ, o nwetara ụgbọ mmiri na-aga Tashish. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta kwuru na Tashish dị na Spen. Ya bụrụ eziokwu, ihe ọ pụtara bụ na ebe Jona na-aga dị puku kilomita atọ na narị ise ma e si Ninive gawa ya. Ikekwe, ọ gaara ewe Jona otu afọ iji ruo ná ngwụcha Osimiri Ukwu ahụ, bụ́ aha a na-akpọ Oké Osimiri Mediterenian n’oge ahụ. Jona kpebisiri nnọọ ike ịhapụ ozi ahụ Jehova ziri ya!

Ọ̀ pụtaziri na Jona bụ onye ụjọ? Anyị ekwesịghị ikpebi ngwa ngwa na ọ bụ onye ụjọ. Anyị ga-emecha hụ na Jona bụ nwoke nwere nnọọ obi ike. Ma, Jona ezughị okè otú anyị niile na-ezughị okè, o nwekwara ọtụtụ ihe ọ na-emezighị emezi otú anyị niile nwere ọtụtụ ihe anyị na-anaghị emezi emezi. (Abụ Ọma 51:5) Ò nwere onye n’ime anyị na-enwetụbeghị mgbe ụjọ tụrụ ya?

O nwere ike ịdị anyị mgbe ụfọdụ ka ihe Chineke gwara anyị mee ọ̀ tara akpụ ma bụrụ ihe anyị na-agaghị emeli. O nwedịrị ike ịna-esiri anyị ike ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke, bụ́ nke a gwara Ndị Kraịst ka ha na-eme. (Matiu 24:14) Ọ na-adịkarịrị anyị mfe ichefu eziokwu doro anya Jizọs kwuru, nke bụ́: “Ihe niile kwere omume n’ebe Chineke nọ.” (Mak 10:27) Ọ bụrụ na anyị na-echefu ya mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ịghọta ihe bụ́ nsogbu Jona. Ma, olee ihe mechara mee n’ihi ọsọ ahụ Jona gbara?

Jehova Dọrọ Onye Amụma Ya Nupụrụ Isi Aka ná Ntị

Anyị nwere ike iji uche anyị hụ ka Jona banyere n’ụgbọ mmiri ahụ gaa chọọ otu ebe nọrọ. Ọ ga-abụ na ụgbọ ahụ bụ ụgbọ ndị Finishia ji ebu ngwá ahịa. Ọ nọ na-ele ka onyeisi ụgbọ ahụ na ndị ọzọ na-arụ ọrụ na ya nọ na-arụsi ọrụ ike iji malite njem ha. Mgbe ụgbọ ahụ ji nwayọọ kwọpụ ma gamie, Jona nwere ike iche na ya agbaarala nsogbu ahụ na-atụ ya ụjọ ọsọ. Ma, na mberede, ihu ígwé gbanwere.

Oké ifufe mere ka ebili mmiri dị egwu malite ibugharị oké osimiri ahụ. O nwere ike ịbụ na ụdị ebili mmiri ahụ karịrị ogo ụgbọ mmiri a na-arụ n’oge a. Ò were oge tupu ụgbọ ahụ e ji osisi rụọ emewe ka ọ chọrọ ịnyakasị, ya eyiekwa ka oké ebili mmiri ahụ ekpuchiela ya? N’oge ahụ, Jona ọ̀ ma ihe ahụ o mechara dee, ya bụ, na ọ bụ ‘Jehova mere ka oké ifufe fekwasị oké osimiri ahụ’? Anyị amaghị. Ma, Jona hụrụ na onye ọ bụla n’ime ndị na-arụ ọrụ n’ụgbọ mmiri ahụ malitere ịkpọku chi ya, ọ makwa na chi ha agaghị enyere ha aka. Akwụkwọ o dere kwuru, sị: “Ụgbọ mmiri ahụ wee chọwa ikpu ihu.” (Jona 1:4; Levitikọs 19:4) Ma, oleekwanụ otú Jona ga-esi ekpeku Chineke ọ na-agbara ọsọ ekpere?

Ebe Jona hụrụ na ya agaghị enwe ike inyere ha aka, ọ gara n’ala ala ụgbọ mmiri ahụ chọrọ otu ebe dinara ala. Ezigbo ụra buuru ya n’ebe ahụ. * Onyeisi ụgbọ mmiri ahụ hụrụ Jona, ya akpọtee ya ma gwa ya ka o kpekuo chi ya ekpere otú ndị ọzọ na-eme. Ebe ndị na-akwọ ụgbọ ahụ kwenyesiri ike na oké ifufe ahụ agbaghị aka, ha fere nzà ka ha mara onye ọ ga-abụ ya kpataara ha nsogbu ahụ n’ime ndị niile nọ n’ụgbọ ahụ. Ọ ga-abụrịrị na obi wụnyere Jona n’afọ mgbe nzà na-amaghị ndị niile ọzọ nọ n’ụgbọ ahụ. O teghị aka, eziokwu apụta ìhè. Ọ bụ n’ihi Jona ka Jehova ji mee ka oké ifufe ahụ fee. Ọ bụkwa ya ka o mere ka nzà ahụ ma.—Jona 1:5-7.

Jona kọọrọ ndị na-akwọ ụgbọ ahụ ihe niile merenụ. Ọ bụ ohu Chineke pụrụ ime ihe niile, bụ́ Jehova. Ọ bụ Chineke a ka ọ na-agbara ọsọ, ọ bụkwa ya ka o mejọrọ, nke mere ka ha niile nọrọ n’oké nsogbu a. O juru ha niile anya; Jona hụkwara na ezigbo ụjọ ji ha. Ha jụrụ ya ihe ha ga-eme ya ka ụgbọ ha nakwa ha onwe ha ghara ịla n’iyi. Gịnị ka ọ zara ha? Ọ ga-abụ na ụjọ tụrụ Jona mgbe o chere n’obi ya otú oké osimiri ahụ na-eme mkpatụ ma jụọ oyi ga-esi rie ya. Ma, olee otú ọ ga-esi kpatara ụmụ nwoke niile a ụdị ọnwụ ahụ mgbe ọ ma na ya nwere ike ịzọpụta ha? N’ihi ya, ọ sịrị: “Bulienụ m tụba n’ime oké osimiri, oké osimiri a ga-adakwara unu jụụ; n’ihi na m maara na ọ bụ n’ihi m ka oké ifufe a ji efekwasị unu.”—Jona 1:12.

Ihe a o kwuru, ò yiri okwu onye ụjọ? Ọ ga-abụrịrị na obi tọrọ Jehova ụtọ mgbe ọ hụrụ na obi kara Jona iwepụta onwe ya ịnwụ n’oge ahụ ihe siri ezigbo ike ka ndị ọzọ ghara ịnwụ. Ihe a Jona mere gosiri okwukwe siri ike o nwere. Anyị nwere ike iṅomi Jona taa ma ọ bụrụ na mkpa ndị mmadụ ana-echu anyị ụra karịa mkpa nke onwe anyị. (Jọn 13:34, 35) Ọ bụrụ na anyị ahụ onye nọ ná mkpa ego, ma ọ bụ onye ihe na-enye nsogbu n’obi, ma ọ bụ onye e kwesịrị inyere aka ka ya na Chineke dịrị ná mma, ànyị na-ewepụta onwe anyị nyere onye ahụ aka? Ọ na-atọ Jehova ezigbo ụtọ ma anyị mee otú ahụ.

Ọ ga-abụ na ihe Jona kwuru metụrụ ndị na-akwọ ụgbọ mmiri ahụ n’ahụ́, n’ihi na ná mmalite, ha ekweghị eme ihe o kwuru. Kama nke ahụ, ha nwara ike ha niile ịkwọrọ ụgbọ ahụ pụọ n’ebili mmiri ahụ. Ma, ihe niile ha mere enweghị isi. Ebili mmiri ahụ kakwuru njọ. N’ikpeazụ, ha hụrụ na o nweghị ihe ọzọ ha ga-eme. Ha kpọkuru Chineke Jona, bụ́ Jehova, ka o meere ha ebere ma bulie Jona tụba ya n’ime oké osimiri ahụ.—Jona 1:13-15.

E Meere Jona Ebere ma Napụta Ya

Jona dakpuru n’ime oké osimiri ahụ na-eme mkpatụ. Ọ ga-abụ na ọ gbalịrị ka o see n’elu mmiri ahụ ma hụ ụfụfụ mmiri ahụ na-agbọ nke na-egosi na ụgbọ mmiri ahụ ji ọsọ na-apụ. Ma, oké ebili mmiri bịara nuba ya n’ala ala oké osimiri ahụ. Ka ọ na-emikpu n’ike n’ike, obi ya gwara ya na nke ya na-eme agwụla.

Jona mechara kwuo otú obi dị ya mgbe ahụ. O nweghị ihe na-abataghị ya n’obi. Ọ na-ewute ya na ya agaghịzi ahụ ọmarịcha ụlọ nsọ Jehova nke dị na Jeruselem. Ọ dị ya ka ọ̀ na-emikpu n’ogbu oké osimiri ahụ, ruo n’ala ala ugwu, bụ́ ebe ahịhịa ndị dị n’ala oké osimiri ga-atụhị ya. O yiri nnọọ ka ebe ahụ ọ̀ ga-abụ ili ya, ya bụ, ebe ọ ga-anọ nwụọ.—Jona 2:2-6.

Ma, cheregodị! O nwere nnukwu ihe dị ndụ nke dị ojii na-abịa ya nso. O ji ike gaa n’ebe ọ nọ, meghee nnukwu ọnụ ya, kpụrụ Jona, loo!

Ọnwụ abịala. Ma, e nwere ihe dị ịtụnanya Jona chọpụtara. Ọ ka dị ndụ! Ihe ahụ loro ya atapịaghị ya ma ọ bụ mee ka ọ ghara ikukwa ume. Jona agbarighịkwa n’ime afọ ya. Kama nke ahụ, Jona ka na-eku ume, ọ bụ eziokwu na ọ nọ n’ebe kwesịrị ịbụ ili ya. Akpata oyi ji nwayọọ nwayọọ nwụọ Jona n’ahụ́. O doro Jona anya na ọ bụ Chineke ya, bụ́ Jehova, mere “ka otu nnukwu azụ̀ loo” ya. *Jona 1:17.

Jona nọ n’afọ azụ̀ ahụ ọtụtụ awa agafee. Jona nọ n’ebe ahụ gbara oké ọchịchịrị chee echiche nke ọma ma kpekuo Jehova Chineke ekpere. O nwere ihe anyị ga-amụta n’ekpere ahụ o kpere nke e dere n’isi nke abụọ nke akwụkwọ Jona. Ekpere ahụ gosiri na Jona ma Akwụkwọ Nsọ nke ọma, n’ihi na ọtụtụ ugboro, o kwuru ihe ndị e dere n’akwụkwọ Abụ Ọma. O gosikwara na Jona nwere otu àgwà mara mma, ya bụ, o nwere obi ekele. Otú Jona si mechie ekpere ya bụ: “Ma mụ onwe m ga-eji olu ekele m chụọrọ gị àjà. M ga-emezu ihe m kwere ná nkwa. Ọ bụ Jehova nwe nzọpụta.”—Jona 2:9.

Jona mụtara na Jehova nwere ike ịzọpụta onye ọ bụla ọ chọrọ ịzọpụta n’oge ọ bụla ọ chọrọ, n’agbanyeghị ebe onye ahụ nọ. Ọbụna “n’afọ azụ̀ ahụ” ohu ya Jona nọ, Jehova gbataara ya ọsọ enyemaka ma zọpụta ya. (Jona 1:17) Ọ bụ naanị Jehova nwere ike ime ka mmadụ dịrị ndụ n’afọ nnukwu azụ̀ ruo ụbọchị atọ, ehihie na abalị, n’enweghị ihe ọ bụla mere ya. Taa, ọ dị mma ka anyị cheta na ọ bụ Jehova bụ ‘Chineke onye ume ndụ anyị dị n’aka.’ (Daniel 5:23) Ọ bụ ya nwe ume niile anyị na-eku na ndụ anyị dị. Ànyị na-ekele ya maka ihe ndị a? Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịna-erubere Jehova isi?

Jona kwanụ? Ò rubeere Jehova isi, si otú ahụ kelee ya maka ihe ndị o meere ya? O mere otú ahụ. Mgbe ụbọchị atọ, ehihie na abalị, gachara, azụ̀ ahụ buuru Jona pụta n’ikpere mmiri ma ‘gbọpụta ya n’ala akọrọ.’ (Jona 2:10) Ị̀ hụrụ na n’ihe a niile merenụ, Jona ejighị aka ya gwuru mmiri pụta? Ma, ọ bụ ya ga-eji aka ya si n’ikpere mmiri ahụ gawa ebe ọ bụla ọ chọrọ ịga. O teghị aka, oge ruru ka Jona gosi ma ọ̀ ga-eji obi ya dum kelee Chineke maka ihe ndị o meere ya. Jona 3:1, 2, kwuru, sị: “Okwu Jehova wee ruo Jona ntị nke ugboro abụọ, sị: ‘Bilie, gaa Ninive bụ́ obodo ukwu, kwusaara ya okwu m na-agwa gị.’” Olee ihe Jona ga-eme?

Jona egbughị oge. Anyị na-agụ, sị: “Jona wee bilie gaa Ninive dị ka Jehova kwuru.” (Jona 3:3) N’eziokwu, o rubere isi. O doro anya na ọ mụtara ihe n’ihe o mejọrọ. Anyị kwesịkwara iṅomi okwukwe Jona n’ihe a o mere. Anyị niile na-eme mmehie; anyị niile na-emejọkwa ihe. (Ndị Rom 3:23) Ma, ànyị na-atọ ná mmejọ anyị, ka ànyị na-amụta ihe na ya ma laghachikwuru Chineke, na-erubere ya isi?

Jehova ọ̀ gọziri Jona maka irubere ya isi? Eenụ! Ọ gọziri ya. Ma, ọ dịghị ihe ọzọ, ọ ga-abụ na Jona mechara mata na ndị nọ n’ụgbọ mmiri ahụ anwụghị. Ozugbo Jona kwuru na ya dị njikere ịnwụ, a tụba ya n’oké osimiri ahụ, oké ebili mmiri ahụ akwụsị, ndị na-akwọ ụgbọ mmiri ahụ malitere “tụwa egwu Jehova nke ukwuu,” ma chụọrọ ya àjà, kama ịchụrụ ya chi ha.—Jona 1:15, 16.

Jona mechara nweta ngọzi karịrị nke ahụ. Jizọs kwuru na oge Jona nọrọ n’afọ nnukwu azụ̀ ahụ bụ amụma na-egosi oge yanwa ga-anọ n’ili, ma ọ bụ Shiol. (Matiu 12:38-40) Mgbe Jona ga-anụ banyere ngọzi a n’oge a ga-akpọlite ya n’ọnwụ n’ụwa, obi ga-atọ ya ezigbo ụtọ. (Jọn 5:28, 29) Jehova chọkwara ịgọzi gịnwa. Ị̀ ga-amụta ihe n’ihe i mejọrọ, rube isi ma jiri obi gị wepụta onwe gị ijere Chineke ozi, otú Jona mere?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Mgbe ndị Farisii na-ekwu banyere Jizọs, o nwere ihe ha ji nganga kwuo banyere Galili nke anyị kwesịrị ilebara anya, n’ihi na ọ bụ n’obodo dị na Galili ka a mụrụ Jona. Ha sịrị: “Chọọ n’Akwụkwọ Nsọ, ị ga-ahụ na ọ dịghị onye amụma ga-esi na Galili.” (Jọn 7:52) Ọtụtụ ndị nsụgharị na ndị na-eme nnyocha kwuru na ọ ga-abụ na ndị Farisii ahụ na-ekwu ihe na-edoghị ha anya, ya bụ, na e nwetụbeghị onye amụma si n’obodo Galili ahụ a na-eleda anya ma ọ bụ na e nweghị mgbe a ga-enwe onye amụma ga-esi na ya. Ya bụrụ otú ahụ, ihe ọ pụtara bụ na ndị Farisii ahụ na-eleghara ma akụkọ ihe mere eme ma amụma e buru ebu anya.—Aịzaya 9:1, 2.

^ par. 17 Iji gosi na ezigbo ụra buuru Jona, nsụgharị Septuagint kwuru na ọ nọ na-ekwo ụra. Ma, kama iwere na ụra Jona hiri na-egosi na ọ chọghị ịma ihe na-emenụ, ọ ga-adị mma ka anyị cheta na mgbe ụfọdụ ụra na-eburukarị ndị ike ụwa gwụrụ. N’oge ahụ tara akpụ Jizọs nọ n’ogige Getsemeni, Pita, Jems na Jọn nọ “na-ero ụra n’ihi iru uju.”—Luk 22:45.

^ par. 25 Ihe a na-akpọ okwu Hibru bụ́ “azụ̀” n’asụsụ Grik bụ “nnukwu anụ mmiri,” ma ọ bụ “azụ̀ buru ibu.” Ọ bụ eziokwu na e nweghị otú a ga-esi amata ụdị anụ mmiri loro Jona, a chọpụtara na n’Oké Osimiri Mediterenian, e nwere azụ̀ shark ndị buru oké ibu nke na ha nwere ike ilo mmadụ. E nwekwara azụ̀ shark ndị ka ndị ahụ ukwuu n’ebe ndị ọzọ. Azụ̀ shark bụ́ whale nwere ike iru mita iri na ise n’ogologo, ma ọ bụ karị.

[Igbe na Foto dị na peeji nke 29]

Ndị Katọrọ Akwụkwọ Jona Achịtaghị Ájá

▪ Ihe ndị a kọrọ n’akwụkwọ Baịbụl bụ́ Jona, hà mere eme n’eziokwu? Kemgbe ụwa, e nwere ndị na-akatọ akwụkwọ ahụ. N’oge anyị a e nwere ndị ọrụ ha bụ ịtụchasị Baịbụl, a na-elekarị akwụkwọ Jona anya dị ka akụkọ ifo, akụkọ e chepụtara echepụta ma ọ bụ akụkọ ụgha. Otu nwoke na-ede akwụkwọ, bụ́ onye dịrị ndụ n’ihe dị ka narị afọ abụọ gara aga, kwuru na otu ụkọchukwu sịrị na akụkọ Jona na nnukwu azụ̀ ahụ bụ ihe atụ efu. Ụkọchukwu ahụ sịrị na akụkọ ahụ pụtara na Jona nọrọ n’otu họtel dị na Jọpa, nke a na-akpọ Azụ̀ Whale. Mgbe Jona na-enwekwaghị ego ọ ga-eji akwụ ụgwọ, onyenwe họtel ahụ chụpụrụ ya. Ọ bụ otú ahụ ka o si “banye n’ime” azụ̀ Whale, e mechaa, ya “agbọpụ” ya. N’eziokwu, o yiri ka ndị na-akatọ Baịbụl hà kpebiri ime Jona ihe karịrị ihe nnukwu azụ̀ ahụ gaara eme ya.

Gịnị mere ọtụtụ ndị ji eche na e kwesịghị ikwere n’akwụkwọ Baịbụl bụ́ Jona? Ọ bụ n’ihi na ihe ndị e dere n’akwụkwọ ahụ bụ ọrụ ebube. O yiri ka anya ọtụtụ ndị na-akatọ Baịbụl ji ele ọrụ ebube ọ̀ bụ anya ha ji ele ya kemgbe ụwa, ya bụ, na ọrụ ebube enweghị ike ime eme. Ma, otú ahụ ha si ele ya anya ò ziri ezi? Jụọ onwe gị, sị, ‘M̀ kweere n’ahịrịokwu mbụ e dere na Baịbụl?’ Ihe e dere na ya na-agụ, sị: “Ná mmalite, Chineke kere eluigwe na ụwa.” (Jenesis 1:1) Ọtụtụ nde mmadụ ndị na-eche echiche nke ọma n’ụwa dum kweere n’eziokwu a doro anya. Ma, eziokwu ahụ karịrị ọrụ ebube niile ọzọ e mechara kọọ akụkọ ha na Baịbụl.

Chebagodịrị nke a echiche: Ò nwere ihe e dere n’akwụkwọ Jona nke onye ahụ kere eluigwe dị ebube na ihe niile dị ịtụnanya dị ndụ n’ụwa na-agaghị emeli? Ọ̀ bụ ime ka oké ifufe fee? Ọ̀ bụ ime ka nnukwu azụ̀ loo mmadụ? Ka ọ̀ bụ ime ka azụ̀ ahụ gbọpụta onye ahụ o loro? Ihe ndị a enweghị ihe ọ bụụrụ Onye ike ya na-anaghị agwụ agwụ.—Aịzaya 40:26.

A sịgodị na Chineke ejighị aka ya rụọ ọrụ ebube, ihe ndị dị ebube na-eji aka ha eme mgbe ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, e kwuru na n’afọ 1758, otu onye na-akwọ ụgbọ mmiri dakpuru n’Oké Osimiri Mediterenian, otu azụ̀ shark eloo ya. Ma, a gbara azụ̀ ahụ égbè, ya agbọpụta nwoke ahụ o loro. Mgbe ahụ, a dọpụtara nwoke ahụ ná mmiri ahụ, ya abụrụ na ọ ka dị ndụ, e nweghịkwa ezigbo ihe mere ya. Ọ bụrụ na akụkọ ahụ mere eme, anyị ga-asị na ọ bụ ihe pụrụ iche na ihe dị ịtụnanya. Ma, anyị agaghị akpọ ya ọrụ ebube. Ọ̀ bụ na Chineke enweghị ike iji ike ya mee ihe karịrị nke ahụ?

Ndị na-ekwenyeghị n’ọrụ ebube na-ekwusi ike na o nweghị onye ga-anọ n’ime afọ azụ̀ ụbọchị atọ ghara ikubi. Ma, ụmụ mmadụ ụbụrụ na-aghọ nkọ amụtala otú e si agbanye ikuku n’ihe, mechie ya nke ọma, mmadụ ejiri ya nọruo ogologo oge n’ime mmiri. Ọ̀ bụ na Chineke enweghị ike iji ike ya na amamihe ya karịrị nke mmadụ mee ka Jona dịrị ndụ ma na-eku ume n’ime afọ azụ̀ ruo ụbọchị atọ? Ọ ga-emeli ya, dị ka otu mmụọ ozi Jehova gwara Meri, nne Jizọs, otu mgbe, sị: “N’ebe Chineke nọ, ọ dịghị okwu ọ bụla e kwupụtaworo nke ga-abụ ihe na-apụghị ime eme.”—Luk 1:37.

Olee ihe ọzọ gosiri na ihe e dere n’akwụkwọ Jona mere eme? Ihe Jona dere banyere ụgbọ ahụ na ndị nọ n’ime ya doro anya, bụrụkwa eziokwu. Na Jona 1:5, e kwuru na ndị na-akwọ ụgbọ mmiri ahụ nọ na-atụba ngwongwo ha n’oké osimiri ahụ ka ụgbọ ahụ ghara ịdị arọ. Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme n’oge ochie nakwa iwu ndị rabaị kwuru na ọ bụ ihe a na-emekarị ma ihu ígwé jọọ njọ. Ihe Jona mechara dee banyere obodo Ninive dabara n’ihe ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie chọpụtara banyere obodo ahụ. Nke ka nke bụ na Jizọs Kraịst kwuru na ụbọchị atọ ahụ Jona nọ n’ime afọ nnukwu azụ̀ ahụ bụ amụma gosiri ụbọchị ole yanwa ga-anọ n’ili. (Matiu 12:38-40) Ihe Jizọs kwuru gosiri na ihe Jona kọrọ mere eme.

“N’ebe Chineke nọ, ọ dịghị okwu ọ bụla e kwupụtaworo nke ga-abụ ihe na-apụghị ime eme.”—LUK 1:37

[Foto dị na peeji nke 26]

Ndị na-akwọ ụgbọ mmiri ahụ buliri Jona tụba ya n’ime oké osimiri ahụ, dị ka Jona gwara ha mee