Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọrụ Meri Rụrụ nke Mezuru Nzube Chineke

Ọrụ Meri Rụrụ nke Mezuru Nzube Chineke

Ọrụ Meri Rụrụ nke Mezuru Nzube Chineke

MGBE Jizọs nọ na-eje ozi n’ụwa, otu nwaanyị, nke so n’ìgwè mmadụ ọ na-agwa okwu, ji oké olu kwuo, sị: “Obi ụtọ na-adịrị afọ buru gị na ara ị ṅụrụ!” Ọ bụrụ na Jizọs chọrọ ka a na-enye nne ya nsọpụrụ pụrụ iche, oge a gaara abụ oge magburu onwe ya ịgwa ndị mmadụ ka ha mewe otú ahụ. Kama ime otú ahụ, ọ gwara nwaanyị ahụ, sị: “Ee e, kama nke ahụ, Obi ụtọ na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke ma na-edebe ya!”—Luk 11:27, 28.

Jizọs akwanyereghị nne ya ùgwù pụrụ iche. O nweghịkwa mgbe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha mewe otú ahụ. Ebe ọ dị otú a, nsọpụrụ pụrụ iche ọtụtụ ndị na-aga chọọchị na-enye Meri ọ̀ dịnụ mma? Ka anyị jiri Akwụkwọ Nsọ leba anya n’ihe ụfọdụ a na-akụzi n’ọtụtụ ebe banyere nne Jizọs.

“I Jupụtara na Grasịa,” “Ị Dị Ngọzi n’Etiti Ụmụnwaanyị Niile”

Mmụọ ozi bụ́ Gebriel gwara Meri ọrụ ọ ga-arụ nke ga-emezu nzube Chineke. N’oge ahụ, mmụọ ozi ahụ kelere ya, sị: “Ndeewo, onye e meere amara dị ukwuu, Jehova nọnyeere gị.” (Luk 1:28) Lee otú otu nsụgharị si sụgharịa ekele ahụ: “Ekele, i jupụtara na grasịa, Osebụrụwa nọnyeere gị!” Obere oge nke ahụ gachara, Elizabet kelere Meri, sị: “Onye a gọziri agọzi ka ị bụ n’etiti ndị inyom, ihe a gọziri agọzi ka mkpụrụ nke afọ gị bụkwa!” (Luk 1:42) Okwu ndị a ọ̀ na-egosi na e kwesịrị inye Meri nsọpụrụ pụrụ iche?

N’eziokwu, ọ naghị egosi. Ọ bụ eziokwu na okwu ndị ahụ so n’ekpere ndị Katọlik na-ekpeku Meri, Baịbụl gosiri na e kwesịghị ikpeku ya ekpere. Gebriel na Elizabet kwetara na ịmụ Mesaya bụ ohere ọma bịaara Meri, ma, ikpeku ya ekpere adabaghị n’ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru. Kama nke ahụ, mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs rịọrọ Jizọs ka ọ kụziere ha otú e si ekpe ekpere, o gosiri na ọ bụ Nna ya ka e kwesịrị ikpeku ekpere. Ekpere a ma ama Jizọs ji kụzie otú e si ekpe ekpere si otú a malite: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.”—Matiu 6:9.

O So ná Ndị Ga-achị Achị

Ihe ọzọ a na-akụzikarị banyere Meri bụ na ọ bụ “Eze Nwaanyị nke eluigwe” ugbu a. O nweghị ebe Baịbụl kpọrọ ya ụdị aha ahụ. Ma, Baịbụl gosiri na e nwere ọrụ pụrụ iche ọ ga-arụ ná ndokwa Chineke mere n’eluigwe. Gịnị bụ ọrụ ahụ?

Jizọs gosiri na ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi ga-eso ya chịa n’Alaeze ya. (Luk 22:28-30) Jizọs ga-enye ndị ahụ a họọrọ ikike ka ha “bụụrụ Chineke anyị . . . ndị nchụàjà, ha ga-achịkwa ụwa dị ka ndị eze.” (Mkpughe 5:10) Ihe Baịbụl kwuru mere ka o doo anyị anya na Meri so n’otu n’ime ndị ahụ e nyere ohere ọma a pụrụ iche. Olee ihe mere anyị ji kwuo nke a?

Ị ga-echeta na mgbe Jizọs nwụchara, Meri na ndị na-eso ụzọ Jizọs na ụmụnne Jizọs “ji otu obi nọgide na-ekpe ekpere.” Ndị zukọtara na-ekpe ekpere ahụ dị ihe dị ka otu narị mmadụ na iri abụọ. “Ụmụ nwaanyị ụfọdụ” so n’ime ha. (Ọrụ 1:12-15) Baịbụl kwuru na ka “ememme Pentikọst na-aga n’ihu, ha niile zukọrọ n’otu ebe” mgbe a wụkwasịrị ha mmụọ nsọ nke Chineke, bụ́ nke mere ka ha nwee ike ikwu okwu n’asụsụ mba ọzọ dị iche iche.—Ọrụ 2:1-4.

Ebe ọ bụ na Meri so ná ndị e nyere ngọzi a, ihe ọ pụtara bụ na a họọrọ ya na ụmụ nwaanyị ndị nke ọzọ, bụ́ ndị natara mmụọ nsọ, ka ha soro ná ndị ha na Jizọs ga-achị n’Alaeze eluigwe. Ya mere, nke a na-egosi nnọọ na Meri so Jizọs nọrọ ugbu a n’ebube n’eluigwe. (Ndị Rom 8:14-17) Ka anyị tụlee ụfọdụ ọrụ ọma Jizọs na Meri na ndị ọzọ ga-eso ha chịa ga-arụ bụ́ nke ga-emezu nzube Chineke.

Ime Ka Ngọzi Pụrụ Iche Ruo Ụmụ Mmadụ Aka

Akwụkwọ Baịbụl bụ́ Mkpughe kwuru na a ga-akpọlite otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ n’ọnwụ ka ha dịrị ndụ n’ebube n’eluigwe, ha na Jizọs abụrụ ndị nchụàjà, ndị ikpe, na ndị eze. (Mkpughe 14:1, 4; 20:4, 6) Ebe ha ga-abụ ndị nchụàjà, ha ga-eso mee ka àjà Jizọs baara ụmụ mmadụ niile na-erube isi uru, mee ka ahụ́ ha, omume ha, na mmekọrịta ha na Chineke zuo okè. (Mkpughe 21:1-4) Ndị niile ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe Jehova ga-enwe ohere magburu onwe ya ịhụ oge ọma ahụ. *

Meri rụrụ ọrụ nke mezuru nzube Jehova. Ọ ka na-arụkwa. Anyị kwesịrị iṅomi Meri n’ihi okwukwe ya, nakwa n’ihi otú o si rube isi, dịrị umeala n’obi, bụrụ ezigbo nne ma tachie obi mgbe ọnwụnwa bịaara ya. Ebe ọ bụ na ọ bụ ya mụrụ Mesaya ma soro ná ndị ga-eme ka ngọzi ga-adịru ebighị ebi ruo ụmụ mmadụ aka, e kwesịrị ịkwanyere ya ùgwù.

Ma, ihe kacha mkpa anyị mụtara n’aka Meri bụ na ya na ndị niile ọzọ bụ́ ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi na-efe naanị Jehova, o nweghịkwa chi ọzọ ha na-efe. Meri, na ndị ọzọ ha na Kraịst ga-eso chịa n’eluigwe, ji oké olu na-asị: “Ka ngọzi na nsọpụrụ na otuto na ike dịrị Onye ahụ nọ ọdụ n’ocheeze ahụ [ya bụ, Jehova Chineke], dịkwara Nwa Atụrụ ahụ [ya bụ, Jizọs Kraịst], ruo mgbe niile ebighị ebi.”—Mkpughe 5:13; 19:10.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere ngọzi ndị ahụ, gụọ isi nke asatọ nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke di na peeji nke 10]

Anyị kwesịrị iṅomi Meri n’ihi okwukwe ya na otú o si rube isi ma dịrị umeala n’obi