Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ònye Bụ Chineke?

Ònye Bụ Chineke?

Ònye Bụ Chineke?

OLEE ihe ị ga-aza ma a jụọ gị ajụjụ a? Ụfọdụ ndị chere na ha ma Chineke nke ọma, na ọ bụkwa ezigbo enyi ha. Ndị ọzọ weere Chineke otú ha si were onye ikwu ha ha na-amarughị ala. Ha kweere na ọ dị adị, ma, ha amarughị ya ala. Ọ bụrụ na i kweere na Chineke, olee ihe ị ga-aza ma a jụọ gị ajụjụ ndị a?

1. Ò nwere otu onye dị adị bụ́ Chineke?

2. Chineke ò nwere aha?

3. Jizọs ọ̀ bụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile?

4. Chineke ọ̀ na-eche banyere m?

5. Chineke ọ̀ na-anabata otú ọ bụla ndị mmadụ si efe ya?

Ọ bụrụ na ị jụọ ndị ọzọ ajụjụ ndị a, o nwere ike ịbụ na ihe otu onye ga-aza ga-adị iche n’ihe ibe ya zara. Ka a sịkwa ihe mere e ji nwee ọtụtụ akụkọ ụgha na echiche ụgha banyere Chineke.

Ihe Mere Ịmata Azịza Ha Ji Dị Oké Mkpa

Mgbe Jizọs Kraịst nọ na-agwa otu nwaanyị nke kweere na Chineke okwu n’otu olulu mmiri, o mere ka o doo anya na ọ dị mkpa mmadụ ịmara ihe bụ́ eziokwu banyere Chineke. Nwaanyị ahụ, bụ́ onye Sameria, kwetara na Jizọs bụ onye amụma. Ma, o nwere ihe nọ na-enye ya nsogbu n’obi. Ya na Jizọs anaghị ekpe otu okpukpe. Mgbe ọ gwara ya Jizọs, Jizọs gwara ya hoo haa, sị: “Unu na-efe ihe unu na-amaghị.” (Jọn 4:19-22) O doro anya na Jizọs kweere na ọ bụghị ndị niile na-ekpe okpukpe maara Chineke n’ezie.

Ihe ahụ Jizọs kwuru ọ̀ na-egosi na o nweghị onye nwere ike ịmata onye Chineke bụ n’ezie? Mba. Jizọs mechara gwa nwaanyị ahụ, sị: “Ndị na-efe ezi ofufe ga-efe Nna m n’ime mmụọ na n’eziokwu, n’ihi na, n’ezie, Nna m na-achọ ka ndị dị otú ahụ fee ya ofufe.” (Jọn 4:23) Ì so ná ndị na-efe Chineke “n’ime mmụọ na n’eziokwu”?

Ọ dị oké mkpa ka ị mata ihe bụ́ azịza ajụjụ ahụ. Ọ̀ bụ maka gịnị? Mgbe Jizọs nọ na-ekpe ekpere, o kwuru ihe mere o ji dị mkpa ịmata Chineke nke ọma, sị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) N’eziokwu, otu n’ime ihe ga-ekpebi ma ị̀ ga-adị ndụ n’ọdịnihu bụ ịmata ihe bụ́ eziokwu banyere Chineke.

Mmadụ ò nwere ike ịmata ihe bụ́ eziokwu banyere Chineke? Ee, mmadụ nwere ike ịmata ya! Oleezi otú i nwere ike isi mata ya? Jizọs kwuru banyere onwe ya, sị: “Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.” (Jọn 14:6) O kwukwara, sị: “Ọ dịghịkwa onye maara onye Nna ahụ bụ ma e wezụga Ọkpara ya nakwa onye Ọkpara ya chọrọ ikpughere ya.”—Luk 10:22.

Ihe ọ pụtara bụ na ebe mmadụ ga-esi amata onye Chineke bụ bụ n’ihe Jizọs Kraịst, bụ́ Ọkpara Chineke, kụziri. N’eziokwu, Jizọs kwere anyị nkwa, sị: “Ọ bụrụ na unu anọgide n’okwu m, unu bụ n’ezie ndị na-eso ụzọ m, unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.”—Jọn 8:31, 32.

Oleezi otú Jizọs si zaa ajụjụ ise ndị ahụ a jụrụ ná mmalite?

[Foto dị na peeji nke 4]

Ị̀ na-efe Chineke ị na-amaghị?