Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere M?
Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere M?
Ihe ndị mmadụ na-azakarị:
▪ “Chineke akarịala ichewe banyere nsogbu m.”
▪ “Echeghị m na ọ na-eche banyere m.”
Olee ihe Jizọs kwuru?
▪ “A na-ere nza ise mkpụrụ ego abụọ nke ga-azụtali naanị ihe dị nta, ka ọ́ bụghị ya? Ma a dịghị echefu otu n’ime ha n’ihu Chineke. Ma a gụwo ọbụna ntutu isi niile unu ọnụ. Unu atụla egwu; unu dị oké ọnụ ahịa karịa ọtụtụ nza.” (Luk 12:6, 7) O doro anya na Jizọs kụziri na Chineke na-eche banyere anyị.
▪ “Unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla, sị, ‘Gịnị ka anyị ga-eri?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-aṅụ?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-eyi?’ N’ihi na ihe a niile bụ ihe ndị mba ọzọ na-achụsi ike. N’ihi na Nna unu nke eluigwe maara na ihe a niile dị unu mkpa.” (Matiu 6:31, 32) Jizọs kweere na Chineke maara mkpa onye ọ bụla n’ime anyị.
BAỊBỤL kwuru hoo haa na Chineke na-eche banyere anyị. (Abụ Ọma 55:22; 1 Pita 5:7) Ọ bụrụ otú ahụ, oleezi ihe mere anyị ji atagbu onwe anyị n’ahụhụ taa? Ọ bụrụ na Chineke hụrụ anyị n’anya, ọ bụrụkwa na ọ bụ ya kacha ike, olee ihe mere na o mebeghị ka ahụhụ kwụsị?
Ọtụtụ ndị amaghị azịza ya, nke bụ́ na ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu na-achị ajọ ụwa a. Mgbe Setan na-anwa Jizọs ọnwụnwa, o gosiri ya alaeze niile nke ụwa ma sị ya: “M ga-enye gị ikike a niile na ebube ha, n’ihi na e nyefewo ha n’aka m, ọ bụkwa onye ọ bụla m chọrọ ka m na-enye ya.”—Luk 4:5-7.
Ònye mere Setan onye na-achị ụwa? Mgbe nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, rubeere Setan isi ma gbakụta Chineke azụ, ihe ọ pụtara bụ na ha họọrọ ka Setan chịwa ha. Kemgbe ahụ ha nupụrụ isi, Jehova Chineke ji ndidi gba nkịtị ka o doo anya na ọchịchị Setan achịtaghị ájá. Jehova adịghị amanye ụmụ mmadụ ka ha fee ya, kama o meela ka anyị nwee ohere ịlọghachikwuru ya.—Ndị Rom 5:10.
Ebe Chineke na-eche banyere anyị, o mere ndokwa ka Jizọs napụta anyị, ka Setan ghara ịchị anyị. N’oge na-adịghị anya, Jizọs ga-eme “ka ọ ghara ịdị bụ́ onye ahụ nke nwere ikike ịkpata ọnwụ, ya bụ, Ekwensu.” (Ndị Hibru 2:14) Ọ ga-esi otú ahụ “bibie ọrụ Ekwensu.”—1 Jọn 3:8.
A ga-eme ka ụwa a ghọọ paradaịs. N’oge ahụ, Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya [ndị mmadụ], ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.”—Mkpughe 21:4, 5. *
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 12 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe mere Chineke ji kwe ka nhụjuanya dịrị, gụọ isi nke 11 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 8]
A ga-eme ka ụwa a ghọọ paradaịs