Chineke Ò Nwere Aha?
Chineke Ò Nwere Aha?
Ihe ndị mmadụ na-azakarị:
▪ “Aha ya bụ Chineke.”
▪ “Aha ya karịrị akarị.”
Olee ihe Jizọs kwuru?
▪ “Ya mere, kpeenụ ekpere otú a: ‘Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.’” (Matiu 6:9) Jizọs kweere na Chineke nwere aha.
▪ “Emewokwa m ka ha mara aha gị, m ga-emekwa ka a mara ya, ka ịhụnanya i nwere n’ebe m nọ wee dịrị n’ime ha, mụ na ha adịkwa n’otu.” (Jọn 17:26) Jizọs mere ka a mara aha Chineke.
▪ “Unu agaghị ahụ m ma ọlị ruo mgbe unu ga-asị, ‘Ngọzi na-adịrị onye ahụ nke na-abịa n’aha Jehova.’” (Luk 13:35; Abụ Ọma 118:26) Jizọs kpọrọ aha Chineke.
CHINEKE ji aka ya gwa anyị aha ya. E dere na o kwuru, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova; nke ahụ bụ aha m.” * (Aịzaya 42:8, Bible Nsọ nke Union Version) Aha ahụ bụ́ Jehova bụ otú kacha mma ndị Igbo si akpọ aha Hibru ahụ Chineke gụrụ onwe ya. O nwere ike ịtụ gị n’anya na aha Hibru ahụ pụrụ iche pụtara ọtụtụ puku ugboro na Baịbụl n’oge a na-ede ya. Ọ pụtara ọtụtụ ugboro karịa aha ọ bụla ọzọ dị na Baịbụl.
A jụọ ụfọdụ ndị “Gịnị bụ aha Chineke?” ha nwere ike ịza na “aha Chineke karịrị akarị,” na “aha ya bụ Alfa na Omega.” Ndị ọzọ na-asị na “aha ya bụ Chineke.” Ma ihe ndị a bụ utu aha ndị na-egosi ụdị onye Chineke bụ. O nweghị nke ọ bụla n’ime ha zatara ajụjụ ahụ, n’ihi na ihe ndị ahụ abụghị aha.
Olee ihe mere Chineke ji gwa anyị aha ya? Ọ bụ ka anyị nwee ike ịmatakwu onye ọ bụ. Iji maa atụ, e nwere ike ịkpọ mmadụ Maazị, Ọga, Papa, ma ọ bụ Papa Ukwu. Utu aha ndị a nwere ihe ha na-ekwu banyere onye a na-akpọ ha. Ma, aha onye ahụ na-echetara anyị ihe niile anyị maara banyere ya. Ọ bụkwa otú ahụ ka utu aha bụ́ Onyenwe anyị, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, Nna, na Onye Okike na-echetara anyị ọrụ dị iche iche Chineke na-arụ. Ma, ọ bụ naanị aha ya, bụ́ Jehova, na-echetara anyị ihe niile anyị maara banyere ya. Ị̀ ga-asịnụ na ị maara Chineke ma ọ bụrụ na ị maghị aha ya?
Ọ dị mkpa ịmata aha ahụ, dịkwa mkpa ịkpọ ya akpọ. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ maka na Baịbụl gwara anyị, sị: “Onye ọ bụla nke na-akpọku aha Jehova ka a ga-azọpụta.”—Ndị Rom 10:13; Joel 2:32.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 9 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịhụ ebe a kọwara ihe aha Chineke pụtara nakwa ihe mere aha ahụ adịghị ná nsụgharị Baịbụl ụfọdụ, gụọ peeji nke 195 ruo nke 197 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 6]
E nwere ike ịkpọ mmadụ Maazị, Ọga, Papa, ma ọ bụ Papa Ukwu. Ma, aha onye ahụ na-echetara anyị ihe niile anyị maara banyere ya