Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Josaya Họọrọ Ime Ihe Ziri Ezi

Josaya Họọrọ Ime Ihe Ziri Ezi

Kụziere Ụmụ Gị Ihe

Josaya Họọrọ Ime Ihe Ziri Ezi

Ì CHERE na o siri ike ime ihe ziri ezi? *— Ọ bụrụ na ị zaa ee, ọtụtụ ndị ga-asị na ị zatara ya. Ọ na-esikwara ndị toro eto ike ime ihe ha maara ziri ezi. Ka anyị hụ ihe mere o ji siere Josaya ezigbo ike ịhọrọ ime ihe ziri ezi. Ị̀ ma onye Josaya bụ?—

Josaya bụ nwa Emọn, bụ́ eze Juda. Emọn dị naanị afọ iri na isii mụọ Josaya. Ọ bụ nnọọ onye ọjọọ otú nna ya, bụ́ Eze Manase, bụ. N’eziokwu, Manase bụ nnọọ eze ọjọọ nke chịrị ọtụtụ afọ. Ma, ndị Asiria jidere ya, tụọ ya mkpọrọ n’obodo dị anya bụ́ Babịlọn. Mgbe Manase nọ n’ụlọ mkpọrọ, ọ rịọrọ Jehova ka ọ gbaghara ya, Jehova gbaghakwaara ya.

Mgbe Manase si n’ụlọ mkpọrọ pụta, ọ laghachiri Jeruselem wee maliteghachi ịchị. Ozugbo ahụ, o meziri ihe ndị o mebiri ma nyere ndị obodo ya aka ife Jehova. Ọ ga-abụrịrị na o wutere ya mgbe Emọn nwa ya na-eṅomighị omume ọma ya. Ọ ga-abụ n’oge ahụ ka a mụrụ Josaya. Baịbụl ekwughị otú Manase na nwa nwa ya bụ́ Josaya nọkọruru. Ma, ì chere na Manase gbalịrị inyere ya aka ife Jehova?—

Mgbe Josaya dị naanị afọ isii, Manase nwụrụ, nna Josaya, bụ́ Emọn, amalitezie ịchị. Emọn chịrị naanị afọ abụọ, ndị na-ejere ya ozi egbuo ya. Ya mere, Josaya ghọrọ eze Juda mgbe ọ dị afọ asatọ. (2 Ihe E Mere, isi nke 33) Olee ihe i chere mere mgbe ahụ? Josaya ò mere ihe ọjọọ otú nna ya Emọn mere, ka ò mere ezi ihe otú nna nna ya Manase mere mgbe ahụ o chegharịrị?—

Ọ bụ eziokwu na Josaya bụ nwatakịrị mgbe ahụ, ọ maara na ya chọrọ ife Jehova. N’ihi ya, o gere ndị hụrụ Jehova n’anya ntị kama ige ndị enyi nna ya ntị. Josaya dị naanị afọ asatọ, ma ọ maara na ọ dị mma ige ndị hụrụ Chineke n’anya ntị. (2 Ihe E Mere 34:1, 2) Ị̀ ga-achọ ịma banyere ndị dụrụ Josaya ọdụ, bụ́ ndị o ṅomiri àgwà ọma ha?—

Otu n’ime ndị Josaya ṅomiri bụ Zefanaya onye amụma. Zefanaya bụ onye ikwu Josaya n’ihi na ọ ga-abụ eze ọma bụ́ Hezekaya, nna Manase, mụrụ nna nna nna ya. Mgbe Josaya malitere ịchị ọhụrụ, Zefanaya dere akwụkwọ Baịbụl a na-akpọ Zefanaya. Zefanaya kwuru ihe ọjọọ ga-eme ndị họọrọ ime ihe ọjọọ, o dokwara anya na Josaya gere ya ntị.

Onye ọzọ o ṅomiri bụ Jeremaya. Ọ ga-abụ na ị nụtụla banyere ya. Jeremaya na Josaya bụ ọgbọ, ha tokọkwara n’otu ebe. Jehova mere ka Jeremaya si n’ike mmụọ nsọ dee akwụkwọ Baịbụl a na-akpọ Jeremaya. Mgbe Josaya nwụrụ n’agha, Jeremaya dere abụ pụrụ iche a na-akpọ abụ iru uju iji gosi na o wutere ya nke ukwuu. (2 Ihe E Mere 35:25) Chegodị echiche otú ha abụọ si gbaa ibe ha ume ka ha nọgide na-efe Jehova!

Olee ihe i chere ị ga-amụta n’akụkọ ndụ Josaya?— Ọ bụrụ na papa gị anaghị efe Jehova otú papa Josaya na-efeghị ya, ò nwere onye nwere ike inyere gị aka ka ị mụta banyere Chineke? O nwere ike ịbụ mama gị, nna nna gị, nne nne gị, ma ọ bụkwanụ onye ikwu gị ọzọ. O nwekwara ike ịbụ onye ọ bụla ọzọ na-efe Jehova, bụ́ onye mama gị ga-ekwe ka ọ kụziwere gị Baịbụl.

Ihe dị mkpa anyị mụtara bụ na Josaya maara na ndị o kwesịrị imeta enyi bụ ndị na-efe Jehova, ọ bụ eziokwu na ọ bụ nwatakịrị. Họrọ ime ihe ziri ezi otú ahụ o mere!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ọ bụrụ nwatakịrị ka ị na-agụrụ akụkọ a, akara ùhiè ndị dị n’isiokwu a na-echetara gị ka ị kwụsịtụ gbaa ya ume ka ọ zaa ajụjụ ndị ahụ.

Ajụjụ:

○ Ònye bụ nna Josaya? Ònye bụ nna nna ya? Oleekwa ụdị ndị ha bụ?

○ Olee otú nna nna Josaya si gbanwee ndụ ya?

○ Olee aha ndị amụma abụọ ọ ga-abụ na Josaya ṅomiri omume ọma ha, oleekwa ihe mere i ji chee na ọ dị mkpa inwe ndị enyi dị ka ha?

[Foto ndị dị na peeji nke 25]

Olee ụdị aka ọ ga-abụ na Zefanaya na Jeremaya nyeere Josaya ime ihe ziri?