Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịchọsi Ndị Nwere Mmasị n’Okwu Chineke Ike

Ịchọsi Ndị Nwere Mmasị n’Okwu Chineke Ike

Akwụkwọ Ozi Si Ireland

Ịchọsi Ndị Nwere Mmasị n’Okwu Chineke Ike

CHI taa efoola, obere mmiri na-ezonụ emeekwala ka o siere m ike isi n’ime ụgbọala m na-ahụ ihe na-emenụ n’ime ime obodo a m na-agbafe. Mgbe m gbara kilomita iri na isii, erutere m n’ugwu dị nso na Westport, bụ́ obere obodo dị n’ụsọ oké osimiri n’ebe ọdịda anyanwụ Ireland. Mgbe e mechara, anwụ chawara, ijiriji ekupụchaa, mụ amalitezie ịhụ ọtụtụ obere ala mara mma, ndị mmiri gbara gburugburu, dị nso n’ebe ahụ. Ọ bụ ala ole na ole n’ime ala ndị ahụ mmiri gbara gburugburu ka ndị mmadụ bi. Ma, ndị na-akpa anụ n’ebe a na-eji ụgbọ mmiri ebuga anụ ụlọ ha n’ụfọdụ ala ndị ahụ mmiri gbara gburugburu ka ha taa ahịhịa.

E nwere ọtụtụ ugwu n’ebe ọdịda anyanwụ nke ụsọ oké osimiri ahụ. Ugwu ndị ahụ nọ na-acha nzu nzu n’ehihie a anwụ na-acha. Ugwu kasị elu n’ebe a bụ Croagh Patrick, bụ́ ugwu ọnụ ya pịrị apị nke ndị obodo a na-akpọ Reek. Ejisiri m ike nyara ụgbọala m gafesịa okporo ámá ndị dị na Westport, bụ́ ndị dị warara ma na-ekwo ekwo, gafeekwa ugwu Reek, gawazie n’ebe Ndịàmà Jehova na-anaghị agakarị ozi ọma.

Nwoke m chọ na-aga amaghị na m na-abịa taa. Enwetara m akwụkwọ ozi kwuru na ọ kwatara ebe a n’oge na-adịbeghị anya, nakwa na ọ chọrọ ka Ndịàmà maliteghachi ịkụziri ya Baịbụl. Anọ m na-eche, sị: ‘Ọ̀ dị afọ ole? Ọ̀ lụọla nwaanyị ka ọ̀ bụ okokporo? Olee ụdị ihe ndị na-amasị ya?’ Elere m akpa m anya, na-eche ma m̀ jikwa Baịbụl na ụdị akwụkwọ dị iche iche e ji amụ Baịbụl. Anọ m na-eche ihe m nwere ike ikwu iji mee ka o nwekwuo mmasị n’ozi ọma Alaeze Chineke.

Agbafeela m Reek ugbu a. Mgbidi ndị e ji naanị nkume rụọ, bụ́ ndị a rụrụ ọtụtụ n’ime ha n’oge Oké Ụnwụ e nwere n’ihe dị ka otu narị afọ na iri ise gara aga, dịgasị n’ala ubi tọgbọ chakoo bụ́ ndị dịịrị ruo n’osimiri. Mgbe m leliri anya elu, lekwa otu nnụnụ mmiri ebe ọ gbasara nku ya, ikuku eburu ya na-aga! E nwegasịrị osisi ndị ifufe hịgọrọ n’ihu ihu.

Ụlọ ndị dị n’ime obodo a enweghị nọmba, okporo ámá ndị dị na ya enweghịkwa aha. Adres e nyere m iji chọta ụlọ nwoke ahụ bụ naanị aha ụlọ ya na mpaghara ebe ọ dị. Ma, ihe mbụ m chọrọ ime bụ ịchọta onye ga-amarịrị ebe mmadụ niile bi, ya bụ, onye na-ekesa akwụkwọ ozi. Mgbe nkeji iri atọ gasịrị, achọtara m post ọfịs obodo ahụ, bụ́ otu ọnụ ụlọ dị n’otu ogologo ụlọ nwere ọtụtụ ọnụ ụlọ. N’ihe e kowere n’ọnụ ụzọ ya, e dere, sị, “Anyị Emechiela.” N’agbanyeghị nke ahụ, ajụrụ m ajụjụ n’otu ụlọ ahịa dị n’ebe ahụ, a gwa m mpaghara ebe ụlọ ahụ dị.

Mgbe m gbara kilomita asatọ ọzọ, ahụrụ m ebe m na-achọ, ya bụ, ebe ụzọ hịgọrọ banye n’aka nri, obere ụzọ ọzọ abanyekwa n’aka ekpe ya. Akụrụ m aka n’ọnụ ụzọ nke otu ụlọ dị nso n’ebe ahụ. Otu agadi nwaanyị pụtara ma tuoro m ọnụ na ya biwere ebe a mgbe ya dị obere, ma, o wutere ya mgbe ọ chọpụtara na ya amaghị otú m ga-esi achọta nwoke ahụ m na-achọ. Ọ sịrị m bata ka ya kpọọ mmadụ na telefon.

Ka ya na onye ahụ na-ekwu na telefon, ọ nọ na-ele m anya, o dokwara m anya na ọ nọ na-eche onye m bụ na ihe m na-achọ. Ahụrụ m obere ihe oyiyi Meri n’akụkụ ọnụ ụzọ ya, hụkwa nnukwu foto Kraịst n’ahụ́ ájá. Chaplet chịsa n’elu tebụl kichin ya. Iji mee ka obi ruo ya ala, asịrị m ya, “E nwere ozi dị mkpa ndị enyi ya sị m zie ya.”

Di ya batara kọwara m akụkọ obodo ahụ. Ma, ọ dịghị ihe nwaanyị ahụ jụtara onye mbụ ọ kpọrọ na fon, ya asị m chere ka ya kpọọ ndị ọzọ. O yiri ka ọ dịghị onye nụtụrụla banyere nwoke ahụ ma ọ bụ ụlọ ahụ. Elere m ihe na-akụnụ. Chi ejiwela. Achọpụtara m na m ga-edowe ya ụbọchị ọzọ. Ekelere m ha abụọ maka enyemaka ha, banyeghachi n’ụgbọala m lawa.

Abịaghachiri m n’izu so ya. Na nke ugbu a, ahụrụ m nwoke ahụ na-ekesa akwụkwọ ozi, ya akọwaara m nke ọma otú m ga-esi enweta ebe m na-achọ. Mgbe nkeji iri na ise gasịrị, ahụrụ m ebe ọ gwara m na m ga-ahụ ụzọ abụọ gaferịtara. Abanyere m n’aka ekpe, gbara ụzọ ahụ ruo n’isi, gbarakwa ya lọghachi, na-achọ ihe ọzọ ọ sịrị na m ga-ahụ, ya bụ, àkwà mmiri ochie e ji nkume rụọ. Ahụghị m ya. N’ikpeazụ, ahụrụ m àkwà mmiri ahụ, lepụzie anya, lekwa ụlọ ahụ m nọ na-achọ kemgbe n’elu ugwu!

Akwụsịtụrụ m chee echiche otú m ga-esi zie ozi ọma ma m ruo ebe ahụ. Ọ bụ otu agadi nwoke ka m hụrụ n’ụlọ ahụ. Ọ gwara m, sị, “Ewela iwe, lee ụlọ ị na-achọ ebe ahụ.” Ọ tụụrụ m aka n’otu ụlọ osisi nọchiri. Agara m ebe ahụ, kụọ aka n’ọnụ ụzọ, na-atụ anya ịhụ onye m na-achọ. Ka m na-eche ka mmadụ pụta, elere m anya n’Oké Osimiri Atlantic dị nso n’ebe ahụ. Ikuku efesiwela ike, ebili mmiri nọkwa na-enupụta mmiri na-enwu ọcha n’ụsọ oké osimiri ahụ a na-emetọghị emetọ. Ọ dịghị onye m na-ahụ, ọ dịghịkwa onye nọ n’ụlọ ahụ m kụrụ aka.

Agara m ebe ahụ ugboro abụọ ọzọ tupu mụ ahụ otu nwa okorobịa. O kwuru, sị: “Ọ bụ ụlọ a, ma, nwoke ahụ ị na-achọ, bụ́ onye bibu na ya, akwapụla, amakwanụghị m ebe o bizi.” Akọwaara m ya ihe mere m ji bịa, chọpụtakwa na nwa okorobịa a na Ndịàmà Jehova ekwutụbeghị okwu. E nweela mgbe e zuru ya ohi, ọ nọkwa na-eche ihe mere Chineke ji kwere ka ụdị ihe a na ihe ọjọọ ndị ọzọ na-eme. M nyere ya magazin Ụlọ Nche na Teta! ndị ọhụrụ zara ajụjụ ahụ, ọ nakwaara ha ozugbo.

Akwụkwọ Nsọ nyere anyị iwu ịchọsi ndị nwere ezi obi ike. O wutere m na ahụghị m nwoke ahụ m nọ na-achọ. Ma, echetụdịghị m na mgbalị m furu ọhịa. Na Ireland, ịnụ ozi ọma Alaeze Chineke na-agụ ọtụtụ ndị agụụ. Site n’enyemaka Jehova, obere mkpụrụ nke eziokwu Baịbụl ahụ a kụrụ n’obi nwa okorobịa ahụ nwere ike ịmị mkpụrụ otu ụbọchị.