Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Bụghị Naanị Achịcha Ga-eme Ka Mmadụ Dị Ndụ—Otú M Si Pụta n’Ụlọ Mkpọrọ Ndị Nazi ná Ndụ

Ọ Bụghị Naanị Achịcha Ga-eme Ka Mmadụ Dị Ndụ—Otú M Si Pụta n’Ụlọ Mkpọrọ Ndị Nazi ná Ndụ

Ọ Bụghị Naanị Achịcha Ga-eme Ka Mmadụ Dị Ndụ—Otú M Si Pụta n’Ụlọ Mkpọrọ Ndị Nazi ná Ndụ

Dị ka Joseph Hisiger si kọọ

M jụrụ otu onye mkpọrọ ibe m, sị: “Gịnị ka ị na-agụ?” Ya asị m, “Ọ bụ Baịbụl,” kwuokwa, sị, “M ga-enye gị ya ma i nye m bred gị ruo otu izu.”

A MỤRỤ m na March 1, 1914, n’obodo Moselle, nke nọ n’okpuru ndị Germany n’oge ahụ. Mgbe Agha Ụwa Mbụ biri n’afọ 1918, e nyeghachiri ndị France Moselle. N’afọ 1940, ndị Germany wereghachiiri ya. Ma, mgbe Agha Ụwa nke Abụọ biri n’afọ 1945, ọ laghachiiri ndị France ọzọ. N’oge niile ahụ, ọ na-abụ m bụtụ onye France mụ abụtụ onye Germany. N’ihi ya, m mụtara asụsụ French na asụsụ German.

Ndị mụrụ m bu okpukpe Katọlik n’isi. Kwa abalị, tupu anyị alaba, ezinụlọ anyị na-egbu ikpere n’ala kpee ekpere. Anyị na-aga chọọchị n’ụbọchị Sunday na n’ụbọchị ndị e nwere ezumike ná mba anyị. Eji m okpukpe m kpọrọ ihe, anọkwa m n’òtù katikizim ndị Katọlik.

Otú M Si Ghọọ Onyeàmà Na-arụsi Ọrụ Ike

N’afọ 1935, Ndịàmà Jehova abụọ bịara hụ ndị mụrụ m. Ihe ha kwurịtara bụ otú ndị okpukpe si tinye aka n’Agha Ụwa Mbụ. Ka nke ahụ gasịrị, m nwekwuru mmasị ịmụ Baịbụl. N’afọ 1936, ajụrụ m ụkọchukwu anyị ma m̀ nwere ike inweta Baịbụl. Ọ gwara m na m gaghị aghọtali ya, ọ gwụla ma m̀ mụrụ nkà mmụta okpukpe. Ma, naanị ihe nke a mere bụ ime ka ọ gụwakwuo m agụụ inweta Baịbụl na ịgụ ya.

N’ọnwa January 1937, otu Onyeàmà mụ na ya na-arụkọ ọrụ, nke aha ya bụ Albin Relewicz, malitere ịgwa m ihe Baịbụl na-akụzi. Ajụrụ m ya, sị: “Ọ̀ kwa i nwere Baịbụl?” O nwere Baịbụl, n’oge na-adịghịkwa anya, o ji nsụgharị Elberfelder, bụ́ Baịbụl German, gosi m aha Chineke bụ́ Jehova ma nye m Baịbụl ahụ. Eji m ịnụ ọkụ n’obi na-agụ ya ma malite ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà na-enwe n’obodo dị anyị nso bụ́ Thionville.

N’ọnwa August 1937, eso m Albin gaa otu mgbakọ mba niile nke Ndịàmà nwere na Paris. Ọ bụ ebe ahụ ka m nọ malite ịga n’ụlọ ndị mmadụ na-ekwusara ha ozi ọma. N’oge na-adịghị anya, e mere m baptizim. Ná mmalite afọ 1939, aghọkwara m ọsụ ụzọ, ya bụ, Onye Kraịst na-ezisa ozi ọma oge niile. A gwara m ka m kwusawa ozi ọma n’obodo Metz. Ka o ruziri na July, a kpọrọ m òkù ịbịa rụọ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Paris.

Otú E Si Kpagbuo M n’Oge Agha

Ejeteghị m ozi aka n’alaka ụlọ ọrụ ahụ, n’ihi na n’ọnwa August 1939, a gwara m ka m bịa sonye n’òtù ndị agha France. Akọ na uche m ekweghị m gaa agha ahụ, n’ihi ya, a tụrụ m mkpọrọ. N’ọnwa May 1940, mgbe m nọ n’ụlọ mkpọrọ, ndị Germany lụsoro ndị France agha na mberede. Ka ọ na-erule ọnwa June, e meriela France, mụ aghọghachikwa onye Germany. N’ihi ya, n’ọnwa July 1940, mgbe m pụtara n’ụlọ mkpọrọ, alaghachiri m na nke nne na nna m.

Ebe ọ bụ ndị Nazi na-achị obodo anyị n’oge ahụ, anyị na-ezukọta na nzuzo na-amụ Baịbụl. Onye anyị na-esi n’aka ya enweta Ụlọ Nche bụ Maryse Anasiak, bụ́ otu nwaanyị Onye Kraịst na-anaghị atụ egwu, nke m na-ahụbu n’otu ebe Onyeàmà na-eme bred. Ezeere m ihe isi ike Ndịàmà na-enwe na Germany ruo n’afọ 1941.

Ma otu ụbọchị, ndị uwe ojii ndị Nazi a na-akpọ ndị Gestapo bịara n’ụlọ anyị. Otu n’ime ha gwara m na a machibidola Ndịàmà iwu, juzie m ma m̀ ka ga-abụ Onyeàmà. Mgbe m sịrị ya, “Ee,” ọ sịrị m soro ya. Obi mapụrụ mama m, ya atụbọọ. Mgbe onye uwe ojii Gestapo ahụ hụrụ nke a, ọ sịrị m nọrọwa lekọta mama m.

N’ụlọ ọrụ ebe m na-arụ, ekeleghị m onyeisi anyị “Toonụ Hitler!” Ekwekwaghị m ịbanye n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị Nazi. N’ihi ya, n’echi ya, ndị Gestapo kpụụrụ m. Mgbe ha na-agba m ajụjụ, ekweghị m ịgwa ha aha Ndịàmà ibe m. Onye na-agba m ajụjụ ji iwe sụọ m isi égbè n’isi, mụ atụbọọ. Na September 11, 1942, Sondergericht (ya bụ, Ụlọikpe Pụrụ Iche) nke dị na Metz mara m ikpe mkpọrọ afọ atọ “maka ịgbasa ozizi Ndịàmà Jehova na Ndị Mmụta Baịbụl na-ezi.”

Mgbe izu abụọ gafere, e si n’ụlọ mkpọrọ Metz kpọrọ m gaa ọtụtụ ebe, mechazie kpọga m n’ogige ọrụ mmanye nke dị na Zweibrücken. N’ebe ahụ, mụ na ndị na-arụzi ụzọ ụgbọ okporo ígwè rụrụ ọrụ. Anyị na-agbanwe nnukwu ígwè ndị e ji rụọ ụzọ okporo ígwè, hịọgide ha n’ụzọ okporo ígwè ahụ ma na-awụnyeghachi okwute na ha. Nri ụtụtụ a na-enye anyị bụ naanị otu iko kọfị na obere bred, a na-enyekwa anyị otu efere ofe n’ehihie nakwa ná mgbede. A kpọfeziri m n’ụlọ mkpọrọ dị n’otu obodo dị nso n’ebe ahụ, bụ́ ebe m rụrụ ọrụ n’ụlọ ọrụ ebe a na-edozi akpụkpọ ụkwụ. Mgbe ọnwa ụfọdụ gasịrị, e zighachiri m n’ogige ọrụ mmanye Zweibrücken, gwazie m ka m rụwa ọrụ n’ubi.

Ọ Bụghị Naanị Achịcha Mere M Ji Dịrị Ndụ

N’ụlọ mkpọrọ, onye mụ na ya bi n’otu ọnụ ụlọ bụ nwa okorobịa si Netherlands. Amụtatụrụ m asụsụ ya ma nwee ike iji ya gwa ya ihe ndị m kweere. Ọ malitere ibi ndụ otú Chineke chọrọ nke na ọ gwara m ka m mee ya baptizim n’ime osimiri. Mgbe o si ná mmiri pụta, ọ makụrụ m ma sị m: “Joseph, aghọọla m nwanna gị!” Mgbe a kpọgaghachiri m ịrụ ọrụ n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè ahụ, mụ na ya anọghịzi.

Onye mụ na ya bizi n’otu ọnụ ụlọ mkpọrọ bụ onye Germany. Otu mgbede, ọ malitere ịgụ otu obere akwụkwọ, ya bụ, Baịbụl! Ọ bụ mgbe ahụ ka ọ gwara m na ya ga-enye m Baịbụl ahụ ma ọ bụrụ na mụ enye ya bred m ruo otu izu. M siri ya, “Ekwela m!” Ọ bụ ezie na ọ dịghịrị m mfe inye ya bred m ruo otu izu, ọ dịghị mgbe m kwara ụta na m nyere ya ya. Amalitere m ịghọta ihe okwu a Jizọs kwuru pụtara, nke bụ́: “Ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ, kama ọ bụ okwu niile nke na-esi n’ọnụ Jehova pụta.”—Matiu 4:4.

Ugbu a m nwetara Baịbụl, nsogbu bụzi otú m ga-ezi zoo ya ka a ghara ịnara m ya. Ọ bụ ezie na a na-ekwe ka ndị mkpọrọ ndị ọzọ nwee Baịbụl, a naghị ekwe ka Ndịàmà nwee ya. N’ihi ya, m na-agụ ya na nzuzo n’abalị, ma m jiri ákwà m na-eji ehi ụra kpuchie onwe m. Chi bọọ, m na-ezo ya n’ime uwe m yi agagharị. Anaghị m ahapụ ya n’ime ụlọ mkpọrọ ka a ghara ịhụ ya ma e lewe ụlọ.

Otu ụbọchị mgbe a na-akpọ aha ndị mkpọrọ niile, achọpụtara m na m chefuru Baịbụl m. Ná mgbede ahụ, eji m ọsọ laghachi n’ụlọ m n’ụlọ mkpọrọ, ma ahụzighị m Baịbụl ahụ. Mgbe m kpekusịrị Chineke ekpere banyere ya, agakwuuru m onye nche ụlọ mkpọrọ ahụ, gwa ya na mmadụ weere akwụkwọ m, nakwa na m chọrọ ka e nyeghachi m ya. Uche ya adịchaghị n’ihe m na-ekwu, n’ihi ya, enwetaghachiri m Baịbụl m. Eji m obi m niile kelee Jehova!

N’oge ọzọ, a kpọgara m n’ebe m ga-aga saa ahụ́. Mgbe m na-eyipụ uwe m ndị ruru unyi, eji m nwayọọ hapụ Baịbụl ahụ ka ọ dapụ n’ala. Mgbe onye nche lefuru anya, eji m ụkwụ m kpọba Baịbụl ahụ n’ebe a na-asa ahụ́. Ezoro m ya n’ebe ahụ ka m na-asa ahụ́. Mgbe m sachara ahụ́, emeghachiri m ihe ahụ m mere mbụ, jiri ụkwụ kpọba Baịbụl ahụ n’ebe a wụsara uwe ndị dị ọcha.

Ihe Isi Ike na Ihe Obi Ụtọ Ndị Bịaara M n’Ụlọ Mkpọrọ

Otu ụtụtụ n’afọ 1943, mgbe ndị mkpọrọ kwụ n’ahịrị n’ogige ụlọ mkpọrọ, ahụrụ m Albin! E jidekwala ya. Ọ ma ụma lee m anya ma tụkwasị aka n’obi ya iji gosi na mụ aghọọla nwanna ya. O jizi aka gwa m na ya ga-edere m akwụkwọ ozi. N’echi ya, mgbe ọ na-agafe, ọ tọgbọrọ otu mpempe akwụkwọ n’ala. Ma onye nche hụrụ ya, a tụbazie ma mụnwa ma yanwa n’ụlọ mkpọrọ ebe naanị otu onye na-anọ ruo izu abụọ. Naanị nri a na-enye anyị bụ bred mara ebu na mmiri, anyị na-ehikwa n’elu plank, a naghịkwa enye anyị ákwà anyị ji ekpuchi onwe anyị.

Mgbe nke ahụ gachara, a kpọfere m n’ụlọ mkpọrọ dị na Siegburg, bụ́ ebe m rụrụ ọrụ n’ụlọ ọrụ ndị tinka. Ọrụ ahụ na-agwụ ike, nri a na-enyekwa anyị anaghị ezuru anyị. N’abalị, m na-arọ nrọ ebe m na-ericha ọnụ—ebe m na-ata keeki na mkpụrụ osisi. Ma, m teta, agụụ na-ejide m, akpịrị na-akpọkwa m nkụ. Atara m ezigbo ahụ́. Ma, kwa ụbọchị, m na-agụ obere Baịbụl m, ọ na-emekwa ka m hụ ihe mere m ji kwesị ịdịgide ndụ.

Emechara M Nwere Onwe M!

Na mberede, n’otu ụtụtụ n’ọnwa April 1945, ndị nche ụlọ mkpọrọ ahụ gbafusịrị, ghewe ọnụ ụzọ ụlọ mkpọrọ ahụ oghe. Enwerela m onwe m! Ma ebugodị m ụzọ gaa ụlọ ọgwụ iji nwetaghachi onwe m. Ka ọ na-erule ngwụcha ọnwa May, alaghachiri m n’ụlọ nne m na nna m. Ha chere na mụ anwụọla. Ozugbo mama m hụrụ m, o bewere ákwá ọṅụ. O wutere m na ọ nọghịzi ọdụ papa m na mama m anwụọ.

Amaliteghachiri m iso Ọgbakọ Thionville na-amụ ihe. Obi tọrọ m nnọọ ụtọ ịhụ ụmụnna m ndị nwoke na ndị nwaanyị ọzọ! O mere m obi ụtọ ịnụ otú ha si kwesị ntụkwasị obi n’agbanyeghị ọtụtụ ule bịaara ha. Ezigbo enyi m bụ́ Albin nwụrụ n’obodo Regensburg, dị na Germany. Ka e mesịrị, anụrụ m na nwa nwanne nna m bụ́ Jean Hisiger ghọrọ Onyeàmà, nakwa na e gburu ya n’ihi na ọ jụrụ ịga agha n’ihi akọ na uche ya. Jean Queyroi, onye mụ na ya rụkọrọ n’alaka ụlọ ọrụ dị na Paris, nọrọ afọ ise n’ogige ọrụ mmanye ndị Germany. *

Amaliteghachiri m ikwusa ozi ọma n’obodo Metz ozugbo. N’oge ahụ, mụ na ezinụlọ Minzani na-anọkọkarị. E mere nwa ha nwaanyị, bụ́ Tina, baptizim na November 2, 1946. O jighị ozi ọma egwuri egwu, enwekwara m mmasị n’ebe ọ nọ. Anyị lụrụ na December 13, 1947. Na September 1967, Tina malitere ọrụ ikwusa ozi ọma oge niile, ọ rụgidekwara ya ruo mgbe ọ nwụrụ na June 2003, bụ́ mgbe ọ gbara afọ iri itoolu na asatọ. Ọnwụ Tina ka na-ewute m.

Agafeela m nnọọ afọ iri itoolu ugbu a, aghọtakwala m na ọ bụ Okwu Chineke nyere m ike idi ule ndị ahụ ma merie ha. E nweela mgbe ụfọdụ m nọrọ agụụ, ma ọ dịghị mgbe m na-anaghị agụ Okwu Chineke. Jehova enyekwala m ike. “Okwu [ya] echebewo m ndụ.”—Abụ Ọma 119:50.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 27 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịgụ akụkọ ndụ Jean Queyroi, gụọ Ụlọ Nche nke October 1, 1989, peeji nke 22 ruo nke 26.

[Foto dị na peeji nke 21]

Ezigbo enyi m bụ́ Albin Relewicz

[Foto dị na peeji nke 21]

Maryse Anasiak

[Foto dị na peeji nke 22]

Baịbụl ahụ m ji bred e nyere m otu izu nweta

[Foto dị na peeji nke 23]

N’afọ 1946, mgbe mụ na Tina ka na-achọ ịlụ alụ

[Foto dị na peeji nke 23]

Jean Queyroi na nwunye ya, bụ́ Titica