Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụbọchị Kacha Mkpa Kemgbe Ụmụ Mmadụ Dịwara Ndụ

Ụbọchị Kacha Mkpa Kemgbe Ụmụ Mmadụ Dịwara Ndụ

Ụbọchị Kacha Mkpa Kemgbe Ụmụ Mmadụ Dịwara Ndụ

Ọ bụ ụbọchị Jizọs Kraịst nwụrụ. Olee ihe mere ọnwụ Jizọs ji dị oké mkpa? Ọ dị ọtụtụ ihe mere ya.

Ebe ọ bụ na Jizọs rubeere Chineke isi ruo ọnwụ, ọ pụtara na ụmụ mmadụ nwere ike ịnọgide na-erubere Chineke isi.

Ọnwụ Kraịst mekwara ka ụfọdụ ụmụ mmadụ nwee ohere iso ya chịa n’eluigwe. O mekwara ka ọtụtụ ndị ọzọ nwee ohere inweta ndụ ebighị ebi na paradaịs n’elu ụwa.

N’abalị bọtara ụbọchị Jizọs nwụrụ, o ji achịcha na-ekoghị eko na mmanya na-acha ọbara ọbara mee ihe nnọchianya nke àjà ọ ga-eji ahụ́ ya chụọ n’ihi otú o si hụ ụmụ mmadụ n’anya. Ọ gwakwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” (Luk 22:19) Ị̀ ga-echeta ọnwụ a dị mkpa?

Ndịàmà Jehova ji obi ụtọ na-akpọ gị ka i soro ha cheta Ọnwụ Jizọs. N’afọ a, ụbọchị Ncheta Ọnwụ Jizọs bụ Thursday, April 9, mgbe anyanwụ dachara. I nwere ike ịga ya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova kacha gị nso. Biko jụta Ndịàmà Jehova bi gị nso ebe a ga-eme ya na oge ọ ga-abụ.