Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Ọ̀ Na-akpọrọ Ụmụaka Ka Ha Ghọọ Ndị Mmụọ Ozi n’Eluigwe?

Chineke Ọ̀ Na-akpọrọ Ụmụaka Ka Ha Ghọọ Ndị Mmụọ Ozi n’Eluigwe?

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Chineke Ọ̀ Na-akpọrọ Ụmụaka Ka Ha Ghọọ Ndị Mmụọ Ozi n’Eluigwe?

Ọ bụrụ na nwatakịrị anwụọ, ndị enyi ndị ezinụlọ nwa ahụ, bụ́ ndị bịara ịkasị ha obi, nwere ike ịgwa ha, sị, “Ọ ga-abụrịrị na Chineke chọrọ mmụọ ozi ọzọ n’eluigwe.” Ò yiri gị ka ọ̀ bụ eziokwu?

Ọ bụrụ eziokwu na Chineke na-egbu ụmụaka maka na ọ chọkwuru ndị mmụọ ozi n’eluigwe, ihe ọ pụtara bụ na obi fere ya azụ. Ma, Baịbụl kwuru na ọ dịghị otú ahụ. (Job 34:10) Nna nwere ọmịiko agaghị akpọrọ nwa ndị mmadụ n’ike naanị iji mee ka ezinụlọ nke ya bukwuo ibu. Ma, ọ dịghị nne ma ọ bụ nna nwere ọmịiko karịa Jehova, n’ihi na àgwà bụ́ isi Jehova nwere bụ ịhụnanya. (1 Jọn 4:8) Ịhụnanya dị ukwuu o nwere agatụdịghị ekwe ya mesie ndị mmadụ ike otú ahụ.

Jụọ onwe gị, sị, ‘Chineke ọ̀ chọkwuru ndị mmụọ ozi n’eluigwe?’ Baịbụl kwuru na ọrụ niile Chineke rụrụ dị mma, zuokwa okè. (Diuterọnọmi 32:4) Mgbe o kere ọtụtụ nde ndị mmụọ ozi, o kere ha ka ha zuo okè, ha zukwara ole ọ chọrọ. (Daniel 7:10) Chineke ò mehiere ihe mgbe ọ na-eke ha ma ghara ikeru ha ole ọ chọrọ? O nweghị ike ime eme! N’eziokwu, Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile emekataghị mehie ihe otú ahụ. Ọ bụ eziokwu na Jehova ahọrọla ụfọdụ ụmụ mmadụ ka ha ghọọ mmụọ iji soro chịa n’Alaeze eluigwe ya, ma, ha agaghị anwụ mgbe ha ka bụ ụmụaka.—Mkpughe 5:9, 10.

Ihe ọzọ mere na Chineke agaghị akpọrọ ụmụaka n’ụwa ka ha ghọọ ndị mmụọ ozi n’eluigwe bụ na ime otú ahụ adabaghị ná nzube ya maka ụmụaka mgbe o kere mmadụ. N’ogige Iden, Chineke gwara Adam na Iv, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba ma jupụta ụwa, meekwanụ ka ọ dịrị n’okpuru unu.” (Jenesis 1:28) Ụmụaka bụ onyinye Chineke nyere iji mezuo nzube ya ahụ, nke bụ́ ime ka ndị ezi omume jupụta ụwa. O nweghị mgbe o zubere ka ụmụaka nwụchuo ọnwụ ma ghọzie ndị mmụọ ozi. Baịbụl kwuru hoo haa na ụmụaka bụ “ihe nketa si n’aka Jehova.” (Abụ Ọma 127:3) Jehova, bụ́ Chineke ịhụnanya, ọ̀ ga-anaraghachi ndị mụrụ ụmụ onyinye o nyere ha? Mbanụ!

Ọ na-agbawa nne na nna obi ma nwa ha nwụchuo ọnwụ, ọ na-ewutekwa ha nke ukwuu, na-emekwa ha obi ọjọọ. Ma, olee olileanya ndị nwa ha nwụrụ nwere? Baịbụl kwere nkwa na Chineke ga-akpọlite ọtụtụ nde mmadụ n’ọnwụ na paradaịs n’elu ụwa ebe a. Chegodị echiche otú ọ ga-adị mgbe a ga-akpọlite ụmụaka, ahụ́ esie ha ike, ha na ndị hụrụ ha n’anya ahụkwa ọzọ. (Jọn 5:28, 29) Ọ bụ uche Chineke ka ụmụaka tolite, kporie ndụ ma mụta banyere Chineke na ihe o zubere maka ụwa. N’ihi ya, ụmụaka nwụrụ anwụ anaghị aghọ ndị mmụọ ozi n’eluigwe, kama, ha na-eche ka a kpọlite ha n’ọnwụ n’ụwa paradaịs. N’oge ahụ, ma ụmụaka ma ndị toro eto ga-eji obi ụtọ fee Onye kere anyị, bụ́ Jehova Chineke, ruo mgbe ebighị ebi, bụ́ mgbe Ọ ga-eji ịhụnanya na-elekọta anyị.