Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ọ Bụla Nwere Oge

Ihe Ọ Bụla Nwere Oge

Ihe Ọ Bụla Nwere Oge

Baịbụl kwuru, sị: “E nwere oge a kara aka maka ihe ọ bụla, ihe ọ bụla a na-eme n’okpuru eluigwe nwekwara oge.” Onye dere okwu ndị a, bụ́ Eze Sọlọmọn oge ochie, onye maara ihe, kwukwara na e nwere oge ịmụ nwa na oge ịnwụ anwụ, oge iwu ihe na oge ịkwatu ya, oge ịhụ mmadụ n’anya na oge ịkpọ mmadụ asị. O mechara kwuo, sị: “Olee uru onye na-arụ ọrụ na-erite n’ihe ọ na-adọgburu onwe ya n’ọrụ?”—Ekliziastis 3:1-9.

Ọ BỤRỤ na ụfọdụ ndị gụọ amaokwu Baịbụl ahụ, ha na-ewere ya na Baịbụl na-akụzi na a kara ihe niile na-emenụ aka, ya bụ, ha na-eche na Baịbụl kwadoro ozizi akara aka. Ọ̀ bụnụ eziokwu? Baịbụl ọ̀ na-akụzi na a kara ihe niile na-eme ná ndụ aka? Ebe ọ bụ na “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke,” ihe anyị gụrụ n’otu amaokwu Baịbụl ga-adabarịrị n’ihe amaokwu ndị ọzọ dị na Baịbụl kwuru. N’ihi ya, ka anyị hụ ihe amaokwu ndị ọzọ dị na Baịbụl, bụ́ Okwu Chineke, kwuru banyere okwu a.—2 Timoti 3:16.

Oge Ọdachi na Ihe A Na-atụghị Anya Ya

Sọlọmọn dekwuru n’akwụkwọ Ekliziastis, sị: “M wee tụgharịa uche ọzọ hụ n’okpuru anyanwụ na ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ na-emeri n’ọsọ, ọ bụghịkwa ndị dị ike na-emeri n’agha, ọ bụghịkwa ndị maara ihe na-enweta ihe oriri, ọ bụghịkwa ndị nwere nghọta na-enweta akụnụba, ọ bụghịkwa ndị nwere amamihe na-enweta ihu ọma.” Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ zara, sị: “N’ihi na oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya na-abịakwasị ha niile.”—Ekliziastis 9:11.

Ihe Sọlọmọn na-ekwu abụghị na akara aka na-ekpebi ihe niile na-eme ná ndụ mmadụ, kama, ọ na-ekwu na ụmụ mmadụ enweghị ike ikwu ihe niile ga-esi n’ihe ọ bụla ha chọrọ ime pụta “n’ihi na oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya na-abịakwasị ha niile.” Ọtụtụ mgbe, ihe na-eme ihe ji eme mmadụ na-abụ naanị na onye ahụ nọ n’ebe kwesịrị ekwesị n’oge kwesịrị ekwesị, ma ọ bụkwanụ anyị asị na onye ahụ nọ n’ebe na-ekwesịghị ekwesị n’oge na-ekwesịghị ekwesị.

Weregodị okwu bụ́: “Ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ na-emeri n’ọsọ” dị ka ihe atụ. O nwere ike ịbụ na ị ma ihe akụkọ mere n’ọsọ ụkwụ puku mita atọ nke ụmụ nwaanyị gbara n’egwuregwu Olimpik n’afọ 1984 na Los Angeles, California, U.S.A. Otu onye ọsọ nke na-anọchi anya Britain na otu nke na-anọchi anya United States bucha n’obi inweta ihe nrite ọlaedo n’ọsọ ahụ. Ma, n’etiti ụzọ, ha abụọ kụkọtara. Otu n’ime ha dara, kwụsị ọsọ ahụ; onye nke ọzọ enwee nkụda mmụọ nke na ọ gbara onye nke asaa.

Ọ̀ bụ akara aka mere ihe ahụ ji mee? Ụfọdụ ndị nwere ike ikwu otú ahụ. Ma, o doro anya na ihe mere mmadụ abụọ ahụ ji daa n’ọsọ ahụ bụ na ha abụọ kụkọtara, bụ́ ihe ọ na-enweghị onye tụrụ anya na ọ ga-eme. À ga-asịzi na a kara ya aka na ha abụọ ga-akụkọta? Ụfọdụ ndị nwekwara ike ikwu otú ahụ. Ma, ndị na-akọ otú egwuregwu ahụ si aga kwuru na ihe kpatara ya bụ na mmadụ abụọ ahụ sichara ike, ha nọkwa na-agba mbọ ịgbafe ibe ha. Ọ bụ ihe ahụ Baịbụl kwuru, ya bụ, na “oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya na-abịakwasị ha niile.” Otú ọ sọkwara mmadụ ya kwadebe maka ihe ọ na-achọ ime, a na-enwe ihe ụfọdụ a na-atụghị anya ha ndị nwere ike ikpebi ihe ga-emecha mee, ọ gbasaghịkwa akara aka.

Oleezi ihe Baịbụl na-ekwu mgbe ọ sịrị na “e nwere oge a kara aka maka ihe ọ bụla”? Ò nwere ihe ọ ga-abụ anyị mee, ya ekpebie ihe ga-emecha mee anyị n’ọdịnihu?

Oge Kacha Mma Maka Ihe Ọ Bụla Mmadụ Na-eme

Ihe onye ahụ si n’ike mmụọ nsọ dee ihe ahụ na Baịbụl na-ekwu abụghị banyere akara aka mmadụ ma ọ bụ ihe ga-emecha mee mmadụ n’ọdịnihu, kama ọ na-ekwu banyere nzube Chineke na otú ọ ga-esi emetụta ụmụ mmadụ. Olee otú anyị si mara? Ọ bụ ya bụ isi ihe amaokwu ya ndị ọzọ na-ekwu. Mgbe Sọlọmọn kwuchara ọtụtụ ihe ndị a ga-asị na ha nwere “oge a kara aka,” o dere, sị: “Ahụwo m ọrụ Chineke nyeworo ụmụ mmadụ nke ha ga na-arụ. O mewo ka ihe ọ bụla maa mma n’oge ya.”—Ekliziastis 3:10, 11.

Chineke nyere ụmụ mmadụ ọtụtụ ọrụ ha ga-arụ, ma ọ bụ ọtụtụ ihe ha ga-eme, Sọlọmọn kpọkwara ọtụtụ n’ime ha aha. Chineke nyekwara anyị ohere ikpebi ihe anyị chọrọ ime. Otú ọ dị, ọrụ ọ bụla nwere oge ọ ga-abụ a rụọ ya, ya arụpụta ihe kacha mma. Dị ka ihe atụ, legodị ihe Sọlọmọn kwuru n’Ekliziastis 3:2, ya bụ, na e nwere “oge ịkụ ihe na oge ifopụ ihe a kụrụ.” Ndị ọrụ ubi ma na mkpụrụ ọ bụla nwere oge kwesịrị ekwesị e ji akụ ya. Ọ bụrụkwanụ na onye ọrụ ubi ahapụ ịkụ ihe n’oge a na-akụ ya, kụọ ya n’oge na-abụghị oge a na-akụ ya? Ọ bụrụ na ihe ahụ ọ kụrụ emeghị nke ọma n’agbanyeghị mgbalị ya niile, ọ̀ ga-asị na ọ bụ akara aka mere ya? Mbanụ! Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ kụghị mkpụrụ ahụ n’oge o kwesịrị ịkụ ya. Ihe gaara agaziri onye ọrụ ubi ahụ ma a sị na o sooro otú Onye Okike anyị si hazie ihe.

N’ihi ya, ihe Chineke kpebiri abụghị akara aka mmadụ na ihe niile ga-emecha mee ná ndụ mmadụ, kama, ọ bụ ụkpụrụ ụfọdụ dabara ná nzube ya bụ́ ndị ga na-eduzi ihe ụmụ mmadụ na-eme ná ndụ. Ka ihe nwee ike ịgara ụmụ mmadụ nke ọma n’ihe niile ha na-eme, ha ga-achọpụtarịrị ihe bụ́ nzube Chineke na oge ọ ga-emezu ya, meekwa ka ihe ha na-eme daba ná nzube ya na oge ya. Ihe Chineke karala aka, nke na-agaghịkwa agbanwe agbanwe, abụghị ndụ ụmụ mmadụ, kama ọ bụ ihe ndị Chineke zubere ime. Jehova si n’ọnụ Aịzaya onye amụma kwuo, sị: ‘Okwu m nke si n’ọnụ m pụta agaghị agba aka lọghachikwute m, kama ọ ga-eme ihe na-atọ m ụtọ, ọ ga-emezukwa ihe m zigara ya ka o mee.’—Aịzaya 55:11.

Gịnịzi bụ́ “okwu” Chineke ma ọ bụ nzube ya maka ụwa na ọdịnihu ụmụ mmadụ bụ́ nke ‘ga-emezu’?

Ịghọta Oge Chineke

Sọlọmọn kwuru ihe ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ ahụ. Mgbe o kwuchara na ‘Chineke emewo ka ihe ọ bụla maa mma n’oge ya,’ o kwuziri, sị, “O tinyewo ọbụna mgbe ebighị ebi n’obi ha, ka ụmụ mmadụ wee ghara ịchọpụta ọrụ ezi Chineke rụrụ site ná mmalite ruo ná ngwụsị.”—Ekliziastis 3:11.

Ndị mmadụ edeela ọtụtụ ihe banyere amaokwu a. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị na-enwetụbeghị mgbe ọ nọ na-eche ihe mere o ji dịrị ndụ na ebe ndụ a du ya aga. Kemgbe ụwa, ọ na-esiri ụmụ mmadụ ike ikweta na naanị ihe dị ná ndụ bụ mmadụ ịdọgbu onwe ya n’ọrụ, e mechaa ya anwụọ. Anyị, bụ́ ụmụ mmadụ, pụrụ iche n’ihe niile dị ndụ e kere eke n’ihi na anyị na-eche maka ndụ anyị ugbu a nakwa maka ọdịnihu anyị. Ọ na-adịdị anyị ka anyị anwụla anwụ. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ maka ihe ahụ Akwụkwọ Nsọ kwuru nke bụ́ na Chineke ‘tinyere mgbe ebighị ebi n’obi ụmụ mmadụ.’

N’ihi ọchịchọ a ụmụ mmadụ nwere, ha na-echekarị ma hà ga-adịrị ndụ gawa ma ha nwụọ. Ụfọdụ chere na e nwere ihe dị n’ime anyị ka na-adị ndụ ma anyị nwụọ. Ndị ọzọ kweere na anyị ga na-alọ ụwa ruo mgbe ebighị ebi. Ndị ọzọkwa chere na ọ bụ akara aka mmadụ na-edu ya ma ọ bụkwanụ na ọ bụ Chineke na-ekpebi ihe niile na-eme ná ndụ mmadụ, nakwa na anyị agaghị agbanweli ya. Ọ dị mwute na o nweghị nke ọ bụla n’ime nkọwa ndị a nke merela ka obi ruo ndị mmadụ ala. Ihe kpatara ya bụ na Baịbụl kwuru na mmadụ agaghị ejili aka ya ‘achọpụta ọrụ ezi Chineke rụrụ site ná mmalite ruo ná ngwụsị.’

Ọ dịla anya ihe a ụmụ mmadụ chọwara ịmata, nke na-ekwebeghị ha mmata, chuwere ndị ọkà ihe ọmụma ụra. Otú ọ dị, ebe ọ bụ Chineke tinyere ọchịchọ ahụ n’obi anyị, ó kwesịghị ka ọ bụrụ ya ga-agwa anyị ihe anyị ga-eme iji nweta ihe ahụ na-agụ anyị? A sị ka e kwuwe, Baịbụl kwuru banyere Jehova, sị: “Ị na-asaghe aka gị, were ihe na-agụ ihe ọ bụla dị ndụ nyejuo ya afọ.” (Abụ Ọma 145:16) Ọ bụrụ na anyị amụwa Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, anyị ga-ahụ otu o si kọwaa ihe bụ́ ndụ na ihe bụ́ ọnwụ nke ọma, anyị ga-aghọtakwa ihe bụ́ nzube ebighị ebi Chineke maka ụwa a na ụmụ mmadụ.—Ndị Efesọs 3:11.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 5]

“Ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ na-emeri n’ọsọ.”—Ekliziastis 9:11

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 6]

Ọ bụrụ na onye ọrụ ubi akụghị mkpụrụ mgbe o kwesịrị, ọ̀ ga-asị na ọ bụ akara aka mere ka ihe ọ kụrụ ghara ime nke ọma?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 7]

Ihe mere anyị ji eche banyere ndụ na ọnwụ bụ na Chineke ‘tinyere mgbe ebighị ebi n’obi ụmụ mmadụ’