Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikwusa Ozi Ọma na Ịkụzi Baịbụl n’Africa

Ikwusa Ozi Ọma na Ịkụzi Baịbụl n’Africa

Ikwusa Ozi Ọma na Ịkụzi Baịbụl n’Africa

Mba ole dị na ya: 57

Mmadụ ole bi na ya: 848,582,269

Ndịàmà Jehova: 1,122,493

Ndị a na-akụziri Baịbụl: 2,202,217

KWA afọ, anyị na-agụ banyere mgbalị a na-eme iji mee ka ndị mmadụ mara Jehova Chineke ma hụ ya n’anya. Ọrụ a abụghị obere ọrụ, a rụruokwala ya n’ebe dị anya. O nweghị ụlọ ọrụ ga-akwụli ọtụtụ nde mmadụ ụgwọ ka ha kpọsawara ha ụdị ozi ọ bụla ná mba dị iche iche otú a. Ma, Ndịàmà Jehova anaghị achọ ka a kwụọ ha ụgwọ maka ọrụ ịkụzi Baịbụl ha na-arụ. Ha na-eso ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, nke bụ́: “Unu natara n’efu, na-enyenụ n’efu.” (Matiu 10:8) Akụkọ ndị ị ga-agụ ugbu a gosiri na ọ bụ eziokwu.

Rwanda Otu ụbọchị, mgbe otu nwata nwaanyị dị afọ itoolu si ụlọ akwụkwọ na-alọta, ọ hụrụ nnukwu ego dị n’obere akpa n’okporo ụzọ. Ndị ezinụlọ ya, bụ́ ndị ha na Ndịàmà na-amụ Baịbụl, kpebiri ime ihe ha mụtara na Baịbụl. N’ihi ya, ha chọtara onye nwe ego ahụ ma nyeghachi ya ego ya. Onye nwe ego ahụ jụrụ nwata nwaanyị ahụ, sị, “Ọ bụrụ na mụ enye gị ego maka ihe ọma a i meere m, gịnị ka ị ga-eji ya eme?”

Nwata nwaanyị ahụ sịrị ya, “M ga-eji ya zụọ Baịbụl.”

O juru nwoke ahụ anya, ya asị ya, “M chere na ị ga-eji ya zụrụ uwe na akpụkpọ ụkwụ ebe ọ bụ na ndị nke a i yi emeela ochie.” Nwata nwaanyị ahụ kwusiri ike na ihe ka ya mkpa bụ inweta Baịbụl. Nwoke ahụ chọrọ ịmata ihe mere ezinụlọ nwata nwaanyị ahụ ewereghị ego ahụ. Mgbe a gwara ya na ha na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl, ọ zụrụ Baịbụl abụọ, otu maka nwata nwaanyị ahụ, otu maka ezinụlọ nke ya. Ọ gwakwara Ndịàmà ka ha bịawa na nke ha kụziwere ha Baịbụl. Ezinụlọ abụọ ahụ na-eme nke ọma n’ọmụmụ Baịbụl ha.

Madagascar Otu onye nlekọta sekit, bụ́ onye ozi nke na-aga eso ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị iche iche ekwusa ozi ọma kwa izu, na nwunye ya nọ na-aga ileta otu ọgbakọ dị n’ime ime obodo. Ka ha nọ na-aga, ha zutere ndị na-ezu ehi, bụ́ ndị bu anyụike na ube. Mgbe nwunye onye nlekọta ahụ kpekuchara Chineke ekpere n’obi ya ka o nye ya obi ike, o nyere ha traktị bụ́ Ndụ n’ime Ụwa Ọhụrụ nke Udo ma gwa ha, sị: “Taa, onye ọ bụla nọ n’ụjọ. Ma n’oge na-adịghị anya, Chineke ga-ebibi ndị ajọ omume ma weta ụwa ọhụrụ nke udo ga-adị na ya.” Otu n’ime ndị ikom ahụ gere ntị nke ọma ma nara traktị ahụ.

Ná mgbakọ Ndịàmà Jehova nwere mgbe otu afọ gafere, otu nwoke bịakwutere nwunye onye nlekọta ahụ ma jụọ ya ma ọ̀ matara onye ọ bụ. O kwuru na ya so ndị ohi ahụ ọ hụrụ n’ụzọ apịtị ahụ nakwa na ọ bụ ya bụ onye nke ahụ naara ya traktị. O kwuziri, sị: “Anyị si n’ebe anyị gara ohi na-alọta n’ụbọchị ahụ ị hụrụ anyị. Ihe i kwuru mere ka m chee echiche. M gwara onwe m, sị: ‘Anyị anaghị atụ ndị uwe ojii na ndị soja ụjọ n’ihi na anyị ga-agbanahụli ha. Ma, ọ bụrụ na Chineke ga-ebibi ndị ajọ omume, olee otú m ga-esi agbanahụ ya?’ N’ihi ya, m kpebiri ịjụkwu ajụjụ. Mgbe m ruru ụlọ, m gakwuuru onye agbata obi m nke ya na otu Onyeàmà Jehova nke na-ekwusa ozi ọma oge niile na-amụ Baịbụl. M kwere ka Onyeàmà ahụ kụziwekwara m Baịbụl, a na-agakwa ime m baptizim ná mgbakọ a.”

Mozambique N’afọ 1992, Madalena, onye gafetụrụla afọ iri atọ, nwere ihe mberede ụgbọala nke mere ka ọ ghara ịgalikwa ije. Kemgbe ahụ, ọ na-esi ike ya apụta èzí. Mgbe afọ atọ gafere, Ndịàmà ziri papa ya ozi ọma n’ihu ụlọ ha. Papa ya bụ onyeisi otu okpukpe ọdịnala, ndị okpukpe ahụ na-ezukọkwa n’azụ ụlọ ha. Madalena nụrụ ozi ọma ahụ a nọ na-ezi papa ya, nụkwa na Ndịàmà ahụ jụrụ ajụjụ ya, ya agwa ha ka ha bata n’ime ụlọ. O metụrụ ya n’ahụ́ nke ukwuu na ha nwere ezi mmasị n’ebe ọ nọ! O kwere ka a bịa kụziwere ya Baịbụl, nweekwa mmasị nke ukwuu n’ihe ọ nọ na-amụta. Mgbe Ndịàmà ahụ hụrụ ịnụ ọkụ n’obi ya, ha nyeere ya aka n’ọtụtụ ụzọ. Otu n’ime ihe ndị ha meere ya bụ inyere ya aka ịna-abịa ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Aka a e nyeere Madalena mere ka e mee ya baptizim n’ime mmiri n’afọ 2002, ya egosi ọha na eze na ya enyefeela Jehova onwe ya

Otú Ndịàmà si na-elekọta Madalena mere ndị mụrụ ya obi ụtọ nke ukwuu. Mama ya hapụrụ okpukpe di ya malite ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Ná mmalite, papa Madalena sịrị na ya emekataghị hapụ okpukpe ya. Ma, ka oge na-aga, ọ malitere ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Ndị òtù ya nwara ime ka ọ kwụsị, ebe ọ bụ ya bụ onyeisi ha. Ma, ọ gbanweghị obi ya, ọ kpọkwara ngwongwo niile o ji ekpe okpukpe ya ọkụ. N’afọ 2007, e mere ya na nwunye ya baptizim. Ezinụlọ ahụ dum na-eme nke ọma n’ofufe ha na-efe Jehova.

Zimbabwe Decibel, bụ́ nwata nwaanyị dị afọ itoolu, na-ezi ụmụ klas ya na ndị nkụzi ha ozi ọma. Otu ụbọchị, Decibel chọpụtara na ihu onye nkụzi ha gbarụrụ agbarụ, ya agakwuru ya ma jụọ ya ma ọ̀ dị ihe na-eme ya obi ọjọọ. Onye nkụzi ha gwara ya na nwa nwanne ya nwaanyị nwụrụ. Decibel kwere onye nkụzi ha nkwa na o nwere ihe ya ga-ewetara ya nke ga-akasi ya obi. Ọ natara ndị mụrụ ya broshuọ bụ́ Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ ma wegara ya onye nkụzi ha n’echi ya. Onye nkụzi ahụ gụrụ paragraf ole na ole na broshuọ ahụ ma tie mkpu ọṅụ. Mgbe e mechara, o degaara ndị mụrụ Decibel akwụkwọ ozi o ji kelee ha maka ọzụzụ ha nyere nwa ha nakwa maka obi Decibel kasiri ya n’oge ọ nọ ná nchekasị.

Ghana Abigail na nne nne ya na nna nna ya, bụ́ ndị na-ekpe chọọchị Presbyterian, bi n’ebe ndịda Ghana. A kụziiri Abigail na Ndịàmà Jehova bụ ndị amụma ụgha. Mgbe ọ nụrụ na ndị mụrụ ya, bụ́ ndị bi n’ebe ọzọ na Ghana, na Ndịàmà na-amụ Baịbụl, o nyere ya nsogbu n’obi. N’ihi ya, o degaara ha akwụkwọ ozi ka ha na Ndịàmà kwụsị ịmụ ihe. Ebe ọ bụ na akwụkwọ ozi ahụ arụpụtaghị ihe ọ chọrọ, o mere njem karịrị otu puku kilomita ịga hụ ha. Akpata oyi wụrụ Abigail n’ahụ́ mgbe ọ hụrụ na Baịbụl nke ya na hel abụghị ebe a na-ata ndị ajọ omume ahụhụ. Ọ malitere ịmụ Baịbụl na iso ndị mụrụ ya na-aga ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, malitekwa ikwusa ozi ọma. E mere Abigail baptizim ná mgbakọ abalị abụọ nke Ndịàmà Jehova nwere na nso nso a.