Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Kọrịnt “Obodo Nwere Ọdụ Ụgbọ Mmiri Abụọ”

Kọrịnt “Obodo Nwere Ọdụ Ụgbọ Mmiri Abụọ”

Kọrịnt “Obodo Nwere Ọdụ Ụgbọ Mmiri Abụọ”

Ọ BỤRỤ na i lee anya na map mba Gris, ị ga-ahụ na ala ka ukwuu ná mba ahụ sọnyere isi na mmiri, ị ga-ahụkwa na ebe ndịda ya dị ka nnukwu ala mmiri gbara gburugburu. Ihe jikọtara mpaghara abụọ a bụ ala dị warara, nke obosara ya dị ihe dị ka kilomita isii n’ebe ọ kacha dịrị warara. A na-akpọ ya Ala Dị Warara nke Kọrịnt, o jikọtakwara ebe ndịda na ebe ugwu mba ahụ, ya bụ, mpaghara Peloponnese sọnyere isi na mmiri na mpaghara ka ukwuu nke mba ahụ.

O nwekwara ihe ọzọ mere ala ahụ dị warara ji dị mkpa. A na-akpọ ya àkwà oké osimiri. Ihe mbụ mere e ji akpọ ya aha ahụ bụ na n’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ ya, e nwere Ọwara Oké Osimiri Saronic nke na-asọba ma n’Oké Osimiri Aegean ma ná mpaghara Oké Osimiri Mediterenian nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ. Nke abụọ abụrụ na n’akụkụ ọdịda anyanwụ ya, e nwekwara Ọwara Oké Osimiri Kọrịnt nke e si na ya abanye n’Oké Osimiri Ionian, Oké Osimiri Adriatic, na mpaghara Oké Osimiri Mediterenian nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ. Ọ bụ n’etiti ebe a niile ka obodo Kọrịnt dị, bụ́ ebe Pọl onyeozi kwụsịtụrụ n’oge ọ na-ekwusa ozi ọma ná mba dị iche iche. N’oge ochie, ihe e ji mara obodo a bụ akụnụba ya, ndụ okomoko, na omume rụrụ arụ.

Obodo Dị n’Ebe Dị Mma

Obodo Kọrịnt dị ná ngwụcha ngwụcha ebe ọdịda anyanwụ nke ala ahụ dị warara dị mkpa. O nwere ọdụ ụgbọ mmiri abụọ. Otu dị na Lechaeum, n’ebe ọdịda anyanwụ, nke ọzọ adịrị na Senkrea, n’ebe ọwụwa anyanwụ. Ọ bụ ya mere onye Gris bụ́ ọkà mmụta ihe ndị dị n’ụwa, nke aha ya bụ́ Strabo, ji kpọọ Kọrịnt “obodo nwere ọdụ ụgbọ mmiri abụọ.” N’ihi ebe ahụ dị mkpa obodo Kọrịnt dị, ọ ghọrọ ebe ndị ahịa si mba dị iche iche si agafe. O nwere okporo ụzọ ndị ahịa si n’ebe ugwu si aga n’ebe ndịda, nweekwa ụzọ ndị ahịa ji ụgbọ mmiri si esi n’ebe ọwụwa anyanwụ aga n’ebe ọdịda anyanwụ.

Kemgbe oge ochie, ụgbọ mmiri ndị si n’ebe ọwụwa anyanwụ (Eshia Maịnọ, Siria, Finishia, na Ijipt) na ndị si n’ebe ọdịda anyanwụ (Ịtali na Spen) na-ebu ngwá ahịa ha abịa, butusịa ha n’otu n’ime ọdụ ụgbọ mmiri abụọ ahụ, sizie n’ala ahụ dị warara dị kilomita ole na ole bufee ha n’ọdụ ụgbọ mmiri nke ọzọ. Ha na-ebubazi ngwá ahịa ndị ahụ n’ụgbọ mmiri ọzọ, gawa ebe ha na-aga. A na-esi n’obere ụzọ a na-akpọ diolkos ebufe obere ụgbọ mmiri n’ala ahụ dị warara.—Gụọ  igbe dị na peeji nke 27.

Gịnị mere ndị na-akwọ ụgbọ mmiri ji esikarị n’ala ahụ dị warara agafe? Ọ bụ n’ihi na ha anaghị achọ ịgba narị kilomita atọ na iri abụọ n’oké osimiri, bụ́ nke ga-eme ka ha banye n’ebe a na-enwekarị oké ebili mmiri na ndịda Peloponnese. Ebe ndị na-akwọ ụgbọ mmiri na-akacha ezere bụ Cape Malea, bụ́ ebe e kwuru banyere ya, sị: “Ị gbaa ụzọ Cape Malea, mara na ị gaghị alaru ụlọ.”

Senkrea—Ọdụ Ụgbọ Mmiri Mmiri Kpuchiri

Ụgbọ mmiri ndị na-agba n’oké osimiri ndị dị n’Eshia na-akwụsị n’ọdụ ụgbọ mmiri Senkrea, nke dị ihe dị ka kilomita iri na otu ma e si n’ebe ọwụwa anyanwụ Kọrịnt gawa ya. Taa, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na mmiri ekpuchichaala ya n’ihi oké ala ọma jijiji mere n’ebe ahụ n’ihe dị ka otu puku na narị afọ isii gara aga. Strabo kwuru na Senkrea bụ nnukwu ọdụ ụgbọ mmiri na-ekwo ekwo, onye Rom bụ́ ọkà ihe ọmụma aha ya bụ Lucius Apuleius kpọkwara ya “ebe mara oké mma ụgbọ mmiri si mba dị iche iche na-abịakarị.”

N’oge Rom na-achị ụwa, ọdụ ụgbọ mmiri ahụ nwere ebe abụọ e wubanyere n’oké osimiri, bụ́ ebe e si abanye n’ụgbọ mmiri. Ebe abụọ ahụ mere ka obosara ebe mbata ọdụ ụgbọ mmiri ahụ dịrị n’agbata otu narị mita na iri ise na narị mita abụọ. Ụgbọ mmiri ndị dị mita iri anọ n’ogologo na-abanyeli n’ọdụ ụgbọ mmiri ahụ. Otu n’ime ihe ndị a hụrụ mgbe e gwuru ndịda ebe ọdịda anyanwụ ya bụ ụlọ arụsị nke e chere na ọ bụ nke chi nwaanyị bụ́ Isis. Ọ ga-abụ na ọtụtụ ụlọ ndị dị n’akụkụ nke ọzọ nke ọdụ ụgbọ mmiri ahụ bụ ụlọ arụsị nke chi nwaanyị bụ́ Aphrodite. E weere ya na ọ bụ chi abụọ a na-echebe ndị na-akwọ ụgbọ mmiri.

O nwere ike ịbụ na ihe so mee ka Pọl onyeozi rụọ ọrụ ịkpa ákwà ụlọikwuu na Kọrịnt bụ na ọtụtụ ụgbọ mmiri na-abịa n’ọdụ ụgbọ mmiri ahụ. (Ọrụ 18:1-3) Akwụkwọ bụ́ In the Steps of St. Paul kwuru, sị: “Oge oyi ruwe, ndị na-akpa ákwà ụlọikwuu na Kọrịnt, bụ́ ndị na-akpakwa ákwà ụgbọ mmiri, na-enwe nnukwu ọrụ. N’oge ahụ ụgbọ mmiri na-eju n’ọdụ ụgbọ mmiri abụọ ahụ, na-eche ka e mepeghachi ọdụ ụgbọ mmiri ndị ahụ ma oge oyi gafee, ọ ga-abụrịrị na ndị na-arụzi ụgbọ na Lechæum na Senkrea na-enwe nnọọ ọrụ nke na ọrụ na-eru onye ọ bụla matụụrụ akpa ákwà ụgbọ mmiri.”

Mgbe Pọl nọchara na Kọrịnt ihe karịrị ọnwa iri na asatọ, ọ banyere ụgbọ mmiri, si Senkrea gaa Efesọs, n’ihe dị ka afọ 52 Oge Anyị. (Ọrụ 18:18, 19) Mgbe ihe dị ka afọ anọ ọzọ gafere, a malitere ọgbakọ Ndị Kraịst na Senkrea. Baịbụl gwara anyị na Pọl gwara Ndị Kraịst nọ na Rom ka ha nyere otu nwaanyị Onye Kraịst aha ya bụ Fibi aka, bụ́ onye si “n’ọgbakọ dị na Senkrea.”—Ndị Rom 16:1, 2.

Taa, ndị na-aga ikiri ebe ahụ ọdụ ụgbọ mmiri Senkrea dịbu na-egwu mmiri ya dị ọcha, na-egwufesị ihe ndị dakasịrị adakasi e ji rụọ ọdụ ụgbọ mmiri ahụ. Ọtụtụ n’ime ha amaghị na ọtụtụ narị afọ gara aga, e nwere ọtụtụ ndị ọchụnta ego na Ndị Kraịst na-ekwusa ozi ọma n’ebe ahụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ọdụ ụgbọ mmiri nke ọzọ dị na Kọrịnt, ya bụ, ọdụ ụgbọ mmiri Lechaeum, nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ nke ala ahụ dị warara.

Lechaeum—Ọdụ Ụgbọ Mmiri Dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ

Otu ụzọ a rụrụ nke ọma, a na-akpọ Okporo Ụzọ Lechaeum, si n’ọma ahịa Kọrịnt gaa n’ọdụ ụgbọ mmiri Lechaeum, nke dị kilomita abụọ ma e si n’ọma ahịa ahụ gawa n’ebe ọdịda anyanwụ. O nwere ebe ndị injinia kpopụsịrị ájá n’ikpere osimiri ahụ mgbe ha na-arụ ọdụ ụgbọ mmiri ahụ, jirizie ájá ha kpopụtara wụọ n’ikpere osimiri ahụ ka oké ifufe si n’ọwara oké osimiri ahụ ghara imebisị ụgbọ ndị a kwụsịrị n’ọdụ ụgbọ mmiri ahụ. O nwere mgbe ọdụ ụgbọ mmiri a bụ ọdụ ụgbọ mmiri kacha ukwuu e nwere n’Oké Osimiri Mediterenian. Ndị na-amụ banyere ihe mgbe ochie egwupụtala otu ihe dịbu n’ụlọ nduzi ndị ọrụ ụgbọ mmiri dakasịrị adakasị, bụ́ ihe oyiyi nke chi bụ́ Poseidon.

N’Okporo Ụzọ Lechaeum, bụ́ nke nwere mgbidi n’akụkụ ya abụọ, e nwere ebe ndị ụkwụ na-aga, nweekwa ụlọ ndị ọchịchị, ụlọ arụsị dị iche iche, na veranda ndị ụlọ ahịa dị na ha. Ọ ga-abụrịrị na Pọl hụrụ ndị ọ ga-ezi ozi ọma n’ebe ahụ, ya bụ, ndị bịara ịzụ ahịa, ndị na-ekwu okwu na-abaghị uru, ndị na-ere ahịa, ndị ohu, ndị ọchụnta ego, na ndị ọzọ.

Ọ bụghị naanị ụgbọ mmiri ndị ahịa ka e nwere na Lechaeum, e nwekwara ọtụtụ ụgbọ mmiri ndị agha. Ụfọdụ ndị na-ekwu na ọ bụ n’ebe a na-arụ ụgbọ mmiri na Lechaeum ka onye Kọrịnt na-arụ ụgbọ mmiri, bụ́ Ameinocles, nọ rụpụta ụgbọ mmiri pụrụ iche n’ihe dị ka afọ 700 Tupu Oge Anyị, bụ́ otu n’ime ụgbọ mmiri ndị kacha sie ike e ji lụọ agha n’oge ochie. Ụgbọ mmiri a nyeere ndị Atens aka imeri ndị agha ụgbọ mmiri Peshia n’agha kpụ ọkụ n’ọnụ ha lụrụ na Salamis n’afọ 480 Tupu Oge Anyị.

Ebe ahụ bụ́bu ọdụ ụgbọ mmiri na-ekwo ekwo bụzi naanị “ọdọ mmiri ojii nke ahịhịa amị juru.” O nweghị ihe mmadụ ga-ahụ na-egosi na ebe ahụ bụ otu n’ime ọdụ ụgbọ mmiri ndị kacha ukwuu e nwere n’Oké Osimiri Mediterenian ọtụtụ narị afọ gara aga.

Ibi na Kọrịnt Siiri Ndị Kraịst Ike

Ọ bụghị naanị na ndị Kọrịnt ji ọdụ ụgbọ mmiri ha kpaa ego, kamakwa, ọdụ ụgbọ mmiri ndị ahụ webatara àgwà dị iche iche n’obodo ha. Dị ka ihe atụ, ọdụ ụgbọ mmiri ahụ wetaara ha azụmahịa na akụnụba. Nnukwu ego ndị Kọrịnt na-ana n’ọdụ ụgbọ mmiri ha na ụtụ ahịa ha na-ana maka isi n’ala ha na-ebufe ngwá ahịa na ụgbọ mmiri mere ka ha nwee ezigbo ego. Ha na-anakwa ụtụ ahịa n’okporo ụzọ ha. Ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ isii gara aga, ụtụ ndị ọchịchị obodo ahụ na-anata n’ahịa ha na nke ha na-anata ụgbọ mmiri ndị na-akwụsị n’ọdụ ụgbọ mmiri ha medịrị ka ha kwụsị ịna ụmụ amala ha ụtụ isi!

Ndị Kọrịnt nwekwara ụzọ ọzọ ha si anapụta ndị ahịa bịara n’obodo ha ego. Ọtụtụ n’ime ha na-ebi ndụ okomoko, na-agakwa oriri na nkwari rụrụ arụ. Ndị na-akwọ ụgbọ mmiri na-enubatakwa n’obodo Kọrịnt, na-eme ka ọ bakwuo ọgaranya. Strabo kwuru na ọ naghị esiri ha ike imefusị ego ha. Ndị Kọrịnt na-arụkwara ndị bịara abịa ọrụ dị iche iche, tinyere ịrụzi ụgbọ mmiri.

E kwuru na n’oge Pọl, ihe dị ka narị puku mmadụ anọ bi n’obodo ahụ. Naanị obodo ọtụtụ mmadụ bi karịa ya bụ Rom, Alegzandria, na Antiọk nke Siria. Ndị Gris, ndị Rom, ndị Siria, ndị Ijipt, na ndị Juu, bicha na Kọrịnt. Ndị njem na-abata mgbe niile n’ọdụ ụgbọ mmiri ha, ya bụ, ndị bịara maka egwuregwu mmega ahụ́, ndị na-eme ihe egwuregwu, ndị ọkà ihe ọmụma, ndị ọchụnta ego, na ndị ọzọ. Ndị ọbịa ahụ na-eweta onyinye n’ụlọ arụsị dị iche iche, na-achụkwara chi dị iche iche àjà. Ihe a niile mere ka Kọrịnt ghọọ nnukwu obodo na-ewu ewu. Ma, o furu ndị Kọrịnt ihe.

Akwụkwọ ahụ bụ́ In the Steps of St. Paul kwuru, sị: “Ọdụ ụgbọ mmiri abụọ ahụ dị na Kọrịnt mere ka ọ ghọọ nnukwu obodo, meekwa ka ndị Kọrịnt mụta omume rụrụ arụ n’aka ndị mba ọzọ, bụ́ ndị na-akwụsị ụgbọ mmiri ha n’ọdụ ụgbọ mmiri Kọrịnt.” Ndị si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ na n’Ebe Ọdịda Anyanwụ bucha àgwà ọjọọ ha bịa n’obodo ahụ. N’ihi ya, Kọrịnt ghọrọ obodo omume ọjọọ na ndụ okomoko iberibe juru, ya bụ, obodo a kacha bie ndụ rụrụ arụ na ya na Gris oge ochie. Nke a meziri ka a kpọwa onye na-ebi ndụ rụrụ arụ onye Kọrịnt.

Ụdị ịhụ ego n’anya na omume rụrụ arụ e nwere na Kọrịnt mere ka ibi ndụ otú Chineke chọrọ siere Ndị Kraịst ike. Ọ dị mkpa ka a dụọ ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ na Kọrịnt ọdụ ka ha na-eme omume dị Chineke mma. Ọ bụ ya mere Pọl ji katọọ anyaukwu, ịpụnara mmadụ ihe, na omume ndị ọzọ rụrụ arụ n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Kọrịnt. Ọ bụrụ na ị gụọ akwụkwọ ozi ndị ahụ e si n’ike mmụọ nsọ dee, ị ga-ahụ omume rụrụ arụ ndị chere Ndị Kraịst bi n’ebe ahụ aka mgba.—1 Ndị Kọrịnt 5:9, 10; 6:9-11, 18; 2 Ndị Kọrịnt 7:1.

N’agbanyeghị nke ahụ, mbata ndị si ná mba dị iche iche na-abata na Kọrịnt bakwaara ndị Kọrịnt uru. Echiche ọhụrụ na-esi n’ebe dị iche iche abata n’obodo ahụ mgbe niile. Ndị obodo ahụ na-anabata ndị si ebe ọzọ karịa obodo ndị ọzọ Pọl gara. Otu onye na-akọwa Baịbụl kwuru na “ndị si n’ebe ọwụwa anyanwụ na n’ebe ọdịda anyanwụ na-abịa n’obodo oge ochie ahụ nwere ọdụ ụgbọ mmiri, na-ewebatara ndị bi na ya ụdị echiche, nkà ihe ọmụma, na okpukpe dị iche iche e nwere n’ụwa.” N’ihi ya, ndị okpukpe dị iche iche nweere onwe ha ikpe okpukpe ha, o dokwara anya na o mere ka ọ dịkwuoro Pọl mfe ikwusa ozi ọma n’ebe ahụ.

Ọdụ ụgbọ mmiri abụọ dị na Kọrịnt, ma nke dị na Senkrea ma nke dị na Lechaeum, so n’ihe mere obodo ahụ ji baa ọgaranya ma bụrụ obodo a ma ama. Ọdụ ụgbọ mmiri ndị ahụ mekwara ka ibi ndụ na Kọrịnt siere Ndị Kraịst ike. Otu ihe ahụ na-emekwa n’oge anyị a. Ihe ọjọọ dị iche iche, ndị dị ka ịchụ akụnụba ka à na-anwụ anwụ na ime omume rụrụ arụ, nwere ike imebi adịm ná mma ndị na-atụ egwu Jehova na Jehova. N’ihi ya, anyị kwesịrị ige ntị na ndụmọdụ si n’ike mmụọ nsọ Pọl nyere Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 27]

 DIOLKOS—ISI N’ALA NKỊTỊ BUFEE ỤGBỌ MMIRI

N’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ isii gara aga, mgbe atụmatụ e mere ka a rụọ ọwara oké osimiri na Kọrịnt kụrụ afọ n’ala, Periander, bụ́ eze ndị Kọrịnt, rụrụ ihe dị egwu e si na ya ebufe ụgbọ mmiri n’ala dị warara nke Kọrịnt. * A kpọrọ ihe ahụ ọ rụrụ diolkos, nke pụtara “bufee.” Ọ bụ obere ụzọ e ji mbadamba nkume rụọ nke nwegasịrị oghere miri emi ndị a dọnyere okporo osisi ndị e ji abụba machie elu ha. A na-ebutụsị ngwongwo dị n’ụgbọ mmiri ndị kwụsịrị n’otu n’ime ọdụ ụgbọ mmiri ndị ahụ, dọnye ha na trọk, ndị ohu akwara ha si n’ụzọ ahụ kwafee ha n’ọdụ ụgbọ mmiri nke ọzọ. A na-esikwa na ya ebufe obere ụgbọ mmiri, ma ndị nke bu ibu, mgbe ụfọdụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 29 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata otú e si rụọ ọwara osimiri e nwere n’ebe ahụ ugbu a, gụọ isiokwu bụ́ “Akụkọ Banyere Ọwara Oké Osimiri Kọrịnt,” na Teta! (Bekee) nke December 22, 1984, peeji nke 25 ruo nke 27.

[Map dị na peeji nke 25]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

GRIS

Ọwara Oké Osimiri Kọrịnt

Ọdụ Ụgbọ Mmiri Lechaeum

Kọrịnt Oge Ochie

Senkrea

Ala Dị Warara nke Kọrịnt

Ọwara Oké Osimiri Saronic

Peloponnese

OKÉ OSIMIRI IONIAN

Cape Malea

OKÉ OSIMIRI AEGEAN

[Foto dị na peeji nke 25]

Ụgbọ mmiri ndị na-ebu ngwá ahịa na-esi n’Ọwara Oké Osimiri Kọrịnt agbafe n’oge anyị a

[Foto dị na peeji nke 26]

Ọdụ Ụgbọ Mmiri Lechaeum

[Foto dị na peeji nke 26]

Ọdụ Ụgbọ Mmiri Senkrea

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 25]

Todd Bolen/Bible Places.com