Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“M Maara Nnọọ Ihe Mgbu Ha Na-enwe”

“M Maara Nnọọ Ihe Mgbu Ha Na-enwe”

Bịaruo Chineke Nso

“M Maara Nnọọ Ihe Mgbu Ha Na-enwe”

Ọpụpụ 3:1-10

“NSỌ, nsọ, nsọ ka Jehova . . . dị.” (Aịzaya 6:3) Okwu ndị ahụ e si n’ike mmụọ nsọ dee na-egosi na ọ bụ Jehova Chineke kacha dị ọcha, kachakwa dị nsọ. I nwere ike ịjụ, sị, ‘Ịdị nsọ ya ọ̀ na-eme ka ọ ghara inwe mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ ma ọ bụ na-eze ha eze? Chineke nke dị nsọ otú ahụ ò nwere ike ichewe banyere onye mmehie na-ezughị okè dị ka m?’ Ka anyị tụlee okwu na-agba ume Chineke gwara Mozis, nke dị n’Ọpụpụ 3:1-10.

Otu ụbọchị, ka Mozis na-azụ atụrụ, ọ hụrụ otu ihe tụrụ ya nnọọ n’anya, ya bụ, ọkụ nọ na-enwu n’otu osisi ogwu ma “o reghị osisi ogwu ahụ.” (Amaokwu nke 2) N’ihi otú ihe ahụ si ju ya anya, ọ bịakwuru nso ịchọpụta ihe na-emenụ. Jehova ji otu mmụọ ozi ya gwa Mozis okwu site n’etiti osisi ogwu ahụ, sị: “Abịala nso n’ebe a. Yipụ akpụkpọ ụkwụ gị, n’ihi na ebe i guzo bụ ala nsọ.” (Amaokwu nke 5) Chegodị echiche—ala ahụ ghọrọ ebe dị nsọ n’ihi na o nwere onye nọchiri anya Chineke nọ n’ebe ahụ!

Chineke ahụ dị nsọ nwere ihe mere o ji gwawa Mozis okwu. Chineke sịrị ya: “N’ezie, ahụwo m ahụ́ a na-emekpa ndị m bụ́ ndị nọ n’Ijipt, anụwokwa m mkpu ákwá ha na-eti n’ihi ndị na-amanye ha ịrụ ọrụ; n’ihi na m maara nnọọ ihe mgbu ha na-enwe.” (Amaokwu nke 7) Chineke maara ahụhụ ndị ya na-ata; ọ nụkwara arịrịọ ha. O weere ya na ya so ha na-ata ahụhụ ahụ. Cheta na Chineke sịrị: “M maara nnọọ ihe mgbu ha na-enwe.” Otu akwụkwọ e ji eme nnyocha kwuru banyere okwu ndị ahụ bụ́ “m maara nnọọ,” sị: “Okwu ndị ahụ na-egosi na ihe ahụ metụrụ ya n’obi, nakwa na o nwere ọmịiko.” Ihe Jehova gwara Mozis gosiri na ọ bụ Chineke nke na-echebara nnọọ ndị ya echiche.

Olee ihe Chineke mere? Ihe o mere abụghị naanị imetara ha ebere mgbe ọ hụrụ ihe merenụ ma ọ bụ nweere ha ọmịiko mgbe ọ nụrụ arịrịọ ha. Ihe ndị ọ hụrụ na ihe ndị ọ nụrụ kpaliri ya ime ihe. O kpebiri ịkpọpụta ndị ya n’Ijipt ma kpọga ha “n’ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.” (Amaokwu nke 8) N’ihi ya, Jehova nyere Mozis ọrụ ọ ga-arụ, sị ya: ‘Kpọpụta ndị m n’Ijipt.’ (Amaokwu nke 10) Mozis rubeere Jehova isi ma kpọpụta ụmụ Izrel n’Ijipt n’afọ 1513 Tupu Oge Anyị.

Jehova anaghị agbanwe agbanwe. Obi kwesịrị isi ndị na-efe ya taa ike na ọ na-ahụ ahụhụ ha na-ata ma na-anụ ákwá ha na-ebe maka enyemaka. Ọ maara nnọọ ihe mgbu ha na-enwe. Ma, ihe Jehova na-eme abụghị naanị inwere ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi ọmịiko. Chineke anyị nke na-ahụ n’anya na-enyere ha aka “n’ihi na ihe banyere [ha] na-emetụ ya n’obi.”—1 Pita 5:7.

Ọmịiko Chineke na-eme ka anyị nwee olileanya. N’ihi enyemaka ya, anyị bụ́ ụmụ mmadụ na-ezughị okè nwere ike ịdịtụ nsọ ma na-eme ihe na-atọ ya ụtọ. (1 Pita 1:15, 16) Akụkọ Mozis na osisi ogwu ahụ gbara otu nwaanyị, bụ́ Onye Kraịst nke nkụda mmụọ na obi ịda mba kparala aka ọjọọ, ume ma kasie ya obi. Nwaanyị ahụ kwuru, sị: “Ọ bụrụ na Jehova ga-emeli ka ala nkịtị dị nsọ, m kwesịrịnụ inwetụwa olileanya. Echiche a enyerela m ezigbo aka.”

Ị̀ chọrọ ịmatakwu banyere Chineke ahụ dị nsọ, bụ́ Jehova? Gị na ya nwere ike ịdị n’ezigbo mma, n’ihi na Jehova “maara nnọọ otú e si kpụọ anyị, ọ na-echeta na anyị bụ ájá.”—Abụ Ọma 103:14.