Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Ajọ Ifufe Fere na Myanmar Metụtara Nwetara Enyemaka

Ndị Ajọ Ifufe Fere na Myanmar Metụtara Nwetara Enyemaka

Ndị Ajọ Ifufe Fere na Myanmar Metụtara Nwetara Enyemaka

NA May 2, 2008, ajọ ifufe a na-akpọ Nargis fere na Myanmar, laa ọtụtụ ihe n’iyi, ya aghọọ ihe akụkọ ná mba dị iche iche ozugbo. A kọrọ na mgbe mmiri si n’oké osimiri sọba n’ebe a na-akpọ Irrawaddy Delta, ọ fọrọ ntakịrị ka ndị nwụrụnụ na ndị furunụ bụrụ otu narị puku na puku iri anọ.

Ọ bụ ihe ịtụnanya na ọ dịghị otu n’ime ọtụtụ Ndịàmà Jehova bi n’ebe ahụ ọkọ kọrọ. Ihe kacha nyere ha aka bụ na mgbe ifufe ahụ na-efe, ha gbabara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha a rụsiri ike. N’otu ebe, Ndịàmà iri abụọ na mmadụ iri asatọ ọzọ si n’obodo ahụ nọ n’elu Ụlọ Nzukọ Alaeze ruo awa itoolu ka idei mmiri ahụ toruru mita ise. O nweghị ihe mere onye ọ bụla n’ime ha. Ọ dị mwute na narị mmadụ atọ nwụrụ n’obodo ahụ. N’ọtụtụ obodo n’ebe ahụ, ọ bụ naanị Ụlọ Nzukọ Alaeze bụ ụlọ na-adaghị.

Ụbọchị abụọ ajọ ifufe ahụ fechara, alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Yangon zipụrụ ndị ọrụ enyemaka ka ha gaa n’ọgbakọ dị na Bothingone, n’ụsọ oké osimiri. Ndị ọrụ enyemaka ahụ gafesịrị ebe ifufe ahụ mebisịrị ihe, zere ndị ohi, gafeekwa ozu ndị na-esi ísì ma buru osikapa, nri ndị e ji àkwá mee, mmiri, na kandụl ruo Bothingone. Ọ bụ ha bụ ndị ọrụ enyemaka mbụ rutere n’ebe ahụ. Mgbe ha nyechara Ndịàmà bi n’obodo ahụ ihe ndị ha wetaara ha, ha gwara ha okwu si na Baịbụl iji gbaa ha ume ma nye ha Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, ebe ọ bụ na ajọ ifufe ahụ lara ihe niile ha nwere n’iyi.

Otú Ndịàmà ajọ ifufe ahụ mebisịrị ihe ha si lee ihe ahụ merenụ anya magburu nnọọ onwe ya. Otu Onyeàmà nọ n’ọgbakọ dị n’Irrawaddy, bụ́ ebe ifufe ahụ mebisịrị ihe, kwuru, sị: “Ihe niile anyị nwere emebisiela. Ụlọ anyị niile adakasịala. Ihe niile anyị kụrụ n’ubi alaala n’iyi. Idei mmiri emebisiela mmiri niile anyị na-aṅụ aṅụ. Ma, ọ naghị ewute ụmụnna anyị otú o si ewute ndị ọzọ. Ha tụkwasịrị Jehova na nzukọ ya obi. Anyị ga-eme ihe ọ bụla a gwara anyị mee ma ànyị ka ga-anọ n’obodo a ma ànyị ga-akwaga ebe ọzọ.”

Ndịàmà iri atọ, ndị ihe niile ha nwere mebichara, ji obi ụtọ bụọ abụ Alaeze ha ruo awa iri o were ha iru ebe ndị ọrụ enyemaka rụụrụ ha ebe ha ga-ebi ma debere ha nri na uwe ha wetaara ha. Tupu ha eruo ebe ha na-aga, ha nụrụ na Ndịàmà Jehova na-enwe mgbakọ abalị abụọ ha n’obodo dị nso n’ebe ahụ. Ha kpebiri ịgagodị mgbakọ ahụ nụrụ Okwu Chineke ma soro Ndị Kraịst ibe ha kpakọrịta.

N’ebe niile ahụ ajọ ifufe ahụ fere, ụlọ iri atọ na ise nke Ndịàmà mebisịrị, otu narị na iri abụọ na ise emebitụ, obere ihe emebiekwa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze asatọ. Ekele dịrị Chineke na e nweghị ezigbo ihe mere alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị n’obodo ahụ mmiri gbara gburugburu.

Mgbe ajọ ifufe ahụ malitere, o nweghị otú mmadụ si aba ma ọ bụ apụ n’alaka ụlọ ọrụ ahụ n’ihi na nnukwu osisi dachisiri ụzọ ndị dị nso n’ebe ahụ. Awa ole na ole ifufe ahụ fechara, ihe karịrị mmadụ iri atọ ná ndị na-arụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ ahụ gara jiri aka bupụsịa osisi ndị ahụ. Ka ha na-arụ ọrụ ahụ, o juru ndị nọ n’ebe ahụ anya. N’oge na-adịghị anya, ụmụ nwaanyị Ndịàmà buteere ndị ọrụ ahụ ihe ọṅụṅụ jụrụ oyi na mkpụrụ osisi a ka ghọrọ aghọ, ha nyetụkwara ndị agbata obi ha ọrụ ahụ a na-arụ juru anya. Mgbe otu onye nta akụkọ hụrụ ihe na-emenụ, ọ jụrụ, sị, “Ole ndị bụ ndị a na-arụ ọrụ ka ndanda?” Mgbe a gwara ya ndị ha bụ, o kwuru, sị, “Ọ dị m nnọọ ka ya bụrụ na ndị ọzọ nwere mmụọ inyere ibe ha aka otú Ndịàmà Jehova nwere!”

Ozugbo ahụ, Ndịàmà hiwere kọmitii abụọ n’ebe abụọ ná mba ahụ iji lebara nsogbu ahụ anya ma kesaa ihe ndị e nyere n’onyinye iji nyere ndị ọdachi ahụ metụtara aka. Ọtụtụ narị Ndịàmà wepụtara onwe ha iso rụọ ọrụ enyemaka ahụ. N’ụbọchị ole na ole, a rụụrụ Ndịàmà ndị ụlọ ha dara ụlọ ọhụrụ. Mgbe otu n’ime ìgwè ndị ahụ na-arụ ụlọ bịara ịrụrụ otu Onyeàmà ụlọ, o juru nnọọ ndị agbata obi ya anya. Otu n’ime ha sịrị: “Ndị chọọchị nwaanyị Onyeàmà a na-arụziri ya ụlọ ya. Ọ dịghị otu n’ime ndị Buddha ibe m bịara nyere m aka. A sịkwa na m ma, m gaara aghọ Onyeàmà mgbe o ziri m ozi ọma!”

Mgbe ndị ahụ na-arụzi ụlọ na ndị kọmitii enyemaka ahụ bịara Thanlyn ile otu ụlọ fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ na ifufe mebichara ya, akpata oyi wụrụ ha n’ahụ́ mgbe ezinụlọ Ndịàmà nwe ụlọ ahụ gwara ha, sị: “O nweghị ihe mere ụlọ anyị. Ụlọ anyị dị mma. Anyị ka nwere ike ibi na ya, nsogbu adịghị! Ụfọdụ Ndịàmà enwedịghị ụlọ. Gaanụ nyere ha aka!”

N’otu ebe na Yangon, ụfọdụ ndị gbaara ọsọ ndụ gbaga n’otu ụlọ chọọchị. Ma, a kpọchiri ụlọ chọọchị ahụ akpọchi, e nweghịkwa onye banyeliri n’ime ya. Ezigbo iwe were ndị mmadụ, ha achọọ ịgbaka ọnụ ụzọ ụlọ chọọchị ahụ. Ma, Ndịàmà Jehova nyeere ọtụtụ ndị aka ịgbaba n’Ụlọ Nzukọ Alaeze mgbe ajọ ifufe ahụ na-efe. Dị ka ihe atụ, n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze dị na Dala, otu di na nwunye bụ́ Ndịàmà kpọbatara ndị agbata obi ha iri abụọ gbatara ọsọ ndụ n’ebe ahụ. N’ụtụtụ echi ya, ndị ahụ enweghịzi ụlọ ha ga-alaghachi, agụụ nọkwa na-agụ ha. Nke nwoke hụrụ onye na-ere osikapa ma zụta nke ga-ezuru mmadụ niile ahụ.

N’otu ezinụlọ bi na Yangon, e nwere ma Ndịàmà Jehova ma ndị na-aga chọọchị ndị ọzọ. Mgbe ajọ ifufe ahụ fechara, ezinụlọ ahụ dum bịara ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ̀ bụ maka gịnị? Otu n’ime ha kwuru, sị: “Ndị chọọchị anyị sịrị na ha ga-abịa hụ anyị mgbe ajọ ifufe ahụ fechara, ma ọ dịghị onye anyị hụrụ. Ọ bụ naanị Ndịàmà bịara. Unu nyere anyị osikapa na mmiri. Unu dị iche ná ndị chọọchị ọzọ!” Ụlọ Nche a mụrụ n’ụbọchị ahụ, nke isiokwu ya bụ, “Jehova Na-anụ Mkpu Enyemaka Anyị Na-eti,” tọrọ ndị na-abụghị Ndịàmà n’ezinụlọ ahụ ụtọ, ha zakwara ọtụtụ ajụjụ mgbe a na-amụ ya.

N’izu sochiri izu ahụ ajọ ifufe ahụ fere, otu nwaada ya na Ndịàmà na-amụ Baịbụl bịara ọmụmụ ihe. N’ọmụmụ ihe ahụ, a gụrụ akwụkwọ ozi alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova zitere, nke kwuru ihe e merela iji nye aka, kwuokwa ihe ndị ajọ ifufe ahụ metụtara kọrọ. Mgbe a na-agụ akwụkwọ ozi ahụ, nwaada ahụ bewere ákwá. Obi tọrọ ya ezigbo ụtọ mgbe ọ nụrụ na a chọtara Ndịàmà niile nakwa na o nweghị onye merụrụ ahụ́ n’ime ha. Mgbe a gbasara, e nyere ya ụfọdụ ihe ndị e wetaara Ndịàmà, wuokwara ya ụlọikwuu n’akụkụ ụlọ ya. O kwuru na ọ dị ya nnọọ ka Ndịàmà hà egboorola ya mkpa ya niile.

Jizọs kwuru, sị: “Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:35) Jems, onye na-eso ụzọ Jizọs, kwukwara hoo haa na onye nwere ezigbo okwukwe na-eji ọrụ ọma ya egosi ya. (Jems 2:14-17) Ndịàmà Jehova anaghị eji ịrụ ọrụ ọma egwuri egwu, ha na-agbalịkwa igosi ụdị ịhụnanya ahụ site n’inyere ndị nọ ná mkpa aka.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 11]

Baịbụl kwuru na onye nwere ezigbo okwukwe na-eji ọrụ ọma ya egosi ya