Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Oge M Erubeghị”

“Oge M Erubeghị”

“Oge M Erubeghị”

Ọkwọ ụgbọala nke kwọ otu nnukwu gwongworo e ji ebu ihe e kpofuru ekpofu ejitelighị ụgbọala ya. Gwongworo ahụ hapụrụ okporo ụzọ gaa kụtuo otu di na nwunye na otu nwa okorobịa dị afọ iri abụọ na atọ, bụ́ ndị nọ na-agara onwe ha n’akụkụ ụzọ. Otu akwụkwọ akụkọ a na-ebi na New York City kọrọ na di na nwunye ahụ nwụrụ ozugbo, nwa okorobịa ahụ atụbọọkwa. Mgbe nwa okorobịa ahụ tetara ma ghọta ihe merenụ, ihe mbụ batara ya n’obi bụ: ‘Ihe a emeghị eme. Chineke, biko, nyere m aka ka m nweta onwe m.’ O kwuziri, sị, “Oge m erubeghị.”

Ọ GA-ABỤ na ị nụtụla ụdị akụkọ ahụ. Ọ bụrụ na ọ fọrọ obere ka ọdachi gbuo mmadụ, ndị mmadụ na-ekwu, sị, ‘Oge ya erubeghị.’ Ma, ọ bụrụ na mmadụ anwụọ n’ihe mberede ọ na-ekwesịghị ịnwụ, ndị mmadụ na-asị, ‘Oge ya eruola,’ ma ọ bụkwanụ ha asị, ‘Ọ bụ uche Chineke.’ Ma hà sịrị na o si n’aka Chineke ma hà sịrị na ọ bụ akara aka onye ahụ, ma ọ bụkwanụ na onye ahụ nwere ihu ọma, ihe ha na-ekwu bụ otu ihe. Ọtụtụ ndị kweere na ihe ndị na-eme ná ndụ ha si n’akara aka nakwa na ha agaghị agbanweli ha. Ọ bụghị naanị mgbe mmadụ nwụrụ ma ọ bụ mgbe mmadụ nwere ihe mberede ka ndị mmadụ na-eche otú ahụ; ọ malitekwaghị n’oge anyị a.

Dị ka ihe atụ, ndị Babịlọn oge ochie kweere na kpakpando na otú ha si aga na-ekpebi ihe ndị na-eme ná ndụ mmadụ. N’ihi ya, ha na-ele anya n’eluigwe iji nweta ihe àmà na ihe mgbaàmà ga na-eduzi ha. Ndị Gris na ndị Rom fere ọtụtụ chi nwaanyị akara aka, bụ́ ndị ikike ha nwere ime ka mmadụ nwee ihu ọma ma ọ bụ ihu ọjọọ na-eyi mgbe ụfọdụ ka ọ̀ karịdịrị nke nnukwu chi ha, bụ́ Zus na Jupita.

Ná mba ndị dị n’Eshia, ndị Hindu na ndị Buddha kweere na ihe na-eme mmadụ ugbu a bụ n’ihi ihe onye ahụ metara n’ụwa mbụ ya, nakwa na ihe o metara ugbu a ga-ekpebi ihe ga-eme ya n’ụwa ya ọzọ. Okpukpe ndị ọzọ, ma ndị ụka, kweere n’ozizi akara aka n’ihi na ha na-akụzi na Chineke akaala ihe niile ga-eme ụmụ mmadụ akaa.

N’ihi ya, ọ bụghị ihe ijuanya na ọbụna n’oge anyị a a sịrị na ndị mmadụ emepeela anya, ọtụtụ ndị ka kweere na a kaala otú ndụ ha ga-adị, ihe ndị ga-eme ha kwa ụbọchị, na ihe ọdịnihu ha ga-abụ akaa, nakwa na ha agaghị agbanweli ha. Ì chere otú ahụ? Ọ̀ bụ eziokwu na a kaala ihe ndị na-eme mmadụ ná ndụ akaa, ma ihe ọ̀ ga-agara ya nke ọma ma ọ bụ na ọ gaghị agara ya, ma ọmụmụ ya ma ọnwụ ya? Ihe ndị na-eme ná ndụ gị hà si n’akara aka? Ka anyị hụ otú Baịbụl ga-esi enyere anyị aka ịza ajụjụ ndị a.

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 3]

Ken Murray/New York Daily News