Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú E Si Kpọlite Lazarọs n’Ọnwụ

Otú E Si Kpọlite Lazarọs n’Ọnwụ

Maka Ndị Na-eto Eto

Otú E Si Kpọlite Lazarọs n’Ọnwụ

Otú ị ga-esi mee ya: Nọrọ n’ebe ụzụ na-adịghị mee ihe omume a. Mgbe ị na-agụ ebe ndị ahụ a chọrọ ka ị gụọ n’Akwụkwọ Nsọ, were ya na ị nọ mgbe ihe ahụ ị na-agụ mere. Jiri uche gị kirie ebe ọ na-eme. Nụrụ ihe ndị nọ n’ebe ahụ na-ekwu. Gbalịa ka ị ghọta otú obi dị ndị ị na-agụ akụkọ ha.

CHEBARA OTÚ IHE A SI MEE ECHICHE.—GỤỌ JỌN 11:1-45.

Mgbe ị gụrụ amaokwu nke 21, olee otú i chere obi dị Mata, oleekwa otú i chere obi dị Meri mgbe ị gụrụ amaokwu nke 32?

․․․․․

A sị na ị nọ mgbe ihe e kwuru n’amaokwu nke 33 na nke 35 mere, olee otú ị ga-esi akọwa otú obi dị Jizọs?

․․․․․

Gbalịa chee echiche otú obi dị Lazarọs mgbe ihe ahụ e dere n’amaokwu nke 43 na nke 44 mere nakwa otú obi dị ndị ọzọ nọ n’ebe ahụ.

LEBAKWUO YA ANYA.

Ọ ga-ewe Jizọs abalị abụọ isi n’ebe ọ nọ ruo Betani. Ya bụrụ otú ahụ, gịnị mere Jizọs agawaghị ozugbo? (Gụghachi amaokwu nke 6.)

․․․․․

Olee otú Baịbụl si gosi na Meri na Mata ji ife Chineke kpọrọ ihe? (Luk 10:38, 39; Jọn 11:24)

․․․․․

Gịnị mere Jizọs ji kpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ n’agbanyeghị na ha ga-anwụ ọzọ? (Mak 1:41, 42; Jọn 5:28, 29; 11:45)

․․․․․

MEE IHE Ị MỤTARA. DEE IHE Ị MỤTARA BANYERE . . .

Ikike na mmasị Jizọs nwere ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ.

․․․․․

Otú Jizọs nweruru ọmịiko n’ebe ndị na-eru uju nọ.

․․․․․

OLEE ONYE Ị GA-ACHỌ ỊHỤ N’OGE A GA-AKPỌLITE NDỊ MMADỤ N’ỌNWỤ?

․․․․․

OLEE IHE KACHA BAARA GỊ URU N’AKỤKỌ A? Ọ̀ BỤ MAKA GỊNỊ?

․․․․․