Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Bụ Mmadụ Ga-ekpebi Ma À Ga-amụ Ya Ọzọ?

Ọ̀ Bụ Mmadụ Ga-ekpebi Ma À Ga-amụ Ya Ọzọ?

Ọ̀ Bụ Mmadụ Ga-ekpebi Ma À Ga-amụ Ya Ọzọ?

ÒNYE na-eme ka a mụọ mmadụ ọzọ? Mgbe ndị ụkọchukwu ụfọdụ na-agba ndị na-ege ha ntị ume ka ha ghọọ Ndị Kraịst a mụrụ ọzọ, ha na-ekwu ihe a Jizọs kwuru: “A ghaghị ịmụ unu ọzọ.” (Jọn 3:7) Ndị ụkọchukwu ahụ na-ekwu ya ka ọ̀ bụ iwu, ka à ga-asị na ha na-asị ndị ahụ, “Bụrụnụ ndị a mụrụ ọzọ!” Ha na-esi otú ahụ akụzi na ọ bụ Onye Kraịst nke ọ bụla ga-ekpebi ma ọ̀ ga-erubere Jizọs isi ma mee ihe ndị o kwesịrị ime ka a mụọ ya ọzọ. Ihe ha na-ekwu bụ na ọ bụ mmadụ ga-ahọrọ ma à ga-amụ ya ọzọ. Ma, ihe a ha na-ekwu ọ̀ dabara n’ihe Jizọs gwara Nikọdimọs?

Ọ bụrụ na anyị agụọ ihe ahụ Jizọs kwuru nke ọma, anyị ga-aghọta na Jizọs akụzighị na ọ bụ mmadụ ga-ahọrọ ma à ga-amụ ya ọzọ ma ọ bụ na a gaghị amụ ya. Gịnị mere anyị ji kwuo otú a? Okwu Grik a sụgharịrị ‘ịmụ ọzọ’ nwekwara ike ịbụ “isi n’elu mụọ mmadụ.” * Ya mere, ụzọ nke abụọ a e nwere ike isi sụgharịa ya gosiri na ịmụ mmadụ ọzọ ‘na-esi n’elu,’ ya bụ, ọ ‘na-esi n’eluigwe,’ ma ọ bụ “n’aka Nna” anyị. (Jọn 19:11; Jems 1:17) N’eziokwu, ọ bụ Chineke na-eme ka a mụọ mmadụ ọzọ.—1 Jọn 3:9.

Ọ bụrụ na anyị eburu okwu ahụ bụ́ “isi n’elu” n’uche, ọ gaghị esiri anyị ike ịghọta ihe mere o ji bụrụ na mmadụ enweghị ike ime ka a mụọ ya ọzọ. Chegodị echiche otú e si mụọ gị. Ọ̀ bụ gị kpebiri ka a mụọ gị? Mbanụ! A mụrụ gị maka na nna gị tụrụ ime gị. N’otu aka ahụ, ihe ga-eme ka a mụọ anyị ọzọ bụ naanị ma ọ bụrụ na Chineke, bụ́ Nna anyị nke eluigwe, emee ka a mụọ anyị ọzọ. (Jọn 1:13) Ọ bụ ya mere o ji bụrụ na ihe Pita onyeozi kwuru ziri ezi. Ọ sịrị: “Ka Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst bụrụ onye a gọziri agọzi, n’ihi na dị ka ebere ya si dị ukwuu, ọ mụrụ anyị ọzọ.”—1 Pita 1:3.

Ọ̀ Bụ Iwu?

Ma, ụfọdụ ndị nwere ike ịjụ, sị, ‘Ọ bụrụ eziokwu na ọ bụghị mmadụ ga-ekpebi ma à ga-amụ ya ọzọ, gịnị mere Jizọs ji nye iwu, sị: “A ghaghị ịmụ unu ọzọ”?’ Ihe a bụ ezigbo ajụjụ, n’ihi na ọ bụrụ n’ezie na ọ bụ iwu ka Jizọs nyere, ọ pụtara na o nyere anyị iwu ka anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli. Jizọs agaghị enye ụdị iwu ahụ. Ya bụrụ otú ahụ, olee otú anyị kwesịrị isi ghọta okwu ahụ bụ́ na a ghaghị “ịmụ unu ọzọ”?

Ọ bụrụ na anyị eleruo ya anya n’asụsụ mbụ e ji dee ya, anyị ga-achọpụta na ọ bụghị iwu ka Jizọs nyere. Kama nke ahụ, ọ bụ okwu nkịtị ka o kwuru. E kwuo ya n’ụzọ ọzọ, mgbe Jizọs kwuru na a ghaghị “ịmụ unu ọzọ,” ọ na-ekwu otú ihe dị, ọ naghị enye iwu. Ọ sịrị: “Ọ dị mkpa ka e si n’elu mụọ unu.”—Jọn 3:7, Baịbụl Modern Young’s Literal Translation.

Iji ghọta ọdịiche dị n’iwu na n’okwu, chebara ihe atụ a echiche. Ka e were ya na otu obodo nwere ụlọ akwụkwọ dị iche iche. Otu n’ime ha bụ ụlọ akwụkwọ e wuru maka naanị ụmụ amaala obodo ahụ ndị bi n’ebe dị anya. Otu ụbọchị, otu nwa okorobịa na-abụghị nwa amaala obodo ahụ gakwuuru onyeisi ụlọ akwụkwọ ahụ, gwa ya, sị, “Achọrọ m ịbata n’ụlọ akwụkwọ unu.” Onyeisi ụlọ akwụkwọ ahụ asị ya, “Ị chọọ ịbata n’ụlọ akwụkwọ anyị, ị ghaghị ịbụ nwa amaala obodo anyị.” O doro anya na ọ bụghị iwu ka onyeisi ụlọ akwụkwọ ahụ nyere nwa okorobịa ahụ. O nyeghị ya iwu, sị, “Bụrụ nwa amaala obodo anyị!” Kama, ihe ọ gwara ya bụ, “Ị ga-abata n’ụlọ akwụkwọ anyị ma ọ bụrụ na ị bụ nwa amaala obodo anyị.” Ihe onyeisi ụlọ akwụkwọ ahụ mere bụ naanị ikwu otú ihe dị, ya bụ, otú mmadụ ga-esi bụrụ nwa akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ. N’otu aka ahụ, mgbe Jizọs sịrị: “A ghaghị ịmụ unu ọzọ,” ihe ọ na-ekwu bụ naanị otú ihe dị, ya bụ, otú mmadụ ga-esi ‘banye n’Alaeze Chineke.’

Alaeze Chineke a o kwuru okwu ya bụ ihe ọzọ dị mkpa n’okwu ịmụ mmadụ ọzọ a. Ọ gbasara ajụjụ ahụ bụ́, Gịnị mere e ji amụ mmadụ ọzọ? Ịmata azịza ajụjụ ahụ ga-enyere mmadụ aka ịghọta nke ọma ihe ịmụ mmadụ ọzọ pụtara.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ọ bụ otú a ka Baịbụl dị iche iche si sụgharịa Jọn 3:3. Dị ka ihe atụ, Baịbụl bụ́ A Literal Translation of the Bible na-agụ, sị: “Ọ bụrụ na e sighị n’elu mmụọ mmadụ, ọ gaghị enwe ike ịhụ alaeze Chineke.”

[Foto dị na peeji nke 6]

Olee otú ịmụ mmadụ ọzọ na ịmụ nwa ọhụrụ si yie?