Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ò Nwere Okpukpe Chineke Weere Ka Ezi Okpukpe?

Ò Nwere Okpukpe Chineke Weere Ka Ezi Okpukpe?

Okwu Pụrụ Iche A Ga-agwa Ọha na Eze

Ò Nwere Okpukpe Chineke Weere Ka Ezi Okpukpe?

Ọtụtụ ndị na-ekpe okpukpe nne na nna ha na-ekpe mgbe a mụrụ ha. Ndị ọzọ na-ahọrọ okpukpe ha ga-ekpe mgbe ha toro. N’eziokwu, e nwere ọtụtụ okpukpe mmadụ nwere ike isi na ha họrọ nke ọ chọrọ ikpe. O nwere ike ịbụ na i chetụla, sị, ‘Okpukpe mmadụ na-ekpe ò nwere ihe o mere?’

A ga-aza ajụjụ ahụ n’okwu a ga-agwa ọha na eze nke isiokwu ya bụ, “Ò Nwere Okpukpe Chineke Weere Ka Ezi Okpukpe?” A ga-ekwu okwu a si na Baịbụl n’ụwa niile n’ihe karịrị narị mba abụọ na iri atọ. N’ọtụtụ ebe, a ga-anọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova kwuo ya na Sunday, April 26, 2009. Ndịàmà bi gị nso ga-enwe mmasị ịgwa gị ebe a ga-anọ ekwu ya na oge ọ ga-abụ. Anyị ji obi ụtọ na-akpọ gị òkù ka ị bịa.