Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụfọdụ Ga-aghọ Ndị Ọchịchị, Ọtụtụ Ndị Erite Uru

Ụfọdụ Ga-aghọ Ndị Ọchịchị, Ọtụtụ Ndị Erite Uru

Ụfọdụ Ga-aghọ Ndị Ọchịchị, Ọtụtụ Ndị Erite Uru

KEMGBE oge ndịozi Jizọs, Chineke si n’etiti ụmụ mmadụ na-ahọrọ Ndị Kraịst ole na ole kwesịrị ntụkwasị obi, na-eme ka ha bụrụ ụmụ ya. Mgbanwe ndị ahụ e doro ịbụ ụmụ Chineke na-enwe ná ndụ ha zuru nnọọ ezu nke na Okwu Chineke kwuru na a mụrụ ha ọzọ. Ihe mere e ji mụọ ndị ohu Chineke ahụ ọzọ bụ ka ha nwee ike ịghọ ndị ọchịchị n’eluigwe. (2 Timoti 2:12) Iji mee ka ha ghọọ ndị ọchịchị, a na-akpọlite ha n’ọnwụ, ha adịrị ndụ n’eluigwe. (Ndị Rom 6:3-5) Ha na Kraịst ga-anọ n’eluigwe ‘chịa ụwa dị ka ndị eze.’—Mkpughe 5:10; 11:15.

Ma, Okwu Chineke kwukwara na ndị ọzọ, ma e wezụga ndị ahụ a mụrụ ọzọ, ga-enweta nzọpụta ebighị ebi. Na Baịbụl (n’Akwụkwọ Nsọ Hibru nakwa n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst), e kwuru na Chineke zubere ịzọpụta ìgwè ụmụ mmadụ abụọ. Otu bụ obere ìgwè mmadụ ndị ga-achị achị n’eluigwe, nke ọzọ abụrụ oké ìgwè mmadụ ndị ga-adị ndụ n’ụwa. Dị ka ihe atụ, lee ihe Jọn onyeozi degaara ndị kwere ekwe ibe ya a mụrụla ọzọ. O kwuru banyere Jizọs, sị: “Ọ bụ àjà ime udo maka mmehie anyị, ma ọ bụghị naanị maka mmehie anyị [ya bụ, obere ìgwè mmadụ ahụ], kama, ọ bụkwa maka mmehie nke ụwa dum [ya bụ, oké ìgwè mmadụ ahụ].”—1 Jọn 2:2.

Pọl onyeozi dekwara, sị: “Ịtụsi anya ike nke ihe e kere eke [ya bụ, oké ìgwè mmadụ ahụ] na-echere mkpughe nke ụmụ Chineke [ya bụ, obere ìgwè mmadụ ahụ].” (Ndị Rom 8:19-21) Olee otú anyị kwesịrị isi ghọta ihe ndị a Jọn onyeozi na Pọl onyeozi kwuru? Lee otú anyị kwesịrị isi ghọta ha: Ndị ahụ a mụrụ ọzọ ga-eso ná ndị ga-achị n’eluigwe. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ iji mee ka ọtụtụ nde mmadụ ga-ebi n’ụwa, bụ́ ndị ọchịchị Chineke ga-achị, rite uru ga-adịru ebighị ebi. Ọ bụ ya mere Jizọs ji kụziere ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere, sị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.”Matiu 6:10.

Akwụkwọ Nsọ Hibru kwukwara na a ga-azọpụta ìgwè ụmụ mmadụ abụọ. Dị ka ihe atụ, lee ihe Jehova gwara Ebreham, nna nna Jizọs. Ọ sịrị ya: “Ọ bụkwa site ná mkpụrụ gị [ya bụ, obere ìgwè mmadụ ahụ] ka mba niile nke ụwa [ya bụ, oké ìgwè mmadụ ahụ] ga-agọzi onwe ha n’ihi na i gewo ntị n’olu m.” (Jenesis 22:18) N’ezie, a ga-agọzi mba niile site ná “mkpụrụ” Ebreham.

Ònye bụ “mkpụrụ” ahụ? Ọ bụ Jizọs Kraịst nakwa ndị ahụ a mụrụ ọzọ, ndị Chineke doro ịbụ ụmụ ya, ga-esonyere ya. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ọ bụrụkwa na unu bụ ndị nke Kraịst, unu bụ n’ezie mkpụrụ Ebreham.” (Ndị Galeshia 3:16, 29) Oleekwanụ ngọzi ndị nke mba niile ga-enweta site ná “mkpụrụ” ahụ? Ọ bụ ohere magburu onwe ya nke ịbụ ndị e mere ka ha na Chineke dịrị ná mma na ịdị ndụ ebighị ebi na paradaịs n’ụwa. Ọbụ abụ bụ́ Devid buru amụma, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:29; Aịzaya 45:18; Mkpughe 21:1-5.

N’eziokwu, ọ bụ mmadụ ole na ole nwere ohere ịchị n’eluigwe, ma, uru ọchịchị eluigwe ahụ ga-eweta, nke bụ́ ndụ ebighị ebi n’elu ụwa na ngọzi niile ga-eso ya, ga-eru ọtụtụ ndị aka. Ka gị na ezinụlọ gị soro ná ndị ga-erite uru ebighị ebi ahụ Alaeze Chineke ga-eweta.

[Foto dị na peeji nke 12]

Ngọzi ọtụtụ nde mmadụ ga-enweta bụ ndụ ebighị ebi n’elu ụwa. Ị̀ ga-eso nweta ya?