Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ihe Ịmụ Mmadụ Ọzọ Ga-arụzu?

Olee Ihe Ịmụ Mmadụ Ọzọ Ga-arụzu?

Olee Ihe Ịmụ Mmadụ Ọzọ Ga-arụzu?

GỊNỊ mere Jizọs ji kwuo na a ‘ga-amụ mmadụ site na mmụọ nsọ’ mgbe ọ na-ekwu banyere iji mmụọ nsọ mee mmadụ baptizim? (Jọn 3:5) Mgbe ụfọdụ, okwu bụ́ ‘ịmụ’ na-apụta “mmalite.” N’ihi ya, ‘ịmụ ọzọ’ na-egosi “mmalite ọhụrụ.” Ya mere, ‘ịmụ’ na ‘ịmụ ọzọ’ na-egosi nke ọma na ndị e ji mmụọ nsọ mee baptizim na Chineke ga-amalite inwe mmekọrịta ọhụrụ. Olee otú mmekọrịta ọhụrụ ahụ si amalite?

Pọl onyeozi ji ihe atụ metụtara ezinụlọ kọwaa otú Chineke si akwadebe ụmụ mmadụ ka ha soro chịa n’eluigwe. O degaara Ndị Kraịst nọ n’oge ya akwụkwọ ozi, gwa ha na ha ga-aghọ “ndị e doro ịbụ ụmụ,” nakwa na nke a ga-eme ka Chineke na-emeso ha “dị ka ụmụ.” (Ndị Galeshia 4:5; Ndị Hibru 12:7) Iji hụ otú ihe atụ nke ime ka mmadụ ghọọ nwa onye ọzọ ga-esi nyere anyị aka ịghọta ụdị mgbanwe a na-enwe ná ndụ onye e ji mmụọ nsọ mee baptizim, ka anyị lebaghachi anya n’ihe atụ nwa okorobịa ahụ chọrọ ịbanye n’ụlọ akwụkwọ e wuru maka naanị ụmụ akwụkwọ ndị bụ́ ụmụ amaala.

Otú Ndụ Ndị E Mere Ka Ha Ghọọ Ụmụ Si Agbanwe

N’ihe atụ ahụ, nwa okorobịa ahụ enweghị ike ịbanye n’ụlọ akwụkwọ ahụ maka na ọ bụghị nwa amaala obodo ahụ. Ka e were ya na otu ụbọchị e nwere nnukwu mgbanwe ná ndụ nwa okorobịa ahụ. Otu nwoke bụ́ nwa amaala obodo ahụ mere ya nwa ya otú iwu obodo ahụ kwuru. Olee otú nke a ga-esi emetụta nwa okorobịa ahụ? Ebe ọ bụ na nwoke ahụ emeela ya nwa ya, ihe niile ruuru ndị ntorobịa ndị ọzọ bụ́ ụmụ amaala obodo ahụ rukwaara ya, ma ịbanye n’ụlọ akwụkwọ ahụ. Ihe ndị ọ ga-enwe ike ime agbanweela kpamkpam.

Ihe atụ a na-egosi ihe na-eme ndị a mụrụ ọzọ, ma, ọ na-eme n’ụzọ dị ukwuu karịa otú o mere nwa okorobịa ahụ. Ka anyị tụlee ụzọ ụfọdụ ọnọdụ ha na ọnọdụ nwa okorobịa ahụ si yie. Naanị ihe ga-eme ka nwa okorobịa ahụ banye n’ụlọ akwụkwọ ahụ bụ ma ọ bụrụ na o ruru ihe a chọrọ n’aka ndị na-abanye n’ụlọ akwụkwọ ahụ, ya bụ, ma ọ bụrụ na ọ bụ nwa amaala obodo ahụ. Ma, ọ gaghị enwe ike iru ihe ahụ a chọrọ n’onwe ya. N’otu aka ahụ, ụfọdụ ụmụ mmadụ ga-aghọ ndị ọchịchị n’Alaeze Chineke, ma ọ bụ n’ọchịchị eluigwe, naanị ma ọ bụrụ na ha ruru ihe a chọrọ n’aka ndị ga-eso chịa, ya bụ, ma ọ bụrụ na ‘a mụrụ ha ọzọ.’ Ma, ha enweghị ike iru ihe ahụ a chọrọ n’onwe ha n’ihi na ịmụ mmadụ ọzọ dị n’aka Chineke.

Olee ihe gbanwere ọnọdụ nwa okorobịa ahụ? Ọ bụ ihe ahụ iwu kwadoro e mere, nke bụ́ ime ka ọ ghọọ nwa nwoke ahụ. Ma, ihe ahụ e mere emeghị ka nwa okorobịa ahụ ghara ịbụkwa onye ọ bụ. Mgbe ọ ghọchara nwa nwoke ahụ, ọ ka bụ otu onye ahụ ọ bụ. N’agbanyeghị ya, mgbe e mezuru ihe niile iwu chọrọ ka e mee iji mee ka ọ ghọọ nwa nwoke ahụ, ọnọdụ ya gbanwere. N’ezie, e nwere ike ịsị na ọ malitela ndụ ọhụrụ, dị ka à ga-asị na a mụrụ ya ọzọ. Ọ ghọrọ nwa nwoke ahụ, bụ́ nke mere o ji ruo eruo ịga ụlọ akwụkwọ ahụ na isonye n’ezinụlọ nna ọhụrụ ya.

N’otu aka ahụ, Jehova gbanwere ọnọdụ ìgwè ụmụ mmadụ na-ezughị okè site n’ime ihe iwu kwadoro iji mee ka ha bụrụ ụmụ ya. Pọl onyeozi, bụ́ onye so n’ìgwè ahụ, degaara ndị kwere ekwe ibe ya akwụkwọ ozi, sị: “Unu natara mmụọ nke ịbụ ndị e doro dị ka ụmụ, bụ́ mmụọ nke anyị sitere na ya na-eti mkpu, sị: ‘Aba, Nna!’ Mmụọ nsọ n’onwe ya so mmụọ anyị na-agba àmà na anyị bụ ụmụ Chineke.” (Ndị Rom 8:15, 16) N’ezie, e sitere n’ido Ndị Kraịst ahụ dị ka ụmụ mee ka ha ghọọ ndị ezinụlọ Chineke, ma ọ bụ “ụmụ Chineke.”—1 Jọn 3:1; 2 Ndị Kọrịnt 6:18.

Odido ahụ Chineke doro ha ịbụ ụmụ ya emeghị ka ha ghara ịbụkwa ndị ha bụ, n’ihi na ha ka bụ ndị na-ezughị okè. (1 Jọn 1:8) Ma, dị ka Pọl kwukwara, mgbe e mezuru ihe iwu chọrọ ka e mee iji doo ha dị ka ụmụ, ọnọdụ ha gbanwere. Mmụọ Chineke mekwara ka o doo ndị ahụ ghọrọ ụmụ Chineke anya na ha na Kraịst ga-ebi n’eluigwe. (1 Jọn 3:2) Ihe a mmụọ nsọ mere ka o doo ha anya nke ọma mere ka ndụ ha gbanwee. (2 Ndị Kọrịnt 1:21, 22) N’ezie, ha malitere ndụ ọhụrụ, ya bụ, e kwuo ya n’ụzọ ọzọ, a mụrụ ha ọzọ.

Baịbụl kwuru banyere ndị ahụ Chineke doro dị ka ụmụ ya, sị: “Ha ga-abụ ndị nchụàjà nke Chineke na nke Kraịst, ha ga-esokwa ya chịa dị ka ndị eze ruo otu puku afọ.” (Mkpughe 20:6) Ndị ahụ Chineke doro dị ka ụmụ ya na Kraịst ga-aghọ ndị eze n’Alaeze Chineke, ma ọ bụ n’Alaeze eluigwe. Pita onyeozi gwara ndị kwere ekwe ibe ya na ha ga-enweta “ihe nketa a na-apụghị ibibi ebibi, nke a na-emerụghị emerụ, nke na-adịghịkwa emebi emebi” bụ́ nke ‘e debeere ha n’eluigwe.’ (1 Pita 1:3, 4) N’ezie, ọ bụ ihe nketa magburu onwe ya!

Ma, e nwere ajụjụ ọzọ e kwesịrị ịza banyere ọchịchị ahụ. Ọ bụrụ na ndị ahụ a mụrụ ọzọ ga-aghọ ndị eze n’eluigwe, oleekwanụ ndị ha ga-achị? A ga-eleba anya n’ajụjụ a n’isiokwu na-esonụ.

[Foto dị na peeji nke 10]

Gịnị ka Pọl kwuru banyere ime ka ndị mmadụ ghọọ ụmụ Chineke?