Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú E Si Amụ Mmadụ Ọzọ?

Olee Otú E Si Amụ Mmadụ Ọzọ?

Olee Otú E Si Amụ Mmadụ Ọzọ?

IHE Jizọs gwara Nikọdimọs abụghị naanị ihe mere ịmụ mmadụ ọzọ ji dị mkpa, onye na-eme ka a mụọ mmadụ ọzọ, na ihe mere e ji amụ mmadụ ọzọ, kama, ọ gwakwara ya otú e si amụ mmadụ ọzọ. Jizọs sịrị: “Ọ bụrụ na a mụghị mmadụ site na mmiri na mmụọ nsọ, ọ pụghị ịbanye n’alaeze Chineke.” (Jọn 3:5) N’ihi ya, ọ bụ mmiri na mmụọ nsọ ka e ji amụ mmadụ ọzọ. Ma, olee ihe “mmiri na mmụọ nsọ” a bụ?

Gịnị Ka “Mmiri na Mmụọ Nsọ” Bụ?

Ebe Nikọdimọs bụ ọkà mmụta okpukpe ndị Juu, o doro anya na ọ maara ihe “mmụọ Chineke” pụtara n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, ya bụ, ike Chineke nọ n’ọrụ nke na-eme ka ndị mmadụ mee ihe pụrụ iche ha na-enweghị ike ime n’ike onwe ha. (Jenesis 41:38; Ọpụpụ 31:3; 1 Samuel 10:6) Ya mere, mgbe Jizọs kwuru banyere “mmụọ nsọ,” Nikọdimọs ghọtara na ọ bụ ike Chineke nọ n’ọrụ ka ọ na-ekwu.

Oleekwanụ maka mmiri ahụ Jizọs kwuru okwu ya? Chegodị echiche banyere ihe ndị e dere tupu e dee ụka ahụ Jizọs na Nikọdimọs kparịtara nakwa ihe e dere mgbe e dechara ya. Ihe ndị ahụ e dere gosiri na Jọn Onye Na-eme Baptizim na ndị na-eso ụzọ Jizọs nọcha na-eme ndị mmadụ baptizim n’ime mmiri. (Jọn 1:19, 31; 3:22; 4:1-3) Ime baptizim ghọrọ ihe a maara nke ọma na Jeruselem. Ya mere, mgbe Jizọs kwuru banyere mmiri, ọ ga-abụ na Nikọdimọs ghọtara na ihe Jizọs na-ekwu abụghị ụdị mmiri ọ bụla, kama, ọ bụ mmiri e ji eme mmadụ baptizim.

A “Ga-eji Mmụọ Nsọ Mee” Ha Baptizim

Ọ bụrụ na ‘ịmụ mmadụ site na mmiri’ pụtara ime onye ahụ baptizim n’ime mmiri, gịnị ka ‘ịmụ mmadụ site na mmụọ nsọ’ pụtara? Tupu Nikọdimọs na Jizọs akparịta ụka, Jọn Onye Na-eme Baptizim amaala ọkwa na ọ bụghị naanị mmiri ka a ga-eji mee ndị mmadụ baptizim, kama, na a ga-ejikwa mmụọ nsọ. O kwuru, sị: “Eji m mmiri mee unu baptizim, ma ọ [Jizọs] ga-eji mmụọ nsọ mee unu baptizim.” (Mak 1:7, 8) Mak, onye so dee Baịbụl, kwuru oge mbụ e mere mmadụ ụdị baptizim ahụ. O dere, sị: “Ka ụbọchị ndị ahụ na-aga, Jizọs si Nazaret nke Galili bịa, Jọn wee mee ya baptizim na Jọdan. Ozugbo o si na mmiri na-ebili, Jọn hụrụ ka eluigwe na-ekewa, hụkwa ka mmụọ nsọ na-ebekwasị ya dị ka nduru.” (Mak 1:9, 10) E ji mmiri mee Jizọs baptizim mgbe e mikpuru ya n’osimiri Jọdan. E ji mmụọ nsọ mee ya baptizim ozugbo ọ natara mmụọ nsọ si n’eluigwe.

Ihe dị ka afọ atọ e mechara Jizọs baptizim, o mesiri ndị na-eso ụzọ ya obi ike, sị: “A ga-eji mmụọ nsọ mee unu baptizim ụbọchị ole na ole mgbe nke a gasịrị.” (Ọrụ 1:5) Olee mgbe ihe a mere?

N’ụbọchị Pentikọst nke afọ 33 Oge Anyị, ihe dị ka otu narị mmadụ na iri abụọ bụ́ ndị na-eso ụzọ Jizọs zukọrọ n’otu ụlọ na Jeruselem. “Na mberede, a nụrụ ụzụ si n’eluigwe dị nnọọ ka oké ifufe nke na-efesi ike, o wee ju ụlọ ahụ dum bụ́ ebe ha niile nọ ala. Ha hụkwara ihe ndị dị ka ire ọkụ. . . .  Ha niile wee jupụta na mmụọ nsọ.” (Ọrụ 2:1-4) N’otu ụbọchị ahụ, a gbara ndị ọzọ nọ na Jeruselem ume ka e mee ha baptizim n’ime mmiri. Pita onyeozi gwara otu ìgwè mmadụ, sị: “Chegharịanụ, ka e meekwa onye ọ bụla n’ime unu baptizim n’aha Jizọs Kraịst ka e wee gbaghara unu mmehie unu, unu ga-anatakwa mmụọ nsọ ahụ a na-enye n’efu.” Oleezi ihe merenụ? “E mere ndị ji obi ha niile [nabata] okwu ya baptizim, a tụkwasịkwara ihe dị ka puku mkpụrụ obi atọ n’ụbọchị ahụ.”—Ọrụ 2:38, 41.

Ụdị Baptizim Abụọ

Gịnị ka baptizim ndị ahụ na-egosi anyị banyere ịmụ mmadụ ọzọ? Ha na-egosi na e nwere ụzọ ihe abụọ dị n’ịmụ mmadụ ọzọ. Cheta na e bu ụzọ jiri mmiri mee Jizọs baptizim, e mechaa, ya anata mmụọ nsọ. N’otu aka ahụ, e bu ụzọ jiri mmiri mee ndị mbụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs baptizim (ọ bụ Jọn Onye Na-eme Baptizim mere ụfọdụ n’ime ha baptizim), e mechaa, ha anatakwa mmụọ nsọ. (Jọn 1:26-36) E bukwa ụzọ jiri mmiri mee puku mmadụ atọ ahụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs baptizim, e mechaa, ha anatakwa mmụọ nsọ.

Ebe anyị ghọtarala baptizim ndị ahụ e mere ndị na-eso ụzọ Jizọs na Pentikọst nke afọ 33 Oge Anyị, olee otú anyị kwesịrị ịtụ anya ka e si na-amụ ndị mmadụ ọzọ n’oge a? Ọ bụ otu ụzọ ahụ e si mụọ ndịozi Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya mbụ ọzọ. Mmadụ ga-ebugodị ụzọ chegharịa ná mmehie ya, hapụ omume ọjọọ ọ na-eme, were ndụ ya nyefee Jehova ife ya ofufe na ijere ya ozi, ya ekwekwa ka e mee ya baptizim na mmiri iji gosi ọha na eze na ya enyefeela Jehova ndụ ya. Ọ bụrụzie na Chineke ahọrọ ya ka o soro ná ndị ga-achị n’Alaeze Ya, a ga-eji mmụọ nsọ tee ya mmanụ. Ihe mbụ dị n’ịmụ mmadụ ọzọ bụ ihe mmadụ ga-ekpebi ka e mee ya (ya bụ, iji mmiri mee onye ahụ baptizim); nke abụọ abụrụ ihe Chineke ga-eji aka ya mee (ya bụ, iji mmụọ nsọ mee onye ahụ baptizim). Mgbe e mere mmadụ ụdị baptizim abụọ a, ihe ọ pụtara bụ na a mụọla ya ọzọ.

Ma, gịnị mere Jizọs ji kwuo na a ‘ga-amụ mmadụ site na mmiri na mmụọ nsọ’ mgbe ya na Nikọdimọs na-akparịta ụka? Ọ bụ iji gosi nke ọma na a ga-enwe mgbanwe pụrụ iche ná ndụ ndị e ji mmiri na mmụọ nsọ mee baptizim. Isiokwu na-esonụ ga-eleba anya ná mgbanwe ahụ.

[Foto dị na peeji nke 9]

Jọn ji mmiri mee ndị Izrel chegharịrị echegharị baptizim