Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Vatican Chọrọ Ime Ka A Kwụsị Ịkpọ Aha Chineke

Vatican Chọrọ Ime Ka A Kwụsị Ịkpọ Aha Chineke

Vatican Chọrọ Ime Ka A Kwụsị Ịkpọ Aha Chineke

NDỊ isi chọọchị Katọlik na-achọ ime ka a kwụsị ịkpọ aha Chineke mgbe a na-ekwu okwuchukwu na chọọchị ha. N’afọ gara aga, Òtù Vatican Na-ahụ Maka Okpukpere Chi na Sakrament zigaara ndị bishọp Katọlik niile akwụkwọ ntụziaka banyere okwu a ná nnọkọ ndị ha nwere n’ebe dị iche iche n’ụwa. Ọ bụ poopu ha nyere “iwu” ka e ziga akwụkwọ ahụ.

Akwụkwọ ahụ, nke e dere na June 29, 2008, kwuru na “kemgbe afọ ole na ole ugbu a, ndị mmadụ amalitela ịkpọ Chineke Izrel aha ya, bụ́ nke a maara dị ka tetragramatọn dị nsọ, nke e ji mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ יהוה, bụ́ YHWH, ede” n’agbanyeghị mba niile a barala banyere ya. Akwụkwọ ahụ kwuru na a sụgharịala aha nsọ ahụ n’ụzọ dị iche iche, dị ka “Yahweh,” “Yahwè,” “Jahweh,” “Jahwè,” “Jave,” “Yehovah,” nakwa n’ụzọ ndị ọzọ. * N’agbanyeghị nke ahụ, iwu ahụ Vatican nyere chọrọ ka ndị Katọlik laghachi n’ihe ha na-emebu. Ihe ọ pụtara bụ na ha ga-eji “Onyenwe anyị” dochie Tetragramatọn ahụ. ‘A gaghịkwa na-ede aha Chineke bụ́ YHWH ede ma ọ bụkwanụ na-akpọ ya akpọ’ n’okwuchukwu ndị Katọlik, n’abụ ha, nakwa n’ekpere ha.

Iji kwado mkpebi a, akwụkwọ ahụ si Vatican chetaara ndị Katọlik “ọdịnala ha dịwara kemgbe ụwa.” Akwụkwọ ahụ kwuru na ọbụna ná nsụgharị Septuagint nke Akwụkwọ Nsọ Hibru e dere tupu oge Ndị Kraịst, a na-asụgharịkarị aha Chineke ka ọ bụrụ Kyʹri·os, nke bụ́ okwu Grik pụtara “Onyenwe anyị.” N’ihi ya, akwụkwọ ahụ kwusiri ike na “ọ dịbeghịkwa mgbe Ndị Kraịst kpọpụtatụrụla tetragramatọn ahụ dị nsọ akpọpụta.” Ihe a e kwuru n’akwụkwọ ahụ leghaara otu ihe àmà doro anya e nwere nke na-adabaghị n’ihe ahụ o kwuru anya. N’oge mbụ e dere nsụgharị Septuagint, ihe e dere n’ebe e dere aha Chineke abụghị Kyʹri·os, kama, ọ bụ aha Chineke bụ́ יהוה. Ndị na-eso ụzọ Kraịst na narị afọ mbụ maara aha Chineke, na-akpọkwa ya akpọ. Jizọs n’onwe ya gwara Nna ya n’ekpere, sị: “Emewokwa m ka ha mara aha gị.” (Jọn 17:26) N’ekpere a ma ama Jizọs ji kụziere ndị na-eso ụzọ ya otú e si ekpe ekpere, ọ kụziiri anyị ikpe ekpere, sị: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.”—Matiu 6:9.

O kwesịrị ịna-enu Ndị Kraịst niile enu n’obi ịhụ na e doro aha Chineke nsọ. Mgbalị Vatican na-eme ka a ghara ịkpọ ya bụ ịkparị Jehova, bụ́ onye kwuru, sị: “Nke a bụ aha m ebeebe, otu a ka a ga-esi na-echeta m site na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ.”—Ọpụpụ 3:15, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 N’asụsụ Igbo, otú e si ede aha ahụ kemgbe bụ “Jehova,” e nwekwara nsụgharị Baịbụl Igbo ndị dere ya otú ahụ.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 30]

“Nke a bụ aha m ebeebe.”—Ọpụpụ 3:15, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik

[Foto dị na peeji nke 30]

Ibe akwụkwọ “Septuagint” nke e dere na narị afọ mbụ Oge Anyị. A kara aha Chineke bụ́ mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ, nke a na-asụgharịkarị YHWH, akara gburugburu

[Ebe E Si Nweta Foto]

A natara Egypt Exploration Society ikike