Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Bụ Ike Chineke Ka E Ji Agwọ Ọrịa Niile E Ji Ọrụ Ebube Agwọ?

Ọ̀ Bụ Ike Chineke Ka E Ji Agwọ Ọrịa Niile E Ji Ọrụ Ebube Agwọ?

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ọ̀ Bụ Ike Chineke Ka E Ji Agwọ Ọrịa Niile E Ji Ọrụ Ebube Agwọ?

O doro anya na Jehova Chineke nwere ikike ịgwọ ọrịa. O dokwara anya na o nwere ike inye ndị na-efe ya ofufe ikike ịgwọ ọrịa. Dị ka ihe atụ, n’oge ndịozi, ikike iji ọrụ ebube agwọ ọrịa so n’onyinye ndị pụrụ iche e si n’ike mmụọ nsọ nye ndị mmadụ. Pọl onyeozi dere, sị: “A na-eme ka mmụọ nsọ pụta ìhè n’ime onye ọ bụla maka nzube bara uru. Dị ka ihe atụ, a na-esite n’ike mmụọ nsọ nye otu onye okwu amamihe, . . . nye onye ọzọ onyinye ịgwọ ọrịa site n’otu mmụọ nsọ ahụ, . . . nye onye ọzọ ibu amụma, . . . nye onye ọzọ ịsụ asụsụ dị iche iche.”—1 Ndị Kọrịnt 12:4-11.

N’agbanyeghị nke ahụ, Pọl dekwara n’otu akwụkwọ ozi ahụ o degaara ndị Kọrịnt na onyinye ọrụ ebube ndị sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke ga-akwụsị. O kwuru, sị: “Ọ bụrụ na e nwere onyinye ibu amụma, a ga-ewepụ ha; ọ bụrụ na e nwere ịsụ asụsụ dị iche iche, ha ga-akwụsị; ọ bụrụ na e nwere ihe ọmụma, a ga-ewepụ ya.”—1 Ndị Kọrịnt 13:8.

Na narị afọ mbụ, Jizọs Kraịst na ndịozi ya ji ọrụ ebube gwọọ ndị mmadụ. N’oge ahụ, Ndị Kraịst na-eji onyinye mmụọ nsọ, bụ́ ndị gụnyere ikike ịgwọ ọrịa, eto Chineke, ha bụkwa ihe àmà ndị gosiri na Jehova ji ọgbakọ Ndị Kraịst ahụ e hiwere ọhụrụ na-arụ ọrụ nakwa na ọ na-agọzi ya. Ma ozugbo ọgbakọ Ndị Kraịst ahụ tozuru okè ma ọ bụ kwụsie ike, kama iji onyinye ndị pụrụ iche amata na ọ bụ ọgbakọ Chineke, e jizi àgwà ndị dị ka okwukwe, olileanya, na ịhụnanya amata ya. (Jọn 13:35; 1 Ndị Kọrịnt 13:13) N’ihi ya, ka ọ na-erula ihe dị ka afọ 100 Oge Anyị, e jighịzi iji ọrụ ebube agwọ ndị mmadụ ọrịa amata okpukpe Chineke nabatara. *

Ma, i nwere ike ịnọ na-eche, sị, ‘Olee ihe mere m ka ji anụ akụkọ banyere ndị e ji ọrụ ebube gwọọ?’ Dị ka ihe atụ, otu akwụkwọ akụkọ kọrọ banyere otu nwoke a sịrị na ọ na-arịa ọrịa kansa. O nwere akpụ n’ime isi ya, n’akụrụ ya, nakwa n’ime ime ọkpụkpụ ya. Nwoke ahụ chere na ya ga-anwụ ruzie ụbọchị a sịrị na Chineke gwara ya okwu. Akụkọ ahụ kwuru na ụbọchị ole na ole nke ahụ gasịrị, ọrịa kansa ya lara.

Mgbe a kọọrọ gị ụdị akụkọ ahụ, ọ́ gaghị adị mma ka ị jụọ onwe gị, sị: ‘Akụkọ a ò mere eme? È nwere ihe e dere ede na-egosi na dọkịta lere ya ahụ́ ma kwuo na o nwere ụdị ọrịa ahụ, mechaakwa chọpụta na ọ gbakeela? A sịgodịkwa na o yiri ka à gwọrọ ya, Baịbụl ọ̀ na-akụzi na ọ bụ ike Chineke ka e ji agwọ ọrịa niile a sịrị na e ji ọrụ ebube agwọ?’

Ọ dị anyị mkpa ịmata azịza nke ajụjụ ndị ahụ, karịsịa nke ikpeazụ ahụ. Jizọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị, sị: “Lezienụ anya maka ndị amụma ụgha . . . Ọtụtụ mmadụ ga-asị m n’ụbọchị ahụ, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ọ̀ bụ na anyị ebughị amụma n’aha gị, chụpụkwa ndị mmụọ ọjọọ n’aha gị, rụọkwa ọtụtụ ọrụ dị ike [ọrụ ebube] n’aha gị?’ Ma mgbe ahụ, m ga-ekwupụtara ha, sị: Ọ dịghị mgbe m maara unu! Sinụ n’ebe m nọ pụọ, unu ndị ọrụ mmebi iwu.”—Matiu 7:15, 21-23.

O doro anya na ikike e ji agwọ ọrịa ndị a sị na e ji ọrụ ebube agwọ nwere ike isi n’ebe ọzọ na-abụghị n’ebe Chineke nọ. Ka ndị na-asị na ha ji aha Chineke na-arụ ọrụ ebube ghara iduhie anyị, ọ dị anyị mkpa ịmata Chineke nke ọma, iji ikike iche echiche Chineke nyere anyị leba ihe anyị nụrụ anya ma mụta otú e si amata ndị na-eme uche ya.—Matiu 7:16-19; Jọn 17:3; Ndị Rom 12:1, 2.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Ọ dị ka a kwụsịrị inye ndị mmadụ onyinye ịrụ ọrụ ebube mgbe ndịozi nwụchara, onyinye ndị ahụ sitere na mmụọ nsọ kwụsịkwara mgbe ndị e nyere ha nwụrụ.