3 Mụta Eziokwu Banyere Jizọs
3 Mụta Eziokwu Banyere Jizọs
“Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:16.
OLEE IHE MERE O JI ESI IKE? Ụfọdụ ndị nwere ike ịgwa gị na ọ dịghị mgbe Jizọs dịrị ndụ n’ụwa. Ndị ọzọ kweere na e nwere mgbe ọ dịrị ndụ n’ụwa, ma, ha na-ekwusi ike na ọ bụ mmadụ nkịtị nke nwụrụla kemgbe.
OLEE OTÚ Ị GA-ESI MERIE YA? Ṅomie onye na-eso ụzọ Jizọs bụ́ Nataniel. * Enyi ya bụ́ Filip gwara ya na ya chere na ya ahụla Mesaya, ya bụ, “Jizọs, nwa Josef, onye Nazaret.” Ma, Nataniel ekwetaghị ihe Filip kwuru naanị maka na ọ bụ enyi ya nwoke. N’ezie, ọ zara ya, sị: “Ọ̀ dị ihe ọma ọ bụla pụrụ isi na Nazaret pụta?” N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe Filip gwara ya ka ọ “bịa hụrụ,” ọ gara ka o jiri anya ya hụ. (Jọn 1:43-51) Ị ga-eritekwa uru ma ọ bụrụ na i jiri aka gị nyochaa ihe ndị na-egosi na Jizọs dịrị ndụ. Olee ihe i nwere ike ime?
Chọpụta ihe na-egosi na Jizọs dịrị ndụ n’ụwa. Josephus na Tacitus bụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme abụọ a na-akwanyere ùgwù ndị dịrị ndụ na narị afọ mbụ, ma ha abụghị Ndị Kraịst. Ha kwuru ihe ndị gosiri na Jizọs Kraịst dịrị ndụ n’ụwa. Mgbe Tacitus na-akọwa otú Eze Ukwu Nero nke Rom si bo Ndị Kraịst ebubo na ọ bụ ha gbara Rom ọkụ n’afọ 64 Oge Anyị, o dere, sị: “Ọ bụ ndị a kpọrọ asị maka arụ ha na-akpa, bụ́ ndị ọha na eze na-akpọ Ndị Kraịst, ka Nero boro ebubo ahụ ma mekpọọ ọnụ. Otu n’ime ndị isi anyị, bụ́ Pontius Pilatus gburu Christus [Kraịst], bụ́ onye e si n’aha ya nweta aha bụ́ Ndị Kraịst, n’oge Taịbiriọs na-achị.”
Akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica, Mbipụta nke 2002, kwuru banyere ihe ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme nke narị afọ mbụ na narị afọ nke abụọ kwuru banyere Jizọs na Ndị Kraịst oge gboo, sị: “Ihe ndị a ndị mmadụ dere n’otu n’otu na-egosi na n’oge ochie, ọbụna ndị na-emegide ndị na-eso ụzọ Kraịst adịghị mgbe ha nwere obi abụọ na Jizọs dịrị ndụ, bụ́ nke ndị mmadụ malitere ịgba ụkwụ ná ngwụsị narị afọ nke 18, gbaakwa ya ụkwụ na narị afọ nke 19, nakwa ná mmalite narị afọ nke 20, n’enweghị ezigbo ihe ha ji n’aka.” N’afọ 2002, uche akwụkwọ akụkọ bụ́ The Wall Street Journal kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị ọka mmụta, ma e wezụga ụfọdụ ndị na-ekweghị na Chineke, ekwetalarị na Jizọs onye Nazaret dịrị ndụ n’ụwa.”
Tụlee ihe akaebe na-egosi na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ. Mgbe ndị na-emegide Jizọs jidere ya, ndị ya na ha kacha akpachi anya gbahapụrụ Matiu 26:55, 56, 69-75) Mgbe e jidesịrị Jizọs, ndị na-eso ụzọ ya gbasasịrị. (Matiu 26:31) Ma, ndị na-eso ụzọ ya maliteghachiri ọrụ ha n’egbughị oge. Pita na Jọn ji obi ike gwa ndị ahụ kpara nkata gbuo Jizọs okwu. Ndị na-eso ụzọ Jizọs nụrụ ọkụ n’obi nke na ha zisara ozizi Jizọs n’Alaeze Ukwu Rom dum, họrọ ịnwụ kama ịjụ ihe ha kweere.
ya, enyi ya Pita jikwa ụjọ gọnahụ ya. (Gịnị mere ha ji kwụsị ịtụ egwu ma jiri ịnụ ọkụ n’obi zisawa ozi ọma? Pọl onyeozi kwuru na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ nakwa na “ọ pụtakwara n’ihu Sifas [Pita], e mesịa, ọ pụtara n’ihu ndị ozi iri na abụọ ahụ.” Pọl kwukwara, sị: “Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ pụtara n’ihu ihe karịrị narị ụmụnna ise n’otu mgbe.” Ọtụtụ n’ime ndị ahụ ji anya ha hụ Jizọs ka dị ndụ n’oge Pọl dere akwụkwọ ozi a. (1 Ndị Kọrịnt 15:3-7) O nwere ike ịdịrị ndị na-arụ eziokwu ụka mfe ịgbagha akaebe otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ gbara. (Luk 24:1-11) Ma, akaebe a narị mmadụ ise gbara banyere ihe ha ji anya ha hụ gosiri nnọọ na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ.
GỊNỊ GA-ABỤ ỤGWỌ ỌRỤ GỊ? A ga-agbaghara ndị nwere okwukwe na Jizọs ma na-erubere ya isi mmehie ha, ha ga-enwekwa ezi akọnuche. (Mak 2:5-12; 1 Timoti 1:19; 1 Pita 3:16-22) Jizọs kwere nkwa na ọ bụrụ na ha anwụọ, ọ ga-akpọlite ha n’ọnwụ “n’ụbọchị ikpeazụ.”—Jọn 6:40.
Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọtakwu isiokwu a, gụọ isiokwu bụ́ “Ònye Bụ Jizọs Kraịst?,” n’isi nke 4 nakwa isiokwu bụ́ “Ihe Mgbapụta Ahụ—Onyinye Kasịnụ Chineke Nyere,” n’isi nke 5 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? *
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 4 Ọ ga-abụ Nataniel ka Matiu, Mak, na Luk, bụ́ ndị so dee Oziọma, kpọrọ Batọlọmiu.
^ par. 10 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.
[Foto dị na peeji nke 7]
Dị ka Nataniel mere, chọpụta ihe na-egosi na Jizọs dịrị ndụ