Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Inweta Ọṅụ n’Agbanyeghị na M Nwere Nkwarụ

Inweta Ọṅụ n’Agbanyeghị na M Nwere Nkwarụ

Inweta Ọṅụ n’Agbanyeghị na M Nwere Nkwarụ

Dị ka Paulette Gaspar si kọọ

Ọ bụ eziokwu na m dị kilogram atọ n’arọ mgbe a mụrụ m, dọkịta ma na enwere m ezigbo nsogbu. Mgbe a na-amụ m, ọkpụkpụ m ụfọdụ gbajiri. Enwere m ọrịa ọkpụkpụ mere ka ọkpụkpụ m ghara isi ike. E bugara m n’ụlọ ebe a na-awa ahụ́, ma ndị dọkịta na-arụ n’ebe ahụ echeghị na m ga-apụta ná ndụ. Ha tụrụ anya na m ga-anwụ n’ime awa iri abụọ na anọ.

AMỤRỤ m na Canberra, bụ́ isi obodo Australia, na June 14, 1972. N’agbanyeghị ihe ndị mmadụ chere, anwụghị m n’ụbọchị ahụ a mụrụ m. Ma oyi bara m ahụ́. Ebe ndị dọkịta ahụ chere na mee elu mee ala m ga-anwụrịrị, ha enyeghị m ọgwụ ọ bụla, ha kpebikwara ịhapụ m “ka m nwụọrọ onwe m.” Ma, emechaghị m nwụọrọ onwe m, apụtara m ná ndụ.

M maara na ọ ga-abụrịrị na ndị mụrụ m nọ ná mwute n’oge ahụ. Ebe ọ bụ na o yighị ka m̀ ga-adị ndụ, ndị na-arụ n’ụlọ ọgwụ, bụ́ ndị bu ezi ihe n’obi, gwara ndị mụrụ m ka ha ghara itinyecha obi n’ebe m nọ. N’ezie, n’ime ọnwa atọ mbụ m nọrọ n’ụlọ ọgwụ, a nadịghị ekwe ka ndị mụrụ m metụ m aka. Obere ihe nwere ike imerụ m ahụ́. Mgbe o doro anya na m ga-adị ndụ, ndị dọkịta tụụrụ ndị mụrụ m aro ka ha kpọga m n’ụlọ ụmụaka nwere nkwarụ.

Ma, ndị mụrụ m kpebiri ịkpọrọ m lawa n’ụlọ ha. N’oge ahụ, Ndịàmà Jehova ka malitere nnọọ ịmụrụ mama m Baịbụl. Ihe ndị ọ mụtara mere ka ọ hụkwuo na ọ bụ ọrụ dịịrị ya ilekọta m. Ma ọ ga-abụrịrị na o siiri ya ike ịhụ m n’anya, ebe ọ bụ na ọ na-eji ike niile o nwere elekọta m. Mụ na ndị mụrụ m na-echu ụlọ ọgwụ ka mmiri. Naanị ịsa m ahụ́ nwere ike ime ka ọkpụkpụ m gbajie. Ọ bụrụgodị naanị uzere ka m mara, ọkpụkpụ m nwere ike ịgbaji.

Otú M Si Daa Mbà n’Obi

Ka m na-etolite, ịnọ n’oche nkwagharị maara m ahụ́. Ọ dịdịghị onye na-eche echiche na m ga-amụ ije ije. N’agbanyeghị otú ilekọta m si siere ndị mụrụ m ike, ha lekọtara m nnọọ nke ọma.

Mama m mekwara ihe niile o nwere ike ime iji kụziere m ozi na-akasi obi dị na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, ọ kụziiri m na n’ọdịnihu, Chineke ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs bụ́ ebe ahụ́ ga-esi mmadụ niile ike, obi eruo ha ala, ha na Chineke adịkwa ná mma. (Abụ Ọma 37:10, 11; Aịzaya 33:24) N’agbanyeghị nke ahụ, mama m kwetara na o siiri ya ike ikwere na m ga-enwe obi ụtọ ná ndụ ọ gwụla ma paradaịs ahụ ọ̀ bịara.

Ná mmalite, anọ m n’ụlọ akwụkwọ ndị nwere nkwarụ. Ọ dịghị ihe ndị nkụzi m gbara m ume ịgba mbọ imeta ná ndụ, ọ dịghịkwanụ ihe m nọ na-agba mbọ imeta. N’ezie, o sidịịrị m ike idi ihe ndị na-eme n’ụlọ akwụkwọ. Ọtụtụ ụmụaka na-emeso m omume obi ọjọọ. Mgbe e mesịrị, abanyere m n’ụlọ akwụkwọ ndị ahụ́ dị mma na-aga. Achọpụtara m na ịmụta otú mụ na ndị ọzọ ga-esi na-adị ná mma wekọọrọ ume na ike niile dị m n’ahụ́. N’agbanyeghị nke ahụ, ekpebisiri m ike na m ga-agụru akwụkwọ afọ iri na abụọ.

Echere m echiche banyere otú ndụ ụmụ akwụkwọ ibe m si yie ihe tọgbọ chakoo na otú ha si yie ndị na-enweghị olileanya ná ndụ, karịsịa mgbe m nọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Echekwara m echiche banyere ihe ndị nne m kụziiri m na Baịbụl. N’ime obi m, amaara m na ihe ndị mama m kụziiri m bụ eziokwu. Ma, eziokwu Baịbụl erughị m n’obi n’oge ahụ. N’oge ahụ, ekpebiri m itinye isi ná ntụrụndụ na ihe ọchị, n’achọghị ịma ihe echi ga-abụ.

Mgbe m dị afọ iri na asatọ, esi m n’ụlọ ndị mụrụ m kwapụ ma kwaba n’ụlọ ebe mụ na ndị ọzọ nwere nkwarụ bi. Nkwapụ ahụ m kwapụrụ mere m obi ụtọ ma tụọ m ụjọ. Inwe ike ime ihe ndị m na-enwebughị ike ime, ikpebiri onwe m ihe m ga-eme, inwe ndị enyi na iso ha na-akpa tọrọ m ezigbo ụtọ. Ọtụtụ n’ime ndị enyi m lụrụ di. Ọ nọkwa na-agụ m agụụ inweta di nke m na onye ga-ahụ m n’anya. Ma, n’ihi nkwarụ m, o yighị ka m̀ ga-enweta di. Obi jọrọ m njọ mgbe nke a doro m anya.

N’agbanyeghị ya, ọ dịghị mgbe m tara Chineke ụta maka ọrịa m. Ihe ndị m mụtarala banyere Chineke mere ka m mara na o nweghị ike ime ihe na-ezighị ezi. (Job 34:10) Agbalịrị m iwere ndụ m otú m si hụ ya. N’agbanyeghị nke ahụ, adara m mbà n’obi.

Otú M Si Jiri Nwayọọ Nwayọọ Gbakee

Ekele dịrị Chineke na mama m ghọtara otú ọnọdụ m dị ma kpọọ otu n’ime ndị okenye ọgbakọ nke bi m nso. Okenye ahụ kpọrọ m na fon ma gwa m ka m bịa ọmụmụ ihe Ndị Kraịst n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova. Otu nwanna nwaanyị nọ n’ọgbakọ ahụ malitekwara ịmụrụ m Baịbụl kwa izu.

Ka ihe m na-amụ na Baịbụl nọ na-echetara m eziokwu Baịbụl ndị mama m kụziirila m, amalitere m ịgbanwe otú m si ele ndụ anya. Mụ na Ndị Kraịst ibe m ịnọ na-atọ m ụtọ. Ma, ebe ọ bụ na ụjọ na-atụ m na e nwere ike ịkpasu m iwe, anaghị m agwa mmadụ otú obi dị m. Echere m na ọ bụ àgwà a m nwere mere o ji siere m ike iji obi m dum hụ Chineke n’anya. N’agbanyeghị ya, amaara m na m kwesịrị inyefe Chineke ndụ m. N’ihi ya, na December 1991, e mere m baptizim, bụ́ nke gosiri na mụ enyefeela Chineke ndụ m.

Akwapụrụ m n’ụlọ ahụ mụ na ndị nwere nkwarụ bi ma kwaba n’ụlọ ebe naanị m bi. Nke a baara m uru ma kpatara m nsogbu ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, ezigbo owu na-ama m. Ụjọ na-atụkwa m na ụmụ nwoke nwere ike ịbata n’ụlọ m n’ike. N’oge na-adịghị anya, adakwara m nnọọ mbà n’obi ọzọ. Ọ bụ ezie na m na-eji ihu ọchị ezochi ihe na-emenụ, agwọ nọ n’akịrịka. Ọ dịsi m mkpa ike inweta ezigbo enyi nke mụ na ya ga na-anọ.

Ekweere m na Jehova Chineke nyere m nnọọ ụdị enyi ahụ. Ndị okenye ọgbakọ anyị mere ndokwa ka Suzie, bụ́ nwanna nwaanyị lụrụla di, mụwaziere m Baịbụl. Suzie abụghịrị m naanị onye nkụzi. Ọ ghọkwaara m ezigbo enyi m hụrụ n’anya nke ukwuu.

Suzie kụziiri m otú m ga-esi na-agwa ndị ọzọ ihe ndị m na-amụta, ma mgbe anyị na-aga ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ ma n’oge ndị ọzọ. Amaliteziri m ịghọta àgwà Chineke nke ọma karị. Ma, n’agbanyeghị na e meela m baptizim, ejibeghị m obi m niile hụ Chineke n’anya. N’otu oge, anọdị m na-eche ma ọ̀ bụ m kwụsị ijere ya ozi. Akọọrọ m Suzie ihe m na-eche, o nyekwaara m aka imeri nsogbu ahụ.

Suzie nyekwaara m aka ịghọta na ihe kacha akpatara m obi ọjọọ bụ na mụ na ụfọdụ ndị na-ahụchaghị Jehova n’anya na-akpa. N’ihi ya, amalitere m imeta ndị ha na Chineke dị n’ezigbo mma enyi, karịsịa ndị tọrọ m. Ihe ọzọkwa bụ na mụ na mama m adịchakwaghị ná mma; n’ihi ya, amalitere m ime ka mụ na ya na nwanne m nwoke dịkwuo ná mma. O juru m anya na obi bịara tọwa m ụtọ otú ọ na-atọtụbeghị m. Mmekọrịta mụ na ụmụnna m ndị nwoke na ndị nwaanyị, ndị ezinụlọ m, na nke kacha nke, mmekọrịta mụ na Jehova malitere inye m ọṅụ na ume.—Abụ Ọma 28:7.

Ọrụ Ọhụrụ

Mgbe m gasịrị otu mgbakọ ebe m gere okwu na-akọwa ọṅụ ọtụtụ ndị na-enwe maka na ha na-ekwusa ozi ọma oge niile, agwara m onwe m, sị, ‘M ga-emelinụ ya!’ N’ezie, ama m na nke a ga-esiri m ezigbo ike n’ihi nkwarụ m. Ma, mgbe m chesịrị echiche banyere ya ma kpee ekpere maka ya, etinyere m akwụkwọ ịghọ onye na-akụzi Baịbụl oge niile. N’April 1998, amalitekwara m ọrụ ọhụrụ ahụ.

Olee otú m si ebu nkwarụ a m nwere ekwusa ozi ọma? Anatụghị m achọ ịnọ ka ndị ọzọ na-emere m ihe niile, na-eche ka ha nyere m aka ịgaru ebe m na-aga ma na-enyere m aka n’ụzọ ndị ọzọ. N’ihi ya, Suzie na di ya, bụ́ Michael, tụụrụ m otu aro magburu onwe ya, ya bụ, ka m zụọ ọgba tum tum! Ma oleekwanụ otú m ga-esi na-agba ọgba tum tum? Dị ka ị hụrụ na foto dị n’isiokwu a, a rụụrụ m ọgba tum tum mụ otú m chọrọ. Ọ bụ ezie na adị m naanị kilogram iri na itoolu n’arọ, ọ nadịghị adị m mkpa isi n’oche nkwagharị m bilie iji banye n’ọgba tum tum mụ!

Inwezi ike ịpụ na ịbata mgbe m chọrọ na-eme ka m nwee ike ịga na nke ndị mmadụ ma mụọrọ ha Baịbụl n’oge ga-adịrị mụ na ha mma. Ka m kwuo eziokwu, ọ na-atọ m ụtọ ịgba ọgba tum tum mụ, ikuku ana-ekusa m n’ihu, bụ́ otu n’ime ihe ndị na-enyetụ m obi ụtọ!

Ọ na-atọ m ụtọ ịgwa ndị mmadụ okwu n’okporo ụzọ, ọtụtụ n’ime ha na-akwanyekwara m ùgwù. Ọ na-amasị m ịkụziri ndị mmadụ Baịbụl. Ọchị na-atọ m mgbe ọ bụla m chetara ihe mere otu mgbe mụ na nwanna toro ogologo na-aga ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ. O kelere onye nwe ụlọ, onye ahụ nwe ụlọ legidere m nnọọ anya ma jụọ onye mụ na ya nọ n’ozi ọma, sị, “Ọ̀ na-ekwuli okwu?” Anyị abụọ dapụrụ n’ọchị. Mgbe m kwusachaara nwaanyị ahụ ozi ọma, ọ maara n’ezie na m na-ekwuli nnọọ okwu!

Ndụ atọwala m ụtọ ugbu a, amụtakwala m ịhụ Jehova Chineke n’anya. Ekelere m nnọọ nne m maka ịkụziri m eziokwu Baịbụl, m ji obi ike na-atụsi anya ike na n’oge na-adịghị anya, Chineke ‘ga-eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ,’ ma obere ahụ́ m.—Mkpughe 21:4, 5.

[Ihe odide gbatụrụ okpokpo nke dị na peeji nke 30]

“Agbalịrị m iwere ndụ m otú m si hụ ya. N’agbanyeghị nke ahụ, adara m mbà n’obi”