Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

È Nwere Onye Na-eche Banyere M?

È Nwere Onye Na-eche Banyere M?

È Nwere Onye Na-eche Banyere M?

Ọ̀ dịtụla mgbe i chere na i nweghị onye inyeaka, ka à ga-asị na e nweghị onye ghọtara ihe gị na ya na-alụ? A sịgodị na ha ma nsogbu gị, ọ dị gị ka ha achọghị ịma.

MGBE nsogbu dakwasịrị anyị, ọ na-adị anyị ka oké mmiri ozuzo na-agaghị akwụsị akwụsị. Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike kpebie na anyị agaghị edikwa ya, n’ihi na ọ na-echi anyị ọnụ n’ala, yiekwa ihe na-ekwesịghị ịdakwasị anyị. Ọ na-emekarị anyị ma ọ bụrụ na ihe mberede, nchegbu, ọrịa na-anaghị ala ala ma ọ bụ ihe yiri ha na-emekpọ anyị ọnụ. O nwere ike ịdị anyị ka ụwa anyị ọ̀ gwụla, anyị echewe ebe anyị nwere ike inweta nkasi obi. È nwere onye na-eche banyere anyị?

“Chineke nke Nkasi Obi Niile” Na-eche Banyere Anyị

Na Baịbụl, a kpọrọ Chineke “Nna nke obi ebere na Chineke nke nkasi obi niile.” (2 Ndị Kọrịnt 1:3) Chineke, onye aha ya bụ Jehova, ma na anyị chọrọ nkasi obi. E dere okwu a bụ́ “nkasi obi” n’ụdị ya dị iche iche ihe karịrị otu narị ugboro na Baịbụl. Ọ na-emesi anyị obi ike na Chineke ma nsogbu anyị na-enwe, ọ chọkwara ịkasi anyị obi. Ọ bụrụ na anyị amata nke ahụ, ọ ga-eme ka anyị kwenyesie ike na a sịgodị na o yie ka ndị ọzọ ahụghị nsogbu anyị, a sịkwa na ha aghọtaghị ma ọ bụ ha anaghị eche banyere ya, Jehova Chineke na-eche banyere ya.

Baịbụl mere ka o doo anya na Jehova na-eche banyere anyị n’otu n’otu. O kwuru, sị: “Anya Jehova dị n’ebe niile, na-elegide ndị ọjọọ na ndị ọma.” (Ilu 15:3) Baịbụl kwukwara na Job 34:21, sị: “Anya ya na-ahụ ụzọ mmadụ, ọ na-ahụkwa nzọụkwụ ya niile.” Jehova na-ahụ àgwà anyị na-akpa, ma àgwà ọma ma àgwà ọjọọ. Ọ maara ọnọdụ anyị, o nwekwara ike ime ihe ọ bụla ọ ma ga-abara anyị uru. Okwu onye ọhụ ụzọ ma ọ bụ onye amụma, bụ́ Hanenaị, gwara Esa bụ́ Eze Juda, gosiri na nke ahụ bụ eziokwu. Ọ sịrị ya: “Anya Jehova na-ahụzu ụwa dum iji gosi ike ya maka ndị obi ha zuru ezu n’ebe ọ nọ.”—2 Ihe E Mere 16:7, 9.

E nwere ihe ọzọ mere Jehova ji na-eche banyere anyị. Jizọs kwuru, sị: “Ọ dịghị onye pụrụ ịbịakwute m ma ọ bụrụ na Nna m, bụ́ onye zitere m, adọtaghị ya.” (Jọn 6:44) Jehova na-eche banyere anyị nke ọma nke na ọ na-enyocha obi mmadụ iji mara ma onye ahụ ọ̀ chọrọ ịmụtakwu banyere ya. Ọ bụrụ na ọ hụ na onye ahụ chọrọ, ọ na-enyere ya aka. Dị ka ihe atụ, na Dominican Republic, e nwere otu nwaanyị a wara ahụ́ n’ụlọ ọgwụ n’ihi ọrịa kansa. O kpegaara Chineke ekpere ka o nyere ya aka ịchọta ezi okpukpe. Mgbe o kpechara ekpere ahụ, di ya wetaara ya broshuọ a na-akpọ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? * Ọ bụ Onyeàmà Jehova ziri di ya ozi ọma n’ụtụtụ ahụ nyere ya broshuọ ahụ. Nwaanyị ahụ gụrụ ya, ghọta na Chineke azala ekpere ya. O kwere ka Onyeàmà ahụ mụwara ya Baịbụl, o rughị ọnwa isii, ya enyefee Chineke onwe ya, e meekwa ya baptizim.

N’akwụkwọ Baịbụl bụ́ Abụ Ọma, e nwere ọtụtụ okwu ndị na-enye obi ụtọ, bụ́ ndị ndị Hibru oge ochie na-abụ abụ, dị ka Eze Devid, dere. Okwu ndị ahụ gosiri na Jehova na-eche banyere anyị n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. N’Abụ Ọma 56:8, Eze Devid rịọrọ Chineke, sị: “Gbanye anya mmiri m n’ime karama akpụkpọ gị. Ọ̀ bụ na ọ dịghị n’akwụkwọ gị?” Okwu ndị ahụ gosiri na Devid ma na Jehova maara ahụhụ ọ na-ata, marakwa nsogbu ọ na-enye ya n’obi. Jehova ma ahụhụ Devid na-ata, o chetakwara na ihe gbara Devid anya mmiri bụ ahụhụ ahụ nyere ya nsogbu n’obi. N’eziokwu, Onye Okike anyị na-eche banyere ndị niile na-achọ ime uche ya, ya bụ, “ndị obi ha zuru ezu n’ebe ọ nọ.”

Ebe ọzọ Baịbụl kwuru na Chineke hụrụ anyị n’anya ma na-eche banyere anyị bụ n’Abụ Ọma nke 23. N’okwu mmeghe ya, e ji Chineke tụnyere onye ọzụzụ atụrụ nke hụrụ atụrụ ya n’anya. O kwuru, sị: “Jehova bụ Onye na-azụ m dị ka atụrụ. Ọ dịghị ihe ga-akọ m.” Onye na-azụ atụrụ n’Izrel oge ochie na-elekọta atụrụ ya nke ọma, ma na-agụ nke ọ bụla aha. Ọ na-akpọ atụrụ nke ọ bụla òkù kwa ụbọchị ma jiri nwayọọ na-adịda ya aka n’ahụ́ iji mata ebe o merụrụ ahụ́. Ọ bụrụ na ọ hụ ebe o merụrụ ahụ́, ọ ga-ete ya mmanụ ka ọnyá ahụ laa ngwa ngwa. Ọ bụrụ na ahụ́ adịghị atụrụ ahụ, onye ọzụzụ atụrụ ahụ ga-agbà ya ọgwụ ma jide ya ka ọ ghara idinara ala nwụọ. N’eziokwu, ọ bụ ezigbo ihe atụ nke gosiri otú Jehova si eche banyere ndị na-achọ ime uche ya.

Ekpere na Mbilite n’Ọnwụ Na-egosi na Chineke Na-eche Banyere Anyị

Ihe mere e ji dee abụ ọma ndị ahụ na ndị ọzọ na Baịbụl abụghị naanị ka anyị na-agụ ha nakwa ka ha na-eme anyị obi ụtọ. Ha na-egosi anyị otú ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie si site n’ala ala obi ha kọọrọ Jehova mkpa ha ka o nyere ha aka, gosikwa ekele ha kelere ya maka otú o si duo ha na otú o si gọzie ha. Okwu ndị ahụ mere ka o doo anya na ndị ohu Chineke ahụ kwenyesiri ike na Chineke na-eche banyere ha. Ịgụ na ịtụgharị uche n’okwu ndị ahụ ha si n’ala ala obi ha kwuo ga-enyere anyị aka ịma na Chineke na-echekwa banyere anyị. Ekpere anyị na-ekpegara Chineke bụ otu ihe magburu onwe ya gosiri na ọ na-eche banyere anyị.

Ma, mgbe ụfọdụ, nsogbu nwere ike zuo anyị ahụ́ nke na anyị amakwaghị otú anyị nwere ike isi kpee ekpere banyere ya. Nke ahụ ọ̀ ga-eme ka Jehova ghara ịma nsogbu anyị? Ndị Rom 8:26 kwuru, sị: “Mmụọ nsọ na-enyekwara anyị aka n’adịghị ike anyị; n’ihi na anyị amaghị nsogbu nke anyị kwesịrị ikpe ekpere maka ya dị ka ọ dị anyị mkpa ịdị na-ekpe, ma mmụọ nsọ n’onwe ya na-arịọrọ anyị arịrịọ mgbe anyị na-asụ ude n’ekwughị okwu.” Amaokwu Baịbụl ahụ na-agwa anyị na ekpere ndị ohu Chineke oge ochie ji ike mmụọ nsọ kpee nwere ike igosi otú obi dị anyị, nakwa na Jehova, “onye na-anụ ekpere,” na-anụ ha ka à ga-asị na ọ bụ anyị na-ekpe ha.—Abụ Ọma 65:2.

Olileanya mbilite n’ọnwụ bụ ihe ọzọ na-emesi anyị obi ike na Chineke na-eche banyere onye ọ bụla n’ime anyị. Jizọs Kraịst kwuru, sị: “Oge awa na-abịa mgbe ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya [ya bụ, Jizọs] wee pụta.” (Jọn 5:28, 29) Ihe okwu Grik a sụgharịrị ebe ahụ pụtara bụ “ili ncheta” ọ bụghị “ili” nkịtị. Ọ na-egosi na Chineke na-echeta ụdị mmadụ onye ahụ bụ mgbe ọ dị ndụ.

Chegodị echiche, Chineke ịkpọlite mmadụ n’ọnwụ pụtara na ọ ga-ama ihe niile banyere onye ahụ, ma ọdịdị onye ahụ, ma àgwà ndị o bu pụta ụwa na ndị ọ mụtara amụta, ma echiche ya niile! (Mak 10:27) Chineke anaghị echefu onye ahụ n’agbanyeghị na ọtụtụ narị afọ agafeela kemgbe ọ nwụrụ. (Job 14:13-15; Luk 20:38) N’ihi ya, Jehova Chineke na-echeta ihe niile e ji mara ọtụtụ nde ndị nwụrụ anwụ. Nke ahụ na-egosi anyị na ọ na-eche banyere onye ọ bụla n’ime anyị!

Jehova Na-akwụ Ụgwọ Ọrụ

Olee ihe anyị ga-eme ka Chineke hụ anyị n’anya ma na-eche banyere anyị? Ihe kacha mkpa bụ igosi na anyị tụkwasịrị ya obi, na-erubere ya isi ma nwee okwukwe n’ebe ọ nọ. Pọl onyeozi mere ka o doo anya na e nwere ihe jikọrọ anyị inwe okwukwe na Chineke na Chineke iche banyere anyị. O dere, sị: ‘Ọ bụrụ na okwukwe adịghị, ọ gaghị ekwe omume ime ihe dị ya ezi mma, n’ihi na onye na-abịaru Chineke nso aghaghị ikwere na ọ dị adị, na ọ bụkwa onye na-akwụ ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.’—Ndị Hibru 11:6.

Cheta na ọ dị ihe abụọ ga-eme ka okwukwe anyị na-atọ Chineke ụtọ. Nke mbụ bụ na anyị ‘ga-ekwerịrị na ọ dị adị,’ ya bụ, anyị ga-ekwerịrị na Chineke dị adị nakwa na ọ bụ Onye Ọchịchị Kacha Elu, bụrụkwa onye anyị kwesịrị irubere isi ma na-efe. Nke abụọ bụ na anyị ga-ekwerịrị na ọ bụ “onye na-akwụ ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.” Ihe ọzọ so n’inwe ezi okwukwe bụ ikwere na Chineke na-eche banyere ọdịmma nke ndị niile na-achọsi ike ime uche ya nakwa na ọ na-akwụ ha ụgwọ ọrụ. Ọ bụrụ na ị na-amụ Okwu Chineke ma na-eso ndị na-erubere ya isi na-akpa, ị ga-enwekwa ụdị okwukwe ga-eme ka Chineke kwụọ gị ụgwọ ọrụ ma na-elekọta gị.

Ọtụtụ mmadụ taa kweere na Chineke enweghị mmasị n’ihe ụmụ mmadụ na-eme. Ma, dị ka anyị hụrụla, Baịbụl mere ka o doo anya na Chineke na-eche banyere ndị gosiri na ha nwere ezi okwukwe na ya. Taa, ọ bụ eziokwu na ihe isi ike, nchegbu, ihe agaghị otú e si chee ya, na obi ọjọọ, na-emekpakarị anyị ahụ́, anyị ekwesịghị ịtụ ụjọ. Jehova Chineke na-eche banyere anyị. N’eziokwu, ọ na-akpọ anyị òkù ka anyị bịakwute ya ka o nyere anyị aka, n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. Ọbụ abụ kwuru, sị: “Tụkwasị Jehova ibu arọ gị, ya onwe ya ga-akwadokwa gị. Ọ dịghị mgbe ọ ga-ekwe ka onye ezi omume maa jijiji.”—Abụ Ọma 55:22.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 29]

Amaokwu Akwụkwọ Nsọ Ndị Ga-eme Ka Okwukwe Gị Sie Ike na Chineke Na-eche Banyere Gị

“Anya Jehova na-ahụzu ụwa dum iji gosi ike ya maka ndị obi ha zuru ezu n’ebe ọ nọ.”—2 IHE E MERE 16:9

“Gbanye anya mmiri m n’ime karama akpụkpọ gị. Ọ̀ bụ na ọ dịghị n’akwụkwọ gị?”—ABỤ ỌMA 56:8

“Jehova bụ Onye na-azụ m dị ka atụrụ. Ọ dịghị ihe ga-akọ m.”—ABỤ ỌMA 23:1

“Gị Onye na-anụ ekpere, ọ bụ gị ka anụ ahụ́ niile bụ́ mmadụ ga-abịakwute.”—ABỤ ỌMA 65:2

“Ị ga-akpọ òkù, mụ onwe m ga-azakwa gị. N’ihi na agụụ ọrụ aka gị ga-agụsi gị ike.”—JOB 14:15

“Onye na-abịaru Chineke nso aghaghị ikwere na ọ dị adị, na ọ bụkwa onye na-akwụ ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.”—NDỊ HIBRU 11:6

“Tụkwasị Jehova ibu arọ gị, ya onwe ya ga-akwadokwa gị. Ọ dịghị mgbe ọ ga-ekwe ka onye ezi omume maa jijiji.”—ABỤ ỌMA 55:22