Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Bụ Otu Chineke Ka Okpukpe Niile Na-efe?

Ọ̀ Bụ Otu Chineke Ka Okpukpe Niile Na-efe?

Ọ̀ Bụ Otu Chineke Ka Okpukpe Niile Na-efe?

“Enwere m ihe ndị m kweere, agaghịkwa m agbanwe ha. A sị ka e kwuwe, o nweghị okpukpe na-adịghị mma ebe ọ bụ otu Chineke ka anyị niile na-efe.”

Ò NWETỤLA mgbe ị nụrụ ka mmadụ kwuru ụdị ihe a? Ọtụtụ ndị kweere na ọ dịghị okpukpe na-anaghị akụziri ndị mmadụ ife Chineke otú ọ na-anabata na ihe mere e ji kee anyị. Ọtụtụ ndị kwekwaara na okpukpe ọ bụla nwere ebe ọ dị mma, nweekwa ebe ọ na-adịghị mma, kwerekwa na o nweghị otu okpukpe ga-asị na ọ bụ naanị ya na-akụzi eziokwu ma ọ bụ na ọ bụ naanị ya na-efe Chineke otú ọ na-anabata.

A na-ekwukarị ụdị ihe a n’oge a ndị mmadụ kweere na mmadụ ekwesịghị ịkatọ okpukpe ndị ọzọ. N’ezie, a na-elekarị ndị chere na nke a abụghị eziokwu anya dị ka ndị na-anaghị anabata echiche ndị ọzọ na ndị onwe ha judịrị afọ. Olee ihe i chere? Ì chere na ọ bụ otu Chineke ka okpukpe niile na-efe? Okpukpe mmadụ na-ekpe ò nwere ike ime ka ofufe ya ghara ịdị Chineke mma?

È Nwere Ezigbo Ọdịiche na Ha?

Otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma kwuru na e nwere puku okpukpe itoolu na narị itoolu dị iche iche n’ụwa ugbu a, ụfọdụ n’ime ha dịkwa n’ọtụtụ ebe n’ụwa ma nwee ọtụtụ ndị òtù. Ngụkọ ndị e mere na-egosi na ihe dị ka mmadụ asaa n’ime mmadụ iri ọ bụla n’ụwa na-ekpe otu n’ime okpukpe ise a ma ama n’ụwa, bụ́ okpukpe Buddha, okpukpe ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst, okpukpe Hindu, okpukpe Alakụba, na okpukpe ndị Juu. Ọ bụrụ na ọ bụ otu Chineke ka okpukpe niile na-efe, o doro anya na okpukpe ise a kwesịrị inwe otu olu n’ọtụtụ ozizi ha, n’otú ha si akọwa Chineke, nakwa n’otú ha si akọwa nzube Chineke. Gịnị ka ihe àmà ndị e nwere na-egosi?

Onye Roman Katọlik bụ́ ọkà mmụta okpukpe, nke aha ya bụ Hans Küng, kwuru na ụfọdụ n’ihe okpukpe ndị a ma ama n’ụwa na-akụzi banyere otú ndị mmadụ kwesịrị isi na-emeso ibe ha bụ otu. Dị ka ihe atụ, ihe ka ọtụtụ n’ime ha na-ekwu na igbu ọchụ, ịgha ụgha, izu ohi na mmadụ idina onye ikwu ya adịghị mma, ha na-akụzikwa na ụmụaka kwesịrị ịsọpụrụ ndị mụrụ ha nakwa na ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ịhụ ụmụ ha n’anya. Ma, okpukpe ndị a a ma ama enwetụghị otu olu ma a bịa n’ihe ndị ọzọ, karịchaa n’otú ha si akọwa onye Chineke bụ.

Dị ka ihe atụ, ndị Hindu na-efe ọtụtụ chi, ma a sịrị na ndị Buddha ejighị n’aka na e nwere onye bụ́ Chineke. Ndị Alakụba na-akụzi na e nwere otu Chineke. Chọọchị ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst na-akụzikwa na e nwere otu Chineke, ma ihe ka ọtụtụ n’ime ha na-ekwukwa na Chineke bụ Atọ n’Ime Otu. Chọọchị ndị a niile na-ezikwa ọtụtụ ozizi dịgasị iche na nke ibe ha. Ndị Katọlik na-ekpegara Meri, nne Jizọs, ekpere ma, ndị Protestant anaghị eme otú ahụ. Iwu ndị Katọlik machibidoro iji ihe aka mere egbochi afọ ime, ma ihe ka ọtụtụ ná ndị Protestant enweghị ụdị iwu ahụ. Ndị Protestant enweghị otu olu n’okwu banyere nwoke idina nwoke.

Ò kwesịrị ekwesị iche na okpukpe ndị na-enweghị otu olu otú ahụ n’ozizi ha na-efe otu Chineke? Mbanụ. Kama nke ahụ, naanị ihe nke a na-eme bụ ime ka ndị mmadụ nọrọ ná mgbagwoju anya banyere onye Chineke bụ na ihe ọ chọrọ n’aka ndị na-efe ya ofufe.

Hà Na-eme Ka Ndị Mmadụ Dị n’Otu Ka Hà Na-ekewa Ha Ekewa?

Ọ bụrụ na ọ bụ otu Chineke ka okpukpe niile na-efe, nke ọ bụla n’ime ha ga na-agbalịsi nnọọ ike ime ka ụmụ mmadụ dịrị n’udo. Ihe àmà ọ̀ na-egosi na ha na-eme nke a? Akụkọ ihe mere eme na-egosi na okpukpe na-ekewa ndị mmadụ ma na-akpatara ha esemokwu kama ime ka ha dịrị n’otu. Ka anyị leba anya n’ihe atụ ole na ole.

Malite na narị afọ nke iri na otu ruo na nke iri na atọ, Krisendọm, ya bụ, mba ndị na-ekwu na ha bụ Ndị Kraịst, na mba ndị Alakụba lụrụ ọtụtụ agha a kpọrọ Agha Ntụte. Na narị afọ nke iri na asaa na Yurop, ndị Katọlik na ndị Protestant lụrụ agha were iri afọ atọ. Ndị Hindu na ndị Alakụba nọ n’India na mba ndị dị ya nso lụsoro ibe ha ọgụ na 1947 ozugbo e kwuru na mba ndị ahụ enwerela onwe ha n’aka Great Britain. N’oge na-adịchabeghị anya, ndị Katọlik na ndị Protestant lụrụ agha were ọtụtụ afọ na Northern Ireland. N’ala Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu, udo adịbeghị n’etiti ndị Juu na ndị Alakụba. Nke kacha njọ na ha niile bụ Agha Ụwa nke Abụọ, bụ́ nke ndị nọ n’okpukpe ise ahụ so lụọ. N’agha ahụ, ndị nọdị n’otu okpukpe lụsoro ndị òtù ha nọ ná mba ọzọ agha.

O doro nnọọ anya na okpukpe ndị dị n’ụwa ewetabeghị udo na ịdị n’otu, ọ bụghịkwa otu Chineke ka ha na-efe. Kama nke ahụ, ha ekewaala ụmụ mmadụ, meekwa ka ha nọrọ ná mgbagwoju anya banyere onye Chineke bụ na otú e kwesịrị isi na-efe ya. N’ihi ya, onye ọ bụla chọrọ ife ezi Chineke ofufe ga-asa anya na mmiri họrọ otú ọ ga-esi fee ya. Nke a dabara n’ihe Baịbụl, bụ́ otu n’ime akwụkwọ okpukpe ndị kacha ochie ụmụ mmadụ nwere, gbara anyị ume ka anyị mee.

Họrọnụ Onye Unu Ga-efe

Baịbụl mere ka o doo anya na ịchọta ofufe dị ezi Chineke mma chọrọ mmadụ iche echiche nke ọma na ime ezi nhọrọ. Jọshụa, bụ́ ohu Jehova Chineke, gwara mba Izrel oge ochie, sị: “Họrọnụ taa onye unu ga-efe, ma ọ̀ bụ chi niile nna nna unu hà, bụ́ ndị biri n’ofe Osimiri, fere ma ọ̀ bụ chi niile nke ndị Amọraịt unu bi n’ala ha. Ma mụ onwe m na ezinụlọ m, anyị ga-efe Jehova.” Mgbe ọtụtụ afọ gafechara, Ịlaịja onye amụma gbakwara ụmụ Izrel ume ka ha kpebie chi ha ga-efe, gwa ha sị: “Ruo ole mgbe ka unu ga na-enwe echiche abụọ dị iche? Ọ bụrụ na ọ bụ Jehova bụ ezi Chineke, sowenụ ya; ma ọ bụrụ na ọ bụ Bel [chi ndị Kenan], sowenụ ya.”—Jọshụa 24:15, 16; 1 Ndị Eze 18:21.

Ebe ndị a na ebe ndị ọzọ na Baịbụl gosiri nke ọma na ndị chọrọ ijere ezi Chineke ozi n’oge ochie sara anya na mmiri họrọ ime otú ahụ. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị n’oge anyị a. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ife ezi Chineke na ijere ya ozi, anyị aghaghị ịhọrọ ụzọ ziri ezi isi na-efe ya. Ma, olee ihe ga-enyere anyị aka ime mkpebi dị mma n’ihe banyere ife Chineke? Olee otú anyị nwere ike isi mata ndị na-efe Chineke ezi ofufe?

A Na-amata Ndị Na-efe Ezi Ofufe Site ná Mkpụrụ Ha

Jizọs Kraịst gwara ndị na-eso ụzọ ya banyere ndị na-efe Chineke ezi ofufe na ndị na-anaghị efe ya ezi ofufe, sị: “Ọ dịghị mgbe ndị mmadụ na-aghọrọ mkpụrụ vaịn n’ogwu ma ọ bụ mkpụrụ fig n’uke, ka hà na-eme otú ahụ? Otú ahụ, osisi ọma ọ bụla na-amị ezi mkpụrụ, ma osisi ọ bụla rere ure na-amị mkpụrụ na-abaghị uru; osisi ọma apụghị ịmị mkpụrụ na-abaghị uru, osisi rere ure apụghịkwa ịmị ezi mkpụrụ . . . Ya mere, n’ezie, unu ga-amata ndị ahụ site ná mkpụrụ ha.” Nke a pụtara na ihe a ga-eji amata ndị na-efe Chineke ezi ofufe bụ mkpụrụ ha, ma ọ bụ ọrụ ha. Gịnị bụ mkpụrụ ndị ahụ?—Matiu 7:16-20.

Nke mbụ bụ na ezi ofufe na-eme ka ndị kwere ekwe dị n’otu ma hụ onwe ha n’anya. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ana m enye unu iwu ọhụrụ, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya; dị nnọọ ka m hụrụ unu n’anya, ka unu na-ahụrịtakwa ibe unu n’anya. Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” Ezi ndị na-eso ụzọ Kraịst ga-ahụrịrị onwe ha n’anya nke na ndị niile na-ahụ ha ga-eji ya mara na ọ bụ ha bụ ndị na-efe Chineke ezi ofufe.—Jọn 13:34, 35.

N’ihi ya, ezi Ndị Kraịst agaghị anwa anwa lụso ibe ha agha. Ndị chọọchị hà na-ezere ịlụ agha? N’Agha Ụwa nke Abụọ, naanị okpukpe a ma ama nke jụrụ nnọọ ịkwado agha ahụ n’ụzọ ọ bụla bụ Ndịàmà Jehova. Dr. Hanns Lilje, onye bụ́bu bishọp nke Chọọchị Protestant dị na Hannover, Germany, dere banyere Ndịàmà, sị: “Ọ bụ naanị ha bụ okpukpe a ma ama nke nwere ike ikwu na akọ na uche ha ekweghị ha tinye aka n’agha ndị a lụrụ n’oge Ọchịchị Ndị Nazi.” N’agha ahụ, Ndịàmà nọ n’ọtụtụ mba họọrọ ịta ahụhụ kama ịkwado agha ahụ ma ọ bụ tinye aka na ya.

Olee mkpụrụ ndị ọzọ Jizọs bu n’obi na a ga-eji amata ezigbo ndị na-eso ụzọ ya? Lee otú Jizọs si malite ekpere ahụ a na-akpọkarị Ekpere Onyenwe Anyị: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” Ihe Jizọs butere ụzọ bụ ido aha Chineke, bụ́ Jehova, nsọ. Ihe o kwuru gosiri na ọ chọrọ ka Alaeze Chineke mee ka uche Jehova mee n’ụwa. Olee okpukpe e ji ịkpọsa aha ahụ bụ́ Jehova mara na nke e ji ikwusa na Alaeze Chineke bụ naanị ihe ga-eme ka udo dịrị n’ụwa mara? Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ ná mba na ókèala dị narị abụọ na iri atọ na isii, na-ekesa akwụkwọ e ji amụ Baịbụl n’ihe karịrị narị asụsụ anọ na iri asaa.—Matiu 6:9, 10.

Ndịàmà Jehova na-esokwa ihe nlereanya Jizọs n’izere esemokwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ụdị esemokwu ndị ọzọ. Jizọs kwuru banyere ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ha abụghị nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị nke ụwa.” E wezụga nke ahụ, Ndịàmà kweere na Baịbụl bụ Okwu Chineke, obi sikwara ha ike na “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ bara uru iji ya zie ihe, iji ya dọọ mmadụ aka ná ntị, iji ya mee ka ihe guzozie, na iji ya nye ọzụzụ n’ezi omume, ka onye nke Chineke wee ruo eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ onye a kwadebere n’ụzọ zuru ezu ịrụ ezi ọrụ niile.”—Jọn 17:14, 17; 2 Timoti 3:16, 17.

Ezi Okpukpe Dị Iche

Mkpụrụ ndị a, bụ́ inwe ịhụnanya nke na-eme ka mmadụ ghara ịchọ naanị ọdịmma nke ya, ịchọ ka e doo aha Jehova nsọ, ikwusa Alaeze Chineke, ịnọpụ iche n’ụwa, na inwe okwukwe na Baịbụl, bụcha ihe e ji ama ndị na-efe Chineke ezi ofufe. Mkpụrụ ndị dị otú a na-emekwa ka ndị na-efe Chineke ezi ofufe dịrị iche n’okpukpe ndị ọzọ. Otu nwaanyị ya na Ndịàmà Jehova kwurịtarala okwu ọtụtụ ugboro kwuru echiche ya, sị: “Amaara m ọtụtụ okpukpe, ha niile yikwara. Ọ bụ naanị unu bụ ndị dị nnọọ iche ná ndị ọzọ niile.”

O doro anya na ọ bụghị otu Chineke ka okpukpe niile na-efe. Ma, e nwere otu okpukpe dị iche ná ndị niile ọzọ. Ha bụ Ndịàmà Jehova, ha akarịakwala nde mmadụ asaa n’ụwa dum. Ịkpọsa Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, na ịgbaso ihe o kwuru enyerela ha aka ime ka ndị si ná mba dị iche iche, asụsụ dị iche iche, na agbụrụ dị iche iche dịrị n’otu n’ofufe ha na-efe ezi Chineke, bụ́ Jehova, bụ́ ihe okpukpe ma ọ bụ òtù ọ bụla ọzọ na-enwebeghị ike ime. Obi ga-atọ ha ụtọ inyere gị aka ịmụ banyere ezi Chineke, ịmụta ihe ndị ọ chọrọ n’aka gị, na inwe udo na ahụ́ iru ala a na-enweta n’ife Chineke otú ọ chọrọ. Nke a ọ́ bụghị ihe i kwesịrị ịgbalị ime?

[Foto dị na peeji nke 14]

Ebe ụkọchukwu Chọọchị Ọtọdọks na-agọzi ìgwè ndị agha ọhụrụ na Ukraine, n’afọ 2004

[Ebe E Si Nweta Foto]

GENIA SAVILOV/AFP/Getty Images

[Foto dị na peeji nke 15]

Ndịàmà Jehova na-akụziri ndị nọ n’ebe niile ihe banyere Chineke na Alaeze ya

[Ebe e sigasị nweta foto dị na peeji nke 12]

Peeji nke 12: Nwaanyị Buddha: © Yan Liao/Alamy; Onye nsọ ndị Hindu: © imagebroker/Alamy; peeji nke 13: Nwoke na-agụ Koran: Mohamed Amin/Camerapix; Nwoke Juu: Todd Bolen/Bible Places.com