Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Ọ̀ Na-agbanwe Obi Ya?

Chineke Ọ̀ Na-agbanwe Obi Ya?

Chineke Ọ̀ Na-agbanwe Obi Ya?

BAỊBỤL kwuru banyere Chineke, sị: “Ọ dịghị agbanwe agbanwe, ọ dịghị ka onyinyo nke na-atụgharị atụgharị.” Chineke mesikwara anyị obi ike n’onwe ya, sị: “Abụ m Jehova; adịghị m agbanwe agbanwe.” (Jems 1:17; Malakaị 3:6) Jehova Chineke dị nnọọ iche n’ebe ụmụ mmadụ ndị ọ na-esi ike imeta mma na ịtụkwasị obi nọ maka na ha na-agbanwe obi ha mgbe niile!

Ma, ụfọdụ ndị na-agụ Baịbụl na-eche ma ọ̀ ga-abụ na Chineke agbanweela obi ya. Dị ka ihe atụ, o nwere mgbe Jehova Chineke nyere Ndị Kraịst ikike ịrụ ọrụ ebube, ma ugbu a, ọ nakwaghị enye ha ụdị ikike ahụ. N’oge ochie, Chineke kwere ka ndị ohu ya na-alụ ihe karịrị otu nwaanyị, ma ugbu a, ọ nakwaghị ekwe ha mee otú ahụ. N’Iwu Mozis, Jehova kwuru ka ndị ohu ya na-edebe Ụbọchị Izu Ike, ma ugbu a, ọ chọghị ka ha na-edebe ya. Ihe atụ ndị a ọ́ naghị egosi na Chineke agbanweela?

Ihe mbụ anyị ga-eburu n’obi bụ na ịhụnanya na ikpe ziri ezi Chineke anaghị agbanwe agbanwe. O nwebeghịkwa mgbe “nzube ebighị ebi” ya, nke bụ́ iji Alaeze ya wetara ụmụ mmadụ ngọzi, gbanwere. (Ndị Efesọs 3:11) Ma, dị nnọọ ka i nwere ike ịgbanwe obi gị n’ebe onye na-eme ihe na-ewute gị mgbe niile nọ, Jehova na-agbanwekwa ihe ọ chọrọ ime mgbe ihe gbanwere.

Chineke na-agbanwekwa ntụziaka ọ na-enye ndị ya dabere n’ọnọdụ ha nọ na ihe ndị dị ha mkpa. Nke a ekwesịghị iju anyị anya. Chegodị echiche ihe onye bụ́ aka ochie n’idugharị ndị bịara ilegharị anya ga-eme mgbe ọ hụrụ na nsogbu dị n’ihu. Ọ ga-agwa ndị ahụ o du ka ha soro ụzọ ọzọ nke nsogbu na-adịghị. Ma, nke ahụ apụtaghị na ọ gbanweela obi ya banyere ebe o du ha aga, ka ọ̀ bụ ihe ọ pụtara? Ya mere, ka anyị leba anya n’ihe atọ ahụ e kwuru okwu ha bụ́ ndị na-eju ụfọdụ ndị anya.

Olee Ihe Mere Ọrụ Ebube Ji Kwụsị?

Gịnị mere Chineke ji nye ụfọdụ Ndị Kraịst ikike ịrụ ọrụ ebube na narị afọ mbụ? O nwere ike ịbụ na ị maara na mgbe Izrel bụ mba Chineke họọrọ, o ji ọrụ ebube gosi ugboro ugboro na ya nọnyeere ha. Chineke si n’aka Mozis gosi ike ya na-enweghị atụ mgbe ọ napụtara Izrel n’aka Ijipt ma duo ha n’ala ịkpa ruo mgbe o dubara ha n’Ala Nkwa ahụ. Ọ dị mwute na ọtụtụ ugboro ndị Izrel gosiri na ha enweghị okwukwe na Chineke. Mgbe Jehova mechara jụ mba Izrel ma hiwe ọgbakọ Ndị Kraịst, o nyere ndịozi na ndị ọzọ ikike ịrụ ọrụ ebube. Dị ka ihe atụ, ndịozi bụ́ Pita na Jọn gwọrọ otu nwoke dara ngwọrọ site n’afọ nne ya, Pọl mekwara ka onye nwụrụ anwụ dịrị ndụ. (Ọrụ 3:2-8; 20:9-11) Ọrụ ebube ndị ha rụrụ mere ka ọtụtụ ndị ghọọ Ndị Kraịst n’ọtụtụ ala. Gịnịzi mere ọrụ ebube ji kwụsị?

Pọl onyeozi ji ihe atụ kọwaa ya, sị: “Mgbe m bụ nwa ọhụrụ, m na-ekwu okwu dị ka nwa ọhụrụ, na-eche echiche dị ka nwa ọhụrụ, na-ele ihe anya dị ka nwa ọhụrụ; ma ugbu a m ghọrọ dimkpa, ahapụwo m omume nwa ọhụrụ.” (1 Ndị Kọrịnt 13:11) Otú ahụ nne na nna na-anaghị emeso nwa ha torola eto ihe otú ha si emeso nwa ha nke dị obere, Jehova gbanwekwara otú o si emeso ọgbakọ Ndị Kraịst ihe mgbe ọ ghọrọ “dimkpa.” Pọl onyeozi kwuru na “a ga-ewepụ” onyinye ọrụ ebube ndị dị ka ịsụ asụsụ mba ọzọ ma ọ bụ ibu amụma.—1 Ndị Kọrịnt 13:8.

Olee Ihe Mere Chineke Ji Kwe Ka Ndị Ya Na-alụ Karịa Otu Nwaanyị?

Jizọs gosiri na Chineke nyere iwu ga na-achị alụmdi na nwunye mgbe Ọ gwara di na nwunye mbụ, sị: “Nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ́.” (Matiu 19:5) Chineke bu n’obi ka alụmdi na nwunye jikọta nwoke na nwaanyị ruo mgbe ebighị ebi. Ma, mgbe Chineke mere ka ụmụ Izrel ghọọ mba ma nye ha Iwu Mozis, ịlụ karịa otu nwaanyị ezuola ebe niile. N’ihi ya, ọ bụ ezie na ọ bụghị Chineke kwuru ka a lụwa ihe karịrị otu nwaanyị, o nweghịkwanụ onye ọ sịrị mee otú ahụ, o nyere iwu dị iche iche iji chịkwaa ya. Mgbe e hiwere ọgbakọ Ndị Kraịst, Okwu Chineke machiri nnọọ ịlụ karịa otu nwaanyị.—1 Timoti 3:2.

Jehova Chineke na-ahapụ ihe ụfọdụ ruo mgbe oge ruru ka ọ gbanwee ha. (Ndị Rom 9:22-24) Jizọs gosiri na ihe mere Jehova ji hapụ ndị Izrel ka ha na-alụ nwaanyị otú ọ na-achọghị ruo oge ụfọdụ bụ maka na ‘obi kpọrọ ha nkụ.’—Matiu 19:8; Ilu 4:18.

Olee Ihe Mere E Ji Kwụsị Idebe Ụbọchị Izu Ike?

Chineke nyere iwu ka a na-edebe Ụbọchị Izu Ike kwa izu mgbe ọ napụtachara ụmụ Izrel n’Ijipt. O mechara tinye ya n’Iwu na-achị mba ahụ. (Ọpụpụ 16:22-30; 20:8-10) Pọl onyeozi kwuru na Jizọs ji onwe ya chụọ àjà wee ‘wepụ Iwu ahụ nke ihe mejupụtara ya bụ ntụziaka na ụkpụrụ,’ “hichapụkwa ihe ahụ e ji aka dee.” (Ndị Efesọs 2:15; Ndị Kọlọsi 2:14) Iwu Ụbọchị Izu Ike so n’Iwu ahụ e “wepụrụ,” “hichapụkwa” n’ihi na Baịbụl kwukwara, sị: “Ya mere, unu ekwela ka onye ọ bụla kpee unu ikpe n’iri ihe oriri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ ma ọ bụ n’ihe banyere ememme ma ọ bụ banyere ememme ọnwa ọhụrụ ma ọ bụ banyere ụbọchị izu ike.” (Ndị Kọlọsi 2:16) Oleedị ihe mere Chineke ji nye Iwu Mozis, bụ́ nke iwu Ụbọchị Izu Ike ahụ dị na ya?

Pọl onyeozi dere, sị: “Iwu ahụ aghọwo onye nduzi anyị nke na-eduru anyị gakwuru Kraịst.” Ya edezie, sị: “Ebe ọ bụ na okwukwe ahụ abịala, anyị anọkwaghị n’okpuru onye nduzi.” (Ndị Galeshia 3:24, 25) Chineke agbanweghị obi ya, kama nke ahụ, o ji iwu Ụbọchị Izu Ike nke dịruru nwa oge kụziere ndị mmadụ na ha kwesịrị ịna-ewepụta oge mgbe niile iji tụgharịa uche n’ihe metụtara ofufe Ya. Ọ bụ ezie na iwu Ụbọchị Izu Ike dịrị naanị nwa oge, o gosiri na oge na-abịa mgbe ụmụ mmadụ ga-ezu ike, ya bụ, nwere onwe ha ná nsogbu anụ ahụ́ na nke ime mmụọ.—Ndị Hibru 4:10; Mkpughe 21:1-4.

Chineke nke Kwesịrị Ntụkwasị Obi na nke Na-ahụ n’Anya

Ihe atụ ndị a dị na Baịbụl anyị lebara anya gosiri na Jehova Chineke gbanwere nduzi na ntụziaka ndị o nyere mgbe ụfọdụ. Ma, nke ahụ apụtaghị na ọ gbanwere obi ya. Kama nke ahụ, o nyere iwu ndị ahụ n’ihi ọnọdụ dị iche iche ndị ya nọrọ, ọ bụkwa maka ọdịmma ha. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị taa

Ebe ọ bụ na Jehova anaghị agbanwe ụkpụrụ ya agbanwe, o nweghị mgbe anyị na-enweghị ike ịmata ihe ọ chọrọ ka anyị mee iji mee ya obi ụtọ. Anyị kwesịkwara inwe obi ike na ihe niile Chineke kwere ná nkwa ga-emezu. Jehova kwuru, sị: “Ihe niile dị m ụtọ ka m ga-eme . . . Akpụwo m ya, m ga-emekwa ya.”—Aịzaya 46:10, 11.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 21]

Ịhụnanya na ikpe ziri ezi Chineke anaghị agbanwe agbanwe

[Ihe odide gbatụru okpotokpo nke dị na peeji nke 22]

Pọl kwuru na “a ga-ewepụ” onyinye ọrụ ebube ka oge na-aga

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 23]

Chineke bu n’obi ka alụmdi na nwunye jikọta nwoke na nwaanyị ruo mgbe ebighị ebi