Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ha Hụrụ Okwu Chineke n’Anya

Ha Hụrụ Okwu Chineke n’Anya

Ha Hụrụ Okwu Chineke n’Anya

A NA-ASỤGHARỊKARỊ ozi ndị dị mkpa n’ọtụtụ asụsụ iji hụ na mmadụ niile nwere ike ịghọta ha ghọtara ha. Baịbụl, bụ́ Okwu Chineke, nwere ozi dị mkpa. Ọ bụ ezie na e dere Baịbụl ọtụtụ afọ gara aga, e dere ihe ndị dị n’ime ya “iji nye anyị ntụziaka,” ọ na-akasikwa anyị obi ma na-eme ka anyị nwee olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu.—Ndị Rom 15:4.

N’ihi ya, o kwesịrị nnọọ ekwesị ka Baịbụl, bụ́ nke nwere ozi kasị mkpa e detụrụla, dịrị n’ọtụtụ asụsụ. Kemgbe ụwa, ndị mmadụ agbaala mbọ ịsụgharị Baịbụl n’agbanyeghị ọrịa, mmachibido iwu gọọmenti, na ọbụna egwu e yiri ha na a ga-egbu ha. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ha hụrụ Okwu Chineke n’anya. Ihe anyị na-aga ịkọ ugbu a bụ akụkọ magburu onwe ya nke otú e sirila sụgharịa Baịbụl.

“Ndị Bekee Na-akacha Aghọta Iwu Kraịst n’Asụsụ Bekee”

Mgbe a mụrụ John Wycliffe n’ihe dị ka afọ 1330, asụsụ e ji ekwu okwuchukwu n’England bụ Latịn. Ma, asụsụ ndị nkịtị na-asụ kwa ụbọchị bụ Bekee. Ha na-eji Bekee agwa ndị agbata obi ha okwu, jirikwa ya na-ekpegara Chineke ekpere.

Wycliffe, bụ́ onye ụkọchukwu Katọlik, na-asụ nnọọ Latịn nke ọma. N’agbanyeghị nke ahụ, o chere na o zighị ezi iji Latịn, bụ́ asụsụ ndị gụrụ akwụkwọ, akụzi Akwụkwọ Nsọ. O dere, sị: “E kwesịrị iji asụsụ ndị mmadụ kacha aghọta akụziri ha iwu Chineke, n’ihi na ihe a na-akụziri ha bụ okwu Chineke.” N’ihi ya, Wycliffe kpọkọtara ndị nsụgharị iji sụgharịa Baịbụl na Bekee. O were ha ihe dị ka iri afọ abụọ ịsụgharịcha ya.

Chọọchị Katọlik achọghị ka a sụgharịa Baịbụl. Akwụkwọ bụ́ The Mysteries of the Vatican kọwara ihe mere chọọchị Katọlik achọghị ka a sụgharịa Baịbụl, sị: “O mere ka ndị nkịtị na chọọchị nwee ike iji ozizi dị mfe nke Ndị Kraịst oge ochie tụnyere okpukpe Katọlik nke oge ha . . . Ndị mmadụ bịara nnọọ mata nnukwu ọdịiche dị n’etiti ozizi Onye malitere okpukpe Ndị Kraịst, na ozizi nke onye ji aka ya mee onwe ya osote ya [bụ́ poopu].”

Poopu Gregory nke Iri na Otu nyere iwu ise katọrọ Wycliffe. Ma, onye nsụgharị ahụ ekweghị ka nke ahụ kụda ya obi. Ọ zara ya, sị: “Ndị Bekee na-akacha aghọta iwu Kraịst n’asụsụ Bekee. Mozis nụrụ iwu Chineke n’asụsụ ya, otú ahụkwa ka ọ dị ndịozi Kraịst.” Ihe dị ka n’afọ 1382, obere oge tupu Wycliffe anwụọ, Wycliffe na ndị òtù ya wepụtara Baịbụl Bekee mbụ zuru ezu. Mgbe ihe dị ka afọ iri gasịrị, otu n’ime ndị ya na ha rụrụ ọrụ degharịrị Baịbụl ahụ ma wepụta nke ka mfe ọgụgụ.

Ebe ọ bụ na e nwebeghị ígwè obibi akwụkwọ n’oge ahụ, e ji aka depụta Baịbụl nke ọ bụla, bụ́ ọrụ nwere ike iwe ọnwa iri! Ma, o wutere chọọchị na a na-ekesa Baịbụl nke na otu achịbishọp kwuru na ya ga-achụpụ onye ọ bụla gụrụ ya na chọọchị. Ihe karịrị iri afọ anọ Wycliffe nwụchara, nzukọ ndị isi chọọchị Katọlik nyere ndị ụkọchukwu iwu ka ha gwupụta ozu ya, kpọọ ọkpụkpụ ya ọkụ ma wụba ntụ ya n’osimiri Swift. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị ji obi ha niile na-achọ eziokwu nọ na-achọ inweta Baịbụl Wycliffe. Prọfesọ William M. Blackburn kọrọ, sị: “E depụtaghachiri ọtụtụ Baịbụl Wyclif, kesaa ha n’ọtụtụ ebe, hapụkwara ha ọgbọ sochirinụ.”

Baịbụl Nwata Ji Anụmanụ Akọ Ubi Ga-agụli

N’ime narị afọ abụọ, a kwụsịrị ịsụ ụdị Bekee Wycliffe ji sụgharịa Baịbụl ya ahụ. Ọ nọ na-ewute otu nwa okorobịa bụ́ ụkọchukwu nke bi nso n’obodo Bristol na ọ bụ naanị mmadụ ole na ole na-aghọta Baịbụl. N’otu oge, ụkọchukwu ahụ, bụ́ William Tyndale, nụrụ ebe otu nwoke gụrụ akwụkwọ kwuru na ọ ga-aka mma ịnọ n’enweghị iwu Chineke kama ịnọ n’enweghị iwu poopu. Tyndale zara ya na ọ bụrụ na Chineke ekwe ya, na ya ga-ahụ na, n’oge na-adịghị anya, ọbụna nwata ji anụmanụ akọ ubi maara Baịbụl karịa nwoke ahụ gụrụ akwụkwọ.

Ọ bụ na Vulgate Latịn ka Wycliffe si sụgharịa Akwụkwọ Nsọ ma jiri aka depụta ya. N’afọ 1524, mgbe Tyndale hapụrụla England gaa Germany, ọ malitere ịsụgharị Baịbụl site n’ihe odide Hibru na Grik ochie, nyezie otu ụlọ ọrụ obibi akwụkwọ dị na Cologne ọrụ ibipụta Akwụkwọ Nsọ ahụ ọ sụgharịrị. N’oge na-adịghị anya, ndị iro Tyndale matara na ọ na-asụgharị Baịbụl, ha mekwara ka Òtù Ndị Omeiwu Cologne nye iwu ka a chịtachaa ndị niile e bipụtarala.

Tyndale gbagara obodo Worms, Germany, ma maliteghachi ọrụ ya. N’oge na-adịghị anya, e bugara Akwụkwọ Nsọ Grik Tyndale sụgharịrị na Bekee n’England na nzuzo. N’ime ọnwa isii, e reela ọtụtụ n’ime ya nke na a kpọrọ nzukọ ọdụrụkọ nke ndị bishọp ma nye iwu ka a malite ịgba Baịbụl ọkụ.

Iji kwụsị ndị mmadụ ịgụ Baịbụl na iji taa Tyndale ahụhụ maka okwukwe a sịrị na ọ jụrụ, bishọp London nyere Sir Thomas More ọrụ ide ihe ndị na-adịghị mma banyere Tyndale. Ihe kasị wee More iwe bụ na Tyndale dere okwu bụ́ “ọgbakọ” ná nsụgharị Baịbụl ya kama ide “chọọchị,” deekwa “onye tọrọ mmadụ” ma ọ bụ “okenye” kama ide “ụkọchukwu.” Okwu ndị a mere ka e nyowe ọkwá poopu enyowe ma mee ka a ghara inwezi ọdịiche n’etiti ndị ụkọchukwu na ndị nkịtị. Thomas More katọkwara otú Tyndale si sụgharịa okwu Grik bụ́ a·gaʹpe “ịhụnanya” kama ịbụ “ọrụ ebere.” Akwụkwọ bụ́ If God Spare My Life kwuru, sị: “Nke a ga-emebikwara Chọọchị ihe, n’ihi na iwepụ okwu ahụ bụ́ ọrụ ebere nwere ike ime ka chọọchị gharazie ịna-enweta ọtụtụ onyinye, ego indọljens na ọtụtụ ihe onwunwe a na-agwa ndị chọọchị ka ha na-eweta iji nwee ike ịga eluigwe.”

Thomas More gbara ndị mmadụ ume ka ha kpọwa “ndị jụrụ okwukwe” ọkụ, bụ́ nke mere ka a nyagbuo Tyndale ma kpọọ ozu ya ọkụ n’elu osisi n’October 1536. E mechakwaranụ bee Thomas More n’onwe ya isi mgbe ihe ya na-adịkwaghị eze mma. N’agbanyeghị nke ahụ, Chọọchị Roman Katọlik mere ya senti n’afọ 1935, Poopu John Paul nke Abụọ kwanyekwaara More ùgwù n’afọ 2000, kpọọ ya senti na-echebe ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

Ọ dịghị onye kwanyeere Tyndale ụdị ùgwù ahụ. Ma, tupu ya anwụọ, enyi ya bụ́ Miles Coverdale chịkọtara nsụgharị Tyndale ka ọ ghọọ otu Baịbụl zuru ezu, bụ́ Baịbụl Bekee mbụ e si n’asụsụ ndị mbụ e ji dee Baịbụl sụgharịa! Nwatakịrị ọ bụla ji anụmanụ akọ ubi nweziri ike ịgụ Okwu Chineke. Oleekwanụ banyere Baịbụl ndị a sụgharịrị n’asụsụ ndị ọzọ na-abụghị Bekee?

‘O Nweghị Ihe Ga-eme Ka Ọ Rụlie Ya’

Onye Britain na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ bụ́ Robert Morrison, bu nnọọ ibipụta Baịbụl Chinese zuru ezu n’obi banye ụgbọ mmiri gawa China n’afọ 1807, n’agbanyeghị na ndị ezinụlọ ya na ndị enyi ya achọghị ka ọ gaa. Ọrụ nsụgharị ahụ ọ gara ịrụ adịghị mfe. Onyeisi oche nke otu nnukwu ụlọ ọrụ dị n’India n’oge ahụ bụ́ Charles Grant kwuru, sị: “O nweghị ihe ga-eme ka ọ rụlie ọrụ ahụ.”

Mgbe Morrison rutere, ọ nụrụ na a gwara ndị China na a ga-egbu onye ọ bụla kụziiri onye ọbịa asụsụ ha. Iji chebe onwe ya na ndị kweere ịkụziri ya asụsụ ahụ, Morrison apụtaghị èzí ruo oge ụfọdụ. Otu akụkọ kwuru na “mgbe ọ mụchara asụsụ ndị a na-asụ n’obodo ahụ afọ abụọ, ọ sụwara Mandarin na ihe karịrị otu olumba a na-asụ n’ebe ahụ, na-asụkwa ma na-ede” asụsụ ahụ ede. N’oge ahụ, eze ukwu obodo ahụ tiri iwu nke kwuru na a ga-egbu onye ọ bụla bipụtara akwụkwọ Ndị Kraịst. N’agbanyeghị ihe ize ndụ dị na ya, na November 25, 1819, Morrison sụgharịchara Baịbụl dum n’asụsụ Chinese.

Ka ọ na-erule afọ 1836, e biela ihe dị ka puku Baịbụl abụọ zuru ezu, iri puku Akwụkwọ Nsọ Grik, na iri puku atọ na otu puku nke akụkụ dị iche iche nke Akwụkwọ Nsọ n’asụsụ Chinese. Ịhụ Okwu Chineke n’anya mere ka ọ rụọ ọrụ a sịrị na “o nweghị ihe ga-eme ka ọ rụlie” ya.

Baịbụl A Dụnyere n’Ime Ohiri Isi

Izu abụọ onye America na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ, bụ́ Adoniram Judson na nwunye ya, bụ́ Ann, lụchara na February 1812, ha malitere ogologo njem nke mesịrị buga ha Burma, * bụ́ ebe ha biriziiri n’afọ 1813. Ha malitere ozugbo ịmụ asụsụ Burmese, bụ́ otu n’ime asụsụ ndị kasị sie ike mmụta n’ụwa. Mgbe Judson mụsịrị asụsụ ahụ afọ ole na ole, o dere, sị: “Anyị malitere ịmụ asụsụ ndị bi n’akụkụ ọzọ nke ụwa, ndị otú ha si eche echiche na-eyitụdịghị nke anyị . . . Anyị enweghị akwụkwọ ọkọwa okwu, anyị enweghịkwa onye nsụgharị ga-akọwara anyị otu mkpụrụ okwu.”

Otú ịmụ asụsụ ahụ si sie ike emeghị ka ike gwụ Judson. Ọ sụgharịchara Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst na Burmese n’ọnwa June 1823. Ka e mesịrị, a malitere ịlụ agha na Burma. Ebe ọ bụ na e nyowere Judson enyowe na ọ bụ onye nledo, a tụrụ ya mkpọrọ, jiri ụzọ agbụ ígwè atọ kpọchie ya ma kegide agbụ ígwè ndị ahụ n’otu ogologo ókpòrò ígwè ka ọ ghara ịgba ọsọ. N’akwụkwọ Francis Wayland dere n’afọ 1853 banyere ndụ Judson, o kwuru, sị: “Otu n’ime ihe ndị mbụ Maazị Judson jụrụ ajụjụ ha ozugbo e kwere ka ya na Oriakụ Judson nọkọọ sụọ Bekee bụ ihe odide nsụgharị Agba Ọhụrụ ya.” Ebe ọ bụ na ụjọ tụrụ Ann na udè na ebu nwere ike imebi akwụkwọ ndị ahụ n’ebe e liri ha n’ala ụlọ ha, ọ dụnyere ha n’ime ohiri isi ma wetara ya di ya n’ụlọ mkpọrọ. N’agbanyeghị oké ihe isi ike ndị ahụ, ihe odide ndị ahụ emebighị.

Mgbe Judson nọsịrị ọtụtụ ọnwa n’ụlọ mkpọrọ, a tọhapụrụ ya. Ma ọṅụ ya adịteghị aka. Ka oge gatụkwuru n’afọ ahụ, oké ahụ́ ọkụ jichiri Ann, mgbe izu ole na ole gasịkwara, ọ nwụrụ. Naanị ọnwa isii Ann nwụchara, ada ya nwaanyị bụ́ Maria, onye dị ihe dị ka naanị afọ abụọ, dakwara ọrịa na-enweghị ọgwụgwọ ma nwụọ. Ọ bụ ezie na obi gbawara Judson, ọ gara n’ihu n’ọrụ ya. O mechara sụgharịchaa Baịbụl dum n’afọ 1835.

Ị̀ Hụrụ Okwu Chineke n’Anya?

Ụdị ịhụnanya ndị nsụgharị a hụrụ Okwu Chineke abụghị ihe ọhụrụ. N’Izrel oge ochie, otu ọbụ abụ bụkuru Jehova Chineke abụ, sị: “Lee ka m si hụ iwu gị n’anya! Ọ bụ ihe m na-atụgharị n’uche ogologo ụbọchị dum.” (Abụ Ọma 119:97) Ọ bụghị naanị na Baịbụl bụ ezigbo akwụkwọ. Ozi dị mkpa dị na ya. Ị̀ na-atụgharị Okwu Chineke n’uche site n’ịgụchi ya anya? Ọ bụrụ na ị na-eme otú ahụ ma na-agba mbọ ime ihe ndị ị mụtara na ya eme, ị “ga-enwe obi ụtọ n’ime ya eme.”—Jems 1:25.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 22 A na-akpọzi Burma na asụsụ Burmese Myanmar.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 8]

“Ndị Bekee na-akacha aghọta iwu Kraịst n’asụsụ Bekee.”—JOHN WYCLIFFE

[Foto ndị dị na peeji nke 9]

William Tyndale na otu peeji nke Baịbụl Tyndale

[Ebe E Si Nweta Foto]

Tyndale: E nwetara ya n’akwụkwọ bụ́ The Evolution of the English Bible

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Robert Morrison na Baịbụl zuru ezu ọ sụgharịrị na Chinese

[Ebe e sigasị nweta foto]

Ndị ji ya bụ Ngalaba Akwụkwọ Ndị Metụtara Eshia n’Ọ́bá Akwụkwọ Nzukọ Ezumezu

Robert Morrison, ebe W. Holl sere ya n’akwụkwọ bụ́ The National Portrait Gallery Volume IV, nke e biri n’ihe dị ka 1820 (litho), Chinnery, George (1774-1852) (after)/Private Collection/Ken Welsh/The Bridgeman Art Library International

[Foto ndị dị na peeji nke 11]

Adoniram Judson na Baịbụl ọ sụgharịrị n’asụsụ Burmese

[Ebe E Si Nweta Foto]

Judson: Nke John C. Buttre sere/Dictionary of American Portraits/Dover

[Ebe e sigasị nweta foto dị na peeji nke 8]

Wycliffe: E nwetara ya n’akwụkwọ bụ́ The History of Protestantism (Vol. I); Baịbụl: A natara American Bible Society Library, New York, ikike