Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Njem Anyị Mere Gaa “Obodo Dị Ezigbo Anya n’Ụwa”

Njem Anyị Mere Gaa “Obodo Dị Ezigbo Anya n’Ụwa”

Akwụkwọ Ozi Si Russia

Njem Anyị Mere Gaa “Obodo Dị Ezigbo Anya n’Ụwa”

OBERE ụgbọelu anyị ji na-eme njem feliri na Yakutsk, jiri nnọọ nwayọọ gafee ndagwurugwu Tuymaada. Anyị gbafere ọdọ mmiri dị iche iche kpụkọrọ akpụkọ, gbafeekwa ugwu Verkhoyanskiy. Ugwu Verkhoyanskiy bụ ọtụtụ ugwu snoo kpuchiri elu ha, ezigbo anwụ ana-achakwa na ha. Anyị gbara narị kilomita itoolu, mechazie fedata n’obodo Deputatskiy.

Ọ bụ otú a ka m si malite njem m mere gaa Sakha Republic, bụ́kwa ebe a na-akpọ Yakutia. Obodo a mara ezigbo mma ma sie ike obibi n’ihi otú ebe ahụ dị. O buru ibu karịa Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe niile. N’oge ọkọchị, obodo a na-ekpo ezigbo ọkụ, ma n’oge oyi, ya ajụọ ezigbo oyi. E nwere ọtụtụ ihe ochie a na-egwute n’ala, bụ́ ndị na-egosi ụmụ anụmanụ ndị e nwere n’ebe ahụ n’oge gboo. Ọ bụ eziokwu na ọ dịla ezigbo anya m gasọrọ obodo a, ọ na-adị m ka ọ̀ bụ ụnyaahụ ka m nọ na-ele nnukwu alụlụ kpuchiri obodo nta a na obere ìhè na-egbuke egbuke n’ebe ahụ, na-elekwa ndị obodo Yakut ahụ́ gbasiri ike ka ihu bụ ha naanị ọchị.

Ọ bụghị naanị obodo Deputatskiy ka anyị gara. Mụ na ndị mụ na ha so gakwara obodo ụfọdụ ndị ọzọ. Nke mbụ bụ Khayyr, dị narị kilomita atọ ma ị gawa ime ime ebe ugwu, ọ dịkwa nso n’Oké Osimiri Laptev, n’ebe ugwu Siberia. Gịnị mere anyị ji mee njem a? E nwere mgbe Onyeàmà Jehova bịara n’obodo ndị ahụ, chọpụta na e nwere ọtụtụ ndị chọrọ ịmụtakwu ihe Baịbụl na-akụzi. Ọ dabaziri na anyịnwa bụ́ ndị bi na Yakutsk, nke dị otu puku kilomita site n’obodo ndị ahụ, kacha biri ha nso! Anyị chere na e kwesịrị ịgba ndị a ume ma nyere ha aka.

Mgbe anyị bịarutere n’obodo Deputatskiy, anyị hụrụ otu nwoke nya ụgbọala na-aga Khayyr, ya ekwetakwa ịnara anyị obere ego buruo anyị n’obodo ahụ. Mgbe anyị hụrụ na ụgbọala ya emeela ochie, hụkwa na ọ dịchaghị mma, o sitụụrụ anyị ike ịbanye ya. Ma, anyị mechara banye, ya eburu anyị ná mgbede ahụ gawa obodo ahụ. Anyị amatụdịghị ihe ndị na-aga ime.

Oche ndị dị n’ụgbọala ahụ jụrụ ezigbote oyi otú ala nkịtị jụrụ, anyị chọpụtakwara ozugbo na ha agaghị emecha kpoo ọkụ. Mgbe obere ohere dapụtara, anyị gwara ọkwọ ụgbọala ahụ ka ọ kwụsịtụ ka anyị were uwe oyi anyị ga-eji kpuchie onwe anyị, anyị yikwasịkwara ya n’elu uwe anyị yi. N’agbanyeghị ya, ezigbo oyi ka nọkwa na-atụ anyị.

Nwoke ahụ bu anyị n’ụgbọala bụ onye ebe Ugwu doro anya nke ọma, o mesokwara anyị ka ezi ndị enyi. Na mberede, ya ajụọ anyị, sị, “Ùnu ahụtụla ìhè na-egbuke egbuke n’abalị?” Ahụtụbeghị m ya, n’ihi ya, anyị kwụsịrị ma jiri nwayọọ pụta n’ụgbọala ahụ. Ihe ahụ anyị hụrụ mere ka anyị chefuo oké oyi ahụ na-atụ anyị. Eguzooro m, lepagide anya n’ìhè ahụ, na-ele otú o si tụọ àgwà ka ákwà na otú o si na-egbuke egbuke. Ọ dị nnọọ ka ọ nọ n’ebe aka anyị ga-eru.

N’isi ụtụtụ, ụgbọala anyị miri n’ime snoo, anyị enyere ọkwọ ụgbọala ahụ aka kwapụta ya. Ka anyị gba ụzọ ahụ snoo juru na-aga Khayyr, ụdị ihe ahụ mekwara ọtụtụ ugboro. Ọ bụzi mgbe chi bọchara ka m chọpụtara na ebe ahụ anyị gbara a sị na ọ bụ ụzọ bụ osimiri ndị kpụkọrọ akpụkọ. N’ikpeazụ, n’ihe dị ka n’oge ehihie, anyị rutere Khayyr. O were anyị awa iri na isii isi Deputatskiy rute Khayyr. Ọ bụ eziokwu na anyị chere na anyị ga-ada ọrịa ma anyị gbachaa n’oyi ahụ na njem a na-agwụ ike, ma, n’echi ya, ahụ́ gbasiri anyị ike mgbe anyị tetara. Ọ bụ naanị mkpịsị ụkwụ m yiri ka ọ̀ gbasiri agbasi, o nwere ike bụrụ oké oyi ahụ mere ya. Ndị obodo ahụ nyere m ihe mụ etee n’ụkwụ m.

N’ozi ọma, ọ bụ anyị na-agakwuru ndị mmadụ n’ụlọ ha. Ma, na Khayyr ebe a, ozugbo ndị obodo ahụ nụrụ na anyị bịara, ha achọrọ anyị bịa! N’izu abụọ na ọkara anyị nọrọ ebe ahụ, anyị na-amụrụ ndị obodo ahụ Baịbụl n’ụbọchị ọ bụla, mgbe ụfọdụ, malite n’isi ụtụtụ ruo n’ime abalị. Obi tọrọ anyị ụtọ ịhụ ọtụtụ ndị nwere obiọma, na-elekwa ọbịa nke ọma, bụ́ ndị nwere mmasị ịmụ banyere Chineke. Ọtụtụ ndị agadi nwaanyị ndị Yakut gwara anyị, sị: “Anyị kweere na Chineke. Ọbịbịa unu bịara n’ebe a, bụ́ obodo dị ezigbo anya n’ụwa, gosiri na Chineke dị!”

Omenala ndị obodo ahụ tọrọ anyị ụtọ. Dị ka ihe atụ, ndị obodo ahụ na-edowe mmiri kpụkọrọ akpụkpọ n’ùkwù n’ùkwù n’ihu ụlọ ha otú ahụ e si edowe nkụ. Mgbe ọ bụla ha chọrọ mmiri, ha ewere otu tinye ná nnukwu ketụl e siwere n’ọkụ, ka ọ gbazee. Ndị obodo ahụ nyere anyị azụ̀ ha na-akpọ chir. Azụ̀ a na-atọ ụtọ ma e were ya mee nri ndị obodo ahụ na-akpọ stroganina. Ozugbo e gbutere azụ̀ ahụ, oyi na-esikpọ ya, e bewasịa ya obere obere, suru ya ná nnu na ose a kwọrọ akwọ ma rie ya ozugbo. Ndị obodo ahụ kọọrọ anyị banyere ihe ndị e gwutere n’ala, dị ka ọdụ́ enyí, kọọkwara anyị banyere osisi ndị dịbu n’ebe ahụ n’oge ochie.

Eji m ụgbọelu si na Khayyr gbaa ọtụtụ narị kilomita gaa leta ndị nwere mmasị ịmụ Baịbụl n’obodo ndị ọzọ dị na Yakutia. Ndị obodo ahụ nwere obiọma, ha hụkwara mmadụ ibe ha n’anya. O nwere nwata nwoke m na-amụrụ ihe. Nwata a chọpụtara na ịgba ụgbọelu na-atụ m ụjọ. Iji mee ka ahụ́ ruo m ala, o meere m kaadị. N’ime ya, o sere nza abụọ na otu ụgbọelu, dezie sị: “Sasha, mgbe ọ bụla ị na-agba ụgbọelu, atụla ụjọ na ị ga-ada. Matiu 10:29.” Ihe e dere n’amaokwu Baịbụl ahụ metụrụ m n’ahụ́ mgbe m gụrụ ya! N’ebe ahụ, agụrụ m ihe Jizọs kwuru banyere nza, sị: “O nweghị otu n’ime ha ga-ada n’ala, Nna unu aghara ịma.”

Ihe a m kọrọ bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị mere m obi ụtọ na Yakutia. Obodo a na-ajụ oké oyi ma na-ekpo ezigbo ọkụ, ga na-echetara m banyere ndị obodo a nwere obiọma, bụ́ ndị bi “n’obodo dị ezigbo anya n’ụwa.”

[Foto ndị dị na peeji nke 25]

Anyị chọpụtara na ndị Yakut nwere obiọma ma na-ele ọbịa nke ọma