Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Kpara Àgwà Onye Nwere Ezi Uche

Ọ Kpara Àgwà Onye Nwere Ezi Uche

Ṅomie Okwukwe Ha

Ọ Kpara Àgwà Onye Nwere Ezi Uche

ABIGEL hụrụ na ụjọ ji nwa okorobịa ahụ na-agwa ya okwu. Ahụ́ na-ama nwa okorobịa ahụ ririri, o nwekwara ezigbo ihe kpatara ya. Agwọ nọ n’akịrịka. Ka ha nọ na-ekwu okwu, ihe dị ka narị ndị dike anọ nọ na-abịa n’ụzọ, ha kpebikwara igbu nwoke ọ bụla nọ n’ụlọ Nebal, bụ́ di Abigel. N’ihi gịnị?

Ọ bụ Nebal kpatara ihe niile a. O mesola mmadụ omume obi ọjọọ ma kparịa ya, dị ka ọ na-emebu. Ma na nke ugbu a, ọ kparịrị onye ọ na-ekwesịghị ịkparị, bụ́ ọchịagha nke otu ìgwè ndị agha a zụrụ nke ọma, onye ndị òtù ya hụrụ n’anya ma tụkwasị obi. Ugbu a, otu n’ime ụmụ okorobịa na-arụrụ Nebal ọrụ, ikekwe otu n’ime ndị na-azụrụ ya atụrụ, bịakwutere Abigel, nwee obi ike na ọ ga-achọta otú ọ ga-esi zọọ ha ndụ. Ma, olee ihe otu nwaanyị ga-emeli ìgwè ndị agha?

Ka anyị burugodị ụzọ chọpụtakwuo ihe ụfọdụ banyere nwaanyị ọma a. Ònye bụ Abigel? Olee ihe kpatara nsogbu a? Oleekwa ihe anyị nwere ike ịmụta n’okwukwe ya?

O “Nwere Ezi Uche, Maakwa Mma Ile Anya”

Àgwà Abigel na nke Nebal eyitụghị. Nebal lụtara ezigbo nwaanyị, ma Abigel chọpụtara na onye ọ lụrụ bụ nnọọ ajọ mmadụ. A bịa n’ego, nwoke ahụ nwere ego. N’ihi ya, ọ na-eche na ya bụ nnukwu mmadụ. Ma, olee otú ndị ọzọ si ele ya anya? Ọ ga-ara ahụ́ ịchọta onye ọzọ a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl nke a kpọrọ ụdị aha ọjọọ a kpọrọ Nebal. Aha ya pụtadịrị “Nzuzu” ma ọ bụ “Iberibe.” Ọ̀ bụ nne na nna ya gụrụ ya ụdị aha ahụ mgbe ha mụrụ ya, ka ọ̀ bụ aha a kpọwara ya nke mesịrị nara ya aha? Nke ọ bụla ọ bụ, o biri ndụ otú aha ahụ ọ zara dị. Nebal “dị aka ike, na-akpakwa agwa ọjọọ.” Ọ bụ onye arụrụala na onye aṅụrụma, onye ọtụtụ ndị kpọrọ asị ma na-atụ ụjọ.—1 Samuel 25:2, 3, 17, 21, 25.

Abigel dị nnọọ iche. Aha ya pụtara “Nna M Emeela Onwe Ya Obi Ụtọ.” Ọtụtụ ndị nna na-enwe obi ụtọ inwe nwa nwaanyị mara mma, ma nna maara ihe na-aka enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na nwa ya nwaanyị nwere ezigbo àgwà. Ọtụtụ ndị mara mma elu ahụ́ anaghị ahụ mkpa ọ dị inwe àgwà ndị dị ka ezi uche, amamihe, obi ike, ma ọ bụ okwukwe. Abigel adịghị otú ahụ. Baịbụl kwuru na o “nwere ezi uche, maakwa mma ile anya.”—1 Samuel 25:3.

Ụfọdụ ndị taa nwere ike ịnọ na-eche ihe mere nwa agbọghọ maara ihe otú ahụ ga-eji lụọ ụdị nwoke iberibe ahụ. Cheta na n’oge Baịbụl, ọ na-abụkarị ndị mụrụ ụmụ na-achọtara ụmụ ha ndị ha ga-alụ. Ma ọ́ bụghị ha chọtaara nwa ha onye ọ ga-alụ, ọ na-adị oké mkpa ka ha nabata onye nwa ha chọrọ ịlụ. Ọ̀ ga-abụ na nne na nna Abigel chọrọ ka ọ lụọ Nebal, ma ọ bụdị na ọ bụ ha chọtaara ya ya, n’ihi na Nebal bụ ọgaranya na onye a ma ama? Ọ̀ ga-abụ n’ihi na ogbenye na-echi ha ọnụ n’ala? Nke ọ bụla ọ bụ, ego Nebal emeghị ka ọ bụrụ ezigbo di.

Ndị nne na nna maara ihe na-ahụ na ha kụziiri ụmụ ha ile alụmdi na nwunye anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ha anaghị akwanye ụmụ ha ịlụ mmadụ n’ihi na onye ahụ nwere ego ma ọ bụ gbaa ha ume ka ha na nwoke ma ọ bụ nwaanyị kpawa mgbe ha na-adịbeghị njikere ịlụ di ma ọ bụ nwunye na iburu ibu ndị dị na ya. (1 Ndị Kọrịnt 7:36) Ma, nke ahụ abụkwaghị ihe Abigel ga-echewe ugbu a. N’agbanyeghị ihe mere o ji lụọ Nebal, ọ lụọla ya alụọ, o kpebisikwara ike ime ka ha biri n’udo.

“Ọ Kpọrọ Ha Iyi”

Nebal emeela nnọọ ka ihe siere Abigel ike karịa otú o sitụụrụla ya. Onye ahụ ọ kparịrị bụ Devid. Devid bụ ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, onye Samuel onye amụma tere mmanụ, bụ́ nke gosiri na Chineke ahọrọla Devid ịbụ eze ga-anọchi Sọl. (1 Samuel 16:1, 2, 11-13) Ebe ọ bụ na Eze Sọl, bụ́ ogbu ọchụ na onye anya ụfụ, na-achụgharị Devid, Devid na narị ndị dike isii ya ndị na-akwado ya bi n’ala ịkpa.

Nebal bi na Meyọn, ma o yiri ka ọ̀ na-arụ ọrụ ma nwee ala n’obodo Kamel dị nso n’ebe ahụ. * Obodo ndị ahụ nwere ugwu ndị ahịhịa juru, bụ́ ebe dị mma ịnọ azụ atụrụ, Nebal nwekwaranụ puku atụrụ atọ. Ma, ebe ndị ọzọ gbara obodo ndị ahụ gburugburu bụ ọhịa. I si na ya gawa n’ebe ndịda, ị ga-ahụ nnukwu ala ịkpa Peran. I si na ya gawa n’ebe ọwụwa anyanwụ, tupu i ruo Oké Osimiri Nnu, ị ga-agafe ala na-adịghị eme nri ndị ndagwurugwu na ọgba juru. Ihe adịrịghị Devid na ndị ikom ya mfe n’ebe a, o dokwara anya na ha na-achụ nta iji nweta ihe oriri ma na-edi ọtụtụ ihe isi ike. Ha na-ezutekarị ụmụ okorobịa na-azụrụ ọgaranya bụ́ Nebal atụrụ.

Olee otú ndị agha ahụ na-arụsi ọrụ ike si emeso ndị ọzụzụ atụrụ ahụ? Ọ gaara adịrị ha mfe ịna-anwụrụ atụrụ ha site n’oge ruo n’oge, ma ha emeghị ụdị ihe ahụ. Kama nke ahụ, ha bụụrụ ìgwè atụrụ Nebal na ndị na-ejere ya ozi mgbidi gbaa gburugburu. (1 Samuel 25:15, 16) Ọ dị ọtụtụ ihe na-abụrụ ndị ọzụzụ atụrụ na atụrụ ha nsogbu. Anụ ndị na-eri ibe ha juru eju n’oge ahụ. Ókè Izrel n’ebe ndịda dịkwa nso n’ebe ahụ, n’ihi ya, ìgwè ndị ohi si mba ọzọ na-ezukarị ohi n’ebe ahụ. *

Ọ gaghị adị mfe inyeju mmadụ niile ahụ afọ n’ala ịkpa. N’ihi ya, otu ụbọchị Devid zigara ndị ozi iri na nke Nebal ịrịọ ya maka enyemaka. Devid họọrọ oge dabara adaba. Ọ bụ n’oge a na-akpacha ajị atụrụ, bụ́ mgbe ndị mmadụ na-emesapụkarị aka ma na-eri oriri. Devid jikwa nlezianya họrọ okwu ndị ọ ga-agwa Nebal, kpọọ ya aha gosiri na ọ na-asọpụrụ ya ma gwa ya okwu ndị na-egosi nkwanye ùgwù. Ọ kpọdịrị onwe ya “nwa gị Devid,” ikekwe iji kwanyere Nebal ùgwù na ọ tọrọ ya. Gịnị ka Nebal mere?—1 Samuel 25:5-8.

O were ezigbo iwe! Mgbe nwa okorobịa ahụ e kwuru banyere ya ná mmalite na-akọrọ Abigel ihe merenụ, o kwuru na “ọ kpọrọ ha iyi.” Nebal onye aka ntagide mewere mkpesa na a na-abịa ịnara ya achịcha ya, mmiri ya, na anụ ya ya chọrọ iji mee ihe bara uru. Ọ kparịrị Devid ka onye na-enweghị uru ọ bara ma jiri ya tụnyere ohu gbapụrụ n’aka nna ya ukwu. O nwere ike ịbụ na echiche Nebal na nke Sọl, bụ́ onye kpọrọ Devid asị, yiri. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha lere Devid anya otú Jehova si lee ya. Chineke hụrụ Devid n’anya ma were ya dị ka eze ga-achị Izrel n’ọdịnihu, ọ bụghị dị ka ohu na-enupụ isi.—1 Samuel 25:10, 11, 14.

Mgbe ndị ozi Devid weghachiiri ya ozi, oké iwe were ya. O nyere ha iwu, sị: “Onye ọ bụla kee mma agha ya n’úkwù!” Devid jikeere ma duru narị ndị ikom anọ ya gawa ọgụ. Ọ ṅụrụ iyi igbu onye ọ bụla bụ́ nwoke n’ụlọ Nebal. (1 Samuel 25:12, 13, 21, 22) Devid kwesịrị iwe iwe, ma otú a ọ chọrọ isi gosi iwe ya adịghị mma. Baịbụl kwuru, sị: “Iwe mmadụ adịghị arụpụta ezi omume Chineke.” (Jems 1:20) Ma, olee otú Abigel ga-esi zọpụta ezinụlọ ya?

“Ka Ezi Uche Gị Bụrụ Ihe A Gọziri Agọzi”

Anyị nwere ike ịsị na anyị ahụla ihe mbụ Abigel mere iji mezie oké ihe ọjọọ a di ya mere. O gere ntị, bụ́ ihe di ya, bụ́ Nebal, na-anaghị eme. Nwa okorobịa ahụ bụ́ ohu Nebal kwuru banyere Nebal, sị: “Ọ bụ onye na-abaghị n’ihe nke na o siri ike ịgwa ya okwu.” * (1 Samuel 25:17) Ọ dị mwute na otú onwe Nebal si ju ya afọ mere ka ọ ghara inwe mmasị ige onye ọ bụla ntị. Ọtụtụ ndị ka na-eme ụdị okomoko ahụ taa. Ma, nwa okorobịa ahụ maara na Abigel adịghị otú ahụ, o dokwara anya na ọ bụ ya mere o ji gaa kọsara ya nsogbu a.

Abigel chere echiche ọsọ ọsọ ma mee ihe ozugbo. Baịbụl kwuru, sị: “N’egbughị oge, Abigel mere ngwa ngwa.” N’otu akụkọ a, e kwuru ugboro anọ na nwaanyị a “mere ngwa ngwa.” Ọ kwadebere nnukwu onyinye ọ ga-enye Devid na ndị ikom ya. Mmanya, atụrụ, ọka a ṅara n’ọkụ, achịcha mkpụrụ vaịn a mịrị amị, na achịcha mkpụrụ fig so n’ihe ndị ọ kwadebere. O doro anya na Abigel maara nnọọ ihe o nwere n’ụlọ, marakwa ọrụ ya n’ụlọ, dị nnọọ ka ezigbo nwunye ahụ e mesịrị kọwaa n’akwụkwọ Ilu. (Ilu 31:10-31) O zipụrụ ụfọdụ ndị ohu ya ka ha buru onyinye ndị ahụ gatụwa, naanị ya abịawazie n’azụ. Baịbụl kwuru, sị: “Ma ọ gwaghị di ya Nebal ihe ọ bụla.”—1 Samuel 25:18, 19.

Nke a ọ̀ pụtara na Abigel edoghị onwe ya n’okpuru di ya? Mbanụ. Nebal mesoro onye Jehova tere mmadụ omume ọjọọ, bụ́ nke nwere ike ibutere ọtụtụ ndị aka ha dị ọcha nọ n’ezinụlọ Nebal ọnwụ. Ọ bụrụ na Abigel agba nkịtị, ọ̀ ga-apụta na aka ya dị ná mmehie di ya? Nke ọ bụla ọ bụ, o ji irubere Chineke isi kpọrọ ihe karịa irubere di ya isi.

N’oge na-adịghị anya, Abigel zutere Devid na ndị ikom ya. O mekwara ngwa ngwa ọzọ, nke ugbu a bụ ịgbada n’ịnyịnya ibu ya na iweda onwe ya ala n’ihu Devid. (1 Samuel 25:20, 23) Ọ maliteziri ịkọrọ Devid otú obi dị ya, rịọsie ya arịrịọ ike ka o meere di ya na ezinụlọ ya ebere. Olee ihe mere okwu ya ji ruo Devid n’ahụ́?

O kwuru na ọ bụ ya ka ụta dịịrị maka nsogbu ahụ ma rịọ Devid ka ọ gbaghara ya. O kwetara na di ya bụ onye nzuzu otú ahụ ọ zara n’aha, ikekwe, ihe ọ na-ekwu bụ na Devid akarịala ịga tawa nwoke dị otú ahụ ahụhụ. O kwuru na Devid bụ onye nnochianya Jehova nke ya tụkwasịrị obi, kweta na ọ bụ “agha Jehova” ka ọ na-alụ. O kwukwara ihe gosiri na ọ maara na Jehova kwere Devid nkwa ime ya eze, n’ihi na o kwuru, sị: “Jehova . . . ga-ahọpụta gị ịbụ onye ndú Izrel.” Ọ rịọsikwara Devid ike ka ọ ghara ime ihe ọ bụla nwere ike ime ka ikpe ọbara ma ya ma ọ bụ mechaa ghọọrọ ya “ihe ịma jijiji.” Ikekwe, ihe ọ na-ekwu bụ ihe ga-eme ka obi Devid mawa ya ikpe. (1 Samuel 25:24-31) Okwu ọma ndị ahụ na-eru nnọọ n’ahụ́!

Oleezikwanụ ihe Devid mere? Ọ naara ihe ndị Abigel butere ma kwuo, sị: “Ka Jehova bụ́ Chineke Izrel, bụ́ onye zitere gị taa ka ị bịakwute m, bụrụ onye a gọziri agọzi! Ka ezi uche gị bụrụ ihe a gọziri agọzi, ka gị onwe gị, bụ́ onye gbochiri m taa ịba n’ikpe ọmụma ọbara . . . bụrụkwa onye a gọziri agọzi.” Devid toro ya maka iji obi ike mee ngwa ngwa bịa zute ya, kwetakwa na o gbochiela ya ịba n’ikpe ọmụma ọbara. Ọ gwara Abigel, sị: “Laa n’ụlọ gị n’udo,” jirikwa obi umeala kwuo, sị: “Egewo m ntị n’olu gị.”—1 Samuel 25:32-35.

“Lee Ohu Gị Nwaanyị”

Mgbe ha lawara, Abigel nọ na-eche ihe ahụ merenụ; ọ hụkwara otú àgwà Devid dị obiọma si dị iche na nke onye arụrụala ahụ ọ lụrụ. Ma ọ nọgideghị na-eche ya. Baịbụl kwuru, sị: “E mesịa, Abigel bịakwutere Nebal.” Ee, ọ laghachikwuuru di ya, kpebisie ike ịnọgide na-eme ike ya niile iji na-arụ ọrụ dịịrị ya dị ka nwunye ya. Ọ ghaghị ịgwa ya banyere onyinye ndị ahụ o nyere Devid na ndị ikom ya. Di ya kwesịrị ịma. Ọ ghaghịkwa ịgwa di ya banyere ihe ize ndụ o gbochiri tupu ya anụ ya ebe ọzọ, bụ́kwanụ nke ga-abụrụ di ya oké ihe ihere. Ma, o nweghị otú o si agwa di ya ihe ndị a ugbu a. Ọ nọ na-eri oriri dị ka eze ma ṅụrọọ mmanya anya.—1 Samuel 25:36.

O gosikwara obi ike na ezi uche ọzọ, chere ruo ụtụtụ echi ya mgbe mmanya pụcharala di ya n’anya. Di ya ga-enwezi ike ịghọta ihe ọ na-ekwu, ma o nwekwara ike ịka wee iwe. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ gakwuuru ya ma kọọrọ ya ihe niile merenụ. O doro anya na ọ tụrụ anya na ọ ga-ewe ezigbo iwe, ikekwe kụọ ya ihe. Kama nke ahụ, ọ nọọrọ nnọọ duu, n’emegharịghị ahụ́.—1 Samuel 25:37.

Olee ihe na-eme nwoke a? ‘Obi kụchiri ya, ya onwe ya wee dị ka nkume.’ Ikekwe, ọ ga-abụ ọrịa strok jidere ya. Ma, ọ nwụrụ mgbe ụbọchị iri gasịrị, ọ bụghịkwa ọrịa nkịtị gburu ya. “Jehova tiri Nebal ihe, o wee nwụọ.” (1 Samuel 25:38) Mgbe Chineke gburu nwoke ọjọọ a, alụmdi na nwunye ahụ na-echi Abigel ọnụ n’ala kwụsịrị. Ọ bụ ezie na Jehova anaghị etigbu ndị na-echi di ha ma ọ bụ nwunye ha ọnụ n’ala taa, akụkọ a na-echetara anyị na ọ dịghị ụdị omume ahụ Jehova na-anaghị ahụ. Mgbe oge ya ruru, ọ ga-ekpe ikpe ziri ezi.

Ọ bụghị naanị na Abigel apụtala n’ajọ alụmdi na nwunye, ọ ga-enwetakwa ngọzi ọzọ. Mgbe Devid nụrụ na Nebal anwụọla, o zigara ndị ozi ka ha gaa gwa Abigel na ya chọrọ ịlụ ya. Abigel zara, sị: “Lee ohu gị nwaanyị ka m bụrụ nwaanyị na-eje ozi nke ga na-asa ụkwụ nke ndị ohu onyenwe m.” O doro anya na àgwà ya agbanweghị mgbe ọ matara na ya na-aga ịghọ nwunye Devid; ọ sịdịrị na ya chọrọ ịbụ nwaanyị na-ejere ndị ohu Devid ozi! Baịbụl kwuru ọzọ na o mere ngwa ngwa, nke ugbu a bụ iji kwadebe onwe ya ịgakwuru Devid.—1 Samuel 25:39-42.

Ihe a abụghị ụdị alụmdi na nwunye a na-akọ n’akụkọ ifo nke na-anaghị enwe nsogbu; ọ bụghị mgbe niile ka ihe ga-adịrị Abigel na Devid mfe. Devid eburula ụzọ lụọ Ahinoam, o dokwara anya na inwe nwunye di kpataara ụmụ nwaanyị kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ahụ ihe isi ike. * Devid aghọbekwaghị eze; ọ ka nwere ihe isi ike ndị ọ ga-emeri tupu ya ejewere Jehova ozi dị ka eze. Ma, ka Abigel nọ na-enyere Devid aka ná ndụ ya, mechaa mụtara ya nwa nwoke, ọ chọpụtara na ya lụrụ di ji ya kpọrọ ihe ma na-echebe ya. O nwedịrị mgbe Devid napụtara ya n’aka ndị ntọrọ! (1 Samuel 30:1-19) Devid si otú a ṅomie Jehova Chineke, bụ́ onye hụrụ ụmụ nwaanyị dị otú ahụ nwere ezi uche, nwee obi ike ma kwesị ntụkwasị obi n’anya, jirikwa ha kpọrọ ihe.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 Nke a abụghị Ugwu Kamel ahụ a ma ama nke dị ná mgbago mgbago n’ebe ugwu kama ọ bụ obodo dị n’ọnụ ọnụ ala ịkpa dị n’ebe ndịda.

^ par. 14 Ọ ga-abụ na Devid weere ya na ichebe ndị nwe obodo ahụ na atụrụ ha bụ ọrụ ọ na-arụrụ Jehova Chineke. N’oge ahụ, ọ bụ nzube Jehova ka ụmụ ụmụ Ebreham, Aịzik, na Jekọb biri n’ala ahụ. N’ihi ya, ichebe ha ka ha ghara ịdaba n’aka ndị ohi si ala ọzọ bụ ozi dị nsọ.

^ par. 19 Otú e si dee ihe ahụ nwa okorobịa ahụ kwuru n’asụsụ Hibru bụ “nwa bilial (onye na-abaghị n’ihe).” Mgbe nsụgharị Baịbụl ndị ọzọ na-asụgharị ahịrịokwu a, ha kwuru na Nebal bụ nwoke “na-anaghị ege onye ọ bụla ntị,” sịzie na “ọ baghị uru ịgwawa ya okwu.”

^ par. 30 Gụọ isiokwu bụ́ “Chineke Ọ̀ Kwadoro Ịlụ Ihe Karịrị Otu Nwaanyị?” nke dị na peeji nke 30.

[Foto dị na peeji nke 19]

Abigel na-ege ntị nke ọma, bụ́ ihe di ya na-anaghị eme

[Foto dị na peeji nke 20]

Abigel gosiri umeala n’obi, obi ike, na ezi uche n’ịgwa Devid okwu