Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

2. Ebula Echiche Na-ezighị Ezi n’Obi Na-agụ ya

2. Ebula Echiche Na-ezighị Ezi n’Obi Na-agụ ya

Otú I Nwere Ike Isi Ghọta Baịbụl

2. Ebula Echiche Na-ezighị Ezi n’Obi Na-agụ ya

Ò nwetụla mgbe enyi gị kọọrọ gị ihe na-adịghị mma banyere onye ị na-ahụtụbeghị? Mgbe i mechara hụ onye ahụ, ihe ahụ enyi gị kwuru banyere ya ò mere ka ị ghara ịhụcha àgwà ọma ndị o nwere na ihe ndị ọ na-emeta nke ọma? Ụdị ihe ahụ nwere ike ime ma a bịa n’ihe metụtara Baịbụl.

PỌL onyeozi kwuru ihe nwere ike ime anyị ma ọ bụrụ na anyị eburu echiche na-ezighị ezi n’obi na-agụ Baịbụl. Pọl dere banyere ụfọdụ ndị Juu dịrị ndụ n’oge ya, sị: “Ana m agbara ha akaebe na ha na-anụ ọkụ n’obi n’ijere Chineke ozi; ma ọ bụghị dị ka ezi ihe ọmụma si dị.”—Ndị Rom 10:2.

Ụfọdụ ndị Juu ahụ ndị dịrị ndụ na narị afọ mbụ achọghị ikwere na Jizọs bụ Mesaya, ọ bụ ezie na Akwụkwọ Nsọ Hibru mere ka nke a doo anya. Jizọs onye Nazaret mere ihe niile Akwụkwọ Nsọ kwuru a ga-eji mara Mesaya ahụ, mezuokwa amụma niile e buru banyere ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị obodo ya aghọtaghị Okwu Chineke n’ihi echiche na-ezighị ezi ndị ha nwere, bụ́ ndị ha na-ekweghị ịgbanwe.

Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe ahụ mere ha? Ọ dị mkpa ka anyị ghara ibu echiche na-ezighị ezi n’obi na-agụ Baịbụl. Mmadụ ibu ihe na-ezighị ezi n’obi na-agụ Baịbụl nwere ike ime ka ọ ghara ịghọta eziokwu ndị dị na ya.

Dị ka ihe atụ, otu prọfesọ nke na-akụzi nkà mmụta okpukpe na North Carolina, U.S.A., kwuru na Baịbụl bụ “akwụkwọ nkịtị ụmụ mmadụ dere, nke nwere echiche mmadụ, ndị ọtụtụ n’ime ha dị iche n’ibe ha, ndị ọ na-enweghịkwa otu n’ime ha ga-enyeliri anyị aka ịghọta otú anyị kwesịrị isi bie ndụ.” Ọ bụrụ na mmadụ bu n’obi na Baịbụl bụ “akwụkwọ nkịtị ụmụ mmadụ dere” mgbe ọ na-agụ ya, ọ́ gaghị elefuru ntụziaka ma ọ bụ ụkpụrụ ndị na-amasịghị ya anya?

Ma, Baịbụl na-agba anyị ume ka anyị na-amụsi ya ike. Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere ndị Beria dịrị ndụ n’oge Pọl, sị: “Ha ji oké ịnụ ọkụ n’obi nabata okwu Chineke, na-enyocha Akwụkwọ Nsọ nke ọma kwa ụbọchị iji mara ma ihe ndị a hà dị otú ahụ.” (Ọrụ 17:11) Dị ka ndị Beria mere, o nwere ike ịdị mkpa ka i wepụ echiche ọ bụla na-ezighị ezi i nwere bụ́ nke nwere ike ime ka ị ghara ịghọta ya. Ebula echiche na-ezighị ezi n’obi gụọ Okwu Chineke, ka ọ gụọkwa gị agụụ ịchọpụta ihe ndị magburu onwe ha Onye chepụtara ya kwuru na ya.