Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nwoke nke Nwere Okwukwe ná Nkwa Chineke

Nwoke nke Nwere Okwukwe ná Nkwa Chineke

Maka Ndị Na-eto Eto

Nwoke nke Nwere Okwukwe ná Nkwa Chineke

Otú ị ga-esi mee ya: Nọrọ n’ebe ụzụ na-adịghị mee ihe omume a. Mgbe ị na-agụ ebe ndị ahụ a chọrọ ka ị gụọ n’Akwụkwọ Nsọ, were ya na ị nọ mgbe ihe ahụ ị na-agụ mere. Jiri uche gị kirie ebe ọ na-eme. Nụrụ ihe ndị nọ n’ebe ahụ na-ekwu. Gbalịa ka ị ghọta otú obi dị ndị ị na-agụ akụkọ ha.

CHEBARA OTÚ IHE A SI MEE ECHICHE.—GỤỌ JENESIS 12:1-4; 18:1-15; 21:1-5; 22:15-18.

Kọwaa otú i chere obi dị Ebreham mgbe Chineke kwere ya nkwa na otu “mkpụrụ” nke ga-abara ụwa niile uru ga-esi n’ezinụlọ ya pụta.

․․․․․

Olee otú i chere ndị ọbịa atọ ahụ e kwuru banyere ha na Jenesis 18:2 dị?

․․․․․

Olee otú ị ga-esi kọwaa ihe ahụ merenụ na Jenesis 18:6-8? (Buru n’obi na ọ fọrọ nke nta ka Ebreham gbaa otu narị afọ n’oge ahụ.)

․․․․․

LEBAKWUO YA ANYA.

Afọ ole gafere malite mgbe Jehova kwere Ebreham nkwa na ọ ga-amụta nwa ruo mgbe a mụrụ Aịzik? (Gụgharịa Jenesis 12:4 na 21:5.)

․․․․․

Olee okwu ndị Jehova ji na-emesi Ebreham obi ike n’oge niile ahụ ọ na-eche ka nkwa ahụ mezuo? (Gụọ Jenesis 12:7; 13:14-17; 15:1-5, 12-21; 17:1, 2, 7, 8, 15, 16.)

․․․․․

Olee ihe Jehova meere Ebreham mgbe obi na-esichaghị Ebreham ike na ọ ga-amụta nwa? (Gụgharịa Jenesis 15:3-5, 12-21.)

․․․․․

Olee otú Jehova si jiri nwayọọ nwayọọ mee ka a matakwuo banyere “mkpụrụ” ahụ?

․․․․․

MEE IHE Ị MỤTARA. DEE IHE Ị MỤTARA BANYERE  . . .

Mkpa ọ dị inwe okwukwe ná nkwa Chineke.

․․․․․

Otú Jehova si eji nwayọọ nwayọọ eme ka a mata uche ya.

․․․․․

OLEE IHE KACHA BAARA GỊ URU N’AKỤKỌ A? Ọ̀ BỤ MAKA GỊNỊ?

․․․․․