Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Olee nnọọ ihe mere igbe ọgbụgba ndụ ahụ?

Ụmụ Izrel weere igbe ọgbụgba ndụ ahụ dị ka ihe na-anọchi nnọọ anya ọnụnọ Chineke. (Ọpụpụ 25:22) Ọ bụ igbe dị nsọ e ji osisi rụọ ma jiri ọlaedo machie ya, bụ́ ebe Mozis tinyere mbadamba nkume abụọ e dere Iwu Chineke. Mgbe ụmụ Izrel bi n’ala ịkpa, e dewere Igbe ahụ n’Ebe Kasị Nsọ n’ụlọikwuu nzute. (Ọpụpụ 26:33) E mechara dewe Igbe ahụ n’Ebe Kasị Nsọ n’ụlọ nsọ Sọlọmọn wuru.—1 Ndị Eze 6:19.

Mgbe ikpeazụ e kwuru banyere Igbe ahụ bụ n’Ihe E Mere nke Abụọ 35:3, bụ́ mgbe Eze Josaya bughachiri ya n’ụlọ nsọ ahụ n’afọ 642 T.O.A. O nwere ike ịbụ na Manase, bụ́ onye si n’ezi ofufe dapụ nke chịrị tupu Josaya achịa, bupụrụ Igbe ahụ ma dewe arụsị n’ụlọ nsọ ahụ. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na e bupụrụ ya iji hụ na ọ dịghị ihe mere ya n’oge Josaya na-arụzi ụlọ nsọ ahụ. (2 Ihe E Mere 33:1, 2, 7; 34:1, 8-11) Mgbe nke ahụ gasịrị, anyị amaghị ihe meziri Igbe ahụ, n’ihi na o soghị n’ihe ndị e depụtara e buuru n’ụlọ nsọ ahụ mgbe ndị Babịlọn meriri Jeruselem n’afọ 607 T.O.A.—2 Ndị Eze 25:13-17.

Akwụkwọ Nsọ ekwughị na e bughachiri Igbe ahụ n’Ebe Kasị Nsọ n’ụlọ nsọ ahụ Zerọbabel wugharịrị; o yikwanụghị ka ò nwere mgbe a rụghachịrị Igbe ahụ.—Ezra 1:7-11.

Olee ndị a kpọrọ Jems na Baịbụl?

Ha dị anọ, ọ dịkwa mfe ịghọtahie onye bụ́ onye. Otu n’ime ha bụ nna Judas onyeozi (ọ bụghị Judas Iskarịọt), o nweghịkwa ihe ọzọ anyị maara banyere ya.—Luk 6:16; Ọrụ 1:13.

E nwekwara nke bụ́ nwa Zebedi. Jems a bụ nwanne Jọn, ha abụọ bụkwa ndịozi Jizọs. (Matiu 10:2) Ọ ga-abụ na nne ya bụ Salomi, nwanne nne Jizọs. (Jiri Matiu 27:55, 56 tụnyere Mak 15:40, 41 na Jọn 19:25.) Ya bụrụ otú ahụ, Jems bụ nwa nwanne nne Jizọs. Ọ bụ onye ọkụ azụ̀, bụ́ onye ya na nwanne ya na Pita na Andru gbakọrọ aka na-akụ azụ̀.—Mak 1:16-19; Luk 5:7-10.

Onye nke atọ bụ Jems nwa Alfiọs, bụ́kwa otu n’ime ndịozi Jizọs. (Mak 3:16-18) A kpọrọ ya “Jems nke Nta” na Mak 15:40. O nwere ike ịbụ na a kpọrọ ya “nke Nta” n’ihi na Jems nwa Zebedi ka ya gbaa dimkpa ma ọ bụ tọọ ya.

Onye nke ikpeazụ bụ Josef nwa Meri, bụ́ nwanne Jud na Jizọs. (Mak 6:3; Ndị Galeshia 1:19) N’oge Jizọs na-eje ozi n’ụwa, Jems abụghị onye na-eso ụzọ Jizọs. (Matiu 12:46-50; Jọn 7:5) Ma, tupu Pentikọst 33 Oge Anyị, Jems na nne ya, ụmụnne ya ndị nwoke, na ndịozi nọ n’ọnụ ụlọ dị n’elu na Jeruselem na-ekpe ekpere. (Ọrụ 1:13, 14) Jems mechara ghọọ onye a ma ama n’ọgbakọ Jeruselem ma dee akwụkwọ Baịbụl bụ́ Jems.—Ọrụ 12:17; Jems 1:1.