Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akụnụba nke Na-esi n’Aka Chineke

Akụnụba nke Na-esi n’Aka Chineke

Akụnụba nke Na-esi n’Aka Chineke

Ọ BỤRỤ na ị na-efe Chineke nke ọma, ọ̀ ga-eji akụnụba gọzie gị? O nwere ike, ma ikekwe, ọ gaghị abụ ụdị akụnụba i bu n’uche. Chegodị echiche banyere Meri, nne Jizọs. Mmụọ ozi bụ́ Gebriel pụtara n’ihu ya ma gwa ya na ọ bụ onye Chineke “meere amara dị ukwuu,” nakwa na ọ ga-amụ Ọkpara Chineke. (Luk 1:28, 30-32) N’agbanyeghị nke ahụ, Meri abaghị ọgaranya. Mgbe Meri chụrụ àjà mgbe ọ mụchara Jizọs, o wetara “nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ,” bụ́ onyinye ndị ogbenye na-enye Jehova.—Luk 2:24; Levitikọs 12:8.

Ebe ọ bụ na Meri bụ ogbenye, ọ̀ pụtara na Chineke agọzighị ya? Mbanụ, kama, mgbe ọ gara ileta Elizabet, bụ́ onye ikwu ya, ‘Elizabet jupụtara na mmụọ nsọ, wee tie mkpu n’olu dara ụda, sị: “Onye a gọziri agọzi ka ị bụ n’etiti ndị inyom, ihe a gọziri agọzi ka mkpụrụ nke afọ gị bụkwa!”’ (Luk 1:41, 42) E nyere Meri ohere pụrụ iche nke ịbụ nne Jizọs n’ụwa, bụ́ Ọkpara Chineke hụrụ n’anya.

Jizọs n’onwe ya abaghị ọgaranya. Ọ bụghị naanị na ọ bụ ndị ogbenye mụrụ ya ma zụọ ya, kamakwa, ọ dara ogbenye n’oge niile ọ dịrị ndụ n’ụwa. O nwere mgbe ọ gwara otu nwoke nke chọrọ ịghọ onye na-eso ụzọ ya, sị: “Nkịta ọhịa nwere ọgbà, anụ ufe nke eluigwe nwekwara akwụ́, ma Nwa nke mmadụ enweghị ebe ọ bụla ọ ga-atọgbọ isi ya.” (Luk 9:57, 58) N’agbanyeghị nke ahụ, ọbịbịa Jizọs Kraịst bịara n’ụwa mere ka ndị na-eso ụzọ ya nwee nnọọ akụnụba. Pọl onyeozi dere, sị: “Ọ dara ogbenye n’ihi unu, ka unu wee baa ọgaranya site n’ịda ogbenye ya.” (2 Ndị Kọrịnt 8:9) Olee ụdị akụnụba Jizọs mere ka ndị na-eso ụzọ ya nwee? Oleekwanụ maka oge anyị a?

Olee Ụdị Akụnụba Ọ Bụ?

Akụnụba nkịtị na-emekarị ka mmadụ ghara inwe okwukwe n’ihi na onye bara ọgaranya nwere ike ịtụkwasị ego ya obi karịa Chineke. Jizọs sịrị: “Lee otú ọ ga-esi siere ndị nwere ego ike ịba n’alaeze Chineke!” (Mak 10:23) N’ihi ya, o doro anya na akụnụba nke Jizọs mere ka ndị na-eso ụzọ ya nwee abụghị akụnụba nkịtị.

N’eziokwu, ihe ka ọtụtụ ná Ndị Kraịst narị afọ mbụ bụ ndị ogbenye. Mgbe otu nwoke dara ngwọrọ site n’afọ nne ya rịọrọ Pita ego, Pita sịrị ya: “Enweghị m ọlaọcha na ọlaedo, ma ihe m nwere ka m na-enye gị: N’aha Jizọs Kraịst onye Nazaret, jee ije!”—Ọrụ 3:6.

Ihe onye na-eso ụzọ Jizọs bụ́ Jems kwuru gosikwara na ihe ka ọtụtụ ná ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst bụ ndị ogbenye. O dere, sị: “Geenụ ntị, ụmụnna m m hụrụ n’anya. Ọ̀ bụ na Chineke ahọrọghị ndị dara ogbenye n’ihe nke ụwa ka ha bụrụ ndị bara ọgaranya n’okwukwe, bụrụkwa ndị nketa nke alaeze ahụ, nke o kwere nkwa inye ndị hụrụ ya n’anya?” (Jems 2:5) Pọl onyeozi kwukwara na ọ bụghị ọtụtụ “ndị maara ihe n’ụzọ anụ ahụ́” ma ọ bụ “ndị dị ike” ma ọ bụ “ndị si n’ezinụlọ eze” ka a kpọrọ iso n’ọgbakọ Ndị Kraịst.—1 Ndị Kọrịnt 1:26.

Ọ bụrụ na akụnụba Jizọs mere ka ndị na-eso ụzọ ya nwee abụghị akụnụba nkịtị, olee ụdị akụnụba ọ bụ? N’akwụkwọ ozi Jizọs zigaara ọgbakọ dị na Smeana, ọ sịrị: “Amaara m mkpagbu gị na ogbenye ị dara—ma ị bara ọgaranya.” (Mkpughe 2:8, 9) Ọ bụ ezie na Ndị Kraịst nọ na Smeana dara ogbenye, ha nwere akụnụba bara nnọọ uru karịa ọlaọcha ma ọ bụ ọlaedo. Ha bara ọgaranya n’ihi okwukwe ha na ikwesị ntụkwasị obi ha n’ebe Chineke nọ. Okwukwe n’onwe ya bụ àgwà dị oké ọnụ ahịa n’ihi na “ọ bụghị mmadụ niile nwere” ya. (2 Ndị Tesalonaịka 3:2) N’ezie, ndị na-enweghị okwukwe dara ogbenye n’anya Chineke.—Mkpughe 3:17, 18.

Akụnụba nke Na-esi n’Okwukwe

Ma, olee ihe ndị mere okwukwe ji baa uru? Ndị nwere okwukwe na Chineke na-erite uru ‘n’obiọma ya na ndidi ya na ogologo ntachi obi ya dị ukwuu.’ (Ndị Rom 2:4) A ‘na-agbaghakwara ha njehie’ ha n’ihi okwukwe ha nwere n’àjà mgbapụta Jizọs. (Ndị Efesọs 1:7) Ha nwekwara ụdị amamihe “okwu nke Kraịst” na-enye ndị nwere okwukwe. (Ndị Kọlọsi 3:16) Ebe ha na-eji okwukwe ekpeku Chineke ekpere, “udo nke Chineke nke karịrị echiche niile” na-eche obi ha na uche ha nche, na-eme ka ha nwee afọ ojuju na obi ụtọ.—Ndị Filipaị 4:7.

E wezụga uru niile a, ndị nwere okwukwe na Chineke site n’Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, nwere olileanya magburu onwe ya nke bụ́ ịdị ndụ ebighị ebi. A ma okwu a Jizọs Kraịst kwuru ama, bụ́: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Olileanya ahụ magburu onwe ya na-esikwu ike mgbe mmadụ matara Nna ahụ na Ọkpara ya nke ọma, n’ihi na Jizọs kwukwara, sị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.”—Jọn 17:3.

Ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ ná ngọzi Chineke na-enye bụ ngọzi ime mmụọ, ngọzi ya na-enyekwara mmadụ aka n’ụzọ nkịtị, na-emekwa ka obi ruo onye ahụ ala. Weregodị Dalídio, bụ́ onye bi na Brazil, dị ka ihe atụ. Tupu ya enweta ezi ihe ọmụma banyere nzube Chineke, ọ bụ onye aṅụrụma. Nke a kpatara ọtụtụ nsogbu n’ezinụlọ ya. Ego anaghịkwa anọta ya n’aka. Ya na Ndịàmà Jehova maliteziri ịmụ Baịbụl, ya emee ezigbo mgbanwe ná ndụ ya.

Ihe ọhụrụ ndị Dalídio mụtara mere ka ọ hapụ àgwà ọjọọ ndị ọ na-akpa. O mere nnọọ ọtụtụ mgbanwe ná ndụ ya nke na o kwuru, sị, “Mgbe mbụ, m na-esi n’otu ụlọ mmanya ṅụrụ mmanya gaa n’ụlọ mmanya ọzọ; ma ugbu a m na-agazi n’ụlọ n’ụlọ na-ekwusa ozi ọma.” Ọ na-ekwusazi Okwu Chineke oge nille. Ọ bụghị naanị na mgbanwe ahụ mere ka ahụ́ dịkwuo ya mma, kama o mekwara ka ego nọtawa ya n’aka. Dalídio kwuru, sị, “M na-ejizi ego m na-emefubu ná mmanya enyere ndị nọ ná mkpa aka ma ọ bụkwanụ jiri ya na-azụrụ ihe ndị dị m mkpa.” O nweekwala ọtụtụ ezigbo ndị enyi n’ihi na ya na ndị na-atụ egwu Chineke otú ọ na-atụ na-akpazi. Dalídio enweela obi ụtọ na obi iru ala ugbu a karịa nnọọ otú o nwetụrụla tupu ya amata Chineke.

Onye ọzọ inwe okwukwe na Jehova Chineke mere ka o nwee afọ ojuju na obi ụtọ ná ndụ ya bụ Renato. Ị hụ otú ọchị na-esi eju ya ọnụ taa, ọ ga-esiri gị ike ikweta na ọ dị mgbe o chere na ya bụ onye a jụrụ ajụ. Mama ya gbahapụrụ ya mgbe a mụrụ ya ọhụrụ. E tinyere ya n’akpa tọgbọ ya n’okpuru oche, ihe emerụchaa ya ahụ́, alọ ya adapụbekwaghị. Ụmụ nwaanyị abụọ na-agafe agafe hụrụ ebe akpa ahụ dị n’okpuru oche na-emegharị ahụ́. Na mbụ, ha chere na ọ bụ nwamba mmadụ hapụrụ n’ebe ahụ. Mgbe ha chọpụtara na ọ bụ nwa a mụrụ ọhụrụ, ha kuuru ya ngwa ngwa gaa n’ụlọ ọgwụ dị nso ka e lebara ya anya.

Otu n’ime ụmụ nwaanyị ahụ bụ Onyeàmà Jehova, ọ kọkwaara Onyeàmà ọzọ, bụ́ Rita, banyere nwa ọhụrụ ahụ. Nwa anwụọla Rita n’afọ ọtụtụ ugboro, o nwekwara naanị otu nwa nwaanyị. Ọ chọsiri nwa nwoke ike, n’ihi ya o kpebiri iji Renato mere nwa.

Rita gwara Renato mgbe ọ ka dị obere na ọ bụghị ya mụrụ ya. Ma, o ji ịhụnanya lekọta ya ma gbalịa ịkụziri ya Okwu Chineke. Ka Renato na-eto, ọ malitere inwe mmasị na Baịbụl. O nwekwuru obi ụtọ n’ihi otú e si zọọ ya ndụ mgbe ọ nọ n’ọnụ ọnwụ. Anya mmiri na-eju ya anya mgbe ọ bụla ọ gụrụ ihe a ọbụ abụ bụ́ Devid kwuru: “Ọ bụrụ na nna m na nne m ahapụ m, Jehova ga-akpọrọ m.”—Abụ Ọma 27:10.

Iji kelee Jehova maka ihe niile o meere ya, Renato wepụtara onwe ya ka e mee ya baptizim n’afọ 2002 ma ghọọ Onye Kraịst na-ekwusa ozi ọma oge niile n’afọ sochiri ya. Ọ mabeghị nne na nna mụrụ ya, o nwekwara ike ọ gaghị emecha mata ha. Ma, Renato chere na otu n’ime onyinye kacha oké ọnụ ahịa e nyetụrụla ya bụ ịmata Jehova dị ka Nna ya hụrụ ya n’anya ma na-elekọta ya na inwe okwukwe na ya.

Ikekwe, ọ na-agụ gị agụụ ka gị na Chineke dịrị ná mma, ya ahụkwa gị n’anya, bụ́ nke nwere ike ime ka ndụ gị ka mma n’ezie. Onye ọ bụla, ma ọgaranya ma ogbenye, nwere ohere ya na Jehova Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, ịdị ná mma otú ahụ. O nwere ike nke a agaghị eme ka i nwee akụnụba, ma ọ ga-eme ka obi ruo gị ala, gị enweekwa ụdị obi ụtọ ego niile dị n’ụwa a na-agaghị azụtali. N’ezie, ihe e dere n’Ilu 10:22 bụ eziokwu, nke bụ́: “Ọ bụ ngọzi Jehova na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghịkwa atụkwasị ihe mgbu na ya.”

Jehova Chineke nwere ezigbo mmasị n’ebe ndị na-abịakwute ya nọ nke na o kwuru, sị: “A sị nnọọ na ị ga-aṅa ntị n’ihe m nyere n’iwu! Mgbe ahụ, udo gị ga-adị nnọọ ka osimiri, ezi omume gị ga-adịkwa ka ebili mmiri nke oké osimiri.” (Aịzaya 48:18) O kwekwara nkwa na ya ga-agọzi nnọọ ndị ji ezi obi bịakwute ya n’ihi na Okwu ya kwuru, sị: “Ihe ịdị umeala n’obi na ịtụ egwu Jehova na-arụpụta bụ akụnụba na otuto na ndụ.”—Ilu 22:4.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 6]

Inwe okwukwe na Chineke na-eme ka mmadụ nwee udo, afọ ojuju, na obi ụtọ

[Foto dị na peeji nke 5]

Ọ bụ ezie na ezinụlọ Jizọs n’ụwa dara ogbenye, Chineke gọziri ha nke ukwuu