Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Ò Kwere Gị Nkwa na Ị Ga-aba Ọgaranya?

Chineke Ò Kwere Gị Nkwa na Ị Ga-aba Ọgaranya?

Chineke Ò Kwere Gị Nkwa na Ị Ga-aba Ọgaranya?

‘Chineke chọrọ ka ị baa ọgaranya, nwee ọtụtụ ụgbọala, ahịa gị ana-agakwa nke ọma. Ihe ị ga-eme bụ naanị ikwere na ya ma si n’akpa gị nye ya ihe niile i nwere ike inye ya.’

NKE A bụ ụdị ozizi okpukpe ụfọdụ dị na Brazil na-ezi, dị ka otu akwụkwọ akụkọ a na-ebi n’ebe ahụ kwuru. Ọtụtụ ndị na-ekwere ụdị ozizi a. Magazin bụ́ Time kọrọ banyere ajụjụ ọnụ a gbara ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst na United States, sị: “Ihe karịtụrụ mmadụ isii n’ime mmadụ iri ọ bụla kweere na Chineke chọrọ ka ndị mmadụ baa ọgaranya. Ihe . . . karịtụkwara mmadụ atọ n’ime mmadụ iri ọ bụla kwetara na ọ bụrụ na i nye Chineke ego gị, ọ ga-enyekwu gị ego.”

Ozizi ịba ọgaranya a ejula ebe niile, karịchaa ná mba ndị dị na Latin America, dị ka Brazil, ndị mmadụ na-enugakwa na chọọchị ndị na-ekwe ha nkwa na Chineke ga-eji akụnụba gọzie ha. Ma, ọ̀ bụ eziokwu na Chineke kwere ndị na-ejere ya ozi nkwa na ha ga-aba ọgaranya? Ọ̀ bụ ndị niile jeere Chineke ozi n’oge ochie bara ọgaranya?

N’ezie, Akwụkwọ Nsọ Hibru kwuru n’ọtụtụ ebe na Chineke ji akụnụba gọzie ndị jeere ya ozi. Dị ka ihe atụ, Diuterọnọmi 8:18 kwuru, sị: “Ị ga-echeta Jehova bụ́ Chineke gị, n’ihi na ọ bụ ya na-enye gị ike i ji akpata akụ̀.” Nke a mere ka obi sie ndị Izrel ike na ọ bụrụ na ha erubere Chineke isi, ọ ga-eme ka mba ha baa ọgaranya.

Olee maka ndị mmadụ n’otu n’otu? Job, bụ́ nwoke kwesịrị ntụkwasị obi, bara ezigbo ọgaranya. Mgbe Setan mechara ka Job daa ogbenye, Jehova nyeghachikwara ya akụnụba ya “okpukpu abụọ.” (Job 1:3; 42:10) Ebreham bakwara ọgaranya. Jenesis 13:2 kwuru na o ‘nwere ìgwè anụ ụlọ na ọlaọcha na ọlaedo dị ukwuu.’ Mgbe ndị agha nke eze anọ si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ, bụ́ ndị jikọrọ aka n’agha, kpụụrụ nwa nwanne Ebreham bụ́ Lọt, Ebreham ‘kpọkọtara ndị ikom ya e nyere ọzụzụ, bụ́ narị ndị ohu atọ na iri na asatọ a mụrụ n’ezinụlọ ya.’ (Jenesis 14:14) Ebe Ebreham nwere ‘ndị ikom e nyere ọzụzụ’ dị narị atọ na iri na asatọ bụ́ ndị nwere ike ibu ngwá agha, ọ ga-abụrịrị na ezinụlọ ya buru ezigbo ibu. Na Ebreham nwere ike ịkpa afọ ezinụlọ buru ibu otú ahụ gosiri na ọ bụ nnọọ aka ji akụ̀ nke nwere ọtụtụ ìgwè atụrụ na ìgwè ehi.

N’ezie, ọtụtụ ndị ohu Chineke, bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie, dị ka Ebreham, Aịzik, Jekọb, Devid, Sọlọmọn, na ọtụtụ ndị ọzọ, bara ọgaranya. Ma, nke a ọ̀ pụtara na Chineke ga-eme ka onye ọ bụla na-ejere ya ozi baa ọgaranya? Ya bụrụkwanụ na mmadụ dara ogbenye, ọ̀ pụtara na Chineke anaghị agọzi ya? Isiokwu na-esochi ga-eleba ajụjụ ndị a anya.