Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ego Ọ̀ Na-eme Ka Mmadụ Nwee Ezi Obi Ụtọ?

Ego Ọ̀ Na-eme Ka Mmadụ Nwee Ezi Obi Ụtọ?

Ego Ọ̀ Na-eme Ka Mmadụ Nwee Ezi Obi Ụtọ?

A MỤRỤ Sonia na Spen. Mgbe ọ dị obere, ọ na-eso nne ya aga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Ma, mgbe o toro, ọ kwagara London, England, mechaakwa malite ịrụ ọrụ ná nnukwu ụlọ akụ̀.

Sonia ejighị ọrụ ya egwuri egwu. Ọ na-akpata nnukwu ego, na-echekwara ndị ahịa ya ego buru ibu. Ọrụ ya na-atọ ya ụtọ, ọ na-emekwa nke ọma. Sonia na-arụkarị ọrụ awa iri na asatọ n’ụbọchị, mgbe ụfọdụkwa, ọ na-ehi ụra naanị awa abụọ ma ọ bụ atọ n’abalị. O nweghị ihe ọzọ dị ya mkpa ná ndụ ma ọ́ bụghị ọrụ ya. Ma, ụwa ya tụgharịrị na mberede. Ajọ ọrịa strok bịara Sonia, ikekwe, n’ihi ndụ gbalụ gbalụ ahụ ọ nọ na-ebi. Ọ dị naanị afọ iri atọ mgbe ahụ.

Otu akụkụ ahụ́ Sonia kpọnwụrụ, ndị dọkịta ejikwaghị n’aka na ọ ga-ekwuli okwu ọzọ. Nne ya gawara England ozugbo ilekọta ya. Mgbe Sonia maliteghachiri ịga ije, nne ya gwara ya, sị, “Agawala m ọmụmụ ihe, mụ na gị ga-esokwa aga n’ihi na o nweghị otú m ga-esi ahapụ naanị gị n’ụlọ.” Sonia kwetara iso ya gaa. Gịnị meziri?

Sonia kwuru ihe merenụ, sị: “Ihe niile m nụrụ dara m ka eziokwu. Ọ tọgburu m atọgbu. Eji m obi ụtọ kweta ka otu n’ime ọtụtụ ndị bịara kelee m n’ụbọchị mbụ ahụ m gara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze mụwara m Baịbụl. Ndị mụ na ha na-akpabu akwụsịla ịbịa n’ụlọ m, ma ndị enyi ọhụrụ m nwetara hụrụ m n’anya, na-enyekwara m aka.”

Sonia ji nwayọọ nwayọọ maliteghachi ikwu okwu, o nwekwara ọganihu n’ọmụmụ Baịbụl ya. O rughị otu afọ e mee ya baptizim. Ọtụtụ n’ime ndị enyi ọhụrụ ya bụ Ndị Kraịst na-ekwusa ozi ọma oge niile, ọ hụkwara na ha nwere obi ụtọ. Sonia gwara onwe ya, sị: ‘Achọrọ m ịdị ka ha. Achọrọ m nnọọ inye Jehova Chineke ihe niile m nwere ike inye ya!’ Ugbu a, Sonia na-ekwusa ozi ọma oge niile.

Olee ihe Sonia mụtara n’ihe mere ya? “Ọ bụ ezie na m na-akpata ego buru ibu, gbalụ gbalụ dị n’ọrụ ahụ na ụjọ na-atụ m na e nwere ike ịchụ m n’ọrụ kowere m obi n’elu, na-emekwa m obi ọjọọ. Aghọtala m na ihe kacha mkpa ná ndụ bụ mụ na Nna m nke eluigwe, bụ́ Jehova, ịdị ná mma. Enweela m ezigbo obi ụtọ ugbu a.”

Pọl onyeozi dere, sị: “Ịhụ ego n’anya bụ mgbọrọgwụ nke ụdị ihe ọjọọ niile. Site n’ịchụso ụdị ịhụnanya a, e duhiewo ụfọdụ, ha wee dapụ n’okwukwe. Ha wee jiri ọtụtụ ihe mgbu maa onwe ha aghara aghara dị ka mma.” (1 Timoti 6:10) Ihe ndị mere Sonia mere ka ọ mata na ihe a Pọl kwuru bụ eziokwu.