Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Onye Nwere Obi Ụtọ na Olileanya n’Agbanyeghị na Ọ Dara Ogbenye

Onye Nwere Obi Ụtọ na Olileanya n’Agbanyeghị na Ọ Dara Ogbenye

Akwụkwọ Ozi Si Bolivia

Onye Nwere Obi Ụtọ na Olileanya n’Agbanyeghị na Ọ Dara Ogbenye

Ọ BỤ ezie na m na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ, ná mba ka na-emepe emepe, ọ ka na-ewute m mgbe ọ bụla m hụrụ ndị ogbenye na ndị ike ụwa gwụrụ. Ọ na-agụ m agụụ ka mmadụ niile kwụsị ịta ahụhụ ozugbo. Ma, m maara na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-akwụsị nsogbu ndị a. N’agbanyeghị nke ahụ, ahụla m ọtụtụ ugboro na ndị na-eme ihe Okwu Chineke kwuru na-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị ọnọdụ ọjọọ ha nọ. Sabina bụ otu n’ime ha.

Ọtụtụ afọ gara aga, Sabina ku obere ụmụ ya nwaanyị abụọ na-ele di ya ka ọ na-abanye n’otu bọs ochie ịga chọọ ezigbo ọrụ ná mba ọzọ. O chere ya ọtụtụ ọnwa, ruokwa ọtụtụ afọ, ma ọ lọtaghị. Kemgbe ahụ ọ hapụrụ ha, Sabina na-adọlị kwa ụbọchị iji chọta ihe ya na ụmụ ya nwaanyị, bụ́ Milena na Ghelian, ga-eri.

Ụbọchị mbụ m hụrụ Sabina bụ otu ehihie o ji ndidi na-eresị ọtụtụ ndị ahịa ihe n’ụlọ ahịa nwanne ya nwaanyị. Otú m si hụ Sabina gosiri na o zubeghị ike kemgbe ụtụtụ. M gwara ya na m chọrọ ịbịa ka mụ na ya na ụmụ ya nwaanyị mụwa Baịbụl. Ọ gwara m, sị: “Ọ gaara adị m mma, ma anaghị m enwetụdị ohere. Ma, m ga-achọ ka ị mụwara ụmụ m Baịbụl.” M kwetara. Ka ọmụmụ ihe mụ na ụmụaka ahụ na-aga n’ihu, m matara Sabina, ghọtakwa ụdị ọnọdụ ọ nọ.

Sabina na-eteta n’elekere anọ nke ụtụtụ. Mgbe ụmụ Sabina ka nọ n’ụra n’otu ọnụ ụlọ ha, ọ na-etinye ọkụ n’ekwú ma sikwasị nnukwu ite ochie n’elu ya. Ọ na-esi anụ ọ na-etinye n’achịcha ọ ga-eghe, bụ́ nke ọ na-ere iji kpaa afọ ezinụlọ ya. N’abalị, Sabina na-agwọ ntụ ọka ọ ga-eji eme achịcha ahụ.

Sabina na-eji nwayọọ akwanye ngwongwo niile dị ya mkpa, bụ́ nche anwụ, stovu, karama gas e ji esi nri, tebụl, oche, ite, mmanụ, anụ, ntụ ọka a gwọrọ agwọ na nnukwu galọn mmiri mkpụrụ osisi ọ pịpụtara juru, n’ime trọk ọ natara anata.

N’elekere isii nke ụtụtụ, Sabina na ụmụ ya nwaanyị abụọ na-adị njikere ịgawa. Ha na-emechi ụzọ ha, gbachiekwa ya. Ha na-ekechicha ihu; o nweghị onye na-ekwu okwu ma ọ bụ na-achị ọchị. Obi ha niile na-adị n’ebe ha na-aga. Ọtụtụ ụbọchị, esila m na windo ebe anyị bi, bụ́ ebe obibi nke ndị na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ, hụ ụdị ihe a n’ụtụtụ. N’ezie, Sabina bụ naanị otu n’ime ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị na-ahapụ ụlọ ha n’isi ụtụtụ ịga ree ihe oriri na ihe ọṅụṅụ n’okporo ámá ndị dị na Bolivia.

N’elekere isii na ọkara nke ụtụtụ, mgbe anwụ malitere ịwa n’ugwu dị n’ebe ahụ, Sabina na ụmụ ya na-erute n’ebe ha na-anọ ere ihe. N’ekwughị okwu ọ bụla, ha na-akwasị ihe niile dị na trọk ha ma kwanye ọkụ n’ekwú ha. Ozugbo Sabina tinyere achịcha nke mbụ na mmanụ ọkụ, ọ na-ada ka ebe e tinyere yabasị na mmanụ ọkụ. Ísì ọma ya na-ezu ebe niile n’ụtụtụ ahụ ikuku na-eku ma dọtawa ndị ahịa ha agụụ ji ozugbo.

Sabina jụrụ onye mbụ bịara ịzụ ya ihe, sị: “Ole ka ị chọrọ?” Nwoke ụra na-apụbeghị n’anya gosiri ya mkpịsị aka abụọ n’elelighị anya elu, Sabina ekechiere ya achịcha abụọ dị ọkụ ghere nke ọma. Sabina naara ya obere ego o nyere ya. Ọ bụ otú a ka ọ ga-esi resị ọtụtụ ndị ahịa ya ihe n’ụbọchị ahụ. Mgbe ha rere achịcha nke ikpeazụ ha, ha na-akwakọta ngwongwo ha lawa. Ọ bụ ezie na ụkwụ na-egbu Sabina mgbu n’ihi ọrụ ọ rụrụla n’ụtụtụ, ọ gakwara irere nwanne ya nwaanyị ahịa.

Mgbe mbụ m gara n’ebe ọ na-erere nwanne ya nwaanyị ahịa ka mụ na ụmụ ya mụọ Baịbụl, e doziela obere bench abụọ n’otu akụkụ. Malite n’oge anyị bidoro ịmụ ihe, Milena na Ghelian, bụ́ ndị dị afọ itoolu na afọ asaa mgbe ahụ, na-eji obi ụtọ echere ka anyị mụọ ihe, ha na-akwadebekwa nke ọma. Ụmụaka a na-eme ihere ji nwayọọ nwayọọ malite ịkọrọ m ihe dị ha n’obi ma kwe ka m bụrụ enyi ha. Nke a mere Sabina obi ụtọ. N’oge na-adịghị anya, o kpebiri na mụ na ya ga-amụwakwa Baịbụl n’agbanyeghị na ọ naghị enwetụdị ohere.

Ka Sabina na-aghọtakwu Baịbụl, otú ahụ ka ọ na-ahụkwu Jehova Chineke n’anya. Ọ malitere inwe ihe ọ na-enwetụbeghị, ya bụ, obi ụtọ! Nwaanyị a na-ere ahịa n’okporo ámá bụ́ onye ike ndụ gwụrụ nke na-ekechibu ihu ya agbanweela. Ọ naghịzi ekpuwe ihu n’ala ma ọ gawa ije, ọ na-ewelitezi anya elu, anya ya na-egbukepụkwa egbukepụ. Nwanne ya nwaanyị kwuru, sị, “Ihu na-abụzi Sabina ọchị ọchị. Ọ nabughị achị ọchị.” Ndị ọzọ hụkwara nnukwu mgbanwe ná ndụ Sabina na ụmụ ya. Ọ matala eziokwu banyere Chineke bụ́ nke na-agụ ya agụụ kemgbe.

Ọmụmụ ihe Sabina na-atọ ya ụtọ, ma ohere ọ na-anaghị enwe na-egbochi ya ịga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst. O mechara kweta ịga ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova. Kemgbe ahụ ọ gachara ya, ọ kwụsịbeghị ịga. Sabina nwetara ezi ndị enyi n’ọgbakọ ahụ ọ na-eso amụ ihe. Ọ hụkwara na Jehova na-egboro nnọọ ndị hụrụ ya n’anya, bụ́ ndị na-ahapụ ihe dị iche iche iji jeere ya ozi, mkpa ha.—Luk 12:22-24; 1 Timoti 6:8.

Ihe Sabina na-amụta na-atọ ya ụtọ, ọ na-agụkwa ya agụụ ịkọrọ ya ndị ọzọ. Ma o kwuru, sị, “Ezigbo ụjọ na-ejide m mgbe ọ bụla m chere echiche ịga kwusaara ndị mmadụ ozi ọma.” Ọ nọ na-ajụ onwe ya, sị, ‘Olee otú mụnwa, bụ́ nwaanyị na-eme ihere nke na-agụghị oké akwụkwọ, ga-esi nwee ike ịkụziri onye ọzọ ihe?’ N’agbanyeghị nke ahụ, ebere Chineke meere ya na otú Baịbụl sirila gbanwee nnọọ ndụ ya kpaliri ya ịrụ ọrụ a dị mkpa. Ọ ghọtakwara na ụmụ ya ga-achọ ime ihe ọ bụla ọ na-eme. N’ihi ya, ọ malitere izisara ndị ọzọ ozi ọma. Ụmụ ya ji ịnụ ọkụ n’obi soro ya.

Taa, Sabina abụkwaghị nwaanyị na-enweghị obi ụtọ nke na-adọgbu onwe ya n’ọrụ kwa ụbọchị. Ọ ka bụ ogbenye. Ma, otú o si ele ndụ anya agbanweela. Ugbu a ọ bụzi Onye Kraịst e mere baptizim, ọ na-ezisara ndị ọzọ ozi ọma Alaeze Chineke, nke bụ́ naanị ihe ga-eme ka ịda ogbenye na enweghị olileanya dị n’ụwa kwụsị.—Matiu 6:10.

Elekere ise nke ụtụtụ akụọla, Sabina adịla njikere ọzọ ịhapụ otu ọnụ ụlọ ebe o bi. Ma n’ụtụtụ a, ọ naghị aga ire achịcha ahụ ọ na-ere. Ọ na-aga iso Ndị Kraịst ibe ya ekwusa ozi ọma n’okporo ámá. Oge ọ na-ewepụta kwa izu iji nyere ndị ọzọ aka emeela ka o nwekwuo obi ụtọ ná ndụ. Ọ gbachiri ụzọ, mụmụrụ ọnụ ọchị pụwa n’okporo ámá. Ma, ọ kwaghị trọk ya, kama o bu akpa. Ihe dị n’akpa ahụ bụ Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl ọ ga-eji zisaara ndị mmadụ ozi ga-eme ka ha nwee olileanya. Sabina ji ọnụ ọchị na obi ike kwuo, sị, “Ọ dịghị mgbe m rọrọ nrọ na m ga-ejili Baịbụl zie ndị mmadụ ozi ọma.” O kwukwara, sị, “Ọ na-atọgbu m atọgbu!”