ihe Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa Dị n’Ọdọ Mmiri Kacha Ukwuu n’Etiti Kọntinent America
ihe Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa Dị n’Ọdọ Mmiri Kacha Ukwuu n’Etiti Kọntinent America
Ọ BỤ ezie na Nicaragua bụ obere mba, o nwere ọdọ mmiri kacha ukwuu n’Etiti Kọntinent America, bụ́ Ọdọ Mmiri Nicaragua. Ọ dị mma ịmara na Ọdọ Mmiri Nicaragua nwere ike ịbụ naanị ọdọ mmiri a na-aṅụ mmiri ya aṅụ nke nwere azụ̀ ndị na-ebi n’oké osimiri, dị ka shark, swordfish, na tarpon. Ndị ọkà mmụta sayensị kweere na ọdọ mmiri a bụbu ngalaba Oké Osimiri Pacific, nke ugwu gbawara agbawa mechara kewapụ n’oké osimiri ahụ. Mgbe nnu dị na mmiri ya belatara, ọ maara azụ̀ ndị dị na ya ahụ́.
Ọdọ mmiri ahụ, nke dị otu narị kilomita na iri isii n’ogologo na kilomita iri asaa n’ebe kacha obosara na ya, dị ihe dị ka mita iri atọ n’elu. E nwere ihe karịrị narị agwaetiti anọ n’Ọdọ Mmiri Nicaragua, narị atọ n’ime ha dịkwa gburugburu Ala Asese Sọnyere Isi na Mmiri, bụ́ nke dịdebere obodo Granada, n’ọnụ ọnụ ebe ugwu ọdọ mmiri ahụ. A na-akpọ ha Obere Agwaetiti Granada.
Agwaetiti kacha ukwuu n’ọdọ mmiri ahụ bụ Agwaetiti Ometepe, nke dị n’etiti. Ometepe, bụ́ nke dị kilomita iri abụọ na ise n’ogologo na kilomita iri na atọ n’obosara, nwere nnukwu ugwu abụọ na-agbọpụta ọkụ ndị otu ala dị warara jikọtara. Ugwu nke ka ogologo, bụ́ Concepción, nke ọnụ ọnụ ya gbara nnọọ mkpị, dị otu puku mita na narị isii na iri n’ịdị elu. Ọ na-agbọpụta ọkụ, ọ sachikwara ebe buru ibu n’ebe ugwu agwaetiti ahụ. Ugwu nke ọzọ bụ́ Madera, nke dị otu puku mita na narị atọ na iri itoolu na anọ n’ịdị elu, anaghị agbọpụta ọkụ ugbu a. N’etiti Ugwu Madera, nke ahịhịa ndụ juru, e nwere ọdọ mmiri nke alụlụụ na-ekpuchi.
Ọdọ Mmiri Nicaragua so n’ihe ndị njem na-abịa ekiri n’ebe a. Ha na-abịa ikiri ọmarịcha oké ọhịa na ihe ndị mgbe ochie juru na ya. Ma, e nwere ihe ọzọ dị oké ọnụ ahịa dị n’Ọdọ Mmiri Nicaragua nke ndị mmadụ na-achọpụtachabeghị.
Obodo Mmiri Gbara Gburugburu
N’Obere Agwaetiti Granada, e nwere ọtụtụ ihe ọkụkụ na ụmụ anụmanụ na-adị n’oké ọhịa. Okooko osisi ndị mara mma na-eto n’oké ọhịa juru n’agwaetiti ndị a nwere ugwu ndị na-agbọpụta ọkụ. N’ikpere mmiri ahụ, nnụnụ mmiri ndị mara mma, ndị dị ka obere ụgbala na-acha anụnụ anụnụ, nnukwu oso ehi, ugo na-eri azụ̀, anhinga, na kọmọrant na-akpagharịrị onwe ha kwa ụbọchị. E nwejuru akwụ́ nnụnụ n’ọnụ ọnụ oké ọhịa ndị dị n’ebe ahụ ndị ikuku si n’ọdọ mmiri ahụ na-ebugharị, bụ́ ndị nnukwu nnụnụ na-achatụ ọbara ọbara, bụ́
Montezuma oropendolas, kpara n’alaka nnukwu osisi.Ndị mmadụ bi n’ụfọdụ agwaetiti ndị ahụ. E nwere ụlọ ebe ndị ọkụ azụ̀ nọ n’ebe ahụ bi nakwa ọmarịcha ụlọ ebe ndị ọgaranya na-ebi n’oge ezumike. E nwekwara ụlọ akwụkwọ, ebe a na-eli ozu, ụlọ nri na ụlọ mmanya n’ebe ahụ. Ìgwè agwaetiti ndị dị n’ebe ahụ yiri otu obere obodo, obodo mmiri gbara gburugburu.
Kwa ụtụtụ, otu ụgbọ mmiri e tere agba ọcha na agba anụnụ anụnụ na-aga na nke ọ bụla n’agwaetiti ndị ahụ na-eburu ụmụaka na-ebuga n’ụlọ akwụkwọ. Ụlọ ahịa dị n’ụgbọ epeepe na-esi n’otu agwaetiti aga n’agwaetiti ọzọ, na-eresị ndị mmadụ mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri. N’ọdọ mmiri ahụ, a na-ahụkarị ebe ndị ikom na-akwadebe ụgbụ azụ̀ ha na ebe ụmụ nwaanyị na-asa ákwà.
Ndịàmà Jehova na-arụkwa ọrụ ha n’agwaetiti ndị a. Ha na-eji ụgbọ mmiri agakwuru ndị bi n’ebe ahụ iji kwusaara ha ozi ọma Alaeze Chineke. (Matiu 24:14) Otú mmiri si ju n’ebe a mere ka e nwee otu nsogbu: Olee ebe e nwere ike ịna-ezukọ iji mụọ Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl? Iji rube isi n’iwu Baịbụl bụ́ “ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị,” Ndịàmà chepụtara otú a ga-esi merie nsogbu a, ya bụ, iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze mbụ na-ese n’elu mmiri na Nicaragua!—Ndị Hibru 10:25.
Ụlọ Nzukọ Alaeze Na-ese n’Elu Mmiri
Otu di na nwunye bụ́ Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma oge niile kwagara n’Obere Agwaetiti Granada na November 2005. Ọnwa ole na ole ka e mechara, mgbe ha kpọrọ ndị obodo ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Kraịst nke a na-eme kwa afọ, o juru ha anya ịhụ na mmadụ iri asaa na isii bịara. Nke a mere ka o doo di na nwunye ahụ anya na ọ dị mkpa ịmalite inwechi ọmụmụ ihe Ndị Kraịst anya n’ebe ahụ. Ebe ọ bụ na o siri ike ịchọta ebe dị mma ịnọ na-enwe ọmụmụ ihe, ndị ahụ na-ekwusa ozi ọma oge niile chepụtara ihe ọzọ. Ha jụrụ onwe ha, sị, Ọ́ gaghị adị mma ka anyị wuo Ụlọ Nzukọ Alaeze na-ese n’elu mmiri nke e nwere ike ibuga n’ebe ọ bụla kaara ndị mmadụ mma?
Di na nwunye a dị uchu, bụ́ ndị na-arụtụbeghị ụgbọ, malitere ọrụ a. Ha na mmadụ isii ọzọ rụrụ ọrụ ahụ otu ọnwa. Ụlọ nzukọ ọhụrụ ahụ ga na-ese n’elu mmiri. Ihe a ga-eji arụ ya bụ paịpụ ígwè ndị a gbakọtara ọkụ bụ́ ndị ga-ejikọta drọm iri na abụọ a gbajuru ikuku iji mee ka ha nwee ike ise n’elu mmiri. A ga-eji osisi mee ala ya, jirikwa tapolin kpuchie elu ya. Ndị ọrụ ahụ kpere ekpere kwa abalị banyere ọrụ ahụ
n’ihi na ha ejighị n’aka ma ụlọ nzukọ ahụ ọ̀ ga-eseli n’elu mmiri. Ma, o mechara see n’elu mmiri!Ụbọchị mbụ a nọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ a kwuo Okwu Ihu Ọha bụ na June 10, 2006. N’echi ya, a kpụ ya gaa n’agwaetiti ọzọ ka e nweekwa otu ọmụmụ ihe ahụ maka ndị bi n’ebe ahụ. Ndị niile bịara ọmụmụ ihe abụọ ahụ dị mmadụ iri anọ na asatọ, n’agbanyeghị na ụfọdụ n’ime ha ji ụkwụ gaa ije ihe karịrị ọkara awa n’ime ọhịa. Ha niile nwere obi ụtọ inwe ebe ha ga-anọ na-efe ofufe!
E nwere ihe ndị na-eme mgbe a na-amụ ihe n’Ụlọ Nzukọ a na-anaghị eme n’Ụlọ Nzukọ Alaeze niile. Mgbe ọkà okwu na-ekwu okwu, ndị na-ege ntị nwere ike ịnụ ụda mmiri nke na-akụ na nkume ma ọ bụkwanụ mgbe ụfọdụ nụ mkpu enwe na-eti n’ebe dịtụ anya. N’oge na-adịghị anya, ndị bi n’agwaetiti ndị ahụ hụchiwere nnọọ ụlọ nzukọ ahụ anya. Ha na-efere ya aka ma ha hụ ka e si n’otu ebe kpụrụ ya na-aga ebe ọzọ. Kwa izu, ihe karịrị mmadụ iri abụọ na-abịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ na-ese n’elu mmiri ka ha na Ndị Kraịst ibe ha nọkọọ ma mụọ Baịbụl. Nke a aghọọla nnọọ ihe dị oké ọnụ ahịa!
Agwaetiti Ometepe
Agwaetiti Ometepe dị ihe dị ka kilomita iri ise ma e si n’ebe ndịda Granada gawa ya. Otú agwaetiti a si maa mma na otú ala ya si eme nri nke ọma emeela kemgbe ka ọ bụrụ ebe dị mma obibi. N’ezie, ọ bụ n’ebe a ka a hụrụ ihe ndị kacha ochie e ji rụọ ọrụ ubi na Nicaragua. Taa, e nwere ihe dị ka puku mmadụ iri anọ na puku abụọ bi n’Ometepe, bụ́ ndị ọkụ azụ̀ na ndị na-akọ ọka, unere, kọfị, na ihe ndị ọzọ. E nwekwara ọtụtụ anụ ọhịa na ya. Ọtụtụ icheoku na-ebe ubé ma na-efegharị n’ebe ahụ, nnụnụ ndị yiri ọkwà na-agbasa nku ha ndị na-achatụ anụnụ anụnụ, na-achatụkwa ọcha ka ha na-efegharị n’osisi ndị dị n’ebe ahụ, enwe ndị ihu ha na-acha ọcha, bụ́ nke ọtụtụ ndị na-enwe mmasị ikiri, dịkwa n’ebe ahụ.
A na-ekwusachikwara ndị bi n’Ometepe ozi ọma Alaeze Chineke anya. Na 1966, Ndịàmà e mere baptizim bi n’Ometepe dị naanị mmadụ asatọ, ma ugbu a, ha eruola otu narị mmadụ na iri asatọ na atọ nọ n’ọgbakọ anọ na-eme nke ọma. Ọgbakọ nke ọ bụla nwere Ụlọ Nzukọ Alaeze nke ya dị ya nso. Taa, e nwere otu Onyeàmà n’ime narị mmadụ abụọ na iri atọ ọ bụla bi n’agwaetiti ahụ.
Ndịàmà Jehova bi n’Ometepe ediela ihe isi ike dị iche iche ruo ọtụtụ afọ. Dị ka ihe atụ, ndị mmegide gbara Ụlọ Nzukọ Alaeze dị na Mérida ọkụ na 1980. E wuru ụlọ nzukọ ọzọ na 1984. A nọrọ na ya mụọ ihe ruo mgbe e wuru Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ mara mma na 2003, bụ́ nke mere nnọọ mmadụ iri isii nọ n’ọgbakọ ahụ obi ụtọ.
Na Moyogalpa, e wuru Ụlọ Nzukọ Alaeze e nwere ike iji na-eme mgbakọ mgbe ọ bụla ọ dịrị mkpa. A kụrụ gbamgbam ụlọ nzukọ ahụ ka ọ mafọ amafọ n’azụ, e wee wuo ikpo okwu n’okpuru ya. E si n’ihu ikpo okwu ahụ tụọ kanopi ruo n’ebe ala ahụ gwụrụ ma dewegasịa ya oche. Ọ bụ n’ebe a ka Ndịàmà bi n’ebe ahụ na ndị enyi ha na-ezukọ maka mgbakọ ha na-enwe site n’oge ruo n’oge. Ná mgbakọ ndị a, a na-eme ndị ọhụrụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst baptizim n’Ọdọ Mmiri Nicaragua.—Matiu 28:19.
À Ga-echekwali Ihe Ndị ahụ Dị Oké Ọnụ Ahịa?
Kemgbe ụwa, Ọdọ Mmiri Nicaragua yiri ihe ọ na-enweghị ihe mmadụ ga-emeli ya, ikekwe, n’ihi otú o si buo ibu. Ma taa, ọ dị mkpa ka e chebe ya. Ihe ndị ọrụ ubi na ụlọ ọrụ dị iche iche na-emepụta na ihe idei mmiri na-ebute n’ala e gbukpọrọ osisi ya na-emebi mmiri ya.
A mabeghị ma mgbalị ndị obodo na gọọmenti na-eme ọ̀ ga-eme ka a kwụsị imebi ọdọ mmiri ahụ. Otú o sina dị, Onye Okike ga-ahụ na e chekwara ihe niile dị oké ọnụ ahịa dị n’ụwa, tinyere ọdọ mmiri ya ndị na-egbuke egbuke, agwaetiti ya ndị mara mma, na ọmarịcha anụ ọhịa ndị dị na ya, ma nye ya ụmụ mmadụ na-erube isi dị ka ihe nketa. Baịbụl gwara anyị, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:29.
[Foto dị na peeji nke 26]
Ụlọ Nzukọ Alaeze na-ese n’elu mmiri bụ́ ebe a na-anọ amụ Baịbụl