Ị̀ Maara?
Ị̀ Maara?
Ònye bụ “onyeisi ndị nche ụlọ nsọ,” oleekwa ihe bụ́ ọrụ ya?
Otu n’ime ndị ndú okpukpe ndị Juu bụ́ ndị jidere ndịozi bụ́ Pita na Jọn mgbe ha na-ekwusa ozi ọma bụ “onyeisi ndị nche ụlọ nsọ.” (Ọrụ 4:1-3) Baịbụl ekwughị ihe bụ́ ọrụ onyeisi ndị nche ụlọ nsọ, ma ihe ụfọdụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kwuru mere ka anyị ghọtatụ ọrụ ya.
O yiri ka mgbe Jizọs nọ n’ụwa, onye na-arụ ọrụ a ọ̀ bụ onye nchụàjà nke na-esote nnukwu onye nchụàjà. Onyeisi ndị nche ụlọ nsọ na-ahụ na udo dị n’ụlọ nsọ Jeruselem nakwa n’ogige ya. Ọ bụ ya na-ahụ maka ofufe a na-efe n’ụlọ nsọ ahụ, na-ahụkwa maka ndị e nwere ike ịkpọ ndị uwe ojii ụlọ nsọ. Ndị isi nọ n’okpuru ya na-elekọta ndị nche ndị na-emepe ọnụ ụzọ ụlọ nsọ n’ụtụtụ ma na-emechi ha n’abalị, na-ahụkwa na o nweghị onye banyere n’ebe a na-achọghị ka ndị mmadụ banye ma na-eche akụ̀ ndị dị n’ụlọ nsọ nche.
A haziri ndị nchụàjà na ndị Livaị na-arụ ọrụ n’ụlọ nsọ ahụ ìgwè iri abụọ na anọ, ìgwè nke ọ bụla na-ejekwa ozi otu izu n’otu mgbe, ugboro abụọ n’afọ. Ọ dị ka ìgwè nke ọ bụla ò nwere onyeisi nke ya.—1 Ihe E Mere 24:1-18.
Ndị isi ndị nche ụlọ nsọ bụ ndị a ma ama. A kpọrọ ha aha mgbe a na-ekwu banyere ndị isi nchụàjà, bụ́ ndị gbara izu ka e gbuo Jizọs, ọ bụkwa ha dunyere ndị nọ n’okpuru ha ka ha gaa jide Jizọs.—Luk 22:4, 52.
Matiu 3:4 kwuru na Jọn Onye Na-eme Baptizim riri “igurube na mmanụ aṅụ ọhịa.” Igurube ọ̀ bụ nri ndị mmadụ na-erikarị n’oge ahụ?
Ụfọdụ ndị na-enwe obi abụọ ma ọ̀ bụkwa igurube ka Jọn riri, na-ekwu na ihe Matiu na-ekwu na o riri bụ mkpụrụ nke osisi a na-akpọ locust tree, mkpụrụ osisi na-amị n’ọhịa, ma ọ bụkwanụ ọbụna ụdị azụ̀ dị iche iche. Ma, okwu Grik Matiu dere n’amaokwu ahụ bụ aha otu ụdị igurube nke a na-akpọ Acrididae taa. Ụdị igurube a kacha mara amara n’Izrel bụ ụdị na-anọ n’ọzara, bụ́ nke a maara na-agbakọ aka eripịa ihe ọkụkụ.—Joel 1:4, 7; Nehọm 3:15.
Ndị Asiria na ndị Itiopia oge ochie weere igurube dị ka ezigbo ihe oriri, ndị Arab Bedouin na ndị Juu Yemen ka na-erikwa ya taa. N’Izrel, e weere igurube dị ka nri ndị ogbenye. Mgbe e wepụchara isi ya, ụkwụ ya, na afọ ya, a na-eri etiti ya ná ndụ ma ọ bụ a hụọ ya n’ọkụ, ma ọ bụkwanụ rie ya mgbe a mịkpọchara ya n’anwụ. Mgbe ụfọdụ, a na-etinye igurube nnu ma ọ bụkwanụ tinye ya ná mmanya gbara ụka ma ọ bụ mmanụ aṅụ. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Henri Daniel-Rops kwuru na ọ na-atọtụ ka oporo.
Ebe ọ bụ na Jọn kwusara ozi ọma n’ala ịkpa, ọ ga-abụ na ọ dịịrị ya mfe inweta igurube. (Mak 1:4) Igurube na mmanụ aṅụ bụ nri na-enye ezigbo ihe n’ahụ́ n’ihi na igurube nwere ụzọ atọ n’ime ụzọ anọ nke protein ahụ́ mmadụ chọrọ.
[Foto dị na peeji nke 28]
Ebe ndị ozi bụ́ ndị Asiria bu igurube na pọmigranet
[Ebe E Si Nweta Foto]
E nwetara ya n’akwụkwọ bụ́ Discoveries Among the Ruins of Nineveh and Babylon (1853)