Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịkụ Azụ̀ n’Oké Osimiri Galili

Ịkụ Azụ̀ n’Oké Osimiri Galili

Ịkụ Azụ̀ n’Oké Osimiri Galili

OLEE otú ndụ na-adịrị onye na-akụ azụ̀ n’Oké Osimiri Galili na narị afọ mbụ? Azịza ya ga-enyere anyị aka ịghọtakwu ọtụtụ ihe e dere n’Oziọma, ya bụ, Matiu, Mak, Luk na Jọn, dị ka ndị ahụ a tụlere n’isiokwu bu nke a ụzọ.

“Oké osimiri” ahụ bụ nnọọ ọdọ mmiri a na-aṅụ mmiri ya aṅụ nke dị ihe dị ka kilomita iri abụọ na otu n’ogologo na kilomita iri na abụọ n’obosara. Ọ dịla anya ndị ọkụ azụ̀ kụwara azụ̀ na ya n’ihi ọtụtụ azụ̀ dị na ya. O doro anya na e nwere ahịa ebe a na-ere azụ̀ n’Ọnụ Ụzọ Ámá Azụ̀ nke dị na Jeruselem. (Nehemaya 3:3) Oké Osimiri Galili so n’ebe e si egbute azụ̀ a na-ere n’ebe ahụ.

Pita onyeozi si n’otu obodo dị n’Oké Osimiri Galili nke a na-akpọ Betseida, nke nwere ike ịpụta “Ụlọ Onye Ọkụ Azụ̀.” Aha obodo ọzọ dị n’ọdọ mmiri ahụ bụ Magadan, ma ọ bụ Magdala, bụ́ ebe Jizọs kpọ ndị na-eso ụzọ ya gaa mgbe o jechara ije n’elu mmiri. (Matiu 15:39) Otu onye na-ede akwụkwọ kwuru na e nwere ike ịsụgharị aha ndị Grik na-akpọ obodo ahụ “Ebe A Na-akwadebe Azụ̀.” Ihe e ji mara obodo ahụ bụ ọtụtụ ụlọ azụ̀ dị na ya, bụ́ ebe a na-amị azụ̀ ndị e gbutere n’ebe ahụ ma tinye ha nnu, ma ọ bụkwanụ gburie ha ka ha gbapụta mmiri a na-echekwa n’ite ụrọ a na-akpọ amphorae. Ikekwe, a na-akwakọta ihe ndị a ma buga ha n’ebe niile n’ala Izrel nakwa ọbụna n’ebe ndị ọzọ.

Ya mere, ịkụ azụ̀, ịkwadebe ya, na ire ya bụ nnukwu ihe e ji akpata ego na Galili n’oge Jizọs nọ n’ụwa. Mmadụ nwere nnọọ ike iche na nke a mere ka ọtụtụ ndị bi n’ebe ahụ nwee ego. Ma, ọ bụchaghị otú ahụ. Otu ọkà mmụta kwuru na ịkụ azụ̀ “abụghị ‘ọrụ onye ọ bụla ọ masịrị ya abanye gaa kpara ego,’ dị ka ndị na-agụ Agba Ọhụrụ n’oge a nwere ike iche.” O so “n’achụmnta ego ndị gọọmenti na-enye mmadụ ikike tupu ya amalite, nke na-emebakwa naanị ndị oké ozu.”

Herọd Antipas chịrị Galili dị ka onye ọchịchị nke Rom họpụtara ka ọ chịa ógbè ahụ. N’ihi ya, ọ bụ ya bụ onye okporo ụzọ, ọdụ ụgbọ mmiri, na akụ̀ ndị dị n’ala nakwa ná mmiri ndị dị n’ókèala ya dị n’aka, dị ka ebe ndị a na-egwupụta ihe n’ala, oké ọhịa, ubi, na ebe ndị a na-akụ azụ̀. Herọd na-esi n’ihe ndị a enweta ụtụ buru ibu. Anyị amachaghị otú e si anakọta ụtụ na Galili na narị afọ mbụ. Ma, o yiri ka otú Herọd si naa ụtụ n’oge ahụ adịchaghị nnọọ iche n’otú ndị ọchịchị Gris si naa ụtụ ma ọ bụ n’otú ndị Rom si naa ụtụ n’ebe ndị ọzọ ha chiri n’ebe ọwụwa anyanwụ. O nwere ike ịbụ na ihe ka ukwuu n’ego ndị e nwetara n’ọrụ ndị a rụrụ n’ebe ahụ na n’akụ̀ ndị dị n’ime ala na ná mmiri lara n’akpa ndị oké ozu kama ịga n’akpa ndị nkịtị, bụ́ ndị kacha arụpụta ego ndị ahụ.

Ụtụ Na-anyịgbu Ndị Mmadụ

N’oge Jizọs nọ n’ụwa, ndị nwe ala ndị kacha mma na Galili bụ ndị ezinụlọ eze, e sikwa na ha mawapụta ebe ndị buru ibu Herọd Antipas na-enye ndị ukwu n’ọchịchị ya na ndị ọzọ masịrị ya n’onyinye. Ọ bụ ndị Herọd na-achị na-akwụ ụgwọ ihe niile ọ na-emefu ná ndụ okomoko ya, nnukwu ụlọ ndị o wuru, ụgwọ ọ na-akwụ ọtụtụ ndị o were n’ọrụ n’ọchịchị ya, na onyinye dị iche iche o nyere ndị enyi ya na obodo dị iche iche. E kwuru na ụtụ isi, ụtụ ụzọ, na ụtụ ahịa a na-amanye ndị nkịtị ịtụ na-anyịgbu ha anyịgbu.

Ọ bụkwa naanị Herọd na-ekwu ihe na-eme na mmiri ndị dị n’ókèala ebe ọ na-achị. N’ihi ya, ma ọ́ bụghị na ịkụ azụ̀ so n’ọtụtụ ọrụ a na-arụrụ eze, ya abụrụ ọrụ a na-arụrụ ndị e nyere ala n’onyinye. N’ebe ndị a na-akụrụ eze azụ̀, ndị isi ndị ọnaụtụ, bụ́ ndị aka ji akụ̀ ndị na-anara ọrụ ịnakọta ụtụ ná ngo, na-enwezi ikike ịgwa ndị ọkụ azụ̀ ego ole ha ga na-akwụ iji nweta ikike ịkụ azụ̀ n’ebe ndị ahụ. Ụfọdụ ndị nkọwa ekwuola na ebe ọ bụ na ụlọ ebe Matiu na-anakọta ụtụ dị na Kapaniọm, bụ́ ebe dị mkpa a na-akụ azụ̀ n’Oké Osimiri Galili, ọ ga-abụ na ọ rụụrụ ndị isi ndị ọnaụtụ ndị ahụ ọrụ dị ka “onye ọrụ ngo nke na-enye ndị ọkụ azụ̀ ikike ịkụ azụ̀ n’ebe a na-akụrụ eze azụ̀.” *

Ihe àmà ndị e nwetara na narị afọ mbụ na nke abụọ Tupu Oge Anyị na-egosi na ihe ndị mmadụ na-ejikarị atụ ụtụ isi na Palestaịn bụ ‘ihe ha rụpụtara,’ ọ bụghị ego nkịtị. N’ihi ya, ụfọdụ ndị ji ịkụ azụ̀ mere aka ọrụ na-enye ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ anọ nke azụ̀ ha na-egbute ma ọ bụ nyeruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara azụ̀ ha na-egbute iji kwụọ ụgwọ ikike e nyere ha igbu azụ̀. Ihe odide oge ochie gosiri na ma ó nweghị ihe ọzọ, n’ebe ụfọdụ Rom chịrị, ọ bụ naanị gọọmenti na-ahụ maka ọrụ ịkụ azụ̀ ma nwee ndị ha họpụtara ịhụ na e mere ihe ha kwuru. Na Pisidia, ndị e nwere ike ịkpọ ndị uwe ojii azụ̀ na-ahụ na o nweghị onye ga-egbu azụ̀ ma ọ́ bụghị onye e nyere ikike, na-ahụkwa na ọ bụ naanị ndị na-azụ azụ̀ n’ùkwù ka a na-eresị azụ̀, bụ́kwanụ ndị gọọmenti na-anakwa ụtụ ma na-ahụ na ha mere ihe ha chọrọ.

Otu onye na-eme nnyocha kwuru na n’ihi ụtụ niile a a na-atụ nakwa otú aka gọọmenti si dịrị n’ihe niile, “eze ma ọ bụ onye o nyere ala na ụlọ na-erite uru dị ukwuu, ebe ndị ọkụ azụ̀ na-enweta naanị obere uru.” Uru ndị e were n’ọrụ n’ụdị ọrụ ego ndị ọzọ na-erite na-epekwa nnọọ mpe n’ihi ụtụ karịrị akarị a na-ana ha. O nwetụbeghị mgbe obi na-adị ndị na-atụ ụtụ mma ịtụ ya. Ma, o doro anya na ihe so mee ka asị ndị mmadụ kpọrọ ndị ọnaụtụ, nke e kwuru okwu ya n’Oziọma, ka njọ bụ akwụwaghị aka ọtọ na anyaukwu nke ndị ikom ahụ, bụ́ ndị ji ịnapụ ndị nkịtị ihe ọ bụla ha nwere ike ịnapụ ha baa ọgaranya.—Luk 3:13; 19:2, 8.

Ndị Ọkụ Azụ̀ E Kwuru Okwu Ha n’Oziọma

Ihe ndị e dere n’Oziọma gosiri na Saịmọn Pita nwere ndị ya na ha gbakọrọ aka na-akụ azụ̀. Ndị bịara inyere Pita aka ịdọpụta azụ̀ ha gbutere n’ọrụ ebube Jizọs rụrụ bụ “ndị ibe ha nọ n’ụgbọ nke ọzọ.” (Luk 5:3-7) Ndị ọkà mmụta kwuru na “ndị ọkụ azụ̀ nwere ike ihiwe ‘òtù ndị ọkụ azụ̀’ . . . iji nyere ha aka inweta ikike igbu azụ̀.” O nwere ike ịbụ otú a ka ụmụ Zebedi, Pita, Andru, na ndị ibe ha si nweta ikike ịkụ azụ̀.

Akwụkwọ Nsọ ekwughị kpọmkwem ma ọ̀ bụ ndị ikom Galili ahụ na-akụ azụ̀ nwe ụgbọ na ngwá ọrụ ndị ha ji akụ azụ̀. Ụfọdụ kweere na ọ bụ ha nwe ha. N’ezie, e kwuru na Jizọs banyere n’ụgbọ “bụ́ nke Saịmọn.” (Luk 5:3) Ma, otu akwụkwọ e dere nnọọ banyere isiokwu a kwuru na “ma ọ́ dịghị ihe ọzọ o nwere ike ịbụ ndị ahụ ikike ịkụ azụ̀ dị n’aka nwe ụgbọ ndị ahụ, ndị nọ n’òtù ndị ọkụ azụ̀ ejiri ha na-akụ azụ̀.” Nke ọ bụla ọ bụ, Akwụkwọ Nsọ kwuru na Jems na Jọn nọ na-edozi ụgbụ ha. Ọ ga-abụkwa na ndị ọkụ azụ̀ na ndị ha na-eresị azụ̀ na-akpa ọnụ ahịa, ha na ndị ga-arụrụ ha ọrụ ụbọchị na-akpakwa.

Ya mere, ọrụ ịkụ azụ̀ na Galili na narị afọ mbụ siri ike karịa otú mmadụ nwere ike iche. Ọrụ ha bụ ọrụ achụmnta ego na-adịghị mfe nke jikọtara ọtụtụ ndị. Iburu nke a n’uche na-eme ka anyị ghọtakwuo ihe ndị e kwuru n’Oziọma na ihe ndị Jizọs kwuru banyere ịkụ azụ̀ na ndị ọkụ azụ̀. Nke ka nke bụ na ọ na-enyere anyị aka ịghọta ụdị okwukwe Pita, Andru, Jems, na Jọn nwere. Ịkụ azụ̀ bụ ihe ha ji akpa afọ ha. Ma hà nwere ego ma ọ bụ na ha enweghị n’oge Jizọs kpọrọ ha, ha hapụrụ ọrụ ahụ ha maara nke ọma ozugbo, bụ́ ọrụ ha ji nnọọ akpata ego, iji ghọọ “ndị na-akụta mmadụ.”—Matiu 4:19.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Ọ ga-abụ na Pita onyeozi si Betseida kwaga Kapaniọm, bụ́ ebe ya na nwanne ya Andru na ụmụ Zebedi gbakọrọ aka na-akụ azụ̀. Jizọs bitụkwara na Kapaniọm.—Matiu 4:13-16.

[Map dị na peeji nke 25]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Ọdọ Mmiri Hula

Betseida

Kapaniọm

Magadan

Oké Osimiri Galili

Jeruselem

Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ

[Ebe E Si Nweta Ya]

Todd Bolen/Bible Places.com

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 26]

Todd Bolen/Bible Places.com