Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ekwensu Ọ̀ Dị Adị n’Ezie?

Ekwensu Ọ̀ Dị Adị n’Ezie?

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ekwensu Ọ̀ Dị Adị n’Ezie?

Ee, Baịbụl na-akụzi na e nwere onye dị adị bụ́ Setan bụ́ Ekwensu. Ma, ndị na-akatọ Baịbụl ji otú ahụ Baịbụl si kọwaa Ekwensu eme akaje. Ha na-ekwu na Setan bụ naanị ihe ọjọọ nke dị n’ime ụmụ mmadụ.

Ò kwesịrị iju anyị anya na e nwere echiche dị iche iche banyere onye Setan bụ n’ezie? Mbanụ. Dị ka ihe atụ: Onye omekome nwere ike ịkpa arụ ma hichapụsịa ihe e nwere ike iji mata na ọ bụ ya kpara arụ ahụ, sikwa otú ahụ na-arụ ala n’enweghị onye chọpụtara ya. N’otu aka ahụ, Setan bụ onye omekome nke ọ na-amasị izo ezo na-akpa arụ, na-eme ka omume ọjọọ na-amụba. Jizọs mere ka o doo anya na ọ bụ Setan kpatara ọnọdụ ọjọọ ụmụ mmadụ nọ na ya. Jizọs kpọrọ Setan “onye na-achị ụwa a.”—Jọn 12:31.

Olee otú Ekwensu si malite ịdị? E keburu mmụọ ozi a nupụrụ isi ka ọ bụrụ mmụọ ozi zuru okè nke bi n’eluigwe, ma, o mere onwe ya Ekwensu mgbe ọ gụsiwere ya agụụ ike ka ụmụ mmadụ fewe ya ofufe kama ife Chineke. Baịbụl kwuru banyere mkparịta ụka Setan na Jizọs nwere n’ụwa ebe a, ihe Ekwensu kwukwara ná mkparịta ụka ahụ gosiri nnọọ na ọ bụ onye anyaukwu na-achọ naanị ọdịmma onwe ya. Setan nwara ime ka Jizọs “daa n’ala fee” ya ofufe.—Matiu 4:8, 9.

Setan gosikwara ihe dị ya n’obi n’ụka ya na Chineke kparịtara, nke e dere n’akwụkwọ Job. Ọ ga-eme ihe niile o nwere ike ime iji mee ka ụmụ mmadụ jụ Chineke.—Job 1:13-19; 2:7, 8.

Chegodị echiche: Ọ bụrụ na Setan na Jehova Chineke na Jizọs Kraịst kparịtara ụka, olee otú Setan ga-esi bụrụ naanị ihe ọjọọ nke dị n’ime ndị ọzọ? N’ezie, o nwetụghị ihe ọjọọ dị n’ime Chineke ma ọ bụ Ọkpara ya! N’ihi ya, o doro anya na Setan bụ onye dị adị n’ezie, ya bụ, mmụọ ọjọọ nke na-anaghị akwanyere Jehova ma ọ bụ Jizọs ùgwù.

Ihe ọjọọ juru n’etiti ụmụ mmadụ na-egosi na Ekwensu dị adị n’ezie. Mba dị iche iche n’ụwa a na-ahapụ nri ka o mebie ebe agụụ na-echi ụmụ amaala ha ọnụ n’ala. Mba dị iche iche na-akwakọba ngwá agha ọgwụrụ mba iji gburịta ibe ha. Ha na-ebibi elu ala. Ma, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ amaghị onye na-akpata ịkpọasị na mbibi a ndị mmadụ na-ebibi onwe ha. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị?

Baịbụl gosiri na Setan emeela “ka uche ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì.” (2 Ndị Kọrịnt 4:4) Setan nwere òtù a na-anaghị ahụ anya o ji eme ka ụmụ mmadụ na-eme uche ya. Ọ bụ ya bụ “onye na-achị ndị mmụọ ọjọọ.” (Matiu 12:24) Otú ahụ onyeisi nnukwu òtù ndị omempụ nwere ike iji ndị òtù ya na-arụ arụrụala n’emeghị ka ndị niile nọ n’òtù ahụ mara onye ọ bụ, Setan na-ejikwa òtù nzuzo ọjọọ ya bụ́ ndị mmụọ ọjọọ achị ụmụ mmadụ, ọtụtụ n’ime ha amaghịkwa na o ji ha mere ngwá ọrụ.

Anyị na-ekele nnọọ Chineke na Baịbụl gbara Ekwensu na òtù ya n’anwụ! N’ihi ya, anyị nwere ike ime ihe iji mee ka Ekwensu ghara ịchị anyị. Baịbụl dụrụ anyị ọdụ, sị: “Doonụ onwe unu n’okpuru Chineke; ma na-eguzogidenụ Ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ.”—Jems 4:7.