Mmadụ Ò Nwere Ike Ịmalite Inwe Okwukwe n’Onye Okike?
Mmadụ Ò Nwere Ike Ịmalite Inwe Okwukwe n’Onye Okike?
“MGBE ọ bụla m chere na o nwere ike ịbụ na e nwere Onye Okike, ezigbo iwe na-ewe m n’ihi na ọ pụtara na o nwere onye nwere ikike ịkwụsị ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata ma ọ chọghị iji ike ya akwụsị ya!” Nke a bụ ihe otu onye na-ekwebughị na Chineke, nke e gburu ndị ezinụlọ ya n’oge ndị Nazi chọrọ igbukpọ ndị Juu na ndị ọzọ n’Agha Ụwa nke Abụọ, kwuru. Ọ bụtụghị naanị ya chere otú ahụ.
Mgbe ọdachi dakwasịrị ọtụtụ ndị, ọ na-esiri ha ike ikwere na Chineke, ma ọ bụ ha akasie onwe ha obi site n’ịgwa onwe ha na Chineke adịghị. Olee isi ihe ndị na-eme ka ụfọdụ ndị ghara ikwere na Chineke? Ọ̀ ga-akara ụmụ mmadụ mma ma ha ghara ikwere na Chineke ma ọ bụ n’okpukpe, dị ka ụfọdụ ndị chere? Onye na-ekweghị na Chineke ò nwere ike ịmalite inwe okwukwe n’Onye Okike nke hụrụ anyị n’anya?
Arụ Okpukpe Na-akpa
Ọ bụ ihe ijuanya na ihe kacha eme ka ndị mmadụ ghara ikwere na Chineke bụ okpukpe. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Alister McGrath kọwara, sị: “Ihe kacha eme ka ndị mmadụ ghara ikwere na Chineke bụ n’ihi na arụ a na-akpa n’okpukpe na-asọ ha oyi.” A na-ewerekarị okpukpe dị ka ihe na-akpata agha na ime ihe ike. Otu ọkà ihe ọmụma na-ekweghị na Chineke bụ́ Michel Onfray tụgharịrị uche banyere otú o si bụrụ na otu akwụkwọ okpukpe nwere ike ime ka otu onye “gbalịwa ịdị nsọ” ma mee ka onye nke ọzọ “kpawa arụ,” yiwe ọha egwu.
Ọtụtụ ndị ka na-echeta ihe ọjọọ okpukpe kpataara ha. Mgbe nwa okorobịa onye Sweden, bụ́ Bertil, bụ onye agha, ọ nụrụ ka ụkọchukwu ndị agha ji ịdọ aka ná ntị Jizọs nke bụ́ na ndị ji mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha na-akwado ime ihe ike. Ụkọchukwu ahụ kwuru na a ga-enwerịrị onye ga-eji mma agha ahụ, n’ihi ya, onye agha ga-abụrịrị ohu Chineke!—Matiu 26:52. *
Bernadette, bụ́ onye e gburu nna ya na France n’Agha Ụwa nke Abụọ, chetara oké iwe were ya mgbe a na-eli nwa nwanne nne ya dị afọ atọ n’ihi na otu ụkọchukwu kwuru, sị: “Chineke akpọrọla nwatakịrị a ka ọ ghọọ mmụọ ozi.” Bernadette mechara mụọ nwa nwere nkwarụ, chọọchị ya akasighịkwa ya obi.
Ozizi ọkụ ala mmụọ wutere Ciarán, bụ́ onye toro na Northern Ireland n’oge a na-eme ihe ike n’ebe ahụ. Ọ na-ekwubu na ya kpọrọ Chineke nke kpatara ụdị omume obi ọjọọ ahụ asị ma sị Chineke gbuo ya ma ọ bụrụ na Ọ dị adị. Ọ bụghị naanị Ciarán ka ụdị nkụzi mmekpọ ọnụ a chọọchị na-akụzi na-ewute. N’ezie, o nwere ike ịbụ na ozizi chọọchị so mee ka e nwee ozizi evolushọn. Alister McGrath kwuru na ihe mere Darwin ji nwewe obi abụọ ma Chineke ọ̀ dịkwa abụghị n’ihi na o kweere n’ozizi evolushọn kama ọ bụ “iwe na ọnụma juru ya obi” n’ihi ozizi ọkụ ala mmụọ. McGrath kwukwara banyere “oké uju Darwin nọ na-eru n’ihi ọnwụ nwa ya nwaanyị.”
Ụfọdụ ndị chere na ikpe okpukpe bụ echeghị echiche na mmadụ ikwe ka ihe o kweere na-agba ya ara. Irina, bụ́ onye okwuchukwu na-enweghị isi na ekpere ndị a na-ekpeghachi ugboro ugboro gbụrụ, kọrọ, sị: “O yiri m ka ndị okpukpe anaghị eche echiche.” Louis, bụ́ onye arụrụala okpukpe na-arụ wụrụ akpata oyi n’ahụ́, kwudịrị ihe ka nke ahụ njọ, sị: “Ruo ọtụtụ afọ, m weere okpukpe dị ka ihe na-agwụ ike, ma ahụkwuola m na ọ na-eme ka ndị
mmadụ na-akpa àgwà ọjọọ. Amalitere m imegidesi ụdị okpukpe niile ike.”Ọ̀ Ka Mma Ịghara Ikwere na Chineke?
N’ihi ya, ọ bụghị ihe ijuanya na ọtụtụ ndị na-ele okpukpe anya dị ka ihe na-egbochi ụmụ mmadụ inwe ọganihu na udo. Ụfọdụ ajụọdịla onwe ha ma ọ̀ ga-akara ụmụ mmadụ mma ịghara ikwere na Chineke na okpukpe. Ma, ịjụ okpukpe kpamkpam ò nwere ike ịkpata nsogbu nke ya?
Ọkà ihe ọmụma nke narị afọ nke iri na asatọ, bụ́ Voltaire, ji iwe mee mkpesa banyere arụ chọọchị ọjọọ e nwere n’oge ya na-akpa. N’agbanyeghị nke ahụ, o kweere na ihe mere anyị ji akpa àgwà ọma bụ na e nwere Onye Kachasị Elu. Mgbe nke ahụ gasịrị, onye Germany bụ́ ọkà ihe ọmụma, bụ́ Friedrich Nietzsche, kwuru hoo haa na Chineke anwụọla, ma ụjọ ji ya na ọ bụrụ na ndị mmadụ akwụsị ikwere na Chineke na arụrụala na ihe ọjọọ ga-akarị akarị. Ụjọ a ọ tụrụ ò ziri ezi?
Keith Ward, bụ́ onye na-ede akwụkwọ, kwuru na omume obi ọjọọ ebelatabeghị kemgbe ụwa malitere imepe anya, kama “ọ rịala elu karịa otú e chetụrụla n’echiche.” Ozizi ekweghị na Chineke emebeghịkwa ka ụmụ mmadụ kwụsị àgwà ọjọọ ndị ha na-akpa, dị ka nrụrụ aka na ekweghị ibe nọrọ. Ihe ndị a emeela ka ọtụtụ ndị na-eche echiche, ọbụna ndị na-ekweghị na Chineke, mata na ikwere na Chineke na-eme ka ndị mmadụ na-akpa ezi àgwà.
Keith Ward kwuru otú ikwere na Chineke si eme ka mmadụ na-akpa ezi àgwà, sị: “Okwukwe na-eme ka mmadụ na-achọ nnọọ ịkpa ezi àgwà, mee ka mmadụ mata na ọ bụ ọrụ ya ilekọta ụwa nke Chineke kere.” Ọtụtụ ihe ọmụmụ ndị e nwere n’oge na-adịbeghị anya gosiri na ndị na-ekpe okpukpe na-aka achọ ọdịmma ndị ọzọ. Ịchọ ọdịmma ndị ọzọ na-emekwa ka obi dị mmadụ ụtọ. Ụdị nchọpụta ndị a na-egosikwu na ihe a Jizọs kwuru bụ eziokwu: “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35.
Otú Baịbụl si agbanwe ndụ ndị mmadụ masịrị nnọọ otu onye ọrụ ebere nke na-ekwebughị na Chineke. O kwuru, sị: “Mgbe m jisịrị ọtụtụ afọ nwaa ime ka ndị mmadụ kwụsị àgwà ndị na-akpatara ha na ndị ọzọ nsogbu, ma o nwechaghị isi, o juru m anya ịhụ otú ndị mmadụ nwere nnọọ ike isi gbanwee àgwà ha kpamkpam. Ahụkwara m na ha alaghachighị n’àgwà ọjọọ ndị ha na-akpabu.”
Ka o sina dị, ụfọdụ ndị na-ekweghị na Chineke kweere na esemokwu na mgbukpọ ikwere na Chineke kpatarala karịrị ezi àgwà na obiọma o merela ka ndị mmadụ nwee. Ha nwere ike ikweta na okwukwe na-eme ka ụfọdụ ndị na-akpa ezi àgwà, ma ha ka na-enwe obi abụọ. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị?
Ihe Ndị Ọzọ Na-eme Ka Ndị Mmadụ Ghara Ikwere
A na-akụziri ọtụtụ ndị na evolushọn bụ nnọọ eziokwu doro anya. Dị ka ihe atụ, Anila gara akwụkwọ ná mba Albania na-ekweghị na Chineke. Ọ kọrọ, sị: “Mgbe anyị nọ n’ụlọ akwụkwọ, a kụziiri anyị na onye kweere na Chineke bụ onye iberiibe na onye na-amaghị nke a na-akọ. M na-amụta ihe ndị na-atụ m n’anya mgbe niile banyere ihe ọkụkụ na ihe ndị dị ndụ, ma echere m na ihe niile ahụ si n’evolushọn, ebe ọ bụ na ụdị echiche ahụ mere ka anyị yie ndị ma nke a na-akọ na sayensị.” O kwetara taa na ha “kweere ihe ndị a kụziiri ha n’ajụghị ase.”
Iwe nwere ike ime ka ụfọdụ ndị ghara ikwere na Chineke. Ndịàmà Jehova na-ahụkarị ndị dị otú ahụ ka ha na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ, na-eji Baịbụl ezi ndị mmadụ ozi olileanya. Otu Onyeàmà na-eto eto gara na nke Bertil, bụ́ onye a kpọrọla aha mbụ, iji zie ya ụdị ozi ahụ. Bertil chetara na ya nọ na-ekwu n’ime onwe ya, sị: ‘Legodị onye a bu okpukpe n’isi. Ọ makwanụghị na ọ gaghị enwetali m!’ O kwuru, sị: “Akpọbatara m ya ma malite ịgwa ya ihe na-ewe m iwe banyere Chineke, Baịbụl, na okpukpe.”
Ikpe na-ezighị ezi nyere Gus, bụ́ onye Scotland, nsogbu n’obi. Na mbụ, ọ na-arụ nnọọ Ndịàmà Jehova ụka ma na-emegide ha mgbe ya na ha na-ekwurịta okwu. Ọ jụrụ ụdị ajụjụ ndị onye amụma Hibru, bụ́ Habakọk, jụrụ, bụ́ onye jụrụ Chineke, sị: “Gịnị mere i ji mee ka m na-ahụ ihe ọjọọ, gịnịkwa mere i ji na-ele nsogbu n’anya n’anya?”—Habakọk 1:3.
Ọ dịkwala anya nkịtị o yiri ka Chineke ọ̀ gbachiri ajọ omume wutewere ụmụ mmadụ. (Abụ Ọma 73:2, 3) Simone de Beauvoir, bụ́ onye France na-ede akwụkwọ, nwere mgbe o kwuru, sị: “Ọ kaara m mfe ikwere na ụwa enweghị onye okike karịa ikwere na ụwa nwere onye okike ma nsogbu niile a dị na ya aka dịrị.”
Ma, eziokwu ahụ bụ́ na ọtụtụ okpukpe enweghị ike ịkọwa ihe ndị a na-agbagwoju ndị mmadụ anya ọ̀ pụtara na ha enweghị nkọwa? Gus kwuru na ya mechara nweta “nkọwa na-eju afọ banyere ihe mere Onye Okike nwere ike niile ji kwere ka ụmụ mmadụ taa ahụhụ ruo oge ụfọdụ.” O kwuru, sị, Nke ahụ “nyeere m ezigbo aka.” *
Ụfọdụ ndị na-ekwu na ha ekweghị na Chineke nwere ike inwe obi abụọ banyere evolushọn, mara na ha nwere mkpa ime mmụọ, ọbụna na-ekpekwa ekpere. Ka anyị hụ ihe mere ụfọdụ ndị na-ekweghị na Chineke na ndị kwere na a pụghị ịmata Chineke amata ji chebara nnọọ okwu a echiche ma mechaa meta nnọọ Onye Okike ha enyi.
Olee Ihe Ndị Nyeere Ha Aka Ịmalite Inwe Okwukwe n’Onye Okike?
Nwa okorobịa ahụ bịara na nke Bertil mere ka o chee echiche site n’igosi ya na e nwere ezigbo ọdịiche dị n’etiti ezi Iso Ụzọ Kraịst na okpukpe ndị na-aza Ndị Kraịst naanị n’aha. *
E wezụga ihe ndị a gwara Bertil mere o ji bụrụ na e nwere Onye Okike, o kwuru ihe kacha masị ya, sị: “Obi dị m ụtọ otú o si nwee ndidi n’agbanyeghị na m kpọrọ ekwe nkụ. . . . O wesatụghị m iwe, ọ na-enye m akwụkwọ mgbe niile, na-akwadokwa nke ọma.”Svetlana, bụ́ onye kweere ozizi evolushọn na ozizi ndị Kọmunist, kwetara na ọ bụ naanị ihe ndị kacha ike na-adịgide ndụ n’ụwa. Otú ọ dị, ozizi a na-akụda mmụọ nyere ya nsogbu n’obi. Ihe a kụziiri ya n’ụlọ akwụkwọ nkà mmụta ọgwụ na ahụ́ ike mere ka o nwekwuo mgbagwoju anya: “Mgbe a na-akụziri anyị ihe ọmụmụ ekweghị na Chineke, a gwara anyị na ọ bụ naanị ihe ndị kacha ike na-adịgide ndụ n’ụwa. Ma mgbe a na-akụziri anyị banyere nkà mmụta ọgwụ na ahụ́ ike, a kụziiri anyị na anyị kwesịrị inyere ndị na-adịghị ike aka.” Ọ nọkwa na-eche ihe mere ụmụ mmadụ, bụ́ ndị a sịrị na ha katụ enwe, ji enwekarị nchegbu, ma enwe a sịrị na ha bụbu tupu ha aghọọ mmadụ anaghị enwe nchegbu. O nwetara azịza ya n’ebe ọ na-atụghị anya ya. Ọ sịrị: “Nne nne m ji Baịbụl kọwaara m na ọ bụ ezughị okè anyị na-akpata nchekasị.” Obi tọkwara Svetlana ụtọ mgbe ọ mụtara ihe Baịbụl kwuru mere ndị aka ha dị ọcha ji ata ahụhụ.
Leif, bụ́ onye Scandinavia, kwenyesịburu ike n’evolushọn ma were Baịbụl dị ka akwụkwọ akụkọ ifo. Ma, otu ụbọchị, enyi ya jụrụ ya ajụjụ banyere ihe ndị o kweere, sị: “Ị̀ ma na naanị ihe ị na-eme bụ ikwughachi ihe ndị ọzọ gwara gị, n’enweghị otu mkpụrụ ihe ị ma banyere Baịbụl?” Leif kọwara otú okwu ahụ si ruo ya n’ahụ́, sị: “Achọpụtara m na ajụtụbeghị m ajụjụ banyere evolushọn, kama nke ahụ, m kweere ihe niile a gwara m. . . . Echere m na ịmata amụma Baịbụl na mmezu ha so n’ihe ndị ga-enyere onye na-ekweghị na Chineke aka iche echiche.”—Aịzaya 42:5, 9.
Ike ụwa gwụrụ Ciarán, bụ́ onye a kpọrọ aha na mbụ, n’ihi ọtụtụ afọ o ji dọọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Mgbe ọ na-eche echiche banyere ndụ, o chere, sị: Ọ bụ naanị Chineke nke dị ike ma nwee ịhụnanya nwere ike ịkwụsị nsogbu ụwa ma gosi ya otú ọ ga-esi kwụsị ahụhụ ọ na-ata. Ọ kwara arịrị n’ime onwe ya, sị, ‘A sị nnọọ na ọ dị otú m ga-esi chọta Chi dị otú ahụ.’ Mgbe ọ nọ n’oké nchegbu, o kpere ekpere, sị: “Ọ bụrụ na ị na-anụ ihe m na-ekwu, gositụ m ya, gosikwa m otú m ga-esi nwere onwe m n’ahụhụ m na-ata na otú ụmụ mmadụ niile ga-esi nwere onwe ha n’ahụhụ ha na-ata.” Mgbe ụbọchị ole na ole gachara, otu Onyeàmà Jehova bịara na nke ya. Onyeàmà ahụ kọwaara ya ihe Baịbụl na-akụzi banyere ndị ọjọọ a na-anaghị ahụ anya na-edu ọchịchị ụmụ mmadụ. (Ndị Efesọs 6:12) Nkọwa a kwadoro ihe Ciarán chọpụtarala, meekwa ka ọ chọọ ịmatakwu ihe ndị ọzọ. Mgbe a kụzikwuuru ya Baịbụl, okwukwe o nwere n’Onye Okike nke nwere ịhụnanya malitere isi ike.
Mmekọrịta Gị na Onye Kere Ụmụ Mmadụ
Ihu abụọ ndị okpukpe, ozizi ekweghị na Chineke ndị dị ka evolushọn, na mmebi iwu juru ebe niile emeela ka ọtụtụ mmadụ nwewe obi abụọ ma è nwekwara Onye Okike ma ọ bụ ọbụna kwuo na ọ dịghị adị. Ma, Baịbụl nwere ike ịza gị ajụjụ ndị i nwere otú ọ ga-eju gị afọ, ma ọ bụrụ na i kwere. Ọ na-emekwa ka a mata echiche Chineke, bụ́ “echiche udo, ọ bụghị nke ọdachi, ime ka [i] nwee ọdịnihu na olileanya.” (Jeremaya 29:11) Olileanya ahụ kasiri nnọọ Bernadette obi n’ahụhụ ọ na-ata, bụ́ onye nwa ya nwere nkwarụ mgbe a mụrụ ya, onye nwekwara obi abụọ banyere Onye Okike.
Otú Baịbụl si kọwaa ihe mere Chineke ji kwere ka ahụhụ dịrị eruola ọtụtụ ndị na-ekwebughị na Chineke n’obi na n’uche. Ọ bụrụ na i wepụta oge chọpụta otú Baịbụl si zaa ajụjụ ndị ahụ dị mkpa, o nwekwara ike ido gị anya na e nwere Chineke, bụ́ onye ‘na-anọghị nnọọ n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.’—Ọrụ 17:27.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 6 Iji mata ma ezi Ndị Kraịst hà kwesịrị ịlụ agha, gụọ isiokwu bụ́ “Ịlụ Agha Ò Kwekọrọ n’Ozizi Ndị Kraịst?” nke dị na peeji nke 29-31.
^ par. 22 Ọ bụrụ na ị chọrọ inweta nkọwa zuru ezu banyere ihe mere Chineke ji kwere ka ajọ omume dịrị, gụọ akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?, peeji nke 106 ruo 114. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.
^ par. 25 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata ihe ndị e kwuru kwadoro na e kere ihe eke, gụọ Teta! (Bekee) September 2006, nke isiokwu ya bụ “Is There a Creator? (È Nwere Onye Okike?),” nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
[Igbe dị na peeji nke 13]
Ajụjụ Ndị Ozizi Evolushọn Na-azalighị
• Olee otú ndụ ga-esi si n’ihe na-adịghị ndụ pụta?—ABỤ ỌMA 36:9.
• Gịnị mere anụmanụ ji na-amụ naanị ụdị ya, osisi ana-epupụtakwa ụdị ya?—JENESIS 1:11, 21, 24-28.
• Ọ bụrụ na ụmụ mmadụ si n’enwe dị ala karịa ha pụta, olee ihe mere na e nweghị enwe bụ́ mmadụ ka dị ndụ?—ABỤ ỌMA 8:5, 6.
• Ọ bụrụ na ọ bụ ezie na ọ bụ naanị ihe ndị kacha ike na-adịgide ndụ, olee ihe mere ụmụ mmadụ ji achọ ọdịmma ndị ọzọ?—NDỊ ROM 2:14, 15.
• Ụmụ mmadụ hà nwere olileanya ọ bụla e ji n’aka maka ọdịnihu?—ABỤ ỌMA 37:29.
[Foto ndị dị na peeji nke 12, 13]
Olee otú Chineke nke nwere ịhụnanya ga-esi kee ụwa ụmụaka na-ata ahụhụ na ya?
Ihu abụọ ndị okpukpe emeela ka ọtụtụ ndị ghara ikwere na Chineke