Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Echiche Ụgha nke 2: Ndị Ajọ Omume Na-ata Ahụhụ na Hel

Echiche Ụgha nke 2: Ndị Ajọ Omume Na-ata Ahụhụ na Hel

Echiche Ụgha nke 2: Ndị Ajọ Omume Na-ata Ahụhụ na Hel

Olee ebe echiche ụgha a si? “N’ime ndị ọkà mmụta Gris oge ochie niile, onye ozizi ya kacha metụta ihe ndị mmadụ kweere banyere Hel bụ Plato.”—Histoire des enfers (Akụkọ Banyere Hel), nke Georges Minois dere, peeji nke 50.

“Malite n’etiti narị afọ nke abụọ AD, ọ malitere ịgụ Ndị Kraịst a kụzitụụrụ nkà ihe ọmụma Gris agụụ ịkụzi ihe ha kweere otú ọ ga-ekwekọ n’ihe a kụziiri ha . . . Nkà ihe ọmụma nke kacha masị ha bụ ozizi Plato.”—The New Encyclopædia Britannica (1988), Nke 25, peeji nke 890.

“Ozizi Chọọchị gosiri na e nwere hel nakwa na ọ na-adịru mgbe ebighị ebi. Ozugbo ndị mere njọ ogbugbu nwụrụ, mkpụrụ obi ha na-aga na hel, bụ́ ebe ha na-enweta ntaramahụhụ hel, bụ́ ‘ọkụ ebighị ebi.’ Ahụhụ kachanụ a na-ata mmadụ na hel bụ ikewapụ ya n’ebe Chineke nọ ruo mgbe ebighị ebi.”—Catechism of the Catholic Church, nke 1994, peeji nke 270.

Gịnị ka Baịbụl kwuru? “N’ihi na ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ; ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị, . . . n’ihi na ọrụ ma ọ bụ ichepụta ihe ma ọ bụ ihe ọmụma ma ọ bụ amamihe adịghị na Shiol, ebe ị na-aga.”—Ekliziastis 9:5, 10.

A sụgharịrị okwu Hibru bụ́ Shiol, nke pụtara “ebe ndị nwụrụ anwụ nọ,” “hel” n’ụfọdụ nsụgharị Baịbụl. Olee ihe amaokwu ndị ahụ na-akụziri anyị banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ? Hà na-ata ahụhụ na Shiol iji kwụọ ụgwọ njọ ha? Mba, n’ihi na ha “amaghị ihe ọ bụla.” Ọ bụ ya mere na mgbe nna ochie bụ́ Job nọ n’oké ahụhụ n’ihi ajọ ọrịa rịara ya, ọ rịọrọ Chineke, sị: “Chebe m na hel [Hibru, Shiol].” (Job 14:13; nsụgharị Douay-Rheims Version) Olee uru arịrịọ a ga-abara ya ma a sị na Shiol bụ ebe a na-ata mmadụ ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi? Na Baịbụl, naanị ihe hel pụtara bụ ili nke ihe niile bụ́ mmadụ, bụ́ ebe a na-anaghị arụ ọrụ ọ bụla.

Ezi uche ọ́ kaghị dịrị n’otú a e si kọwaa hel, ó kwekọghịkwa n’Akwụkwọ Nsọ? Olee ụdị ihe ọjọọ mmadụ ga-eme, n’agbanyeghị otú ọ jọruru ná njọ, ga-eme ka Chineke nke hụrụ anyị n’anya mekpaa ya ahụ́ ruo mgbe ebighị ebi? (1 Jọn 4:8) Ma, ọ bụrụ na ọkụ ala mmụọ bụ echiche ụgha, oleekwanụ maka eluigwe?

Jiri amaokwu Baịbụl ndị a tụnyere ibe ha: Abụ Ọma 146:3, 4; Ọrụ 2:25-27; Ndị Rom 6:7, 23

NKE BỤ́ EZIOKWU:

Chineke anaghị ata ndị mmadụ ahụhụ na hel

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 5]

Barrators—Giampolo/The Doré Illustrations For Dante’s Divine Comedy/Dover Publications Inc.